Ndị uweojii Delta Steeti kwuru na aka ha akparala mmadụ abụọ n’ime
mmadụ anọ a na-enyo na aka ha dị n’ogbugbu otu nwoke Injinịa na-arụ ụlọ a kpọrọ
Chigozie Udalor ma lie ozu n’obere ili.
Ọnụ na-ekwuru ndị uweojii na steeti ahụ bụ Bright Edafe
kwuru na a nwụchiri ndị a n’ụbọchị abụọ nke ọnwa Eprelụ, 2025.
Na nkọwa o nyere, Edafe kwuru na nnyocha e mere gosiri na
mmadụ anọ a bụ ndị Benue Steeti Udalor kpọtara ka ha rụọrọ ya ọrụ, gburu ya mgbe
ha chọpụtara na nnukwu ego dị n’ọbaego ya.
O kwuru na ụbọchị 12 Disemba, 2024 ka nwanne Udalor a kpọrọ
Hyacinth Nnalue kpọtụụrụ ndị uweojii ma kwuo na ha na-achọ nwanne ha bụ Udalor kamgbe
ụbọchị 10 Disemba.
O kwuru na Udalor bụ onye na-elekọta ebe ọ na-arụ ụlọ e ji
akụ azụ dị n’ebe a na-akpọ Bod Camp n’obodo Akwukwu.
O kwuru na ngwa ngwa ha nwetere ozi a na ha malitere ime nnyocha
nke mere e jiri nwuchie mmadụ abụọ n’ụbọchị 31 Maachị, 2025.
Ha nwuchiri otu n’ime ha bụ Davido Tacho ka ọ na-achọ iji
ekwentị Udalor ha gburu egbu adọrọ ego n’ọbaego ya. Ebe e mechara nwuchie
Daniel Orshio bụ onye si kpaa arụ a.
Akụkọ kwuru na dịka mmadụ anọ na-arụrụ Udalor ọrụ na ha chọpụtara
na ọkpụrụkpụ ego dị n’ọbaego ya nke mere ha jiri kpaa nkata ma were ‘hammer’
tigbuo ya.
Ha kechiri ozu ya ma lie ya n’obere ili dị n’akwụkwọ ebe ha
na-arụ ọrụ.
Dịka ọ dị ugbua, Edafe kwuru na mmadụ abụọ ha ji eji
na-enyere ha aka n’ime nnyocha nakwa ịgba mbọ nwuchie abụọ fọrọ afọ.