You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.

Take me to the main website

A tụọla onyeisi otu 'Proud Boys' nga afọ 17 maka ịkpalite ọgbaghara na Capitol

Akụkọ kachasị dị mkpa n' Afrịka nakwa mba ụwa niile.

Mkpuchi Na Eme Ozugbo

Ikechukwu Kalu, Uche Akolisa and Adline Okere

  1. Enweghi onye ọbụla nyere anyi iwu imalite ọrụ na Niger – Ndịagha Naịjirịa

    Ndịagha Naịjirịa zipụtala ozi kwuo na enweghi ozi ọbụla ha natara banyere “atụmatụ ndịagha ịrụ ọrụ megide ndị nọ n’isi mweghara ọchịchị na Niger”.

    Ọnụ na-ekwuru ndịagha Naịjirịa zipụtara ozi a iji saa akụkụ na-efegharị nke kwuru na ndịagha Naịjirịa amalitela ọzụzụ maka atụmatụ a.

    O kwuru na ndịagha Naịjirịa agaghị enweike mee ihe dị etu a ọ bụrụ na otu jịkọrọ mba ndị nọ na mpaghara ọdịda anyanwụ Afrịka bụ Ecowas enyeghi ha iwu ime nke a.

    Ọchịagha Gen Tukur Gusau kwuru na “isi ụzọ mwakpo ndịagha bụ ụzọ ikpeazụ a ga-esi ma ọ bụrụ na a nwaa ụzọ niile ndị ọzọ ma isi apụtaghị na ya n’okwu iweghachite ọchịchị onye kwuo” na Niger.

    Ndị isi ọrụ nchekwa na-enwe nzukọ n’isi obodo Naịjirịa bụ Abuja iji nyefee ndị isi Ecowas “atụmatụ ha banyere okwu a”.

  2. Donald Trump: Ndị ọrụ nchekwa awụjuola Washington DC dịka a na-atụ anya ikpe ya taa

    A ga-akpụpụ aka chiburu mba Amerịka bụ Donald Trump ụlọikpe n’ụbọchị Tọọzde a maka ebubo ịkpa nkata ịkụsa mpụtara ntuliaka 2020 bụ nke wepụrụ ya n’oche ọchịchị.

    N’abalị foro chi ụbọchị ikpe a, Trump bugaara ụlọikpe mkpesa maka ikpe a gbara ya ma kwuo na ọ bụ ihe akaebe “nrụrụaka, megide nakwa ịkpụ afọ n’ala” nke mba Amerịka n’oge ọchịchị onyeisiala Joe Biden.

    Enweelarị ikpe abụọ ọzọ nọ n’isi Trump dịka ọ na-agba mbọ ịchụnta vootu iji chịa mba ahụ ọzọ n’afọ 2024.

    Ọtụtụ ndị ọrụ nchekwa awụjuola Washington DC dịka a na-eche ịhụ etu ikpe Tọọzde a ga-esi gaa.

    Egwunyela ihe mgbochi ígwè n'èzí ụlọikpe gọọmenti etiti ebe a ga-agụpụta akwụkwọ ebubo e boro Trump n'ihu ọha.

    Ewubela ihe mgbochi igwe yiri nke a na gburugburu ụlọ imeobi gọọmentị mba Amerịka ebe ndị na-akwado Trump nọ meeọgbaghara n’ọnwa Jenụwarị 2021, iji gosi iwe ha maka mpụtara ntuliaka onyeisiala 2020.

    Ndị ọrụ nchekwa zoro ezo bụ nke na-echekwa ndị isi ala na ndị chiburu mba ahụ wepụtara akwụkwọ ozi ma dọọ ọha aka ná ntị ọha maka "obere kpachị kpachị n’okporoụzọ" nwereike ịdapụta na mpaghara etiti Washington DC.

    N’ụbọchị Wenezde, okuụgha otu onye kpọtụrụ ekwentị gbata gbata nke akara 911 pụtara ihe n’ọha nke kwuru na otu onye buegbe wụbatara n’ime obi gọọmentị nke Capitol nke kpalitere mkpọchi n'ime ụlọọrụ Sịnetị atọ na nakwa ọsọ gbata gbata n’aka ndị uweojii.

    Mgbe onyeisi ndị uweojii ndị na-arụ n’ime ogige Capitol gwara ndị ntaakụkọ okwu, o kwuru na ndị uweojii pụtara zute ndị mere ngagharịiwe ebe ahụ n’afọ abụọ gara aga natara ọzụzụ ma dị njikere izute ndị nwereike ịgba egbe aghara aghara.

    E kwuru na e buliela nchekwa nye ndị ọkaikpe nọ n’isi ikpe a.

    Nke a gụnyere ọkaikpe Tanya Chutkan bụ onye kwuru okwu n’oge gara aga sị na nkenye ekenyere ya isonye ikpe Trump echuola ya ụra dịka onye ọkaiwu ọ gwara okwu a rịọrọ ya “Biko nọrọkwa n’ọndọụ nchekwa”.

    A na-atụ anya na Maazị Trump gbara afọ 77 ga-apụta ụlọikpe etiti dị na Washington DC n’ụbọchị Tọozde n’elekere asatọ nke abalị. A na-atụ anya na ọ ga-ekwu na aka ya dị ọcha n’ebubo a.

    Agbanyeghi na e nyere ya ohere isonye ikpe a site n’igwe teknụzụ nke ihe onyonyo mana akụkọ na-ekwu na ọ ga-apụta ụlọikpe ahụ n’onwe ya.

    Kemgbe ọ pụrụ ọchịchị, ọ bịala obodo ahụ naanị otu mgbe dịka ndị mmadụ amalitela ịkwụ n’aharị na ogige ụlọ ya ebe ahụ.

    Ebubo abụọ ọzọ nke metụtara iji akwụkwọ zoro ezo nke gọọmentị n’ụzọ na-ezighi ezi nakwa igbanwe akwụkwọ o jiri zụọ ahịa n’ụzọ aghụghọ nọ n’isi ya.

    Ndị ikpe na Georgia nwereike ibute ikpe n’isi Trump nke metụtatara ikpa nkata ịkụsa mpụtara ntuliaka 2020.

  3. Ụlọikpe ekwuola ka a tụọ otu nwoke nga ruo afọ ise maka ebubo ịkatọ Eze Morroco

    Onye ọkaiwu otu nwoke na Morocco a na-ebo ebubo ịkatọ Eze mba ahụ na soshal midia agwaala ndị ntaakụkọ na ụlọikpe nyere onye ọ na-anọchiteanya ya ntaramahụhụ ịga nga ruo afọ ise.

    A kpụpụrụ Said Boukioud ụlọikpe maka okwu “ileli ikike ezinaụlọ ndị be Eze anya” site n’okwu ndị o kwuru n’akara Facebook ya n’afọ 2020 mgbe ọ katọrọ mmekọrịta mba ahụ na mba Israel.

    Nwaamadị ahụ bi na Qatar mgbe ahụ.

    Iwu mba Morocco kwuru na ihe niile gbasara mmekọ mba ha na mba ndị ọzọ bụ ọrụ Eze Mohammed VI dịka nkatọ ọbụla nye ọrụ a ga-abụ ihe a hụtara dịka ịrụ aka nye Eze ahụ nke na-ebute ndị mere nke a ntaramahụhụ siri ike.

    Ọkaiwu Boukioud bụ El Hassan Essouni, kwuru na mkpebi a ụlọikpe a mere “siri ezigbo ike ma bụrụ ihe na-enweghi nghọta” dịka ọ gara n’ihu kwuo na onye ọ na-anọchiteanya ya ga-agbagha mpụtara ikpe ahụ.

  4. Niger: Mba Amerịka amalitela ibupụ ụfọdụ ndị ọrụ na-arụ n’ụlọọrụ nnọchịteanya ha dị na Niger

    Mba Amerịka enyela iwu ka a malite ibupụ ụfọdụ ndị na-arụ n’ụlọọrụ nnọchiteanya ha dị na Niger dịka ndị agha weghaara ọchịchị mba ahụ n'izu gara aga.

    E bupụla ọtụtụ narị ndị si mba ọzọ ebe ahụ dịka n’ụbọchị Sọnde ndị ngagharịiwe wakporo ụl ọrụ nnọchianya mba France nọ na Niger.

    Ọchịagha Gen Abdourahamane Tchiani adọọla ọha aka na ntị banyere “ndị mba ọzọ itinye aka n’okwu ihe na-eme n’ime mba ha”.

    Niger bụ mba na-emepụta ọtụtụ ihe ọnatarachi uranium ma nọrọ n’isi ụzọ esi eme njem aga mpaghara Ugwu Afrịka nakwa mpaghara Mediterranean.

    N’ụbọchị Wenezde, onye odeakwụkwọ mba Amerịka bụ Antony Blinken kwutuuru onyeisiala Niger bụ Mohamed Bazoum nke a napụrụ ọchịchị dịka obi gọọmentị mba Amerịka si kwuo dịka ozi ha kwuru na mba Amerịka na-agba mbọ na iweghachi ọchịchị onye kwuo uche ya dị na Niger.

    Ọnụ na-ekwuchitere mba Amerịka bụ Matthew Miller kwuru na, n'agbanyeghị mbupụ ụfọdụ ndị ọrụ ha n’ụlọọrụ nnọchiteanya mba ha nọ n’isi obodo Niger bụ Niamey, na ụlọọrụ a ga-aga n’ihu meepe emepe ma na-arụ ọrụ.

    O kwuru:

    "Anyị ga-aga n’ihu kwudoro ndị mba Niger dịka mmekọrịta anyị na ndị Niger ga-anọgide n’usoro udo ruo ọkwa kacha elu,"

    Mba Amerịka bụ mba na-eziga ọtụtụ ihe enyemaka nye ndị mba Niger nakwa enyemaka n’ọrụ nchekwa, dọrọ aka na ntị na nso nso na mweghara ọchịchị nwereike ime ka ha kwụsị ọrụ niile na mba ahụ.

    Mba France, nke chịburu mba Niger n’oge gara aga, na otu jịkọrọ mba ndị Europe bụ EU akwụsịlarị ọru enyemaka ha nakwa iziga ego nye mba Niger dịka ihe mechapụrụ.

    Otu jịkọrọ mba ndị Ọdịda Anyanwụ Afrịka bụ ‘Economic Community of West African States’ (Ecowas), otu azụmahịa nke mba 15 dị n'Ebe Ọdịda Anyanwụ Africa so n’ime ya, enyela mba Niger ọtụtụ mmachi nke gụnyere ịkwụsị mmekọ azụmahịa niile ha na Niger nwere nakwa mmachi ndị ọzọ.

    N'ozi o zipụtara n’ihe onyonyo gbara n’igwe televishọn n’ụbọchị Wenezde, Ọchịagha Tchiani kwuru na ọchịchị ọhụrụ ya jụrụ "ịnbata mmachị ndị a n'ozuzu ya ma jụ ile atụmatụ mmaja ọbụla anya ebe ọ

  5. Unu asaala chi?

    Nnọọ n'ọbaozi anyị taa bụ ụbọhị atọ nke ọnwa Ọgọọstụ.

    Soro akụkụ ndị dị mkpa ịkọ taa niile ebe a.

  6. Ovwaere Diaso: Etu igwe 'elevator' si tigbuo dọkịta n'ụlọọgwụ Legọs

    Ndị dọkịta na-rụ n'ụlọgwụ General Hospital, Odan, Lagos Island dị na Legọs emela ngagharịiwe ha ji kpoo oku ka enye ogbo ha igwe eji arị ụlọoelu tigburu ikpemnkwụmọtọ.

    Igwe na-ebuli mmadụ elu uleelu Bekee kpọrọ 'elevatọ kugburu Dkta Ovwaere Diaso ụbọchị Tuzde,abalị mbụ nke ọnwa Ọgọstụ.

    Akụkọ kwuru na ọ fọrọ Diaso nanị izụka abụọ ka oge ọzụzụ 'housemanship ya zuo oge ọdachi a mere.

    Ndị dọkịta jicha mpempe akwụkwọ e dere ozi dị iche iche gagharịri na ngwuru ụlọọgwụ ahụ ụbọchị Wenezde na-agụ egwụ sị, " Nanị ihe anyị na-ekwu bụ nye anyị ikpemnkwụmọtọ."

    N'otu aka ahụ, otu jịkọrọ ndị dọkịta Naijiria bụ Nigeria Medical Association a k[pọọla oku ka e nyocha etu ya bụ ihe siri mee.

  7. Justin Trudeau,Praim Minista Canada na nwunye ya ekewala

    Onye Praim Minista mba Kanada bụ Justin Trudeau na nwunye ya bụ Sophie Trudeau ekwekọrịta ịgbasa dịka di na nwunye, dịka ozi ha wepụtara n'ọbaozi ha n'ịntanet si kwuo.

    Ha abụo ekwughị ihe na-ese mana ozi ha jikọrọ aka wepụta n'ụbọchị Wenezde n'akara ọbaozi soshal midia ha kwuru sị," Dịka anyị kpachara nkata siri ike ma dị oke mkpa, anyị ekwekọrịtala onye nọrọ onwe ya."

    Justin Trudeau na Sophie bụ onye mgbasaozi lụrụ onwe ha n'afọ 2005 ma mụta ụmụ atọ Xavier, Ella-Grace na Hadrien.

  8. Niger Coup: Anyị kwadoro ebe Ecowas kwụ- Briten

    Mba Briten ekwupụtala nkwado ha nye mkpebi otu jikọrọ mba dị n'Ọdịda Anyanwụ Afrịka a kpọrọ ECOWAS megide ndị agha weghara ọchịchị n'ike na mba Nijie.

    Na nsonso a, ndị agha mba Nijie kwaturu Mohamed Bazoum bụbụ onyeisiala ha n'oche were ọnọdụ.

    Mana otu Ecowas nke Tinubu bụ onyeisioche ya nyere ha abalị asaa inyeghachi ọchịchị ahụ azụ dịka ha machiri ụgbọelu si mba ahụ fee nmba Nijie.

    Odeakwụkwọ Ukwu mba Briten n'ihe gbasara ihe mmekọrịta Briten na mba ndị ọzọ ma James Cleverly kwuru na Briten nabatara etu Ecowas si kwụrụ shịm n'ozi ha wepụtara maka mgbanwe ọchịchị n'ike ahụ mere na Nijie.

    Cleverly, onye kwuru nke a oge ya na Onyeisiala Tinubu zutere na nsonso a, sịrị na ha ga-aga n'ihu ịkwado ndị enyi kara aka ha nwere na mpaghara Ọdịọ̄a Anyanwụ Afrika iji weghachi udo na ọchịchị onyekwuouche ya na Nijie.

    Cleverly tokwara atụmatụ mgbanwe ọchịchị Tinubu wepụtara, sị na ọ ga adọta ndị ofesi itinye ego azụmahịa na Naijiria.

    O kwuru na Briten dị njikere ị ga n'ihu n'ịkwado ọchịchị onyekwuouche ya tọrọ atọ na Naijiria,

  9. NLC protest: Ndị ọrụ amalitela ngagharịiwe na Naijiria

    Ndị ọrụ n'okpuru otuu jikọrọ ndị ọrụ na Naijiria a kpọrọ "Nigeria Labor Congress"(NLC) amalietela ngagharịiwe na mpaghara dị iche iche na Naijria megide mwepụ Gọọmentị i Wepụrụ ego mbelata ụgwọ mmanụ agbidi nke Bekee kpọrọ 'fuel subsidy, taa bụ Wednezde.

    Mwepụ ego nkwụbilata ego mmanụ butere ka ọnụahhịa mmanụ ụgbọala nakwa ọnụahịa ihe na-ada n'ahịa rịarue elu ọjịị.

    Ngaghariiwe a na-abịa ka ọ gachara abalị abbụọ ọgbakọ Gọọmentị Etiti na ndị ọrụ nwere amịtaghị mkpụrụ

    Ndị ọrụ bu akwụkwọ edegahara ihe ihe dị iche ich gụnyere " "Kweee ka ụmụogbeye kute ume" na ozi ndị ọzọ gụ egwu na-agagharị n'okporoụzọ n'ọtụtụ isiobodo steeti dị iche iche na Naijiria.

    N'Abuja, ndị na-eme ngagharịiwe dọturu ọnụ ama Ụlọomeiwu dịka ndị ọrụnchekwa ebe ahụ gbachiri ụzọama ahụ jụ inye ha ohere banye.

    Gọọmentị Onyeisiala Bola Tinubu kwuru na iwepụ ego nkwụbiilata ego mmanụ ga-enye aka ịkwụsị mmanụ a na-ezupụ na Naijiria ma mee ka ego na-aba n'akpa gọọmentị gbalite iji nye ohere ka a rụọ ọrụ mwulite obodo.

    O kwere nkwa iwepụta ihe idi aka n'obi nke gụnyere ịkwụ ndị ogbenye puku naira asatọ nakwa iwepụta ụgbọala maka ime njem.

    Mana otu NLC kwuru na ihe ndị ezughị.

  10. Ndewonu, Igbo ndị ọma

    Ndeewonu, Igbo ndị ọma anyị ji biri.

    Soro anyị ebe maka akụkọ ndị dị mkpa taa.

  11. Ka chifuo nu!

  12. Plane crash: A zọpụtala mmadụ anọ na ndụ n'ime ụgbọelu dakpọkasịrị n'Ikeja na Legọọs steeti

    Ndị ụlọọrụ NEMA bụ National Emergency Management Agency agwala ndị ntaakụkọ na ha azọpụtala mmadụ abụọ nọ n'ime ụgbọelu helikọpta dakpọkasịrị n'Ikeja na Legọọs.

    Ha sị na ụgbọelu a dakpọrọ ebe Ọba Akran n'Ikeja taata bụ ụbọchị Ọgọst 1, 2023.

    Ha sị na otu onye n'ime mmadụ abụọ ndị a zọpụtara bụ onye ọcha.

    N'ozi ndị NEMA zipụtara ha si na ihe mberede a mere mgbe ndị ọkwọ ụgbọelu nọ n'ọzụzụ ha. Ha kwuru na ụmụnwoke anọ so n'ụgbọelu helikọpta ahụ dakpọkasịrị, na mmadụ abụọ bụ ndị mba Naịjirịa ebe mmadụ abụọ bụ ndị ọcha.

    Ha kụrụ osisi a nyara ụdọ igweokwu dị n'akụkụ ụlọakụ UBA n'okporoụzọ Oba Akran Avenue dị n'Ikeja na Legos. Ka ya bụ mberede mere, ụgbọelu a gbara ọkụ nke e jiri ngwa menyụọ.

    Mmadụ anọ ndị a zọpụtara na ya bụ mberede dị ndụ ma merụọ ahụ n'ụzọ dị icheiche. Ndị ụlọọrụ mmenyụ ọkụ nke Legọọs steeti na ndị enyemaka ụgbọala a tikọtara aka ịhụ na ihe mberede a akarịrị etu ọ dị. N'okwu Adeseye Margaret onyeisi ndị ọrụ gbatagbata mmenyụ ọkụ na Legọọsị ebe o dere si na e gbochiri ihe mberede a.

  13. Etu anyị si wakpoo ogige ndị Ipob/ESN dị n'Imo, Anambra na Enugwu

    Ndịagha Naịjirịa sị ha awakpoola ogige otu Indigenous People of Biafra (Ipob) na ndị Eastern Security Network (ESN) dị n’ime ọhịa Orsomoghu n’etiti Anambra na Imo Steeti.

    Nke a dị n’akwụkwọ ozi ọnụ na-ekwuru ndịagha Naịjirịa bụ Onyema Nwachukwu wepụtara n’ụbọchị Tuzde 1 Ọgọstụ, 2023 nke kwuru na ha na ndị uweojii so mee mwakpo ahụ.

    Ọ sị na ha wakporo ogige a n’ụbọchị Mọnde 31 Julaị, 2023 mgbe nwetere mkpesa na e nwere ndị na-akpa aghara ịmanye ndị mmadụ ịnọ n’ụlọ n’ike na mpaghara Onitsha, Nnewi, Iheme Obosi nakwa Ahịa ọhụrụ dị n’Enugwu steeti.

    Ogige ndị a wakpọro gụnyere Ekeututu, Orsomoghu, Lilu na ndagwurugwu Motor Valley. Ha kwuru na ndị a kwatara mgbọ nke mere ọtụtụ n’ime bu mgbọ egbe merụrụ ha ahụ gbaa ọsọ ebe ha nwuchiri mmadụ ise.

    Ngwa ọrụ ndị a ji gụnyere ogbunigwe, egbe na ihe onyonyo CCTV, ọkọlọtọ ndị Ipob.

    Ọ gara n’ihu kwuo na ndịagha ise na ndị uweojii abụọ merụrụ ahụ site n’ogbunigwe ndị a gbara.

    Nwachukwu kwuru na ndị ọrụ nchekwa ga-aga n’ihu ibuso ndị a agha ma gwaa ndị bi na mpaghara Ọwụwa Anyanwụ ka ha na-aga mkpa dịịrị ha na-atụghị egwu ọbụla.

  14. Anyị agaghị anọnwu n'ụlọ n'ụlọ ruo izuụka abụọ - Alex Otti

    Gọvanọ na-achị Abia Steeti bụ Alex Otti ekwuola na ndị bi na mpaghara Ọwụwa Anyanwụ ọkachasị ndị Abia Steeti agaghị anọnwụ n'ụlọ ruo izuụka abụọ.

    O kwuru nke a na ngwụcha nzukọ imeụlọ ndị gọvanọ Ọwụwa Anyanwụ na Nuhu Ribadu bụ onye ndụmọdụ Onyeisiala Buhari na nchekwa nwere n'Abuja n'ụbọchị Mọnde 31 Julaị, 2023.

    Nke a bụ na nzaghachị oku Simon Ekpa bụ onyendu otu alaka Indigenous People of Biafra (Ipob) ka ndị mmadụ nọrọ n'ụlọ ruo izuụka abụọ malite na 31 Julaị ruo na 14 Ọgọstụ 2023 n'iji mee ka a tọhapụ Nnamdi Kanu bụ onyendu Ipob.

    Gọvanọ Otti kwuru na ọ bụ naanị mmadụ mkpụrụ ole ma ole na-erite uru site n'ịnọ n'ụlọ a ma jiri ngwaagha iji egwu na-amaja ndị mmadụ, na gọọmentị agaghị anọ na mmiri ncha abaa ha n'anya.

    "Mmadụ agaghị eyijanwu gọọmentị na mbaụwa niile, nke a bụ iji dọọ ndị na-akpa ntaka aka na ntị.

    "Anyị agaghị anọnwu n'ụlọ mgbe anyị nwere ọtụtụ ọrụ cheere anyị n'ihu. Ọtụtụ ndị mmadụ na-eri nri site n'ihe ha na-enwete kwa ụbọchị; ndị ọkwọ ụgbọala, nwaanyị na-ere ose n'ahịa, ọ bụrụ na ha nọrọ n'ụlọ izuụka abụọ agụụ ga-egbu ha na ezinaụlọ ha."

    Ndị ọzọ soo n'ọgbakọ ahụ gụnyere Gọvanọ Imo steeti bụ Hope Uzodimma, osote gọvanọ Anambra, Ebonyi nakwa Enugwu steeti, onyeisi ndị uweojii na ndị ọrụ nchekwa ọzọ.