Onyeisiala
mba Amerịka Donald Trump agbaala ndị Amerịka ume, sị ha 'kwụsie ike' dịka mba
ahụ malitere ịnakọta tarifụ “baseline” 10% na mbubata niile na Satọde 5
Eprel 2025.
Onyeisiala
Trump gbara ndị Amerịka ume dịka ụtụisi 10 tarifu ahụ butere ọgbaaghara n’ọnụahịa.
Mba UK na
Fransị so n’ọtụtụ narị mba ndị ọzọ tarifu ọhụrụ Onyeisiala Trump tinyere metụtara
mana ndị ndu ha kwuru na ha ka ga-enwe mkparịtaụka.
N’aka nke ọzọ,
mba Chaịna bụ mba ụtụisi ọhụrụ ahụ metụtara nke ukwuu, e tinyela tarifu
mmegwara na ngwaahịa si Amerịka.
N’ihi nke a,
ndekọ ngwaahịa stọọkụ atọ niile dị n’Amerịka jiri ihe karịa 5% daa na Fraịde,
yana S&P 500 gbadatara ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ 6%, nke gosiri izu kachasị
njọ na stọọkụ Amerịka kemgbe 2020.
Puku kwuru
puku mmadụ gbakọtara na Washington DC, New York na obodo ndị ọzọ iji mee
ngagharịiwe megide ọtụtụ atụmatụ iwu Onyeisiala Trump - site na akụ na ụba ruo
na mbelata mmefu ego gọọmentị.
N’ime ihe
niile ndị a, Onyeisiala Trump kọwara mgbanwe ahịa dịka "mgbanwe akụ na ụba",
nke Amerịka "ga-emeri".
Ọ gwara ndị
Amerịka n’akara Truth Social na ha "Kwụsie ike, ọ gaghị adị mfe, mana
njedebe ga-abụ akụkọ ihe mere eme,".
Cheta na atụmatụ
iwu ọhụrụ Onyeisiala Trump wepụtara e tinyela ihe ịma jijiji n’azụmahịa mba ụwa
niile.
Otu onye a ma
ama Elon Musk bụkwa ezigbo enyi Onyeisiala Trump kwuru na Amerịka na mba dị na
Yurop kwesịrị iwepụ ụtụisi tarifu na ngwaahịa dị n’etiti ha.
O kwuru na
nke a nwereike ịmepụta "mpaghara azụmahịa n'efu n'etiti Yurop na Nọt Amerịka.