Iwe na ọnụma ejula ndị mmadụ obi na mba Sọmalịa dịka a chọpụtara
na nwata nwaanyị dị afọ asatọ furu kemgbe ọnwa isii bi n’ụlọ otu nwoke kwuru na
ọ bụ di ya.
Ezinaụlọ nwata ahụ bi na mpaghara Puntland kwupụtara ya dịka
onye na-efu efu n’ọnwa Septemba gara aga.
Ka ọnwa ole na ole gasịrị, a chọpụtara na nna nwata ahụ nyere
nkwado ka ọ lụọ otu okenye aha ya bụ Sheikh Mahmoud.
Ndị nchekwa wakporo ụlọ nwoke ahụ n'izuụka gara aga ma ji ike
banye n’ime ya dịka ha hụrụ na nwoke ahụ kpọchiri onwe ya na nwata ahụ n’ime ụlọ.
Ọnọdụ ahụ butere iwe na ọnụma na soshal midịa nakwa ngagharịiwe
n’isi obodo Sọmalịa bụ Mogadishu.
O mekwara ka a malite inwe nrụrịtaụka ọhụrụ gbasara iwu ndị
na-echekwa ụmụaka dịka a na-enweghị afọ dị n’iwu maka alụmdi na nwunye.
“Ihe kachasị atụ n’anya bụ ebubo ntọrị nakwa ozi e nwetara
na ezinaụlọ nwata ahụ amaghị ebe ọ nọ kemgbe ọtụtụ ọnwa,” ka Fadumo Ahmed bụ
onyeisi otu na-ahụ maka ikike mmadụ bụ Somali Women Vision Organisation gwara
BBC.
“Anyị nwere ntụkwasịobi na ụlọọrụ ndị maara ọrụ ha ga-eme ihe niile kwesịrị ekwesị n’okpuru iwu,” ka o kwuru.
Nwanne nna nwata ahụ kwuru na nwanne ha nwaanyị si n’ụlọ ha
dị na Bosaso kpọrọ nwata ahụ n’ọnwa Septemba gara aga. Nwanne ha nwaanyị ahụ sịrị
na ya na-eduga nwata ahụ ka ọ hụ nwanne nna ya ọzọ.
Ma ka ọnwa ole na ole gasịrị, ihe onyonyoo fesara ebe niile
ma gosi nwata ahụ ebe ọ na-agụ Koran.
Ezinaụlọ ya malitere ịchọgharị nwata ahụ ma mechaa chọpụta
na ọ nọ na mpaghara Carmo, bụ ebe ya na Sheikh Mahmoud bi.