A ga-akpụpụ aka chiburu mba Amerịka bụ Donald Trump ụlọikpe n’ụbọchị
Tọọzde a maka ebubo ịkpa nkata ịkụsa mpụtara ntuliaka 2020 bụ nke wepụrụ ya n’oche
ọchịchị.
N’abalị foro chi ụbọchị ikpe a, Trump bugaara ụlọikpe mkpesa
maka ikpe a gbara ya ma kwuo na ọ bụ ihe akaebe “nrụrụaka, megide nakwa ịkpụ afọ
n’ala” nke mba Amerịka n’oge ọchịchị onyeisiala Joe Biden.
Enweelarị ikpe abụọ ọzọ nọ n’isi Trump dịka ọ na-agba mbọ ịchụnta
vootu iji chịa mba ahụ ọzọ n’afọ 2024.
Ọtụtụ ndị ọrụ nchekwa awụjuola Washington DC dịka a na-eche ịhụ etu
ikpe Tọọzde a ga-esi gaa.
Egwunyela ihe mgbochi ígwè n'èzí ụlọikpe gọọmenti
etiti ebe a ga-agụpụta akwụkwọ
ebubo e boro Trump n'ihu ọha.
Ewubela ihe
mgbochi igwe yiri nke a
na gburugburu ụlọ
imeobi gọọmentị mba Amerịka ebe
ndị na-akwado Trump nọ meeọgbaghara n’ọnwa Jenụwarị 2021, iji gosi iwe ha maka mpụtara ntuliaka onyeisiala 2020.
Ndị ọrụ nchekwa zoro ezo bụ nke na-echekwa
ndị isi ala na ndị chiburu mba ahụ wepụtara akwụkwọ ozi ma dọọ ọha aka ná ntị
ọha maka "obere
kpachị kpachị n’okporoụzọ"
nwereike ịdapụta na mpaghara
etiti Washington DC.
N’ụbọchị
Wenezde, okuụgha otu onye kpọtụrụ ekwentị gbata gbata nke akara 911 pụtara ihe n’ọha nke
kwuru na otu onye buegbe wụbatara
n’ime obi gọọmentị nke
Capitol nke kpalitere mkpọchi n'ime
ụlọọrụ Sịnetị atọ na nakwa ọsọ gbata gbata
n’aka ndị uweojii.
Mgbe onyeisi
ndị uweojii ndị na-arụ n’ime ogige Capitol gwara ndị ntaakụkọ okwu, o kwuru na ndị uweojii
pụtara zute ndị mere ngagharịiwe ebe ahụ n’afọ abụọ gara aga natara ọzụzụ ma dị
njikere izute ndị nwereike ịgba egbe aghara aghara.
E kwuru na e buliela nchekwa nye ndị ọkaikpe nọ n’isi ikpe a.
Nke a gụnyere ọkaikpe Tanya Chutkan bụ onye kwuru okwu n’oge gara aga
sị na nkenye ekenyere ya isonye
ikpe Trump echuola ya ụra dịka onye ọkaiwu ọ gwara okwu a rịọrọ ya “Biko nọrọkwa
n’ọndọụ nchekwa”.
A na-atụ
anya na Maazị Trump gbara afọ 77 ga-apụta ụlọikpe etiti dị na Washington DC n’ụbọchị
Tọozde n’elekere asatọ nke abalị. A na-atụ anya na ọ ga-ekwu na aka ya dị ọcha
n’ebubo a.
Agbanyeghi
na e nyere ya ohere isonye ikpe a site n’igwe teknụzụ nke ihe onyonyo mana akụkọ
na-ekwu na ọ ga-apụta ụlọikpe ahụ n’onwe ya.
Kemgbe ọ pụrụ
ọchịchị, ọ bịala obodo ahụ naanị otu mgbe dịka ndị mmadụ amalitela ịkwụ n’aharị
na ogige ụlọ ya ebe ahụ.
Ebubo abụọ ọzọ
nke metụtara iji akwụkwọ zoro ezo nke gọọmentị n’ụzọ na-ezighi ezi nakwa
igbanwe akwụkwọ o jiri zụọ ahịa n’ụzọ aghụghọ nọ n’isi ya.
Ndị ikpe na
Georgia nwereike ibute ikpe n’isi Trump nke metụtatara ikpa nkata ịkụsa mpụtara
ntuliaka 2020.