Gọọmenti Naịjirịa adọọla steeti 30 aka na ntị maka nnukwu mmiri ozuzo na oke idemmiri
Gọọmenti Naịjirịa ebuola amụma na a ga-enwe nnukwu mmiri ozuzo na oke idemmiri n’ime steeti iri atọ (30) tinyere isi obodo ha bụ Abuja.
Minista na-ahụ maka akụ ndị si na mmiri na adịmọcha bụ Joseph Utsev kwupụtara nke a n’ụbọchị Tọzde 10 Eprel 2025 oge ọ na-ekwupụta ka e siri tụọ anya gbasara idemmiri n’afọ 2025 nke ụlọọrụ Nigeria Hydrological Services Agency (NIHSA) haziri n’Abuja.
Dịka o siri kwuo, steeti ndị ọnọdụ ahụ ga-akachasị metụta gụnyere Abịa, Adamawa, Akwa Ibom, Anambra, Bauchi, Bayelsa, Benue, Borno, Cross-River, Delta, Ebonyi, Edo, Gombe, Imo, Jigawa, Kebbi, Kogi, Kwara, Lagos, Nasarawa, Niger, Ogun, Ondo, Osun, Oyo, Riva, Sokoto, Taraba, Yobe, Zamfara na isi obodo Naịjirịa bụ Abuja.
Ọ kọwara na steeti ndị bi n’akụkụ osimiri na mpaghara ndịda Naịjirịa ga-ahụta oke idemmiri n’ihi na osimiri ga-eto karịa ka ọ kwesịrị.
Steeti ndị ahụ gụnyere Cross Riva, Delta, Riva, Akwa-Ibom na Edo steeti.