Ka abalị asaa ndị isi mba Ọdịda Anyanwụ Afrịka nyere ndịagha weghaara ọchịchị na Niger ka ha weghachite onyeisiala Mohamed Bazoim dịka onye ọchịchị ọzọ na-eru, ugbua abụrụla oge ma ndịagha ma ndị ọchịchị a ime ezigbo mkpebi siri ike ma me ya ngwa ngwa.
N'ụbọchị ụka gara aga, otu jikọrọ mba ndị ọdịda anyanwụ Afrịka bụ Ecowas nke onyeisiala Bola Ahmed Tinubu na-edu nyere ndịagha a ndị weghaara ọchịchị na Niger iwu ka ha weghachite usoro ọchịchị onye kwuo uche ya na mba ahụ maọbụ ha e jiri aka ike site n'ụzọ ndịagha mee ha ka ha mee ihe ha kwuru.
Otu Ecowas enyela ndị nọ n'isi mweghara ọchịchị a otutu mmachị nakwa ntaramahụhụ dịka mba Naịjirịa kwụsịrị inye mba Niger ọkụ latrik. A gbachikwara okeala jikọrọ mba a na mba ndị ọzọ nke pụtara na ha agaghị enweike bubata ngwa ọbụla maọbụ mee azụmahịa ọbụla. Ihe nke a pụtara bụ na mba a nke mba ndị ọzọ gbara okirikri abụrụla ndị na-agaghị enweike si ụzọ ọdụ ụgbọ mmiri ọbụla mee njem ọbụla maọbụ bụbata ngwa ahịa.
Mana dịka ndị mmadụ chi obi n'aka echi ihe ga-eso okwu ndọrọndọrọ ọchịchị, okwu inwe mkparịtaụka maka udo nakwa okwu ikike ndị agha ịsọ mpi, kedụ ihe nwereike ime n'oge a ma ọ bụrụ na abalị asaa a gachaa?
1. E nwereike ịdọtị oge e nyere ndị a
Otu ihe ndị isi Ecowas nwereike ime bụ ịdọtị oge a e nyere ndịagha a weghaara ọchịchị agbanyegi na nke a nwereike ịbụ ihe a ga-eme ụfọdụ ahụta ha ka ndị na-agba egbe ọnụ mana otu nwereike ịsịkwa na atụmatụ mkparịtaụka udo ha na-eme ebe ahụ na-amịta mkpụrụ nke mere ha ji chọọ ịdọtị oge a. Mana nke bụ nsogbu ugbua a bụ na atụmatụ mkparịtaụka udo a Ecowas na-anwa ime ebe ahụ amalitebeghi ịchịta aja dịka otu onye otu Ecowas zigaara mba ahụ maka atụmatụ a n’ụbọchị Tọọzde gba aka lọta. Mana ndịagha weghaara ọchịchị a jizi iwe gosi etu obi dị ha nye mba ndị ofesi nakwa otu Ecowas. Ha zipụtara ozi kwuo na ha mba Naịjirịa, Togo, mba Amerịka na France agaghịzi na-enwe mmekọ ma kagbuo nkwekọrịta ha na mba France nke chịbụru ha bụ nkwekọrịta kwuru ha ndịagha ha ruru mmadụ 1500 nweeike ịnọ na mba Niger.
Onyeisiala Bazoum onye ka nọ n'aka ndịagha zipụtara ozi nye ụlọ ntaakụkọ the Washington Post nke okwu ya dara ụda n'ime ya mgbe o depụtara onwe ya dịka onye "e ji eji" ma rịọ mba Amerịka nakwa mba ofesi ndị ọzọ ka bịa nyereaka weghachite usoro ọchịchị onye kwuo uche ya ebe ahụ.
N'ụbọchị Fraịdee, mba Amerịka kwuru na ha ga-akwụsịtu ụfọdụ ọrụ enyemaka ha na Niger mana ha ga-aga n'ihu na-eziga enyemaka nri na enyemaka maka ndụ ndị mmadụ.
2. Ha nwereike nwee nkwekọrịta oge ha ga-eweghachite ọchịchị onye kwuo uche ya
Iji dajụọ ọkụ na-agba ebe ahụ, ndị nọ n'isi mweghara ọchịchị a na ndị isi Ecowas nwereike kpebie ma nwee nkwekọrịta oge a ga-eweghachite ọchịchị onye kwuo uche ya. Nke a nwekwaraike ịgụnye ntọhapụ onyeisiala Bazoum na ndị ọchịchị ndị ọzọ e ji eji, iji hụ na mkparịtaụka na-aga siriri werere nakwa iji nwetakwuo oge. Nke a bụ ihe ọtụtụ ndị na-akatọ mweghara ọchịchị a n'Afrịka na-achọ.
Ecowas anabatala usoro mweghachi ọchịchị nke mba Mali na Burkina Faso bụ mba ebe ndịagha weghaara ọchịchị n'afọ olemaole gara aga.
Agbanyeghị nke a mkparịtaụka mweghachi ọchịchị abụrụla ihe nsogbu dịka ịdọtị oge ntuliaka cheere aka mgba mana ndị nọ n'isi weghara ọchịchị ebe ndị a ka na-ekwe nkwa nyeghachi ndị nkịtị ọchịchị.
Mba Sudan nke mepụtara otu pụrụiche nke jikọrọ ndị nkịtị na ndịagha na 2019 kara ịbụ ihe ezi immatụ n'ụdịrị okwu ndị metụtara inyeghachi ndị nkịtị ọchịchị mana etu mba a siri danye n'ọgbaghara na nso nso a emeela ka ihe a bụrụ ihe a ga-echebara echichi tupu e mee.
Ndị isi Ecowas ekwughị kpom kwem na ha ga-eji ikike ndịagha zute ndị weghaara ọchịchị a ma ọ bụrụ na e weghachiteghi onyeisiala Bazoum n'ọkwa ya kama ha nyere ohere gosiri na nke a kwekwaraike ịbụ ụzọ ha ga-eso.
Ndị isi agha Nigeria ekwuola na ụzọ a ga-abụ "ụzọ ikpeazụ ha ga-eso".
Onyeisiala Tinubu kwuru na e nwereike iziga ndịagha "iji hụ na ndị a weghaara ọchịchị mere ihe a chọrọ ma ha gaa n'ihu gbaa isi akwara"
Ecowas emeela ihe dị etu a n'oge gara aga dịka na mba Gambia mgbe Yahya Jammeh jụrụ iritu n'ọkwa ọchịchị agbanyegi na ọ nweteghi mmeri na ntuliaka. Mana okwu iso ụzọ dị etu a n'oge a bụ ike ka taa ezigbo akpụ.
Ihe aka mgba nke mbụ, mba Niger bụ mba kacha buo ibu ma ekwukwe okwu ala na mpaghara ọdịda anyanwụ niile ebe mba Gambia pere ezigbo mpe, nke a pụtara na iziga ndịagha ebe ahụ agaghị adị mfe ma ncha.
Nke abụọ, Naịjirịa bụ mba nwere agba na mpaghara ma nọrọ n'isi ịchọ ka e weghachite ọchịchị onyeisiala Bazoum nwekwara nsogbu na na-echere ya aka mgba n'ụlọ bụ nsogbo enweghị nchekwa nke a pụtara na ịzipụ ọtụtụ ndịagha n'oge a ga-abụ ihe tara ezigbo akpụ.
Nke atọ, ma Mali nakwa mba Burkina Faso ekwuola na e ziga ndịagha na Niger maka okwu a na ha ga-ahụta ya dịka "ịkpọ oku agha" nke bụ na ha ga-apụta n'igwe bịa lụchitere mba Niger agha.
Nke a abụrụla ihe siri ike dịka okwu a nwereike itasuru ọkụ ma ghọọ agha metụtara mpaghara ọdịda anyanwụ niile.
Marakwa na mba Niger na mba Naịjirịa nwereike ọtụtụ mmekọ dịka ụfọdụ ndị na mba abụọ sị otu agbụrụ ma na-asụ otu asụsụ nke nwereike ime ka ndịagha Naịjirịa gara ịchọ imetụta "ụmụnne ha.
Mba ndị dịka Algeria, China na Russia arịọla ka a ghara isi ụzọ ndị agha kama ka e si ụzọ mkparịtaụka kpezie okwu a.
Dịka ha nwechara ọgbakọ ruru abalị atọ n'Abuja, ndị isi agha otu Ecowas kwuru na ha edepụtala atụmatụ ibu agha na Niger ma nyefee ya ndị isi Ecowas ka ha leba anya.
Mba Naịjirịa Ivory Coast, Senegal na Benin ekwuola na ha dị njikere iziga ndịagha ha na Niger ma ọbụrụ ndị isi Ecowas kpebie isi ụzọ iziga ndịagha.
Dịka ndepụta akwụkwọ ozi "Global Fire Power index" siri kwuo, Naịjirịa na onwe ya nwere ndịagha ruru 135,000 ebe Niger nwere naanị 10,000 mana nke a apụtaghị na izi ndị agha ebe ahụ ga-abụ ofe nracha.
Isi ụzọ udo bụ ihe ga-akacha mma nye mmadụ niile okwu a metụtara mana otu Ecowas ga-achọkwa igosi onwe ha ọkachasi dịka ha enwebeghi ike gbochie mweghara ọchịchị na-arị elu na mpaghara ahụ n'afo atọ ndị gara aga.