Ndịagha weghara ochịchị na Niger amaala ọkwa maka atụmatụ ha ịkpụpụ Onyeisiala Mohamed Bazoum ụlọikpe maka ebubo imegide ọchịchị mba ahụ na igba mgba okpuru megide nchekwa mba ha.
Nke a bụ ihe akaebe ọhụrụ ndịagha na-eme nke na-egosi na ha achọghị ile ọkụ mba ndị ofesi na-akwanye ha n’ike ka ha nyeghachi Maazị Bazoum ọkwa ọchịchị.
Kemgbe izuụka atọ ndịagha a weghaara ọchịchị na Niger, ha jichiri ya ma tụnye ya n’okpuru ụlọ obi ọchịchị ya.
Dọkịnta ya kwuru na Bazoum nọ n’ọnọdụ “obi ụtọ” agbanyeghi na e ji ya eji n’ọnọdụ na-adịghị mfe ịnọ”.
Ha ekwupụtaghị ihe ndị ọzọ so okwu a.
E ji Maazị Bazoum dị afọ 63, nwunye ya na nwa ya nwoke e ji kemgbe dị e nwere ọtụtụ ndị chere oke echiche banyere ahụike ya.
N’ụbọchị 26 nke ọnwa Jụlaị, ỌchịaghaAbdourahmane Tchianibụbu onyeisi ndịagha na-echekwa onyeisiala wepụtara onwe ya dịka onyeisi ọhụrụ mba Niger oge ya na ụfọdụ ndịagha ndị ọzọ weghaara ọchịchị ebe ahụ.
Otu jịkọrọ mba Ọdịda anyanwu Afrịka bụ Ecowas ekwubuola na ha ga-eziga ndịagha ha mba Niger ka ha manye ndịagha a weghara ọchịchị mweghachi ọchịchị ahụ mana ha emezubeghi atụmatụ nziga ndịagha a ugbua.
Ndịagha a weghara ọchịchị ekwukwaala na ha ga-ebuso ndịagha ọbụla e zutere ebe ahụ agha.
Ecowas na onwe ha enyekwala mba Niger ọtụtụ mmachi nakwa ntaramahụhụ ndị ọzọ nke gụnyere ịkwụsị inye ha ọkụ latrịk nke mere na ọkụ adịghịzi n’isi obodo ha bụ Niamey nakwa n’akụkụ obodo ndị ọzọ dị mkpa.
N’ụbọchị Satọdee ọtụtụ ndị isi ụka okpukperechi Alakụba nwere agba bụ ndị si mba Naịjirịa mere njem gaa Niger maka atụmatụ ikpe udo na ma kụsị mweghara ọchịchị a.
Praịm minista ọhụrụ ọchịchị ndị a wepụtara bụ Ali Mahamane Lamine Zeinkwuru na ọ na-atụ anya na mkparịtaụka ha na Ecowas ga-abụ ihe e mere n’anbalị olemaole na-abịa abịa “iji kpaa maka etu a ga-esi bulie mmachi ndị e nyere ha”.
Mweghara ọchịchị a mere na Niger bịara sochie ndị ọzọ merela na nso nso a na mba Burkina Faso na Mali dịka Arịka na-alụ ọgụ megide ndịagha nnupụsị ụka Alakụba na-akpa ike ebe ahụ nakwa dịka ikike ọchịchị mba Russia na-efesa n’akụkụ mpaghara Sahel nke Afrịka site n’otu nchekwa ha bụ Wagner.
N'agbanyeghị etu e siri jibido ya, Maazị Bazoum nwereike bipụta ozi site n’aka ụlọntaakụkọ Washington Post ebe o kwuru na ọ bụ onye e ji eji ma kwukwaa na mweghara ọchịchị a na-eme a “ga-emetụta mba anyị, mpaghara anyị na ụwa dum n’ụzọ jọgburu onwe ya”.
E kwuru na Bazoum dị afọ 63 a bụrụla onye tara oke ahụ ugbua n’ụzọ ‘dị oke egwu’ dịka e kwebeghi nwa ya nwoke dị afọ 20 nke nwere ezigbo ọrịa ọjọọ ka ọ hụ dọkịnta ọbụla.
Onyeisi ọrụ ikike dịrị onye n’ụlọọrụ UN bụ Volker Turk kwuru na na ọnọdụ e tinyere abụghị ọnọdụ e kwesịrị itinye mmadụ n’ime ya ma kwuo na ọ bụ ọnọdụ na-akwanyeghịrị ya ugwu dịka o kwuru na nke a megidere iwu ikike dịrị onye nke mbụ ụwa.
Zazia bụ nwa ya nwaanyị dị afọ 34 onye nọ njem ezumike na mba France mgbe ndịagha weghara ọchịchị Niger gwara ụlọ ntaakụkọ Guardian n’izuụka a na nna ya, nne ya na nwanne ya nwoke enweghi mmiri ọṅụṅụ dị ọcha ịnụ, ha enweghi ọkụ latrịk dịka a na-enye naanị osikapa na nrị ‘pasta’ ka ha rie kemgbe ahụ.
Kemgbe ndịagha weghara ọchịchị, a hụla ihu Maazị Bazoum naanị otu mgbe, nke a bụ oge foto e sere ya na onyeisiala Chad bụMahamat Idriss Déby Itno onye bịara zute ya gbara n’ọha.
Maazị Déby gara zute Bazoum na ndịagha a weghaara ọchịchị iji hụ na a ga-enweike kpee udo n’okwu mweghara ọchịchị a mana atụmatụ ya ime nke a kpụrụ afọ n’ala.