Ụtụtụ ọma
Igbo ndị ọma, ụnụ abọọla chi.
Nnọọ na mgbasaozi anyị nke ụbọchị taa.
You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.
Akụkọ kachasị dị mkpa n' Afrịka nakwa mba ụwa niile.
Ikechukwu Kalu, Uche Akolisa and Adline Okere
Igbo ndị ọma, ụnụ abọọla chi.
Nnọọ na mgbasaozi anyị nke ụbọchị taa.
Ụlọọrụ Federal Account Allocation Committee (FAAC) ekesaala ego dị ijeri narị naịra itoolu na ijeri iri isi na isii (N966.110bn) n’etiti gọọmentị etiti, nke steeti nakwa nke okpuruọchịchị dịka ego nwete nke ọnwa Julaị 2023.
Edere nke a n’akwụkwọ mgbasaozi ụlọọrụ FAACwepụtara na nwgwụcha nzukọ ha mere nke ọnwa Ọgọọst n’afọ 2023. Ọnụ na-ekwuru ha bụ Bawa Mokwa gụpụtara nke a.
Onye nọ dịka onyeisi n’ọgbakọ ahụ bụ minista na-ahụ maka ego bụ Wale Edun.
Ijeri naịra 966.110 ekesara bụ ego ndị e nwetere site ego nwete gọọmentị, ụtụisi, ego si na izipu ego n’ịntanetị nakwa ego si n’ụtụisi ịgbanwe ego.
N’ime ọnwa Julaị, 2023, ego ndi esepuru e jiri mee ụgwọ nnakọta dị ijeri naịra 62.419 na ngụkọta mwepu maka nchekwa, nzipu, nkwụghachị na nkagbu ụtụisi bụ ijeri naịra 717.962.
Ọzọ dịka ibe ya, ego fọrọ n’akpaego mmanụ agbidi ‘Excess Crude Acount(ECA)’ n’ọnwa gara aga bụ $4773,754.57.
Ndị mba Zimbabwe na-atụ vootu iji họpụta onyeisiala ọhụrụ nakwa ndị ụlọomeiwu ha na-agbanyeghi ọke ọnụahịa na-emekpa ha ahụ ugbua.
E mere ụbọchị taa ka ọ bụrụ ụbọchị ezumike iji nye mmadụ nde isii na ụma isii ohere ịga tụọ vootu ha.
Mmadụ iri na-azọ ọkwa onyeisiala na-ama Onyeisiala ha ugbua Emmerson Mnangagwa aka n’ọkwa ahụ, ndị a gụnyere Nelson Chamisa nke pati Citizens Coalition for Change (CCC).
Onye na-azọ ọkwa onyeisiala kwesịrị inwete vootu karịrị pasentị isi ise (50%) iji merie.
Ọ bụrụ na o nweghi onye mmeri ya doro anya, a ga-eme ntuliaka mgbakwụnye n’ime izuụka isi bụ ụbọchị abụọ nke Ọktoba.
Nke a bụ ntuliaka mbụ kamgbe ọnwụ Robert Mugabe, bụ onye kachasị na ndọrọ ndọrọ ọchịchị Zimbabwe nakwa nke pati nọ n’ọchịchị bụ Zanu-PF.
Mugabe nwụrụ n’afọ 2019 ihe chụwara afọ abụọ ndịagha chụturu ya n’ọkwa ma were osote ya bụ Mnagagwe dochie ya.
Ọgbọ ntuliaka mepere n’elekere asaa nke ụtụtụ 07:00 (05:00 GMT), a ga-ahọpụtakwa ndịisi okpuruọchịchị obodo.
Tupu ntuliaka amalite, ndị mba ahụ dịbụ kwụrụ n’ahịrị toro ogo iji binye aka n’akwụkwọ ntuliaka ma họpụta onye ga-achị ha.
Ụfọdụ n’ime ha gwara BBC na obi dị ha mma ịme ikike dịịrị ha bụ ịtụ vootu.
Tupu ntuliaka nke taa, ndị ọrụ ntuliaka nọ na-ahazi ngwa ntuliaka ha ma na-ewepụ akwụkwọ ndị na-azọ ọkwa ji chụọ nta vootu.
E zipukwala ndị uweojii n’ebe niile a na-eme ntuliaka iji mee ka ọgbaghara ghara ịdapụta n’oge ntuliaka a.
Ụkọchị ụka penetecostal a ma ama na Naịjirịa bụ William Kumuyi, arịọla ụmụ Naịjirịa ka ha nye onyeisiala Bola Ahmed Tinubu nakwa ndị mịnịsta ọhụrụ ọ họpụtara, nkwado niile dị mkpa ka ha wee rụọ ọrụ nke ọma ma wulite obodo Naịjirịa.
Kumuyi, onye bụkwa onyeisi ụlọụka Deeper Life Christian Ministry, kwuru nke a n'ụbọchị Tuzde, n'Osogbo, isi obodo Osun steeti, dịka ya na ndị ntaakụkọ na-enwe mkparịtaụka maka ọgbakọ 'crusade pụrụ iche nke ndị ụka ya na-akwado.
O kwuru na Chineke ga-agbanwe obi ndị ọchịchị Naịjirịa ma were ha rụọ ọrụ ọma maka ọdịmma obodo anyị.
"Ndị mịnịsta onyeisiala họpụtara, ha abụghị ndị ọhụrụ na-enwebeghị ihe ha merela mbụ. I lee ndị Mịnịsta ọhụrụ a anya n'otu n'otu, ị ga-ahụ ụfọdụ ihe ọma ha merela," Kumuyi kwuru.
"Ọ bụrụ na anyị nye ha nkwado, ghara ị na-akatọ ihe ọbụla ha mere, nabata ha ma kwenye na Chineke ga-eji ha rụọ ọrụ ma were ha dịka akụrụngwa iji wulite obodo anyị."
"Ka anyị chefuo ihe ndị gara aga. Ugbua bụ ụbọchị ọhụrụ, anyị niile nwere nkwenye na anyị ga-ahụ ihe ọhụrụ na mba anyị site n'aka onyeisiala na ndị mịnịsta ya. Ọtụtụ ihe dị mma ga-abịa.
Cheta na onyeisiala Bola Tinubu duru ndị mịnịsta 45 n'iyi ọrụ n'ụbọchị Mọnde, Ọgọst 21, ma dọọ ha aka na nti ka ha rụsie ọrụ ike maka ọdịmma Naịjirịa.
Abdulsalami Abubakar bụ aka chịburu Naịjirịa ekwuola na mkparịtụka mere n’etiti ndị nnochiteanya Ecowas na ndịagha Niger nwere na ngwụcha izuụka gara aga mịtara mkpụrụ.
Ndị nnọchiteanya otu Economic Community of West African States (Ecowas) kwuru na mkparịtaụka udo aghaghị ime ka e weghachịte Onyeisiala Mohamed Bazoum n’ọkwa ọchịchị mba Niger.
Abdulsalami gara kọọrọ onyeisi ndị Ecowas nakwa onyeisiala Naịjirịa bụ Bola Tinubu etu njem ha na mba Niger siri gaa n’ụbọchị Tuzde.
Mgbe ọ na-agwa ndị ntaakụkọ okwu n’Abuja, Abdulsalami kwuru na o nweghi onye chọrọ agha, dịka o nwere olileanya na mkparịtaụka ahụ agaghị ama afọ n’ala.
“Dịka ị maara, ndị ndu Ecowas mere njem na mba Niger na ngwụcha izuụka, anyị gara izute ndịagha iji chọta ụzọ a ga-eji gboo nsogbu anyị nọ n’ime ya.
“Aga m asị na njem anyị na Niger mịtara mkpụrụ. O mepeela ohere ka mkparịtaụka na-aga n’ihu, olileanya dị na anyị ga-eru n’isi ya.
“Olileanya dị na, site n’ụzọ udo anyị ga-ahụ ụbọchị ka mma. O nweghi onye chọrọ ịga agha; o nweghi onye ọ baara uru. Ndị ndu ekwuola na ọ bụrụ ụzọ udo niile daa mana echeghi m na ha niile ga-ada; anyị ga-eru n’isi ya, anyị ga-esi n’ajọ ọnọdụ a pụọ.”
Cheta na ndịagha Niger napụrụ ndị nkịtị ọchịchị bụ nke Onyeisiala Mohamed Bazoum nọ n’isi n’ụbọchị 26 Julaị, 2023.
Onyeisi ndịagha a bụ Abdourahamane Tchiani kwuru ka e nye ha afọ atọ iji hazie ma weghachị ọchịchị n’aka ndị nkịtị.
Ecowa jụwara isi ma sị na ha ga-eji ndịagha wakpoo mba Niger ma ọ bụrụ na ha eweghachịghị ọchịchị n’aka ndị nkịtị.
Otu African Union, mba Amerịka nakwa mba France kwadoro mkpebi ọbụla Ecowas mere maka ịhụ na ọchịchị laghachịrị azụ n’aka Onyeisiala Bazoum.
Obi ọma ka anyị anabata gị n'ọgbakọ BBC Igbo taa na-asị ka ụbọchị taa maara gị mma.
Bịa gụrụ akụkwọ banyere ihe niile na-akpọtụ n'ụwa, malite n'Ọwụwa Anyanwụ Naịjirịa, ruo mba Afrịka ndị ọzọ.
Ndewo!
Daalụ nụ maka isonye anyị taa.
Anyị ji n'aka na unu ga-abịaghachi echi maka akụkọ ndị kachasị mkpa na mba ụwa niile.
Ndị uweojii mba Briten kwuru na Tuzde na ha ebola onye bụbu minista agbidi na Naịjirịa ebubo mpụ ịna aka azụ ma sị na ha na-eche na ọ naara ego iji nye ọrụ ngo na mmanụ agbidi ego ya ruru nde kwuru nde paụnd.
Alison-Madueke bụ onye dị afọ 63 bụ onye gbapụtara ihe n’ọchịchị Goodluck Jonathan bụbu onyeisiala mgbe ọ rụrụ ọrụ dịka minista n’afọ 2010 ruo 2015.
Ọ rụkwara ọrụ dịka onyeisi otu ‘Organization of the Petroleum Exporting Countries (OPEC).
“Anyị na-eche na Diezani Alison-Madueke metọrọ ikike ya na Naịjirịa ma nara onyinye ego ọtụtụ nde paụnd iji nye ọrụ ngo”, ka Andy Kelly kwuru, onyeisi otu nyocha mba Briten a kpọrọ National Crime Agency (NCA) nke ngalaba na-ahụ maka mpụ.
“Ebubo ndị a so na mbọ nyocha tara ọchịchị anyị mere.”
NCA bokwara Alison-Madueke ebubo irite opekatampe ego ruru otu nde narị paụnds, ụgbọala ndị ji oke ọnụahịa, ime njem ụgbọelu nke mmadụ nwee, ya na ezinaụlọ ya ime njem nlereanya n’efu, nakwa ibi n’ọtụtụ ụlọ dị na London.
Ihe ndị ọzọ e boro ya gụnyere onyinye ego gụnyere oche, nrụgharị ụlọ obibi nakwa ndị ọrụ enyemaka n’ụlọ, ịkwụ ụgwọ akwụkwọ, onyinye si n’aka ụlọ ndị na-ere akwa pụrụiche dịka ‘cartier jewellery’ na Louis Vuitton.
Kamgbe nwada a hapụrụ ọchịchị, enweela ọtụtụ ebubo ime mpụ dị n’isi ya mana ọ gọnarịrị ha.
Ndị uweojii mba Briten kwuru na o bibu n’ebe a kpọrọ St. John’s Wood, ebe gbapụtara ihe na mpaghara West London, na ọ ga-awụchi n’ụlọikpe Westminster Magistrate n’ụbọchị Ọktoba 2.
Otu African Union amachiela mba Niger isonye n’emume niile ha na-eme maka iwere ọchịchị n’ike ndịagha mere na mba ahụ n’ọnwa gara aga.
Ngalaba otu a nke na-ahụ maka udo na nchekwa kpokuru ndị otu ha niile nakwa mbaụwa ka ha kwụsị mmekọ ọbụla ha na ndịagha Niger nwere.
Ha kpọkuru ndị a weere ochịchị n’ike ka ha tọhapụ Onyeisiala mba ahụ bụ Mohamed Bazoum bụ onye ha kpachiri.
Otu Ecowas nke mpaghara Ndịda Anyanwụ Afrịka eyiela egwu iji ndị agha ebuso ndịagha Niger agha iji weghachị Bazoum n’ọkwa.
Ndịagha weere ọchịchị n’ike kwuru na ha agaghị eweghachị ọchịchị n’aka ndị nkịtị ma ọ bụrụ na ruo afọ atọ mana Ecowas ajụla ịnabata atụmatụ a.
A kpụpụla otu nwaanyị aha ya bụ Maureen Khikani n'ụlọikpe maka ebubo izu igbe ozi abụọ nakwa aka akpatị ozu ruru iri abụọ na isii na mba Kenya.
Akụkọ kwuru na o zupuru ihe ndị a mgbe ọ na-arụ orụ n'ụlọ nlekọta ozu akpọrọ 'St. Augustine Funeral Services' n'ọnwa Mee afọ gara aga.
A na-eche na igbeozu ahụ pụtara 90,000ksh bụ ego ndị Kenya maọbụ $622. Khikani gọkwara ebubo ahụ niile na-ekwu na aka ya dị ọcha.
Mana ọkaiwu na-anọchite anya ya na-arịọ ụlọikpe ahụ ha jiri nwayọ tulee okwu nwaanyị ahụ n'ihi na ọ bụ naanị ya na-elekọta ụmụ ya.
Donald Trump, bụbu onyeisiala mba Amerịka ekwuola na ọ ga-enyefe onwe ya n'aka ụlọikpe nke steeti Georgia n'ụbọchị Tọzde, bụ ụbọchị 24 nke ọnwa Ọgọst 2023.
Otu onye ọkaikpe n'Atlanta bụ onye ji ikpe gbasara Trump etinyela ego mgbapụta ya ka ọ bụrụ $200,000.
Nkwekọrịta ahụ kwuru na Trump ga-enwere onwe ya dịka ikpe ahụ na-aga n'ihu ma ọ bụrụ na ọ nwaghị ịmaja maọbụ iyi ndị ga-agba akaebe n'ikpe ahụ egwu.
E boro Trump ebubo 13 ọhụrụ nke gbadoro ụkwụ na ọ nwara ịgbanwe mpụtara ntuliaka, mana Trump na-ekwu na aka ya dị ọcha.
N'ụbọchị Mọnde ka Trump dere n'akara soshal midia ya na 'Truth Social' na ya ga-aga Atlanta, Georgia n'ụbọchị Thursday ebe a ga-anọ jichie ya.
O kwuru na ebubo ndị a na-ebo ya bụ mmekpa ahụ nke onye nọ n'isi ya bụ ọkaiwu aha ya bụ Fani Willis.
Ọkaiwu Willis agwala ọkaikpe ka o tinye ụbọchị ikpe ahụ n'ụbọchị ise nke September, ebe Trump ga-anọ kwuo ma ọ dara iwu ka ọ bụ ọdaghị iwu.
A na-atụ anya na ikpe a ga-amalite kpọmkwem n'ọnwa Maachị 2020.
Igbo, ụnụ asaala chi.
Ka anyị malite mgbasaozi nke taa.
Otu nwoke aha ya bụ Shedrack Anuli Chukwumerem agwaala BBC Igbo etu nwanne ya nwoke si nwụ n'aka ndị ohi n'Imo steeti.
Nwanne ya nwoke bụ Wisdom Chukwumerem na-akwado ịfepụ obodo oyibo mgbe ọdachi a dagidere ya.
Shadrack kwuru na ọ bụ mgbe nwanne ya gara ịsepụta ego na nke ndị POS ka ndị ohi ahụ gburu ya n'ihi na cheere na ọ na-akpọ ndị uweojii n'ihi na ọ nọ n'ekwentị mgbe ọ na-aga ebe ahụ.
"Ọ rịọrọ ha elu na ala na ọ bụghị ndị uweojii ka ọ na-akpọ mana ha ekweteghi okwu ya were gbaa ya egbe ugboro atọ n'akụkụ obi ya"
Ọ sị na ọ bụ n'ụlọọgwụ Umuguma ebe ndị uweojii bu ya gaa ka a nọ were kwuo na nwanne ya anwụọla.
"Nwanne m nwoke si obodo oyibo loghachite afọ atọ gara aga. O nwere ụlọ n'ebe akpọrọ World Bank Area N ebe m so ya biri mgbe m bụ ọkwọụgbọala na bus Imo tupu m laghachi n'obodo anyị ịzụwa ahịa.
Nwanne m alụọla nwaanyị ma jirikwa ụmụaka abụọ bi n'obodo oyibo" ka o kwuru.
Shedrack kọwara na ọnwụ nwanne ya metụrụ ezinaụlọ ha n'ụzọ ọjọọ.
"Anyị nọ n'arịrị ugbua n'ihi ọnwụ nwanne m bụ Widom n'ihi ọ bụ ya na-elekọta anyị bụ ụmụnwanne ya ma na-elekọtakwa ezinaụlọ ya bi n'ofesi" ka o kwuru.
Aka na-achị Anambra steeti bụ Gọvanọ Chukwuma Soludo amapụtala enyemaka dị ịcheiche ndị steeti ya ga-erite iji belata ahụhụ si na mwepụ Fuel Subsidy nakwa ọtanisi so ya.
O kwuru nke a n'ụbọchị Monde n'Agulu ma kọwaa na ọ bụ ịso ntuziaka gọọmentị etiti nakwa gọọmentị ya banyere ahụhụ dị n'obodo.
Enyemaka ndị ahụ gụnyere:
Gọvanọ Soludo kọwara na bọọjeti steeti ahụ nke afọ 2023 zuru oke ịkpuchi enyemaka ndị a ọ mapụtara ma kwuo na bọjeti nke afọ 2024 ga-enwe ezi ohere ịchịkọta enyemaka ndị ọzọ ga-ahụ na ọnọdụ obibi ndị Anambra steeti dị mma.
Ndị ojiegbe agbagbuola otu nwoke na nwunye ya na mwakpo nke mere n'Owerri, isi obodo Imo Steeti n'ụbọchị Sọnde.
E mechara chọpụta na ndị ahụ e gburu bụ Mazi Sampson Owobo onye uweojii ji ọkwa ASP tupu ọ laa ezumike nka, na nwunye ya.
Mwakpo a mere n'ebe elekere asatọ nke abalị na mpaghara dị nso n'ogige ndị uweojii a kpọrọ 'Owerri Area Police Command' nakwa ụlọọrụ mgbanyụ ọkụ nke Imo Steeti.
Ndị hụrụ ihe merenụ kwuru na ndị ojiegbe ahụ bụ ndị ohi chọrọ ịnapụ di na nwunye ahụ akpa ha nke ha chere na ego juru n'ime ya, maka na di na nwunye ahụ bụ ndị na-azụ ahịa inye ndị mmadụ ego site n'ige POS.
Ndị ojiegbe ahụ gbara nwoke ahụ egbe n'isi ma gbaa nwunye ya egbe n'akụkụ. Nwoke ahụ nwụrụ ozugbo, mana ndị mmadụ bugara nwunye ya n'ụlọọgwụ 'Federal medica Centre' Owere, ebe ọ nọrọ nwụkwaa, onye ahụ kwuru.
Samson owobo bụ onye Edo Steeti, mana ya na nwunye ya bi n'Owere, Imo Steeti. ọ lara ezumike nka n'ọrụ uweojii afọ ise gara aga.
Ọnụ na-ekwuru ndị uweojii Imo Steeti bụ Henry Okoye gwara onye ntaakụkọ anyị na ndị uweojii amalitela nnyocha gbasara ihe a merenụ, dịka ha ezipụla ndị ọrụ ịchụ ndị ohi kpara arụ a.
Onyeisiala Bola Ahmed Tinubu agwala ndị Mịnịsta o duru n'iyi ọrụ n'ụtụtụ Mọnde ka ha cheta oge niile na ha bụ Mịnịsta gọọmentị etiti, ọ bụghị mịnịsta steeti na mpaghara ha si.
Tinubu kwuru nke a n'emume ebe a nọrọ duo ndị Mịnịsta 45 n'iyi ọrụ n'Abuja.
"Naịjirịa ugbua dịka ụgbọala, mụ onwe m bụ onye na-akwọ ụgbọala a, ụnụ bụ ndị na-enyere m aka, ụmụ Naịjirịa niile bụ ndị nọ n'ime ụgbọala. Ana m arịọ enyemaka ụnụ ka anyị jikọọ aka buru ụgbọala a buga Naịjirịa n'ọdịnihu kacha mma," Tinubu kwuru.
Ọ dọrọ ha aka na ntị ka ha ghara igosi ịkpa oke ọbụla dịka ha na-arụ ọrụ ha, kama ka ha gbasie mbọ ike maka ọdịmma Naịjirịa.
Onyeisiala kwuru na ya agaghị anabata ịda mba ọbụla n'aka ndị mịnịsta ọhụrụ a, "n'ihi na ihe ụmụ Naịjirịa na-atụ anya n'aka anyị buru ibu".
Emume idu n'iyi ọrụ a na-abịa dịka ndị Mịnịsta a gabigara nnyocha n'aka ndị omeiwu sineti izuụka atọ gara aga.
N'ụbọchị Sọnde, Ọgọst 20, ụlọọrụ Onyeisiala kwupụtara na Adegboyega Oyetola, onye e nyeburu Mịnịsta na-ahụ maka njem, ga-abụzi Mịnịsta na-ahụ maka akụ si n'osimiri (Marine and Blue Economy).
N'otu aka ahụ kwa, Abubakar Momoh onye e nyeburu Mịnịsta na-ahụ maka ọdịmma ndị ntorobịa ga-abụzi mịnịsta ga-ahụ maka mwulite mpaghara Niger Delta; ebe Bunmi Tunji-Ojo ga-abụzi Mịnịsta na-ahụ maka nchekwa ime, ma Sa'idu Alkali ga-abụ Mịnịsta na-ahụ maka njem okporoụzọ.
Gọọmentị mba Somalia ekwupụtala mmachị ọbaozi soshal midia Tiktok na Telegram, nakwa ọba ozi chacha a na-akpọ 1XBet.
Ha kwuru na "ndị ekperima na ndị na-eyi ndụ egwu na-eji ọbaozi ndị a agba ozi na-emebi ndị ntorobịa, foto na onyonyo ọjọọ nakwa ozi na-eduhie ọha obodo".
Nke a na-abịa dịka Somalia kwupụtara atụmatụ pụrụ iche iji kụpịa ndị ọgụ nnupuisi al-Shabab bụ ndị weere ọnọdụ na mpaghara dị icheiche na mba ahụ, n'ime ọnwa ise.
Mịnịstrị nzikọrịtaozi na teknụzụ nyere ụlọọrụ ịntanetị dị icheiche iwu ka ha hụ na ọbaozi ndị ahụ anaghịkwa arụ ọrụ na mba ha tupu ụbọchị 24 nke ọnwa Ọgọst, maọbụ ha anata ntaramahụhụ.
Ọgbakọ e nwere na Mogadishu, isi obodo Somalia n'ọdị nso a gbasara etu ịntanetị na soshal midia si emetụta ndụ ndị mmadụ, kwuru na ụfọdụ ọbaozi ndị a na-emetụta ndị ntorobịa mba ahụ n'ụzọ ọjọọ dị icheiche nke gụnyere "ibutere ụfọdụ n'ime ha ọnwụ".
Akwụkwọ ozi si n'aka otu na-agba mbọ maka ikike dịịrị mmadụ bụ 'Human Rights Watch' na-ebo ebubo na ndị ọrụ nchekwa Saudi Arabia gbagburu ọtụtụ ndị ntorobịa chọrọ isi mba Yemen banye na mba ha.
HRW kwuru na narị kwuru narị ndị ntorobịa, ọtụtụ n'ime ha si mba Ethiopia, bụ ndị chọrọ isi Yemen gafee na Saudi Arabia ka a gbagburu.
Saudi Arabia agọbuola agọ ma kwuo na ha egbughi onye ọbụla.
Mana ụfọdụ ndị Ethiopia chọrọ ịgafe Saudi Arabia gwara BBC na ọ bụ eziokwu na ndị ọrụ nchekwa gbara ha egbe, gbagbuo ọtụtụ n'ime ha ma merụkwaa ọtụtụ ndị ọzọ ahụ, dịka ha chọrọ ịmịbanye na mba ahụ n'ọnwa Julaị 2022 ịga chọọ ọrụ.
Mustafa Soufia Mohammed, dị afọ 21, kọọrọ BBC etu ndị ọrụ nchekwa si kwaa ha mgbọ, nakwa etu mgbọ si tụọ ya n'ụkwụ. Ugbua, nwa amadị a mụrụ abụọ alọghachila na Ethiopia.
"Ha gbagidere egbe akwụsịghị akwụsị. Amaghị m na mgbọ tụrụ m n'ụkwụ, mana ọ bụ oge m biliri ka m gaa ije ka m chọpụtara na ofu ụkwụ m adịghịkwa," Mohammed kwuru.
"Agawara m Saudi Arabia n'ihi na ana m achọ ohere iji kwalite ezinụlọ m, mana ihe m chere abụghị ihe merenụ. Ugbua, ọ bụzi nne na nna m na-emere m ihe niile."
Onye ọzọ, Zahra, onye bi na Yemen kwuru na o were ya ihe dịka $2,500 iji nwee ohere irute n'okeala Yeman na Saudi Arabia, tupu ndị ọrụ nchekwa ebido ịkwa ha mgbọ.
Mgbọ gbachapụrụ mkpịsịaka niile dị n'otu aka ya. Ugbua, ọ laghachila na Yemen.
Dịka ngụkọ otu mbaụwa bụ United Nations si gosi, ihe karịrị mmadụ 200,000 na-agba mbọ kwa afọ isi na mpaghara Afrịka dị icheiche banye Yemen n'ụzọ ịgafe mba Saudi Arabia.
Ọtụtụ n'ime ha na-anwụ na ya bụ njem n'aka ndị ọrụ nchekwa mba Saudi Arabia, nakwa oge ụfọdụ ndị ọgụ nnupuisi Houthi bụ ndị weere ọnọdụ na mpaghara Ugwu Yemen,
Ụnụ abọọla chi ụmụ Igbo.
Izuụka ọhụrụ a ga-ewetara anyị niile ihe ọma.
Ka anyị malite.
Ndị ndu otu jikọtara mba ndị dị na Ndịda Anyanwụ bụ Economic Community of West African States (ECOWAS) ajụla ịnabata afọ atọ ndịagha Niger weere ọchịchị n’ike sị ka e nye ha tupu ha weghachị ọchịchị.
Nke a na-abịa dịka onyeisi ndịagha weere ọchịchị n’ike bụ ọchịagha Abdourahamane Tchiani kwuru na ndị Ecowas ga-enye ha afọ atọ iji hazie obodo ha ma weghachịọchịchị n’aka ndị nkịtị.
O kwuru nke na mgbasaozi TV o mere ngwa ngwa ya na ndị ozi Ecowas nwechara ọgbakọ n'ụbọchị Satọde.
Kọmishọna otu a n’ihe banyere ndọrọ ndọrọ ọchịchị bụ Abdet-Fatau Musah gwara BBC na “Ecowas agaghị anabata mgbatị oge atụmatụ inyefe ọchịchị n’afọ atọ. Ha ga-adịrịrị njikere inyefe ọchịchịn’oge na-adịghị anya.”
Ọ gara n’ihu kwuo na “iji ndịagha ebuso ha agha ka dị ezigbote ire.”
Ọ gbakwụnyere na “Ọ ga-akara ha mma inyefe ndị nkịtịọchịchị ma lekwasị anya n’ọrụ ha bụ ichekwa gburu gburu nakwa ugwu mba ha.”
Mba Amerịka na France nwere ogige ndịagha na Niger kwadoro otu Ecowas na mbọ ha na-agba iweghachị ọchịchị n’aka ndị nkiti na mba Niger. Ogige ha ndị a bụ maka ibuagha megide ndị oyi ndụ egwu.
Cheta na ndịagha na-echekwa onyeisiala mba Niger bụ Mohamed Bazoum na-apụrụ ya ọchịchị ma nwuchie ya n’ụbọchị 26 nke ọnwa Julaị, 2023.