You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.

Take me to the main website

Yukren, Amerịka bịnyere aka na nkwekọrịta akụ na ụba sitere n'okike maka ịkwụsị mwakpo Rọshịa

Nchịkọta akụkọ ndị kachasị mkpa mere na mbaụwa n'ọnwa Eprel 2025.

Mkpuchi Na Eme Ozugbo

Uzoamaka Ewuzie, Ikechukwu Kalu, Michael Ngene, Chinonso Ugorji, Michael Ilediagu, Adline Okere

  1. Igbo bụ Igbo anyị na-ekele, Ngwụcha izuụka ọma nụ

    Anyị na-ekele gị maka isonyere ọgbakọ BBC News Igbo taa bụ Satọde Afọ 5 Eprel 2025.

    Gaa n'ihu nọnyere anyị dịka anyị na-ewetere gị akụkọ niile na-akpọtụ n'ala Igbo, Naịjirịa, Afrịka nakwa ụwa niile.

    Ya gazie!

  2. Julius Abure na Usman Nenadi: Ụlọikpe kachasị enyela mkpebị banyere onye bụ onyeisioche otu Lebọ Patị

    Ụlọikpe kachasị na Naịjirịa enyela mkpebi ma sị na Julius Abure bụ onyeisioche otu ndọndọrọ ọchịchị Lebọ patị.

    Ụlọikpe nyere mkpebi ahụ n’Abụja n'ikpe gbasara onye bụ onyeisi oche otu Lebọ Patị n’etiti Julius Abure na Sinetọ Nenadi Usman.

    N’okwu Obiora Ifoh bụ ọnụ na-ekwuru otu Patị ahụ binyere aka ka ha kenere ụlọikpe kachasị na Naịjirịa maka inye mkpebi ahụ n'okwu ahụ.

    Ifoh kwuru na “anyị ji ohere a na-agwa ndị bụ ndị otu ndọrọndọrọ ọchịchị Lebọ patị ka ha kwadoo Julius Abure na ndị ndu ha dịka ụlọikpe kpebiri ikpe gbasara onye bụ onyeisi oche”.

    Mana ka ụlọikpe kachasị nyere mkpebi ya, Sinetọ Nenadi Usman jiri akara X soshal mịdịa sị "Lebọ patị bụ otu ezinaụlọ na-enweghị nkewa, naanị ihe anyị chọrọ bụ ka anyị dozie Naịjirịa"

    "Ugbua enweghị onye meriri maọbụ onye e merirị; anyị niile kwesiri ịbịakọta ọnụ ma dozie obodo anyị".

    Cheta na mgbe nkewa batara n’otu ndọrọndọrọ ọchịchị Lebọ patị bụ mgbe ha mere ọgbakọ ịwepụta ndị ndu ha.

    N’oge ahụ, ọtụtụ Lebọ patị gara Umuahia dị n’Abịa steeti ga-wepụta Sinetọ Nenadi Usman dịka onyeisi oche, ebe ndị nke ọzọ wepụtara Julius Abure n’ọgbakọ ha mere n’ọnwa Maachị abalị 27 n’afọ 2027.

  3. Gọvanọ Hope Uzodimma eduola onye ga na-arụgodu ọrụ ka Nnukwu Ọkaikpe Imo steeti n’iyi ọrụ

    Aka na-achị Imo steeti bụ Hope Uzodimma eduola Ọkaikpe Theophilus Nnamdi Nzeukwu n'iyi ọrụ dịka onye ga na-arụgodu ọrụ ka Nnukwu Ọkaikpe Imo steeti.

    Ọnọdụ a na-abịa dịka ọ gachara ọtụtụ ọnwa otu National Judicial Council (NJC) chụpụrụ onye bụbu Nnukwu Ọkaikpe Imo steeti bụ Theresa Chikeka maka ịtụ asị gbasara afọ ole ọ dị.

    Oge ọ na-ahazi mmemme ahụ n’obi ọchịchị dị n’Owere, Uzodimma kwughachiri ebumnobi ọchịchị ya ime ka ngalaba ikpe Imo steeti bụrụ nke a ga-atụkwasịnwụ obi.

    O kwuru na nhọpụta Ọkaikpe Nzeukwu bụ nke ụlọọrụ Judicial Service Commission (JSC) kpachapụrụ anya mee site n’irubeisi n’iwu Naịjirịa.

    Uzodimma gbara Nzeukwu ume ka ọ gbapụ ọsọ n’usoro e ji ahọpụta Nnukwu Ọkaikpe ga-adịgide adịge n’Imo steeti.

    Ọ gara n’ihu gwa ndị niile na-arụ ọrụ na ngalaba ikpe ka ha hụta ọrụ ha dịka nke dị nsọ ma nye ha ndụmọdụ ka ha were nkwụbaakaọtọ na ịtụ egwu Chineke na-arụ ọrụ ha.

    N’okwu nnabata ya, Ọkaikpe Nzeukwu kelere Gọvanọ Uzodimma na ụlọọrụ JSC maka ntụkwasịobi ha nwere n’ebe ọ nọ.

    O kwere nkwa na ya agaghị agharịpụ ntụkwasịobi ahụ ma ṅụọ iyi na ya ga-ewebata ọnọdụ ọhụrụ nke nwere ntụkwasịobi na inye ngụkọ na ngalaba ikpe nke Imo steeti.

  4. Chaịna ekwuola na ha ga-amanye ụtụisi 34% n'ihe niile e si mba Amerịka ebubata

    Mba Chaịna ekwuola na ha ga-amanye pasenti iri atọ na anọ na ngwaahịa niile si mba Amerịka abata na Chaịna.

    Mịnịstrị na-ahụ maka ego na azụmaahịa n amba Chaịna mere ka a mata nke a ma kwuo na amụma ahụ ga-ebido n’Epril 10 2025.

    Ha katọrọ ụtụisi mba Amerịka manyere n’ihe niile e si mba Chaịna ebubata n’Amerịka ma kwuo na “ọ dara iwu mba ụwa ji azụ ahịa”.

    Onyeisiala mba Amerịka bụ Donald Trump kwupụtara nay a amanyere ụtụisi 54% n’ọnụahịa ihe niile e si mba Chaịna ebubata n’Amerịka.

    Nke a mere mba Chaịna dịka ndị ọ kacha metụta n’ụtụisi ọhụrụ mba Amerịka manyere na ngwaahịa e si mba dị icheiche ebubata n’Amerịka.

  5. Ụlọikpe iwu Saụt Korịa akwadola nchụpụ a chụpụrụ Yoon Suk Yeol dịka onyeisiala

    Ụlọikpe iwu mba Saụt Korịa ekpebiela ma kwado nchụpụ a chụpụrụ Onyeisiala Yoon Suk Yeol.

    Akụkọ kwuru na anya mmiri ọṅụ na arịrị jupụtara anya ndị nkwado Yeol ndị jupụtara n'okporoụzọ iji chere mkpebi ụlọikpe ahụ.

    Ndị uweojii ka anyị nụrụ na ha kwụrụ chịm iji gbochie ihe ọbụla nwereike imetụta udo obodo.

    N'okwu ya oge ụlọikpe kwupụtara mkpebi ha, Yoon kwuru rịọrọ ndị Saụt Korịa mgbaghara n'ihi na o meghị ihe ha tụrụ anya n'aka ya dịka onyeisiala ha.

    Cheta na ọgbaaghara dapụtara na mba Saụt Korịa n'onwa Disemba 2024 oge Yoon nyefere ikike ọchịchị n'aka ndịagha.

    Ọ bụ nke a mere ka a napụ ya ikike ya dịka onyeisiala ụbọchị Satọde 14 Disemba 2024.

    Ụfọdụ ndị ọrụ ya maara ya kwuru na Yoon bụ onye na-eme ihe ọbụla masịrị ya malite oge ọ dị na nwata.

    Ugbua ụlọikpe iwu kwadoro nchụpụ Yool dịka onyeisiala, a ga-eme ntụliaka n'ime abalị iri isii na abịa iji họpụta onye ga-abụ onyeisiala ọhụrụ.ba Saụt Korịa.

  6. Ụtụisi ọhụrụ Trump wepụtara emetụtala azụmahịa na mba Ọstrelịa na Eshia

    Ụtụisi ọhụrụ Onyeisiala Donald Trump na-achị Amerịka wepụtara, akpụọla azụmahịa mba Eshia na Ọstrelịa afọ n'ala.

    Nke a bụ ụbọchị abụọ nke na-eme ebe akụkọ na-ekwu na ụtụisi ọhụrụ nwereike inwe mmetụta nye azụmahịa mbaụwa gbaa gburugburu.

    Azụmahịa mba Amerịka kpụkwara afọ ala. Nke mbụ ya kemgbe ọrịa Covid tiwapụrụ n'afọ 2020.

    Onyeisiala Trump kwuru na ụtụisi ọhụrụ ya na-aga nke ọma ma kwuo na o ga-ewulite azụmahịa n'ọdịnihu.

    N'aka nke ọzọ ndị mbaụwa ekwuola na ha ga-azaghachi mmanye ụtụisi 10% ahụ Onyeisiala Trump manyere na ngwaahịa ọbụla si mba ọzọ abata Amerịka nke ga-amalite ụbọchị Satọde 5 Eprel, 2025.

  7. Ndị be anyị, unu abọọla chi?

    Anyị ji obi ụtọ anabata gị n'ọgbakọ BBC News Igbo taa bụ Fraịde 4 Eprel 2025.

    Ọfọ anyị bụ ka ihe ọma niile so ụbọchị taa bụ ahịa orie ruo gị na ezinaụlọ aka.

    Ije ọma ga-abụ nke gị taa.

    Ndewo!

  8. Etu mmadụ anọ si gbuo onye Injinịa kpọrọ ha ọrụ ma lie ozu ya

    Ndị uweojii Delta Steeti kwuru na aka ha akparala mmadụ abụọ n’ime mmadụ anọ a na-enyo na aka ha dị n’ogbugbu otu nwoke Injinịa na-arụ ụlọ a kpọrọ Chigozie Udalor ma lie ozu n’obere ili.

    Ọnụ na-ekwuru ndị uweojii na steeti ahụ bụ Bright Edafe kwuru na a nwụchiri ndị a n’ụbọchị abụọ nke ọnwa Eprelụ, 2025.

    Na nkọwa o nyere, Edafe kwuru na nnyocha e mere gosiri na mmadụ anọ a bụ ndị Benue Steeti Udalor kpọtara ka ha rụọrọ ya ọrụ, gburu ya mgbe ha chọpụtara na nnukwu ego dị n’ọbaego ya.

    O kwuru na ụbọchị 12 Disemba, 2024 ka nwanne Udalor a kpọrọ Hyacinth Nnalue kpọtụụrụ ndị uweojii ma kwuo na ha na-achọ nwanne ha bụ Udalor kamgbe ụbọchị 10 Disemba.

    O kwuru na Udalor bụ onye na-elekọta ebe ọ na-arụ ụlọ e ji akụ azụ dị n’ebe a na-akpọ Bod Camp n’obodo Akwukwu.

    O kwuru na ngwa ngwa ha nwetere ozi a na ha malitere ime nnyocha nke mere e jiri nwuchie mmadụ abụọ n’ụbọchị 31 Maachị, 2025.

    Ha nwuchiri otu n’ime ha bụ Davido Tacho ka ọ na-achọ iji ekwentị Udalor ha gburu egbu adọrọ ego n’ọbaego ya. Ebe e mechara nwuchie Daniel Orshio bụ onye si kpaa arụ a.

    Akụkọ kwuru na dịka mmadụ anọ na-arụrụ Udalor ọrụ na ha chọpụtara na ọkpụrụkpụ ego dị n’ọbaego ya nke mere ha jiri kpaa nkata ma were ‘hammer’ tigbuo ya.

    Ha kechiri ozu ya ma lie ya n’obere ili dị n’akwụkwọ ebe ha na-arụ ọrụ.

    Dịka ọ dị ugbua, Edafe kwuru na mmadụ abụọ ha ji eji na-enyere ha aka n’ime nnyocha nakwa ịgba mbọ nwuchie abụọ fọrọ afọ.

  9. Gọvanọ Sanwo-Olu arịọla ndị bi na Legọs mgbaghara maka mkpachi okporoụzọ mere na Wenezde

    Gọvanọ Babajide Sanwo-Olu nke Legọs Steeti arịọla ndị bi n’obodo ahụ mgbaghara maka oke kpachikpachi mere n’ụzọ n’ụbọchị Wednezde maka mmechi e mechiri akwammiri ‘Independence Bridge’.

    Mmechi akwammiri a butere nnukwu ntaramahụhụ nye ndị bi na Legọs maka na ọtụtụ ndị mmadụ hiri n’okporoụzọ n’ihi mkpachi nke okporoụzọ.

    Mgbe Sanwo-Olu gara njem nleta n’ebe a na-arụzi akwammiri ahụ na Tọzde, ọ rịọrọ ndị mmadụ mgbaghara maka mkpachi ahụ ma kwuo na a ga-arụcha ụzọ ahụ ngwa ngwa iji belata mkpachi okporoụzọ.

    E mechiri akwammiri ahụ n’ụbọchị Wenezde maka ịrụzi ya, nke butere nnukwu kpachikpachi n’okporoụzọ site n’ụtụtụ ruo n’ụtụtụ Tọzde.

    Ihe onyonyo fesara na soshal midia gosiri ka ọtụtụ ndị mmadụ na ụgbọala ha kwụcha n’okporoụzọ na-agbapụghị ọsọ ọbụla.

  10. Ukọchukwu Naịjirịa a tụrụ mkpọrọ afọ asatọ na mba Saụt Afrịka maka ebubo ịma ụmụnwaanyị elu n'ike enwerela onwe ya

    A tụrụ nwaafọ Naịjirịa bụ ụkọchukwuTimothy Omotoso mkpọro afọ asato na mba Saụt Afrịka.

    Timothy Omotoso bụ onye amaama na-ekwusa ozi ọma sịte n’onyonyo na mba Saụt Afrịka ma wee ụlọụka na mpaghara Pọrtu Elizabeti.

    A tụrụ Timothy Omotoso mkporọ maka ebubo ịdịna ụmụnwaanyị n'ike n’ime ụlọ ụka ya.

    N'oge a na-ekpe ya ikpe ka ọ gwara ụlọikpe na aka ya dị ọcha.

    Otu n'ime ndị gbara akaebe megide Timothy kwuru na ọ dinara ya n'ike mgbe ya dị naanị afọ iri na anọ.

    Mana mgbe a na-ekpebi ikpe ahụ n’ubochi Wenezde garaaga ka onye ọkaikpe kwuru na aka Timothy Omotoso dị ọcha.

    Ọkaikpe sị na ọkaiwu na-ekpe Omotosho ikpe mebiri okwu ahụ n'ụzọ na-ezighị ezi.

    Omotoso kenere ndị ntaakụkọ ma Chineke maka etu ụlọikpe siri kpebie ikpe ya.

    Cheta na mbụ, ụlọikpe tọghapụrụ Lusanda Sulani na Zikiswa Sitho bụ ndị e bokọrọ ha na Timothy Omotoso ebubo ahụ.

    E jidere Omotoso n’afọ 2017 n’ọdọ ụgbọelu mgbe ọ chọrọ isi na mba Saụt Afrịka pụọ.

    Ikpe ya bụ nke mbụ e kpere n’ihu onyonyo nke mmadụ niile kiriri na mba ahụ bụ mba ịma ụmụnwaanyị elu n’ike bụ okwu a kpụ n’ọnụ.

  11. Lee nkenke nkọwa banyere ụtụisi Trump wepụtara

    Onyeisiala mba Amerịka bụ Donald Trump ewepụtara amụma ụtụisi ọhụrụ maka n’ihe niile e si mba ọzọ atụbata na mba ahụ.

    Amụma ụtụisi ahụ metụtara mba ọbụla n’ụwa niile mana e were ndị pasentị nke ha ka ibe ya.

    Pasenti 10 ka a manyere n’ihe niile ga-abata na mba Amerịka:

    Trump manyere opekatampe pasenti 10 na ngwa ahịa nakwa ihe niile si mba ụwa abata n’Amerịka. Nke a metụtakwara mba dị icheiche dịka UK, Ostrelịa, Ajentịna, na Saụdị Arebịa. Nke a ga-ebido n’Epril 5, 2025.

    Mba Pasentị ụtụisi ha pụrụiche:

    Trump wepụtara mba dị 60 bụ ndị ọ hụrụ dịka ndị kwesiri ịkwụ ụtụisi karịa ndị ọzọ. Ọmụma ụtụisi mba ndị nke a ga-ebido n’Epril 9, 2025. Mba ndị ahụ gunyere:

    • Mba niile so n’otu jịkọrọ Yurop: 20pasenti
    • Mba Chaịna: 54%
    • Mba Japan: 24%

    Mba Kanada na Meziko:

    Trump manyere ụtụisi 25pasentị n’ihe niile si na mba abụọ ahụ.

    Ụgbọala e bubatara n’Amerịka:

    Ụgbọala niile e si mba ọzọ tụbata n’Amerịka ka Trump manyere ụtụisi 25pasenti. Nke a ga-ebido n’Epril 3, 2025.

  12. Ụmụ Igbo unu asaala chi?

    Ka Olisa bi n'igwe gozie ụbọchị taa dịka unu na-esonyere anyị.

    Ọ bụ Michael Ilediagu ga-enwetere unu akụkọ ihe na-eme n'ala Igbo, Naịjirịa nakwa mba ụwa niile, mana Ikechukwu Kalu na Chinonso Ugorji ga-esonyere ya n’ehihe.

    Ndewo !

  13. Ọnọdụ USAID etinyela mba Myanmar n'ahụhụ inweta enyemaka mba Amerịka maka ala ọma jijiji

    Mba Amerịka enweghị ike ịnyere Myanmar aka kemgbe ala ọmajijiji dakwasara ha maka etu gọọmenti Donald Trump siri kwụsị ndị ọrụ USAID ọrụ.

    USAID n’ọnụ bekee pụtara ‘US Agency for International Development”.

    Mana onye ọrụ USAID kwuru na kemgbe ọdachi ala ọmajijiji dakwasịrị mba Myanmar na mba Amerịka enweghị ike ịnyere ha aka ma kwuo na ọnọdụ dị etu ahụ ‘na-emetụta ndụ ndị mmadụ”.

    Cheta na ọ bụ site n’out USAID ka mba Amerịka siri enyere ọtụtụ mba aka n’oge ha were ọnọdụ gbatagbata.

    Kemgbe ụbọchị Fraịde garaaga bụ ụbọchị ala ọmajiji dakwasịrị Myanmar, mmadụ ruru 2,700 nwụrụ ebe ndị ọzọ ruru 4,500 meruru ahụ.

    Elon Musk bụ onye ndụmọdụ pụrụiche nke Donald Trump adịla njikere imechi ụlọọrụ USAID ka ọ mechere ka ndị ọrụ ha gaa ezumuike ọrụ.

  14. Val Kilmer na-eme ihe nkiri Hollywood anwụọla ka ọ gbachara afọ 65

    Ndị na-ahazi ihe nkiri na Hollywood akwaala arịrị maka ọnwụ onye na-eme ihe nkiri a kpọrọ Cal Kilmer, onye nwụrụ ka ọ gbachara afọ 65.

    Kilmer so mee ọtụtụ ihe nkiri ndị wuru ewu n’agbata afọ 1980 ruo 1990, nke gụnyere ‘Top Gun na Batman Forever’.

    Otu onye kọwaara Kilmer dịka ‘ezigbo onye ya na mmadụ kwesịrị ịrụkọ ọrụ nakwa onye na-eme mmadụ obi ụtọ.”

    Cher na-eti egwu bụ ọyị nwaanyị Kilmer kwuru na ọ bụ ezigbo ọyị, siri ike ruo oge ọ na-arịa ọrịa.

    Kilmer nwụrụ site n’ọrịa oyi a kpọrọ ‘pneumonia’ n’ụbọchị Tuzde na Los Angeles, dịka nwa ya nwaanyị bụ Mercedes si gwaa ndị ntaakụkọ n amba Amerịka.

    O kwuru na a chọpụtara na nna ya nwere ọrịa kansa nke akpịrị n’afọ 2014 mana o mechara gbakee.

    Ọwụwa a wara ya n’akpịrị metụtara etu o si ekwu okwu ma gbochie ya ị na-eme ihe nkiri ọfụma, mana o mechara lọghachị n’afọ 2022 n’ihe nkiri ‘Top Gun: Maverick’ ya na Tom Cruise mere.

    Tracheotomy surgery affected his voice and curtailed his acting career, but he returned to the screen to reprise his role as fighter pilot Iceman alongside Tom Cruise in 2022's Top Gun: Maverick.

    Kilmer emeela ọtụtụ ihe nkiri ndị ọzọ gụnyere; ‘The Doors, Twixt, Willow dgz.

  15. Ụlọikpe Tribunal akagbuola mkpesa pati AA megide Gọvanọ Okpobholo nke Edo Steeti

    Ụlọikpe Tribunal dị n’Abuja na-ahụ ntuliaka ọkwa Gọvanọ Edo Steeti akụchapụla mkpesa pati Action Alliance (AA) mere megide nhọpụta Monday Okpebholo nke pati All Progressive Congress (APC) dịka Gọvanọ Steeti ahụ.

    Ụlọikpe a kwuru na otu onye a kpọrọ Adekunle Omoaja so gbaa akwụkwọ ahụ enweghi ikike ịgba ụdịrị akwụkwọ ahụ.

    O kwuru na Omoaja esoghi n’ụzọ ọbụla mee ntuliaka ọkwa gọvanọ nke pụtara na o nweghi ikike itinye ọnụ maọbụ ị sị na ntuliaka ahụ agaghị ọfụma.

    Ụlọoikpe gara n’ihu kwuo na ihe bụ iwe Omoaja bụ na a hụtaghị ya dịka Onyeisioche nke Action Alliance maka ịhọpụta onye ji ọkọlọtọ ha zọọ ọkwa, mana a sị na ebubo ya achịtaghị aja n’iwu ntuliaka nke afọ 2022.

    Omoaja gwara ụlọikpe n’akwụkwọ ọ gbara ka ha kagbuo mkwupụta ụlọọrụ na-ahụ maka ntuliaka bụ Inec kwupụtara Okpebholo dịka onye meriri na ntuliaka aka ahụ.

    O bokwara ebubo nrụrụaka ma kwuo na Okpebholo enwetezughi akara vootu kachasị na ntuliaka ahụ.

    He also alleged corruption and that Okpebholo and APC did not win majority of lawful votes in the election.

    O kwukwara na e kweghi pati AA họpụta onye ga-eji ọkọlọtọ ha zọọ ọkwa na-agbanyeghi na ọ bụ onyeisioche pati ahụ.

    Ụlọọrụ Inec kwupụtara Okpebholo dịka onye ji vootu 291,667 merie ndị maara ya aka ebe Asue Ighodalo nke Peoples Democratic Party (PDP) ji vootu 247,655 na-eso ya na ntuliaka ahụ.

  16. A tụgharịala ikpe ọnwụ a mara ndị Amerịka atọ maka ime atụmatụ nkwatu ọchịchị na DR Kongo

    A tụgharịala ikpe ọnwụ a mara ụmụafọ Amerịka atọ maka mbọ ha gbara na nkwatu ọchịchị kụrụ afọ n’ala na mba DR Kongo n'afọ gara aga ka ọ bụrụzie mkpọrọ ọka.

    Ha so n’ime mmadụ iri atọ na asaa (37) ụlọikpe ndịagha mara ikpe n’ọnwa Septemba afọ gara aga.

    E boro mmadụ atọ ahụ ebubo ịnọ n’isi mwakpo e mere n’obi ọchịchị onyeisiala nakwa n’ụlọ otu onye na-akwado Onyeisiala Félix Tshisekedi n’ọnwa Mee gara aga.

    Ntụgharị ikpe ahụ na-abịa dịka onye mba Amerịka họpụtara ọhụrụ ka onye ndụmọdụ pụrụiche maka okwu ndị metụtara Afrịka bụ Massad Boulos ga-awuchi DR Kongo.

    Boulos bụ nna di nwa Onyeisiala Trump bụ Tiffany ka a tụrụ anya iwuchi Kinsasha n’ụbọchị Tọzde 3 Eprel 2025 maka njem ga-ebugakwa ya mba Rụwanda, Kenya na Yuganda.

  17. Izrel ga-eweghaara nnukwu mpaghara na Gaza dịka ọrụ ndịagha na-aga n’ihu

    Mịnịsta na-ahụ maka nchekwa na Izrel bụ Israel Katz ekwuola na ndịagha Izrel ga-aga n’ihu weghaara mpaghara dị iche iche na Gaza dịka ndịagha ha na-agbasa ọrụ ngwa ọgụ ha.

    O kwuru nae be ndị ha ga-eweghaara ga-esonye n’ebe a ga-akpọ mpaghara nchekwa.

    N’ozi o wepụtara n’ụbọchị Wenezde 2 Eprel 2025, Katz kwuru na ịgbasa ihe ngwa ọgụ na Gaza ga-enyeaka imebi ma kpochapụ ndị na-eyi ọha egwu yana akụrụngwa ndị na-eyi ọha egwu.

    O kwukwara na nke a ga-achọ ka apụpụ ndị Palestine ọtụtụ na mpaghara ahụ.

    Nke a na-eme mgbe ụlọọgwụ dị na Gaza kwuru na e gbụrụ ihe ruru ndị Palestine mmadụ iri na ise na mpaghara n’oge abalị.

    Ụlọọrụ na-ahụ maka nchekwa obodo nke Hamas kwuru na enwetara ozu mmadụ iri na abụọ, gụnyere ụmụaka, n'ụlọ dị na mpaghara Khan Younis.

    Akụkọ kwuru na mba Izrel na-atụ ogbunigwe na mpaghara okeala mba Ijipụt. Nke a na-egosi na mba Izrel nwereike ịmalite mbuso agha ọhụrụ na Gaza.

  18. Bashir Ojulari eburula oche dịka onyeisi ụlọọrụ NNPC dịka a chụrụ Kyari n’ọrụ

    Onyeisiala Naịjirịa Bola Tinubu agbanweela ndị isi ụlọọrụ Nigerian National Petroleum Company (NNPC) Limited, ma wepụ onyeisi oche, Pius Akinyelure na onyeisi, Mallam Mele Kyari.

    N’akwụkwụ ozi onye ndụmọdụ pụrụ iche nye Onyeisiala bụ Bayo Onanuga wepụtara n’ụbọchị Wenezde 2 Eprel 2025, o kwuru na Onyeisiala Tinubu ewepụla ndị otu bọọdụ a họpụtara ya na Akinyelure na Kyari na Nọvemba 2023.

    O kwuru na ọ bụ Bashir Ojulari bụ onye ga-eburu oche dịka onyeisi NNPC ebe Ahmadu Kida ga-abụ onyeisi oche bọọdụ ga-enwe mmadụ iri na otu dịka ndị otu ya.

    Onanuga kwuru na Onyeisiala Tinubu họpụtara mmadụ isii ga-abụ ndị otu bọọdụ NNPC site na mpaghara ọchịchị isii enwere na Naịjirịa.

    Onyeisiala Tinubu nyekwara bọọdụ ọhụrụ ahụ atụmatụ ime ihe ozugbo iji hazie nyochaa atụmatụ nke NNPC yana ngwongwo ya bụ ụlọọrụ iji hụ na ha dabara na ebumnuche Naịjirịa.

    O kwuru na ndị niile a họpụtara ga-amalite ọrụ site n’ụbọchị taa bụ Wenezde 2 Eprel 2025.

  19. Ọnụahịa nwereike ịgbanwe n'Amerịka dịka Onyeisiala Trump ga-ekwupụta tarifu ọhụrụ taa

    A na-atụanya na Onyeisiala mba Amerịka Donald Trump ga-ekwupụta tarifu ọhụrụ taa nke obi ọchịchị mba Amerịka ‘White House’ kpọrọ ụbọchị nnwere onwe ‘Liberation Day’.

    Nke a nwereike ime ka ụgbọala, biya na mmanụ ụgbọala ịkawanye ọnụ na Amerịka.

    Akụkọ kwuru na a matabeghị etu ọnụahịa tarifu ahụ ga-esi ala elu maọbụ mba ndị ọ ga-emetụta, mana Onyeisiala Trump kwuru na tarifu ọhụrụ ahụ ga-eme ka ndị Amerịka na-azụ ngwaahịa emepụtara na mba Amerịka.

    Mana ndị nnyocha na-adọ aka na ntị na o nwere ike ịkwalite ọnụahịa ma kpalite agha azụmaahịa na mba ụwa.

    Mba dị na Yurop kwuru na ha dị njikere itinye ọnụahịa mmegwara mana obi ọchịchị mba Amerịka ‘White House’ kwuru na Onyeisiala Trump dị njikere ka yana ụfọdụ mba nwee mkparịtaụka banyere tarifu ọhụrụ a.

    Cheta na tarifu bụ ụtụ isi a na-akwụ n'ahịa esi mba ofesi ebubata, Ọ na-abụkarị pasentị nke uru ngwaahịa ahụ, mana ọ bụ ụlọọrụ ndị na-azụta ngwaahịa ndị ahụ si mba ọzọ ga-akwụ ụtụ isi ahụ.

  20. Ndịagha Myanmar ajụla nkwụsị agha ha na ndị nnupụisi dịka mmadụ 2,700 nwụrụ n’ala ọmajijiji

    Ndịagha Mianmaa ajụla nkwụsị ọgụ ha na ndị nnupụisi dịka ọnụ ọgụgụ ndị nwụrụ n’ala ọmajijiji mere na mba ahụ na-arị elu.

    Onyeisi ndịagha Mianmaa Min Aung Hlaing jụrụ oku ndịagha nnupụisi na-akpọ ka enwee nkwekọrịta nkwụsị ọgụ iji kwe ka ihe enyemaka mmadụ bata na mpaghara ebe ala ọmajijiji mere n’izu gara aga.

    Otu ndị nnupụisi atọ kpọrọ oku ka akwụsị agha nke obere oge dịka ndị ọchịchị kwuru na mmadụ puku abụọ na narị asaa (2,700) anwụọla n’ihe mberede ahụ kpara mkpamkpa na mba ahụ ụbọchị Fraịde 28 Maachị 2025, ebe ka na-achọ ọtụtụ mmadụ achọ.

    Onyeisi ndịagha Mianmaa kwuru na ndịagha ga-aga n’ihu ime ihe kwesịrị ekwesị iji nweta nchekwa na mba ha.

    Ụlọọrụ UN kwuru na ala ọmajijiji ahụ emela ka ọnọdụ Mianmaa, nke nọọ n’agha kemgbe afọ anọ, kawanye njọ.

    Ala ọmajijiji ahụ mekwara na mba ndị agbataobi ha dịka Thailand ebe e kwuru na mmadụ iri abụọ na otu anwụọla.

    Akụkọ kwuru na ndị ọrụ ka na-achọ ndị dị ndụ na mba abụọ ahụ mana olilieanya ịhụ ndị lanarịrị ihe mberede ahụ na-ebelata ugbua dịka a na-ebupụta ọtụtụ ndị nwụrụ anwụ n’ebe ụlọ dara adaa.