Mmadụ 28 anwụọla ebe ọtụtụ narị merụrụ ahụ maka ihe tiwara n’ọdụ ụgbọmmiri Iran
Ndị ọchịchị kwuru na ihe ruru mmadụ iri abụọ na asatọ nwụrụ ebe narị asatọ (800) ndị ọzọ merụrụ ahụ mgbe ihe tiwara n’otu ọdụ ụgbọmmiri Iran.
Ihe ntiwa ahụ mere na Shahid Rajaee bụ nnukwu ọdụ ụgbọmmiri mba ahụ nke dị n’akụkụ obodo ndịda Bandar Abbas n’ụtụtụ Satọde 26 Eprel 2025.
Ọ gbapụrụ windo na elu ụlọ ndị dị nso ma bibie ọtụtụ ụgbọala.
Ndị bi nso ebe ahụ kwuru na ihe ntiwa ahụ metụtara ebe ruru kilomita 50 (kilomita 31).
Ụlọọrụ mgbasa ozi steeti na-akọ na e nwere mmadụ isii amabeghị maka ha.
Ihe onyonyo ndị BBC nyochara na-egosi ọkụ na-esiwanye ike tupu nnukwu ihe ntiwa ahụ eme. O gosikwara ebe ndị mmadụ na-agbanarị ihe ntiwa ahụ, ya na ndị ọzọ merụrụ ahụ dina n'okporoụzọ dịka anwụrụ ọkụ gbara ha gburugburu.
Otu onye gwara Iranian TV na anwụrụ ọkụ, uzuzu na ntụ jupụtara na ụlọ nkwakọba ihe ahụ ma kwuo na ya amazighị maọbụ ya gara n’okpuru tebụl ka ọ bụ ihe ntiwa ahụ tụpụrụ ya ebe ahụ.
Ihe onyonyo ikuku gosiri opekata mpe ebe atọ na-agba ọkụ dịka mịnịsta na-ahụ maka nchekwa obodo n’Iran kwuru na ọkụ a na-agbasa site n'otu akpa gaa na nke ọzọ.
E nyela ụlọakwụkwọ na ụlọọrụ nọ na mpaghara ahụ iwu ka ha mechie n’ụbọchị Sọnde 27 Eprel 2025.