Ihe omimi gbasara ego dị $5m, ọlaedo adịgboroja, egbe na mgbọ egbe, nke a hụrụ n'ime otu ụgbọelu nke onwe na mba Zambia, abụrụla isiokwu nnyocha nke ndị ọrụ nchekwa mba Zambia malitere ugbua na Lusaka.
Ihe a ma bụ na ụgbọelu ahụ si n'obodo Cairo, isi obodo mba Egypt, ma biarute na Zambia izuụka abụọ gara aga.
Ka ọ dị ugbua, onweghị onye ọbụla na Egypt maọbụ Zambia kwetara na ọ bụ ha nwe ụgbọelu ahụ maọbụ ihe dị n'ime ya.
Ihe a ma ugbua bụ na mmadụ isii ndị mba Egypt nọ n'ime ụgbọelu ahụ na ndị ọsọ sonyeere ha na Lusaka, ga-abịa n'ụlọikpe n'ụbọchị Mọnde.
E bokwara ụfọdụ ndị Zambia e jichiri gbasara okwu a ebubo dị icheiche ma kpụgakwa ha ụlọikpe. Mana onwebeghị ebubo e boro ndị nke Egypt e jidere.
Onweghị onye gaara amata maka ihe a merenụma e wepụ otu onye ntaakụkọ onye dere akụkọ ahụ n'ọbaozi ya, Matsda2sh, bụkwa onye ndị ọrụ nchekwa mba Egypt jidere ma bo ya ebubo na aka ya dị na ya.
Otu ndị ọkachamara a na-akpọ 'Egypt Technocrat' nke ọtụtụ ndị ọkachamara mba Egypt na ngalaba dị icheiche nọ na ya, ekwuola na ihe karịrị ụlọọrụ 300 na mba Egypt na-etinye aka na mbupu ego na mba ahụ n'ụzọ ezighi ezi.
Ụfọdụ na-ekwu na ebupụla ego buru ibu na mba Egypt kamgbe onyeisiala Abdel-Fatah al-Sisi malitere ọchịchị afọ itoolu gara aga.
Ọ bụrụ na nke a bụ eziokwu, o nwereike ịbụ na ụgbọelu a bụ naanị otu n'ime ọtụtụ ụgbọelu merela njem dị otu a na mba ahụ.
Dịka o dochabeghị anya onye nwe ego, ọlaedo na ngwaọgụ ndị ahụ a hụrụ n'ime ụgbọelu na Lusaka, Zambia, onweghị onye ma nke bụ eziokwu, mana a na-eche na dịka ikpe ga-amalite gbasara nchọpụta a, eziokwu niile dị na ya ga-apụta ihe n'oge adịghị anya.