You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.

Take me to the main website

Yukren, Amerịka bịnyere aka na nkwekọrịta akụ na ụba sitere n'okike maka ịkwụsị mwakpo Rọshịa

Nchịkọta akụkọ ndị kachasị mkpa mere na mbaụwa n'ọnwa Eprel 2025.

Mkpuchi Na Eme Ozugbo

Uzoamaka Ewuzie, Ikechukwu Kalu, Michael Ngene, Chinonso Ugorji, Michael Ilediagu, Adline Okere

  1. Ndị ụka Kraịst na Naịjirịa esonyela n’emume ụka igu nkwụ

    Ndị ụka Kraịst n’ụwa niile gbaa gburugburu n’eme emume ụbọchị ụka nkwụ taata, iji cheta oge Jeso Kristi ji inyinya ibu banye na Jerusalem yana malite izu ụka dị asọ.

    Akwụkwọ nsọ kwuru na ọ bụ ihe karịrị afọ puku abụọ gara aga ka Jeso mere ya bụ njem ikpeazụ tupu ndị iro ya akpọgbuo ya n’elu obe.

    Onye ọbụla bịara ụka taata ji akwụkwọ ọmụ nkwụ nke ewetara n’igu nkwu iji egosi etu ụmụ Izrel siri tụsara ya Jeso n’ụkwụ mgbe ọ nọ n’ụwa.

    Ngwa ngwa emechara nkea, izu ụka dị asọ ga-amalite. Izu ụka dị asọ a bụ oge a ga-enwe Tọzde dị asọ, ‘Chrism Thursday’ Fraịde dị asọ ‘Good Friday’ nakwa ndị ọzọ.

    Mgbe onye ntaakụkọ BBC gara Holy Ghost Cathedral Enugwu, Bishọp Callistus Onaga na osote ya bụ Bishọp inyeaka Ernest Obodo du ndị ụka kwụrụ n’ahịrị n’ahịrị na-agụ egwu iji gosi ka esi mee ya mgbe ochie.

    N’okwu chukwu ya Bishọp Ernest Obodo kwuru na emume ụka nkwụ n’echetata ndị ụka Kraịst na ọnwụ na mbilite n’onwụ di.

    O nyere ndụmọdụ ka ndị otu Kraịst chegharia ma were izu ụka dị asọ wee bekwute chukwu nso.

    O kpere ekpere ka emume Ista nke afọ 2025 weta ụdo na ezi nchekwa na Naịjirịa na obodo niile a na-alụ ọgụ.

  2. Ọtụtụ mmadụ nwụrụ ebe ndị ọzọ merụrụ ahụ oge Rọshịa tụrụ ogbunigwe na mpaghara Sumy

    Onyeisiala Yukren Volodymyr Zelensky ekwuola na 'ọtụtụ nwụrụ anwụ ebe ndị ọzọ merụrụ ahụ ka Rọshịa tụrụ ogbunigwe na Sumy.

    Ihe ruru mmadụ iri abụọ nwụrụ mgbe Rọshịa jiri ogbunigwe wakpoo etiti ugwu ọwụwa anyanwụ na Yukren, dịka ndị isi siri kwuo.

    Mana mịnịsta na-ahụ maka nchekwa na Yukren, Ihor Klymenko yana na ndị ọrụ mberede steeti kwuru mgbe ha mara ọkwa na Telegram na mmadụ iri abụọ na out (21) anwụọla ebe iri asatọ na atọ (83) ọzọ merụrụ ahụ, gụnyere ụmụaka asaa.

    Onyeisiala Zelensky kwuru na ajọ ogbunigwe ahụ wakporo okporoụzọ obodo mana ọrụ nnapụta na-aga n'ihu.

    Ọ kpọkuru ndị ọchịchị mba ụwa ka ha nye 'zaghachi ziri ezi' na mwakpo a, na-agbakwụnye, sị: "Rọshịa chọrọ kpọmkwem iyi Yukren ụjọ ma ịgbatịkwa agha a”.

    Mwakpo a mere na-akụkụ Yukren ndịagha Rọshịa na-ejikere ịtụ ajọ ogbunigwe.

    Cheta na ọgụ na-aga n'ihu na Yukren ka Rọshịa malitere mbuso agha ya n'ụzọ zuru ezu afọ atọ gara aga.

  3. A machiela otu ndọrọndọrọ ọchịchị mmegide na Tanzania isonye na ntuliaka

    A machibidola otu ndọrọndọrọ ọchịchị mmegide na Tanzania isonye na ntuliaka a ga-eme n’afọ a dịka ụbọchị ole na ole gachara ka e boro onye ndu ya ebubo ịgba ọchịchị mgba okpuru.

    Onyeisi nhoputa ndi ochichi na Independent National Elections Commission bụ Ramadhani Kailima, kwuru na Chadema ekweghị ibinye aka n'akwụkwọ iwu na Satọde, nke pụtara na pati ahụ agaghị esonye na ntuliaka nke a ga-ahazi n’ọnwa Ọktoba.

    Cheta na izu gara aga, a nwụchiri onye ndu Chadema Tundu Lissu ma boo ya ebubo ịgba ọchịchị mgba okpuru n’ihi ngagharịiwe e mere na ndịda Tanzania ebe ọ kpọrọ maka mgbanwe nhoputa ndi ochịchị.

    Ndị otu ndọrọ ndọrọ ọchịchị CCM nke nọ n’ọchịchị na Tanzania kemgbe afọ1977, nwereike ka nọ n’ọchịchị n’ihi mmachibido a.

    "Pati ọ bụla nke na-ebịanyeghị aka n’usoro omume agaghị esonye na ntuliaka izugbe," Kailima kwuru na Satọde 12 Eprel, na-agbakwụnye na a ga-amachibidokwa Chadema itinye aka na ntuliaka ọ bụla ruo 2030.

  4. Izrel awakpola ma bibie ụlọọgwụ ikpeazụ na-arụ ọrụ na Gaza

    Ogbunigwe mba Izrel siri n’elu tụọ ebibiela akụkụ ụfọdụ ụlọọgwụ ikpeazụ na-arụ ọrụ n’obodo Gaza dịka Mịnịstrị ahụike ndị Hamas siri kwuo.

    Ndị akaebe kwuru na ogbunigwe ahụ bibiri ngalaba nlekọta ahụike na ịwa ahụ nke ụlọọgwụ Al-Ahli Baptist.

    Ihe onyonyo e tinyere na ntanetị egosiri nnukwu ọkụ na anwụrụ ọkụ na-ebili n'ụlọọgwụ mgbe mgbọ ogbunigwe dakwasịrị ụlọ nwere okpukpu abụọ. E sere ndị mmadụ, gụnyere ụfọdụ ndị ọrịa ka nọ n'akwa ụlọọgwụ na-agbapụ ebe ahụ.

    Ndịagha nchekwa Izrel (IDF) kwuru na ụlọọgwụ ahụ nwere “ebe njikwa nke Hamas ji eme ihe”. Ọnweghị onye nwụrụ anwụ, dịka ndị ọrụ mberede obodo Gaza siri kwuo.

    Mịnịstri ahụike kwuru na "e bibiri ụlọ ahụ kpamkpam", nke a chụpụrụ ndị ọrịa na ndị ọrụ ụlọọgwụ n’ike.

    Ndị IDF kwuru na o meela ihe "iji belata mmebi nke ndị nkịtị maọbụ n'ogige ụlọọgwụ, gụnyere ịdọ aka na ntị n’ihu na mpaghara akụrụngwa ụjọ, iji ngwa agha ziri ezi, na nlekota ikuku".

  5. Onyeisiala Trump ewepụla ekwentị na kọmputa na tarifu ọhụrụ

    Onyeisiala mba Amerịka Donald Trump ekwuola na ọchịchị ya ewepụla ekwentị, kọmputa na ụfọdụ ngwaọrụ eletrọnịkị ndị ọzọ na tarifu ‘mmegwara’ ọhụrụ ya gụnyere ụtuisi 125% o tinyere na mbubata niile si Chaịna abata Amerịka.

    N’ọkwa ndị ụlọọrụ Kọstọm na Nchekwa okeala nke Amerịka wepụtara kwuru na a ga-ewepụ ngwongwo ndị ahụ na tarifụ 10% nke Onyeisiala Trump tinyere na mba ụwa niile yana ụtụisi mbubata buru ibu nke ndị Chaịna.

    Nke a bụ gbaghara mbụ dị ịrịba ama nke ụdị ọ bụla na tarifụ Onyeisiala Trump na Chaịna, dịka otu onye nnyocha azụmaahịa na-akọwa ya dịka "ọnọdụ na-eweta mgbanwe".

    Dịka ọ na-aga Miami na mgbede Satọde, Onyeisiala Trump kwuru na ọ ga-enye nkọwa ndị ọzọ gbasara iwepụ tarifu ahụ na mmalite nke izu na-abịa.

    Ntugharị a bịara mgbe ụlọọrụ teknụzụ nke Amerịka na-ekwu na ọnụahịa ngwa ndị ahụ nwereike ịrị elu, dịka a na-eme ọtụtụ n'ime ihe ndịa ahụ na Chaịna.

  6. Igbo bụ Igbo, ụnụ abọọla chi?

    Anyị na-asị ụnụ nnọọ n'ọgbakọ BBC News Igbo taa bụ Sọnde 13 Eprel, 2025.

    Ọ bụ Uzoamaka Ewuzie ga na-ewetere ụnụ akụkọ ihe na-eme n’ala Igbo, Naịjirịa, Afrịka na mba ụwa niile. Michael Ngene ga-emechaa sonyere anyị n’oge ehihe.

    Dịka ụnụ na-esonyere anyị, ọfọ anyị bụ na ọ ga-adịrị anyị niile mma.

    Ndewo!

  7. Ụlọọrụ NDLEA agbaala ọgwụike ruru nde 1.6kg ha kpachiri ọkụ

    Ụlọọrụ na-ebuagha megide ịṅụ ọgwụike na Naịjirịa bụ NDLEA na mkpirisi ekwuola na ha alaala ọgwụike dị iche iche n’iyi nke kilogram ha ruru otu nde na ụma isii (1.6mkg).

    Onyeisi mgbasaozi ụlọọrụ a bụ Femi Babafemi kwuru na ha kpachiri ọgwụike ndị a na Legọs, Ogu na Oyo steeti bụ nke kachasị buo ibu a na-agba ọkụ kamgbe e hiwere ụlọọrụ ha.

    O kwuru na ndị ọrụ gọọmentị, ndị ndu ọdịnala, ndịisi ụlọ okpukperechi, ndị ọrụ nchekwa na ndị ọzọ ji anya ha hụụ mgbe a lara ọgwụike ndị a n’iyi n’ebe a kpọrọ Ipara dị n’okporoụzọ awara awara si Legọs gawa Ibadan.

    Onyeisi ụlọọrụ ahụ Ọchịagha Mohamed Buba Marwa kwuru na nke a bụ iji gosi njikere ụlọọrụ ha dị n’ikwụsị ịtụ mgbere ọgwụike na-arị elu na Naịjirịa.

    Ọ gara n’ihu dọọ ndị na-atụ mgbere ọgwụike aka na ntị ka ha wepụ aka n’ụdịrị ihe ọjọọ maọbụghị ya na aka ga-akpara ha.

  8. A tọrọla Ụkọchukwu si mba Amerịka n’otu ụlọụka dị na Saụt Afrịka

    Ndị ojiegbe atọrọla onye Ụkọchukwu si mba Amerịka aha ya bụ Josh Sullivan oge ọ na-aka ụka na Saụt Afrịka.

    Ọnụ na-ekwuru ndị uweojii bụ Andre Beetge gwara BBC na Sullivan nọ na-ekwusa oziọma n’ụlọụka Fellowship Baptist Church dị na Motherwell nke obodo Gqeberra dị na Eastern Cape na mgbede Tọzde 10 Eprel 2025 tupu “ndị ojiegbe anọ fụchiri ihu abata”.

    Ndị ojiegbe ahụ zuuru ekwentị ndị bịara ụka tupu ha buru ụgbọala Toyota Fortuna ụkọchukwu ahụ rie mbọmbọ.

    Ndị uweojii mechara chọta ụgbọala ahụ ebe ndị ekperima gbahapụrụ ya mana ha amaghị ebe a kpọọrọ ya bụ ụkọchukwu tinye isi.

    Ọnụ na-ekwuru ngalaba ụlọọrụ na-ahụ maka ihe ndị na-eme n’Amerịka gwara BBC na ha anụla gbasara nwaafọ Amerịka a tọọrọ na Saụt Afrịka.

    Ka o sinadị, Beetge gwara BBC na e nyefeela okwu ahụ n’aka ngalaba ndị uweojii kachasị na Saụt Afrịka a maara dịka Hawks ka ha leba anya n’okwu ahụ.

  9. Ndị uweojii anwụchiela nwoke tụbara nwa ya nwaanyị ime na Bauchi Steeti

    Ndị uweojii na Bauchi steeti anwụchiela otu nwoke gbara afọ 50 e kwuru na ọ tụwara nwa ya nwaanyị ime n’obodo Ado dị n’okpuru ọchịchị Ganjuwa steeti ahụ.

    Ọnụ na-ekwuru ndị uweojii bụ Ahmed Wakil gbara nke a n’anwụ ma kwuo na a ga-akpụpụ nwoke ahụ ụlọikpe ma ha mechaa nnyocha.

    Wakil gwara BBC na ọ dị ka nwoke ahụ edinara nwa ya nwaanyị ahụ gbara afọ 17 n’ike ugboro ugboro nke mere ka ọ tụrụ ime.

    Ọ gara n’ihu kwuo na ngwa ngwa ha wetara ozi banyere ajọ agwa nwoke ahụ, ndị uweojii gara n’ihu nnyochaa ma nwụchie nwoke ahụ.

    Oge ndị uweojii jụrụ nwata nwaanyị ahụ ajụjụ, o kwuru na ọ bụ eziokwu na nna ya dinara ya ọtụtụ ugboro oge nne mere njem.

    ‘Ọ bụ oge nne m lọtara ka ọ chọpụtara na mụ dị ime’ ka nwata nwaanyị ahụ kwuru.

    N’aka nke ọzọ, nwoke ahụ kwuru na ọ bụ eziokwu na o dinara nwa ya nwaanyị ebe nnyocha e mere n’ụlọọgwụ gosiri na nwata nwaanyị ahụ dị ime ọnwa atọ

  10. Lee ndị na-azọ ọkwa onyeisiala mba Gabon

    Ntuliaka Mba Gabon ga-anọ ụbọchị Satọde 12 Eprel mee ntuliaka ọkwa onyeisiala. Nke a bụ ntuliaka mbụ na mba ahụ kemgbe a napụrụ Ali Bongo ọchịchị n’ike. Ezinaụlọ Ali Bongo achịala Gabon ihe ruru afọ iri is na isii (56).

    N’ime mba ise nọ na mpaghara odida anyanwu na etiti Afrịka a nwere ọchịchị n’ike n’afọ 2020, Gabon bụ mba nke mbụ n’ime ha na-alaghachị n’ọchịchị ndị nkịtị.

    Kemgbe Ọchịagha Brice Clotaire Oligui Nguema napụrụ Ali Bongo ọchịchị n’ike n’afọ 2023, Ali Bongo gara biri n'ala ọzọ.

    Ọchịagha Brice Clotaire Oligui Nguema gara n'ihu gbanwee iwu mba Gabon iji nye ya ohere iji zọọ ọkwa onyeisiala.

    Ọtụtụ ndị mba ahụ kọwara Ọchịagha Nguema dịka onye ha chọrọ.

    Ihe ruru mmadụ 860,000 bụ ndị debanyere aha ha ịtụ vootu na ntuliaka a.

    Ndị na-azọ ọkwa onyeisiala na ntuliaka a gụnyere Ọchịagha Brice Oligui Nguema, Alain Claude Bilie-By-Nze bụbu praịm mịnịsta mba Gabon, Zènaba Chaning Gninga bụ naanị nwaanyị na-azọ ọkwa onyeisiala na ntuliaka a, Axel Stophène Ibinga Ibing, Thierry Yvon Michel Angoma, Alain Simplice Boungoueres, Joseph Lapensèe Essigone na Stèphane lloko Boussengui.

  11. Steve Witkoff ezutela Onyeisiala Putin na-achị Rọshịa banyere ịkwụsị ọgụ ha na mba Yukren

    Onye ọrụ obi ọchịchị Amerịka bụ Steve Witkoff nọrọ ụbọchị Fraịde 11 Eprel zute onyeisiala Rọshịa bụ Vladimir Putin na St Petersburg dịka Onyeisiala Trump na-achị Amerịka na-akpọku Putin ka ọ gaa n’ihu kwụsị ọgụ dị n’etiti ha na mba Yukrn.

    Obi ọchịchị Rọshịa bụ Kremlin kwuru na ọgbakọ ahụ were ihe karịrị awa anọ ebe ụfọdụ ihe ha kpara maka bụ etu a ga-esi nweta nkwekọrịta ma kwụsị ọgụ ha na Yukren.

    Nke a bụ ugboro atọ Witkoff na Putin na-enwe ọgbakọ n’afọ 2025. Akụkọ kwuru na nzukọ ha mịtara ezi mkpụrụ.

    Cheta na Onyeisiala Trump wepụtara ozi na soshal midia ebe o kwupụtara mmwute ya banyere isi akwara Putin gbara banyere ịkwụsị ọgụ ahụ n’agbanyeghị na ọtụtụ mmadụ anwụọla na ya.

  12. Ndị be anyị ụtụtụ ọma nụ oooo

    Anyị na-anabata gị bụ onye ihe ọma na-amasị n'ọgbakọ BBC News Igbo ụbọchị taa bụ ahịa Orie 12 Eprel, 2025.

    Anyị na-agọ ọfọ ka ihu ọma kpọọ gị taa, ije awele ga-abụ nke gị, ihe ọma ga-emere gị na ezinaụlọ gị taa.

    Nnọọ.

  13. Onyeisi Red Cross ekwuola na Gaza bụzi “ọkụ mmụọ nọ n’ụwa”

    Onyeisi otu obi ebere, International Committee of the Red Cross (ICRC) bụ Mirjana Spoljaric agwala BBC na Gaza abụrụla “ọkụ mmụọ nọ n’ụwa” dịka ndịagha Izrel gara n’ihu na-awakpo mpaghara ahụ.

    Mirjana Spoljaric kwuru nke a n’ụbọchị ngalaba ụlọọrụ otu mbaụwa na-ahụ maka ikike mmadụ dọrọ aka na ntị na atụmatụ Izrel na-eyi egwu megide ndị Palestine bi na Gaza.

    ICRC bụ onye nchekwa nkwekọrịta Geneva (nke bụ nkwekọrịta gbasara iwu na usoro ndị a ga-agbaso n’oge agha). Ha na-agwa mpaghara ọbụla ha chere na-enupụisi n’iwu ahụ okwu na nzuzo

    Mana ugbua Spoljaric agbaala ihe na-eme na Gaza n’anwụ ma kọwaa ya dịka “nnukwu nnupụisi” nyere iwu mbaụwa.

  14. Ụmụnwaanyị Rivers Steeti emeela ngagharịiwe ka a kpọchị Gọv. Fubara

    Ọtụtụ ụmụnwaanyị nọọrọ n’ụbọchị Fraịde gbakọta n’okporoụzọ e si aga Aba dị na Port Harcurt bụ isiobodo Rivers Steetị na-eti mkpu ka a kpọghachị Gọvanọ ha bụ Siminalayi Fubara na osote ya bụ Ngozi Odu bụ onye a kwụsịtụrụ ọrụ.

    Ngagharịiwe ahụ nke malitere n’okporoụzọ ahụ ma ruo n’isiụlọọrụ Gọọmentị steeti, ebe ọtụtụ ụmụnwaanyị ndị a bucha akwụkwọ e dere “Kpọchịchitere anyị Fubara”, “Zọpụta ọchịchị onye kwuo uche ya”, “Iwu nke Rivers Steetị ọ pụrụiche?” na ihe ndị ọzọ.

    Ụmụnwaanyị ndị a kọwaara onwe ha dịka ndị nne na nwunye nọ na-abụ abụ ikpe ma na-arịọ Onyeisiala Bola Tinubu ka o wepụ mmachi ahụ o tinyere n’isi Gọvanọ Fubara ma weghachite ọchịchị onye kwuo uche ya na steeti ha.

    Ha bere akwa ma katọọ ihe ha kpọrọ “ọchịchị ndịagha nke iwu na-akwadoghi a kpọrọ aha ọchịchị nchereoge,” ma kwusie ike na ndị Rivers kwesịrị inwete ezi ihe na-abụghị ọchịchị megidere nke onye kwuo uche ya.

    “Anyị bụ ndị udo, ihe a na-eme anyị adịghị mma. Gọvanọ anyị na-arụ ọrụ ya ọfụma na-agbanyeghi ihe ndị na-achọ imegharị ya anya. Ihe na-eme ugbua abụghị ọchịchị onye kwuo uche ya,” ka otu n’ime ndị ndu ha kwuru.

    Ụmụnwaanyị ndị mere ngagharịiwe gụnyere ndị agbọghọ, ndị nne nakwa ndị agadi nwaanyị. Ha kwuru na ngagharịiwe ha na-eme abụghị nke ndọrọ ndọrọ ọchịchị kwadoro kama na ọ bụ maka ichekwa ọchịchị onye kwuo uche ya.

    Ha bu ụzọ gbakọta n’ama Isaac Boro Park bụ ebe ha nọ kpee ekpere tupu ha gawa n’okporoụzọ e si aga Aba.

    Cheta na a kwụsịrị Fubara, osote ya na ndị omeiwu steeti ahụ ọrụ n’ihi ọgbaghara ndọrọ ndọrọ ọchịchị dị na steeti ahụ.

    Onyeisiala Tinubu họpụtara Ibok-Ete Ibas dịka onye ga na-achị steeti ruo ọnwa isii.

  15. Buhari mere ka m chịa ọchị ruo oge mkpịsị ngụgụ m malitere ịfụ m ụfụ - Atiku

    Onye zọrọ ọkwa onyeisiala Naịjirịa n’oge gara aga bụ Atiku Abubakar agaala kpọtụrụ onye bụbu Onyeisiala Naịjirịa bụ Muhammadu Buhari na Kaduna steeti.

    Ndị soro Atiku gaa njem ahụ gụnyere aka chịburu Imo steeti bụ Achike Udenwa, aka chịburu Kaduna steeti bụ Nasir El-Rufai na aka chịburu Sokoto steeti bụ Aminu Waziri Tambuwal tinyere ndị ọzọ na-egwu ndọrọ ndọrọ ọchịchị.

    Atiku zipụrụ onyonyoo njem ahụ n’akara Facebook ya dịka ọ depụtara na ha gara kpọtụrụ Buhari ma chịa ezigbo ọchị.

    “Taa ka m gara kpọtụrụ Muhammadu Buhari iji gosi ya nsọpụrụ m. E nwetara m onwe m dịka o mere ka m chịa ọchị ruo oge mkpịsị ngụgụ m malitere ịfụ m ụfụ,” ka o dere.

    Ka o sinadị, Atiku enyeghị nkọwa ma ọ bụ ihe gbasara ndọrọ ndọrọ ọchịchị ka ha na Buhari kpara oge ahụ ha zutere.

  16. Naịjirịa amachiela iti egwu Eedris Abdulkareem a kpọrọ “Tell Your Papa” n’ụlọmgbasaozi

    Ndị ọchịchị Naịjirịa amachiela ndị mgbasaozi iti egwu a kpọrọ “Tell Your Papa” n’ụlọmgbasaozi ha n’ihi na e jiri ya katọọ onyeisiala.

    Ahịrị egwu ahụ Eedris Abdulkareem tipụtara katọrọ Onyeisiala Bola Tinubu ma gbaa nwa ya nwoke bụ Seyi ume ka o mee ka nna ya mata na “ụmụ mmadụ na-anwụ” site n’ihe isiike na enweghị nchekwa tinyekwara agụụ dị n’obodo.

    N’ozi leta ha degaara ụlọmgbasaozi redio na tivii, ụlọọrụ na-elekọta mgbasaozi na Naịjirịa bụ National Broadcasting Commission (NBC) nyere iwu ka a ghara iti egwu ahụ ma kwuo na o megidere iwu mgbasaozi Naịjirịa.

    Egwu ahụ e wepụtara na mmalite izuụka a abụrụla nke ọtụtụ mmadụ kpụ n’ọnụ n’ọbaozi soshal midịa na Naịjirịa ma meekwa ka ụmụ mmadụ na-arụrịtaụka gbasara ọnọdụ akụnaụba na nchekwa mba ahụ.

    Oge ọ banyere n’ọkwa dịka onyeisiala n’ọnwa Mee afọ 2023, Tinubu webatara ụfọdụ nnwogharị akụnaụba ndị mere ka ọnọdụ obibi ndụ kawanye njọ.

    N’egwu ahụ a gụrụ n’asụsụ Bekee, Pidgin na Yoruba, Abdulkareem gwara ọkpara Tinubu na nna ya “anaghị agbalị” ma kwuo na o kwela “ọtụtụ nkwa ụgha”.

    Abdulkareem gwara Seyi ka ọ gbaa n’okporoụzọ karịa iji ụgbọelu nke onwe ya iji hụta ihe izendụ ụmụafọ Naịjirịa na-agabiga n’ihi enweghị nchekwa.

    Cheta na ọ bụ n’afọ 2003 ka Eedris Abdulkareem wepụtara egwu na-ewu ewu ruo ugbua ọ kpọrọ “Nigeria Jaga Jaga” nke pụtara na Naịjirịa alaala n’iyi.

  17. Chaịna amanyela tarifu 125% n’ahịa niile a na-ebuga n’Amerịka

    Mba Chaịna amanyere tarifu 125 pasentị n’ihe niile e si mba ha ebuga na mba Amerịka.

    Chaịna sitere na pasentị 84 tarifu bulie ya na pasentị 125.

    Cheta na ọ bụ pasentị 125 ka mba Amerịka manyere ihe e si Chaịna ebubata na mba nke ha.

    Kemgbe Onyeisiala mba Amerịka bụ Donald Trump bidoro ịmanye Tarifu agharaagha Onyeisiala mba Chaịna bụ Xi Jinping na-emegwara ma na-ebuli tarifu ha ka ọ ruo na pasentị ọbụla Amerịka manyere ha.

  18. Ọ bụ ezi ihe Yurop ịbuso tarifu agha – Macron

    Onyeisiala mba Frensị bụ Emmanuel Macron ekwuola na atụmatụ Onyeisiala mba Amerịka bụ Donald Trump wepụtara ịkwụsịtụ tarịfu ruo abalị iri itoolu bụ ihe ga-enyere aka ka e nwe mkparịtaụka banyere tarifu ahụ.

    Macron kwuru nke a na X soshal mịdịa ya ma kwuo na mba Amerịka ka manyere tarifu ruru pasenti 25 na ngaraba azụmahịa dị icheiche dịka ụgbọala na igwe.

    Ọ sị na tarrifu opekatampe nke pasenti iri Trump manyere n'ihe niile a na-ebubata n'Amerịka ka digidere.

    Ọ sị na Yurop ga-agba mbọ wepụta ihe ga-egbochị ma chekwa akụnụba ha.

    “Ọ bụ ihe ziri ezị na-anyị nụrụ ọgụ maka na ọ bụ maka ndụ mba anyị niile bụ ihe a na-ekwu maka ya”.

  19. Igbo bụ Igbo anyị sị unu ndenwo!

    Ka chi foro taa wetere anyị na unu niile udo na obi ụtọ dịka unu na-esonyere anyị n’ọgbakọ BBC News Igbo.

    Mara na ọ bụ Michael Ilediagu na Michael Ngene ga-ewetere unu akụkọ ihe na-eme n'ala Igbo, Naịjirịa, Afrịka nakwa ụwa niile.

    Mana, Ikechukwu Kalu na Chinonso Ugorji ga-enwere oche.

    Ndewo!

  20. Ụlọikpe atụfuola akwụkwọ Nnamdi Kanu gbara Gọọmenti Etiti maka imetọ ikike ya

    Ọkaikpe Inyang Ekwo nke Ụlọikpe Ukwu Etiti dị n’Abuja atụfuola akwụkwọ ijeri naịra iri ise (50bn) onyendu otu Indigenous People of Biafra (IPOB) bụ Nnamdi Kanu gbara megide Gọọmenti Naịjirịa.

    Oge ọ na-achabi ikpe ahụ, Ọkaikpe Inyang Ekwo kachapụrụ akwụkwọ ahụ n’ihi na ndị okwu ya metụtara ejighị ya kpọrọ ihe dị mkpa.

    Oge a na-anụrụ ikpe ahụ, a hụghị Nnamdi Kanu maọbụ Gọọmenti Naịjirịa n’ụlọikpe. Ọkaikpe Ekwo kwuru na e yigharịala ikpe ahụ ugboro atọ n’ihi na ndị okwu ahụ metụtara anaghị abịa ụlọikpe.

    O kwuru na ọ bụ naanị ndị nnọchiteanya Gọọmenti Naịjirịa bịara ụlọikpe oge ikpeazụ e yiri ilebara okwu ahụ anya.

    Ọ bụ ọnọdụ a mere Ọkaikpe Inyang Ekwo jiri tụfuo akwụkwọ ikpe ahụ.

    Cheta na Nnamdi Kanu gbara akwụkwọ megide Gọọmenti Etiti na Ọkaikpe Ukwu Naịjirịa maka ịmetọ ikike ya ma bookwa ha ebubo ịtọrọ ya na mba Kenya ma kpọghachite ya Naịjirịa maka ikpe ya ikpe.

    Akwụkwọ ahụ ọ gbara bụ iji mee ka ụlọikpe kọwaa ma etu e siri tọrọ ya na mba Kenya ma kpọghachi ya Naịjirịa ọ dabara n’okpuru iwu Naịjirịa.