You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.

Take me to the main website

A tụọla onyeisi otu 'Proud Boys' nga afọ 17 maka ịkpalite ọgbaghara na Capitol

Akụkọ kachasị dị mkpa n' Afrịka nakwa mba ụwa niile.

Mkpuchi Na Eme Ozugbo

Ikechukwu Kalu, Uche Akolisa and Adline Okere

  1. “Anyị ka na-enyocha ọnwụ Ezinne nwata akwụkwọ ESUT nwụrụ n’ime ụlọ ya - Uweojii

    Ndị uweojii Enugwu steeti ekwuola na ha na-eme nyocha maka ọnwụ nwata nwaanyị ụlọakwụkwọ Enugu State University of Science and Tehnology (ESUT).

    A hụrụ ozu nwata nwaanyị a aha ya bụ Ezinne Mbah ka ọ tọgbọọ n’ime ụlọ ya nakwa enyi ya nwoke bụ onye ka na-ekutu ume ugbua.

    Ọnụ na-ekwuru ndị uweojii bụ Daniel Ndukwe gwara BBC na a hụrụ ozu nwaọgbọghọ ahụ nakwa nke enyi ya nwoke n’ime ụlọ.

    O kwuru ka ọ dị ugbua na nke nwoke ahụ ka na-ekutu ume mana nọrọ n’ọnọdụ amaghị onwe ya a kpọrọ ‘unconscious’.Ọ gaara n’ihu kwuo na nyocha na-aga n’ihu ịchọpụta ihe butere ọdachi ahụ.

    Etu o si mee?

    Akụkọ kwuru na ọ bụ n’ụbọchị ụka ka ndị enyi Ezinne lere anya n’ụlọụka mana ha ahụghị ya, ha kpọrọ ekwentị ya mana ọ naghị akụ.

    Nke a mere ụmụnne ya na ndị enyi ya jiri chọrọ ya gawa n’ụlọ ebe o bi n’ụlọakwụkwọ n’ụbọchị Mọnde ị chọpụta ihe mere na ha ahụghị kamgbe.

    Mgbe ha ruuru, ha nyoro anya n’ime mpio ụlọ ma hụụ ka Ezinne na enyi ya nwoke bụ nwata akwụkwọ ibe ya tọgbọ n’ala.

    Nwanne ya nwoke chọburu ịgbaka ụzọ mana a gwara ya ka o buru ụzọ kpọọ ndị uweojii tupu ọ na-eme nke a.

    Mgbe ndị uweojii bịara mepee ụzọ ahụ, e buuru ha gawa n’ụlọọgwụ.

    Mgbe e ruuru ulọọgwụ ka a chọpụtara na Ezinne anwụọla ebe enyi ya nwoke ka na-ekutu ume ma nọrọ n’ọnụ ọnwụ.

    Ezinne bụ nwata akwụkwọ ESUT na ngalaba ọmụmụ ihe Anatomy ma nọrọ n’afọ agụmaakwụkwọ nke ikpeazụ ya.

  2. Etu ejije 'prank' soshal midia si tinye ndị ntorobịa atọ na nsogbu n'Enugwu

    Ndị uweojii Enugwu Steeti ejichiela ndị ntorobịa atọ maka ime ejije soshal midia gosiri ebe a na-eti otu nwa agbọghọ ihe, yipu ya uwe ya ma kpụchaa ya isi.

    Aha ndị ntorobịa a bụ Obed Chekwube Ugwuanyi, onye e ji MC Sharp mara; Chinenye Agbo onye e ji Star Ella Ada mara; na Anastasia Onu.

    Daniel Ndukwe bụ ọnụ na-ekwuru ndị uweojii Enugwu kwuru na ha jidere mmadụ atọ a n'ụbọchị 14 nke ọnwa Ọgọst maka ihe onyonyo ahụ ha mere, mana ha kwuru na ọ bụ onyonyo eji akpa eguregwu nke bekee na-akpọ 'prank'.

    "Ha sị na ha mere onyonyo ahụ iji nweta ọtụtụ ndị mmadụ ka ha na-eso akara soshal midia ha," Ndukwe kwuru.

    Mana o kwuru na onyeisi ndị uweojii bụ Ahmed Ammani katọrọ ya bụ ihe ma nye iwu ka ndị uweojii nyochaa ya nke ọma ma kpụpụ ndị ntorobịa atọ ahụ ụlọikpe ma a chọpụta na ha dara iwu, iji dọọ ndị mmadụ aka na ntị ka ha wepụ aka n'ụdị ihe a nke nwereike ibute ọgbaaghara n'obodo.

  3. Ndị a na-achọ achọ n'ihe mberede ọkụ ọgbụgba na Hawaii ruru 1,300

    O meela ihe dịka otu izuụka kamgbe ihe mberede ọkụ ọgbụgba dakwasara mpaghara Hawaii nke mba Amerịka, mana ruo ugbua, ọnụọgụgụ ndị nwụrụ n'ọkụ ahụ edochabeghị anya.

    Ọnụọgụgụ ndị a ma nwụrụla n'ọkụ ahụ ugbua dị 101, n'ime ha, naanị mmadụ atọ ka a matarala ndị ha bụ.

    Mana ihe ruru mmadụ 1,300 ka a ka na-achọ achọ, dịka ndị ezinụlọ ha chị obi n'aka ịmata ọnọdụ ha, ebe ndị ọrụ gbatagbata ji nkịta ndị e nyere ọzụzụ pụrụ iche na-achọ ma ha a ga-ahụ ozu ndị ka nọ n'ime ọkụ.

    Gọvanọ Hawaii bụ Josh Green gwara ndị ntaakụkọ n'ụbọchị Mọnde na ọ ga-eru ụbọchị iri tupu ha enweeike ịmata kpọmkwem mmadụ ole nwụrụ n'ihe mberede a.

    Ka ọ dị ugbua ikuku dị na mpaghara ahụ ugbua adịchaghị mma mmadụ ikuru ya, nke mere ọrụ ndị gbatagbata ji nwayọ nwayọ aga.

    Ịchọta ozu ndị nwụrụ n'ọkụ ọgbụgba a bụ ihe siri nnukwu ike, mana ndị ọkachamara na-ekwu na ọ bụrụgodi na a chọta ozu ndị nwụrụ anwụ, ịchọpụta ndị ha bụ kpọmkwem ga-akacha sie ike.

    "Ọkụ agbariela ọtụtụ ihe n'ahụ ndị a nke ga-eme ka nnyocha DNA raa nnukwu ahụ. Ọ bụrụgodi na i nweta akụrụngwa nke i nwereike iji mee nnyocha DNA, ọ ga-adịkwa mkpa inweta ndị a ga-eji tụnyere DNA ahụ. Mana ọ bụladị nke a, ọ bụrụ na ụmụnne abụọ nwụrụ n'ọkụ ahụ, i nwereike ime nnyocha ma chọpụta na mmadụ abụọ ahụ bụ ụmụnne, mana ị gaghị enweike ịkọta onye bụ onye n'ime ha abụọ," Chris Milroy, bụ ọkammụta na ngalaba pathology na mahadum Ottawa gwara BBC.

  4. Lee ebubo ọhụrụ a ga-eji kpụpụ Donald Trump ụlọikpe na steeti Georgia

    Aka chịburu mba Amerịka bụ Donald Trump nwere ebubo 13 ọhụrụ chere ya n'ihu na steeti Georgia, dịka ndị ọkaiwu kwuru na ọ kpara nkata ịkagbu mpụtara ntuliaka onyeisiala nke afọ 2020.

    N'akwụkwọ ebubo ahụ nke pụtara ihe n'ụbọchị Mọnde bụ ụbọchị iri na anọ nke ọnwa Ọgọst, a boro Trump na mmadụ 18 ndị ọzọ ebubo dị icheiche nke gụnyere isonye n'otu ndị omekome, ibo ebubo ụgha na e nwere nrụrụaka na ntuliaka, na ndị ọzọ.

    Otu n'ime ndị aha ha dị n'ebubo ọhụrụ a bụ Rudy Giuliani onye bụbu ọkaiwu Trump n'oge gara aga.

    Mana Trump kwuru na ebubo niile ndị a bụ ụgha ma bụrụkwa atụmatụ ibuso ya agha iji gbochie ndọrọndọrọ ọchịchị ọ na-azọ.

    Nke a bụ ebubo nke anọ a na-ebo Donald Trump n'ime ọnwa anọ. Trump bụkwa onyeisiala Amerịka mbụ a na-akpụpụ ụlọikpe dịka ọ rituchara n'ọchịchị.

    Ọkaiwu Fani Willis bụ onye malitere nnyocha maka ebubo ndị a kwuru na Trump na mmadụ 18 ndị e boro ebubo ndị a nwere ruo ụbọchị 25 nke ọnwa Ọgọst iji nyefee onwe ha n'aka ndị ọrụ nchekwa.

    Lee ụfọdụ ebubo ọhụrụ a na-ebo Donald Trump:

    • Ịkpa nkata iji ụzọ aghụghọ gbanwee mpụtara ntuliaka
    • Ịkpọ odeakwụkwọ steeti Georgia bụ Brad Raffensperger n'ekwentị ma gwa ya ka ọ gbanwee mpụtara ntuliaka n'ụzọ iwu akwadoghị.
    • Ịkpa nkata ịkpọta ndị ọrụ ntuliaka adịgboroja iji were ha gbanwee mpụtara ntuliaka na Georgia.
    • Ịkụ akwụkwọ ozi adịgboroja iji kwanye ndị omeiwu steeti Georgia ka ha jụ ịnabata ụfọdụ vootu a tụrụ na ntuliaka

    Na ndị ọzọ.

  5. Otu onye anwụọla ebe ndị ọzọ na-efu efu n’ọdọ ngwupụta mmanụ agbidi na Delta Steeti

    Otu onye anwụọla ebe a na-achọ mmadụ atọ achọ mgbe ọdọ ebe a na-egwupụta mmanụ nke ụlọọrụ Seplat dara na Delta Steeti.

    Nke a dị n’akwụkwọ ozi ụlọọrụ mmanụ agbidi a wepụtara nke kwuru na ọdachi a mere n’ụbọchị Tuzde 15 Ọgọọst, 2023.

    Ihe onyonyo gosiri mgbe ọdọ ngwupụta mmanụ ahụ na-emikpu n’osimmiri malitere ifesa na soshal midia.

    Ụlọọrụ a kwuru na ọ bụ naanị otu onye nwụrụ n’ime mmadụ karịrị iri itoolu nọ n’ọdọ ngwupụta mmanụ ahụ.

    “Ụlọọrụ Seplat Energy agbarụọla ihu maka ọdachi mere n’ọdọ ebe a na-egwupụta mmanụ nke Depthwise swamp rig Majestic’ n’ụtụtụ a” dịka Roger Brown bụ onyeisi ọrụ ha kwuru.

    O kwuru na nke a mere n’akụkụ obodo Ovhor nke Delta Steeti.

    Ụlọọrụ a kwuru na ahụla mmadụ iri itoolu na abụọ n’ime mmadụ iri itoolu na isii nọ n’ọdọ ahụ dịka otu onye nwụrụ, mmadụ atọ na-efu efu.

  6. Igbo mma mma nụ ooo!

    Obiọma ka anyị ji anabata unu n'ụbọchị taa.

    Buru oche bịa nọnyere anyị maka akụkọ ndị gbapụtara ihe.

  7. Ka chi fo

    Igbo ndị ọma, anyị abịala na njedebe mgbasaozi nke taa.

    Sonyere anyị ọzọ n'elekere asatọ nke ụtụtụ Wenezde.

    Ya gazie.

  8. Ọnụahịa mmanụ ụgbọala agaghị agbali elu ọzọ - Ụlọọrụ Onyeisiala

    Ụlọọrụ Onyeisiala Naịjirịa ekwela ụmụ Naịjirịa nkwa na agaghị enwe mgbali elu ọzọ n'ọnụ ahịa mmanụ ụgbọala n'ebe ọbụla na Naịjirịa.

    Ọnụ na-ekwuru onyeisiala Bola Tinubu bụ Ajuri Ngelale kwupụtara nke a n'akwụkwọ ozi o wepụtara na mgbede ụbọchị Tuzde, dịka o kwukwara na nke a apụtaghị na gọọmentị na-alaghachi azụ na mkpebi ya iwepụ aka n'ijikwa ọnụahịa mmanụ ụgbọala.

    Ngelale kọwara na gọọmentị ga-eleba anya n'ọdachị ụfọdụ dị na ngalaba mmanụ agbịdị Naịjirịa iji mee ka ọnụahịa mmanụ ụgbọala dịrị etu ọ dị ugbua, na-agbanweghị atụmatụ ha tinyeburu na ngalaba mmanụ agbịdị na Naịjirịa.

    Nke a na-abịa dịka ụlọọrụ mmanụ agịdị nke Naịjirịa bụ NNPC n'ịchafụ kwuru n'ụtụtụ ụbọchị Tuzde na ha anaghị eche echiche ibuli ọnụahịa mmanụ ụgbọala.

    Akụkọ kwuburu na ọnụahịa mmanụ ụgbọala ga-arị elu n'ime izuụka na-abịa abịa n'ihi etu ọnụahịa dọla na-arị elu n'ike n'ike.

    Mana otu jikọrọ ndị ọrụ na Naịjirịa bụ 'Nigeria Labour Congress' (NLC) dọrọ aka na ntị na ha ga-amalite abụbụọrụ ma ọ bụrụ na ọnụahịa mmanụ ụgbọala rịa elu ọzọ karịa etu ọ dị ugbua.

    Ọnụahịa mmanụ ụgbọala rịrị elu n'otu ntabị anya n'ụbọchị 29 nke ọnwa May 2023 dịka onyeisiala Bola Tinubu kwuru na gọọmentị ga-akwụsị ịkwụ ụgwọ ha na-akwụbu iji mee ka ọnụahịa mmanụ ụgbọala ghara ịrị elu bụ nke a na-akpọ 'fuel subsidy' na bekee.

    Kamgbe ahụ, ọnụ ahịa njem ụgbọala arịala elu, n'otu aka ahụ kwa, ọnụ ahịa ihe oriri na ihe dị icheiche e ji ebi ndụ arịkwaala elu n'ahịa.

  9. Gọvanọ Alex Otti amachiela 'ọkada' n'Aba, Umuahia malite Ọgọst 14

    Gọọmentị Abia Steeti amachiela ndị na-eji ọgbatumum eme njem, nke e ji ọkada mara na mpaghara ndị mepere emepe na steeti ahụ ọ kachasị Aba na Umuahia.

    Mmachi a malitere n'ụbọchị 14 nke ọnwa Ọgọst, dịka gọvanọ Alex Otti nyere ndị ọrụ nchekwa iwu ijide onye ọbụla dara iwu ahụ, jichie ọgbatumtum ya ma kpụpụkwa onye ahụ ụlọikpe.

    Mana ọtụtụ ndị bi n'Aba akatọọla iwu a gọvanọ otii tinyere dịka ha kwuru na mpaghara dị icheiche n'Aba nwere okporoụzọ ọjọọ nke pụtara na ọ bụ naanị ọgbatumtum nwereike ịga n'ebe ndị ahụ.

    Otu onye bi n'Aba aha ya bụ Clinton Nwachukwu kwuru na ya aghọtaghị ihe 'Aba Metropolis' pụtara dịka iwu gọọmentị kwuru na ọkada agahịkwa na-agba n'Aba metropolis.

    Nwachukwu kwuru na e nweburu iwu mmachi ọkada n'Aba maliterị n'oge Theodore Orji bụ gọvanọ.

    "Gịnị mere gọọmentị ji amachi ihe ha machiburu na mbụ? Nke a nwereike ịbụ ohere ndị uweojii ga-eji na-emekpa ndị mmadụ ahụ, ọ kacha ndị bi na mpaghara Faulks Road, Omuma Road, Cemetery Road, Port Harcourt Road, Obohia Road, Ohanku Road, n'ime Ogbor-Hill, Uratta, Old Express, Abayi-Ariaria, Umuode na ebe ndị ọzọ, maka na mpaghara ndị a bụ naanị ọkada ka ndị mmadụ na-enweike iji gaa ebe ahụ, n'ihi etu okporoụzọ ha si jọọ njọ," Nwachukwu kwuru.

    "Ọ dị mkpa ka gọọmentị kpọpụta aha okporoụzọ dị icheiche ebe ndị ọkada ekwesịghị ị na-agba, iji gbochie ndị uweojii iji ohere a na-emekpa ndị mmadụ ahụ, maka na nke a nwereike ibute ọgbaaghara n'etiti ndị uweojii na ndị ọkada."

    Nwachukwu ji gọọmentị Legọs steeti nye ọmụmaatụ, dịka o kwuru na oge gọọmentị Legọs machiri ọkada, ha depụtara aha okporoụzọ dị icheiche ebe ọkada ekwesịghị ịgba.

    Mana na nkọwa ya, ọnụ na-ekwuru gọvanọ Alex Otti bụ Ferdinand Ekeoma, kwuru na "mmachi ọkada a metụtara mpaghara niile mepere emepe n'Aba na Umuahia, ọ bụ ihe 'metropolis' pụtara," ka Ekeoma gwara onye ntaakụkọ BBC.

    "Ọzọkwa bụ na mmachi a bụ maka ndị ji ọgbatumtum eme njem na-akpata ego, ọ bụghị ndị nwere ọgbatumtum nke onwe ha na-abụghị nke e ji akpata ego."

    "Gọọmentị ga-aga n'ihu, n'oge adịghị anya, depụta okporoụzọ ebe a machiri ọgbatumtum ịgba. Gọvanọ Otti etinyekwala atụmatụ iji gbochie ndị ọrụ nchekwa iji ohere mmachi ọgbatumtum a mekpaa ndị mmadụ ahụ n'ụzọ ọbụla."

  10. Mgbali ọnụahịa ihe na Naịjirịa eruola pasentị 24.8 - NBS

    Ngalaba ngụkọ na Naịjirịa a kpọrọ 'National Bureau of Statistics' ewepụtala mpụtara ngụkọ maka etu ọnụahịa ihe dị icheiche si dị na Naịjirịa maka ọnwa Julaị 2023, nke gosiri na ọnụahịa ihe gbaliri elu ruo pasentị 24.8.

    Nke a ji pasentị 1.29 karịa etu ọ dị n'ọnwa June bụ pasentị 22.79.

    Ihe nke a pụtara bụ na ọnụahịa ihe oriri, njem ụgbọala, na ihe ndị ọzọ na-arị elu n'ike n'ike na Naịjirịa.

    Mpụtara nnyocha a nke e wepụtara n'ụbọchị Tuzde, na-abịa ọnụahịa naịra na-agbada n'ike n'ike dịka otu dọla nọzị n'ọnụ ihe karịrị narị naịra itoolu.

    N'ụbọchị Mọnde, onyeisi ụlọakụ etiti nke Naịjirịa bụ Folashodun Shonubi kwuru na ha ga-etinye atụmatụ dị icheiche iji kwalite ọnụahịa Naịra ma nyekwa ndị niile so eme ka Naịra na-ada ntaramahụhụ kwesịrị ekwesị.

    Ndị ọkachamara kwuru na a na-atụ anya na ọnụahịa ihe ka ga-arị elu karịa dịka ụkọ dọla, nwakwa nkwụsị gọọmentị kwụsịrị ịkwụ ụgwọ 'fuel subsidy' mere ka ọnụahịa mmanụ ụgbọala rịa oke elu.

    Cheta na onyeisiala Bola Ahmed Tinubu kwuru na gọọmentị ga-akwụsị ịkwụ ụgwọ 'fuel subsidy', bụ ụgwọ gọọmentị na-akwụbu iji butuo ọnụahịa mmanụ aụgbọala na Naịjirịa.

    Kamgbe Tinubu kwuru nke a n'ụbọchị 29 nke ọnwa Mee 2023, dịka e duru ya n'iyi ọrụ, ọnụahịa mmanụ ụgbọala bụbu naịra 180, bụzi naịra 570 ruo 700 ugbua maka otu lita na mpaghara Naịjirịa dị icheiche.

  11. Etu ndị uweojii si nwụchie onye zuru ohi nwa otu ọnwa n'Aba

    Ndị uweojii Abia Steeti akọọla etu ha si nwuchie otu nwaagbọghọ maka ebubo izu nwa dọ otu ọnwa.

    Chioma Chinaka bụ ọnụ na-ekwuru ndị uweojii Abia Steeti na a nwuchiri nwaanyị ahụ aha ya bụ Adaeze Lawrence dịka o ku nwtakịrị ahụ dị naanị otu ọnwa na ụbọchị abụọ, na mpaghara Amaogbonna dị n'Aba, Abia Steeti n'ụbọchị Mọnde bụ ụbọchị 14 nke ọnwa Ọgọst 2023.

    Adaeze sara asịsa na ọ bụ ozuzu ka ya zuuru nwa ahụ nke nne ya bụ Owujie Onyinyechi Gift, ndị bi na Creek Road na nso ụlọọrụ Naịjirịa 'brewery' n'Aba.

    "Nnyocha gosiri na Adaeze bụ enyi nwanne nne nwata ahụ o zuuru, ma jiri ụzọ aghụghọ zuru nwata ahụ dịka ọ gwara ndị mụrụ ya na ya chọrọ ihazi obere emume iji ṅụrịa maka ọmụmụ ya," Choma Chinaka dere n'akwụkwọ ozi o zigara ndị ntaakụkọ n'ụbọchị Tuzde.

    Nne nwata ahụ gwara ndị uweojii na ọ bụ n'ụbọchị isii nke Ọgọst ka ha bidoro ịchọ nwa ha dịka Adaeze kuuru ya pụọ.

    Ndị uweojii kwuru na nnyocha ka na-aga n'ihu maka ihe a merenụ, dịka a ga-akpụpụ nwa agbọghọ ahụ ụlọikpe ma ha mechaa nnyocha ha.

  12. Anyị enweghi atụmatụ ibuli ọnụego mmanụ ụgbọala - NNPC

    Ụlọọrụ na-ahụ maka mmanụ agbidi na Naịjirịa bụ Nigerian National Petroleum Corporation (NNPC) ekwuola na ha enweghi atụmatụ ọbụla ibuli ọnụego mmanụ ụgbọala.

    Nke a na-abịa dịka otu jikọtara ndị na-ere mmanụ ụgbọala bụ Independent Petroleum Marketers Association of Nigeria, IPMAN kwuru na ọnụego mmanụ ụgbọala ga-arị elu n'izuụka ole ma ole na-abịa abịa.

    Otu jikọtara ndị ọrụ na Naịjirịa bụ NLC adịla mbụ yie egwu na ha ga-agba abụbụọrụ ebighi ebi ma ọ bụrụ nke a mee.

    Cheta na ọnụego mmanụ ụgbọala si na N185 ruo N617 kamgbe Onyeisiala Bola Tinubu weere ọchịchị n'ụbọchị 29 Mee, 2023.

  13. Anyị ga-agba abụbụọrụ ebighi ebi ma mmanụ ụgbọala rịa elu ọzọ - NLC

    Otu jikọtara ndị ọrụ na Naịjirịa bụ Nigeria Labour Congress (NLC) adọọla gọọmentị aka na ntị na ha ga-agba abụbụọrụ ebighi ebi ma ọ bụrụ e bulie ọnụego mmanụ ụgbọala ọzọ.

    Nke a na-abịa dịka ndị na-ere mmanụ ụgbọala kwuru na ọnụego mmanụ a nwereike ịrị elu nke ugboro atọ kamgbe ọnwa Mee 2023 Onyeisiala Tinubu banyere ọchịchị.

    Ọnụego mmanụ ụgbọala si na N185 gbagoo ruo N500, ma mechaa ruo N617 n’ọnwa gara aga.

    Ugbua ndị na-ere mmanụ ụgbọala kwuru na o nwereike iru N720 n’izuụka ndị na-abịa abịa maka ụkọ ego dọla nakwa ihe ọ na-ada ma a tụnyere na naịra.

    NLC dọrọ aka na ntị a na Mọnde site n’ọnụ onyeisi ha bụ Joe Ajaero n’oge ha na-eme ọgbakọ ndịisi otu ‘African Alliance of Trade Union’ n’Abuja.

    Ajaero kwuru na abụbụọrụ nke ugbua na ha agaghị eme ka gọọmentị maara maka ya, na ọ ga-abụ n’otu ntabi anya.

  14. A nwụchiela ụmụafọ Naịjirịa abụọ kpọga ha mba Amerịka n’ihi mpụ ha mere

    A nwụchiela ụmụafọ Naịjirịa abụọ ma kpọga ga mba Amerịka maka mpụ ịnapụ ndị ntoroọbịa ihe site n’ụzọ aramara.

    Ọkaiwu mba Amerịka nke ngalaba Western District nke Michigan kwupụtara nke a n’ụbọchị Mọnde na sị na a kpọtala ụmụnwoke Naịjirịa abụọ ndị a na mba Amerịka.

    Ụmụnne abụọ ndị a bụ Samuel Ogoshi dị afọ 22 na Samson Ogoshi nke dị afọ 20 si na mpaghara Lagos nke Naịjirịa.

    A ga-ekpe ha ikpe maka ebubo e boro ha n’ọnwa Mee 2023 maka iji ụzọ aramara a kpọrọ ‘sexual extortion’ aghọnarị ndị ntoroọbịa na ụmụaka ndị nwoke na mpaghara Western Michigan.

    E boro Samuel ebubo ibute ihe mere otu nwata dị afọ iri na asaa a kpọrọ Jordan DeMay jiri gbuo onwe ya.

    A hụrụ ozu ya mgbe a chọpụtara na ọ nwụrụ site na mgbọ egbe juru n’ahụ ya n’ọnwa Maachị 2022.

    Ndị nchekwa Naịjirịa nyere aka nwụchie ụmụnne abụọ n’ọnwa Jenụwarị mgbe mba Amerịka mere mkpesa banyere mpụ ha mere.

    Ọ bụ ndị ọkaiwu gọọmentị Naịjirịa nyere aka ịhụ na a kpọgaara ha na mba Amerịka maka ịzara ọnụ ha.

    N’ọnwa Julaị, ọkaiwu B.F.M Nyako nyere iwu ka a kpọga ga mba Amerịka ka zara ọnụ n’ebubo e boro ha.

    N’ọnwa Ọgọọst ka e tinyere aka n’akwụkwọ nke ikpeazụ nyere mba Amerịka ikike ịkpọrọ ụmụnne abụọ ndị a.

    Akụkọ kwuru na ndị ụmụnne abụọ ji mpụ ‘sextortion’ a na-eyija ma na anara ego ruru mmadụ otu narị.

  15. Unu abọọla chi?

    Daalụ maka inọnyere anyị n'ọgbakọ BBC Igbo.

    Biko buru oche gị bịa nke taa maka akụkọ ndị gbapụtara ihe.

  16. Kachifo nu!

    Echi ga-abụ echi ọma.

    Daalụ maka isonye anyị taa.

    Gbagoo elu ka ị gụọ akụkọ ndị dị mkpa anyị depụtara n'ụbọchị Mọnde a.

  17. Etu ndị uweojii si nwụchie ụmụnwoke abụọ maka okwu imetọ nwa nwaanyị dị afọ 11 n'Imo

    Ndị uweojii Naịjirịa n’Imo steeti anwụchila ụmụnwoke abụọ a na-enyo enyo maka okwu imetọ nwanwaanyị dị afọ 11.

    Ọnụ na-ekwuru ndị uweojii steeti abụ bụ Henry Okoye gbara ama dịka o kwuru na ndị a na-enyo enyo na-emetọ nwata ahụ na be nna ya oge ọbụla nna ya hapụrụ ụlọ gawa ọrụ.

    Ndị uweojii kwuru na nnyocha ahụike e mere n’ahụ nwata ahụ gosiri na ọ merụrụ ahụ n’akụkụ ahụ ebe o ji bụrụ nwaanyị dịka ha kwuru na nwata ahụ gbaara ha na nna ya eme etu ndị a si na-emetọ ya.

    Thepolice spokesperson revealed that medical reports revealed that the victim sustained severe injury in her vulva as a result of the defilement and the minor had revealed to her father and the police on how she was defiled by the suspects.

    Okoye kwuru:

    “Anyị nụrụ ozi n’aka otu nwoke maka nwa nwaanyị a sị na e nwere ndị metọrọ”

    “Nnyocha anyị mere any anwụchie ụmụnwoke abụọ, otu n’ime ha dị afọ 42 ebe onye nke ọzọ dị afọ 25”.

    O kwuru na nnyocha ha gosiri na ndị a dinara nwata ahụ ugboro ugboro.

    Mpụtara nnyocha ụlọọrụ NOIPolls mere n’ọnwa Jụlaị 2019 rụrụ aka na otu nwata nwaanyị n’ime atọ ndị bi na Naịjirịa abụrụla ndị opekatampa otu onye akpaala ha aka n’otu ụzọ na-ezighi ezi tupu ha e ruo afọ 25.

    Na nso nso a, akụkọ banyere mmetọ ụmụaka na-ari elu n'akụkụ Naịjirịa dị iche iche.

    N’ọnwa Jụlaị, ndị uweojii Legọs steeti kwuru na ọnụọgụgụ mkpesa banyere mmetọ ụmụaka ha eruola 100 nọnwa atọ. Ọtụtụ steeti na Naịjirịa na-ahụtakwa iri elu mkpesa ndị dị etu a nakwa mkpesa ndịna n’ike nyere ya bụ ihe ndị mmadụ na-ekwusị dịka mmụba ya dịzika “mfesa ọrịa”.

    Ọnụ na-ekwuru ndị uweojii Legọs steeti bụ Benjamin Hundeyin gwara ndị ntaakụkọ na ọnọdụ a na-eche ndị ọchịchị steeti ahụ ezigbo echiche.

    O kwuru: “Anyị na-enyocha okwu mmadụ 83 ugbua iji gosi na ndị uweojii na-agbasi mbụ ike ịbelata mkpagbu ụmụnwaanyị na mwakpo ndị mmadụ maka okike ha na Legọs steeto ”

    Na Naịjirịa, ngalaba 'Ministry of Women Affairs', nakwa ụlọọrụ 'National Agency for the Prohibition of Trafficking in Persons' (Naptip) so na ngalaba gọọmentị ebe ụmụnwaanyị a wakporo n'ike, maọbụ ndị a na-emekpa ahụ nwereike inweta enyemaka.

  18. Niger Coup: Ndịagha weghara ọchịchị chọrọ ịkpụpụ Onyeisiala Bazoum a chụpụrụ n’ọkwa ụlọikpe maka ebubo imegide ọchịchị mba ha

    Ndịagha weghara ochịchị na Niger amaala ọkwa maka atụmatụ ha ịkpụpụ Onyeisiala Mohamed Bazoum ụlọikpe maka ebubo imegide ọchịchị mba ahụ na igba mgba okpuru megide nchekwa mba ha.

    Nke a bụ ihe akaebe ọhụrụ ndịagha na-eme nke na-egosi na ha achọghị ile ọkụ mba ndị ofesi na-akwanye ha n’ike ka ha nyeghachi Maazị Bazoum ọkwa ọchịchị.

    Kemgbe izuụka atọ ndịagha a weghaara ọchịchị na Niger, ha jichiri ya ma tụnye ya n’okpuru ụlọ obi ọchịchị ya.

    Dọkịnta ya kwuru na Bazoum nọ n’ọnọdụ “obi ụtọ” agbanyeghi na e ji ya eji n’ọnọdụ na-adịghị mfe ịnọ”.

    Ha ekwupụtaghị ihe ndị ọzọ so okwu a.

    E ji Maazị Bazoum dị afọ 63, nwunye ya na nwa ya nwoke e ji kemgbe dị e nwere ọtụtụ ndị chere oke echiche banyere ahụike ya.

    N’ụbọchị 26 nke ọnwa Jụlaị, ỌchịaghaAbdourahmane Tchianibụbu onyeisi ndịagha na-echekwa onyeisiala wepụtara onwe ya dịka onyeisi ọhụrụ mba Niger oge ya na ụfọdụ ndịagha ndị ọzọ weghaara ọchịchị ebe ahụ.

    Otu jịkọrọ mba Ọdịda anyanwu Afrịka bụ Ecowas ekwubuola na ha ga-eziga ndịagha ha mba Niger ka ha manye ndịagha a weghara ọchịchị mweghachi ọchịchị ahụ mana ha emezubeghi atụmatụ nziga ndịagha a ugbua.

    Ndịagha a weghara ọchịchị ekwukwaala na ha ga-ebuso ndịagha ọbụla e zutere ebe ahụ agha.

    Ecowas na onwe ha enyekwala mba Niger ọtụtụ mmachi nakwa ntaramahụhụ ndị ọzọ nke gụnyere ịkwụsị inye ha ọkụ latrịk nke mere na ọkụ adịghịzi n’isi obodo ha bụ Niamey nakwa n’akụkụ obodo ndị ọzọ dị mkpa.

    N’ụbọchị Satọdee ọtụtụ ndị isi ụka okpukperechi Alakụba nwere agba bụ ndị si mba Naịjirịa mere njem gaa Niger maka atụmatụ ikpe udo na ma kụsị mweghara ọchịchị a.

    Praịm minista ọhụrụ ọchịchị ndị a wepụtara bụ Ali Mahamane Lamine Zeinkwuru na ọ na-atụ anya na mkparịtaụka ha na Ecowas ga-abụ ihe e mere n’anbalị olemaole na-abịa abịa “iji kpaa maka etu a ga-esi bulie mmachi ndị e nyere ha”.

    Mweghara ọchịchị a mere na Niger bịara sochie ndị ọzọ merela na nso nso a na mba Burkina Faso na Mali dịka Arịka na-alụ ọgụ megide ndịagha nnupụsị ụka Alakụba na-akpa ike ebe ahụ nakwa dịka ikike ọchịchị mba Russia na-efesa n’akụkụ mpaghara Sahel nke Afrịka site n’otu nchekwa ha bụ Wagner.

    N'agbanyeghị etu e siri jibido ya, Maazị Bazoum nwereike bipụta ozi site n’aka ụlọntaakụkọ Washington Post ebe o kwuru na ọ bụ onye e ji eji ma kwukwaa na mweghara ọchịchị a na-eme a “ga-emetụta mba anyị, mpaghara anyị na ụwa dum n’ụzọ jọgburu onwe ya”.

    E kwuru na Bazoum dị afọ 63 a bụrụla onye tara oke ahụ ugbua n’ụzọ ‘dị oke egwu’ dịka e kwebeghi nwa ya nwoke dị afọ 20 nke nwere ezigbo ọrịa ọjọọ ka ọ hụ dọkịnta ọbụla.

    Onyeisi ọrụ ikike dịrị onye n’ụlọọrụ UN bụ Volker Turk kwuru na na ọnọdụ e tinyere abụghị ọnọdụ e kwesịrị itinye mmadụ n’ime ya ma kwuo na ọ bụ ọnọdụ na-akwanyeghịrị ya ugwu dịka o kwuru na nke a megidere iwu ikike dịrị onye nke mbụ ụwa.

    Zazia bụ nwa ya nwaanyị dị afọ 34 onye nọ njem ezumike na mba France mgbe ndịagha weghara ọchịchị Niger gwara ụlọ ntaakụkọ Guardian n’izuụka a na nna ya, nne ya na nwanne ya nwoke enweghi mmiri ọṅụṅụ dị ọcha ịnụ, ha enweghi ọkụ latrịk dịka a na-enye naanị osikapa na nrị ‘pasta’ ka ha rie kemgbe ahụ.

    Kemgbe ndịagha weghara ọchịchị, a hụla ihu Maazị Bazoum naanị otu mgbe, nke a bụ oge foto e sere ya na onyeisiala Chad bụMahamat Idriss Déby Itno onye bịara zute ya gbara n’ọha.

    Maazị Déby gara zute Bazoum na ndịagha a weghaara ọchịchị iji hụ na a ga-enweike kpee udo n’okwu mweghara ọchịchị a mana atụmatụ ya ime nke a kpụrụ afọ n’ala.

  19. Ọnụego mmanụ ụgbọala nwereike ịrị elu orji n’izuụka na-abịa abịa

    Ndị na-ere mmanụ ụgbọala na Naịjirịa ekwuola na ọnụego mmanụ ụgbọala nwereike ịgbago elu ruo N720 kwa otu litre n’izuụka ndị na-abịa abịa n’ihi ego ole dọla na-ada ugbua.

    Ọ bụrụ na nke a mee, ọ ga-abụ ugboro atọ ọnụego mmanụ ụgbọala na-arị elu kamgbe Onyeisiala Tinubu banyere n’ọchịchị n’ụbọchị 29 Mee, 2023.

    Ịdọ aka na ntị a na-abịa dịka ọnụego naịra na-ada ugbua nụ narị naịra 910 ruo 945 ma a tụnyere ya otu dọla n’ahịa.

    Otu jikọtara ndị a na-ere mmanụ ụgbọala bụ Independent Petroleum Marketers Association of Nigeria, IPMAN kwuru na ụjọ ha bụ na ọnụego mmanụ ụgbọala ga na-arị elu dịka dọla na-arị elu.

    Ha kwuru na ọtụtụ ndị chọburu ibubata mmanụ a akagbuola atụmatụ a maka ụkọ ego dọla dị n’ahịa.

    Onyeisi ha bụ Chinedu Okoronkwo kwuru “kamgbe gọọmentị wepuru ego enyemaka ha na-akwụ n’isi mmanụ ụgbọala, ha enweghizi ike ikwu ego ole mmanụ a ga-ada kama ọ bụzị ihe ndị ahịa zụtara ka ha na-ere.”

    “A na-eji dọla azụta mmanụ a, ya mere dọla gbagoo elu, ọnụego mmanụ ụgbọala ga-agbago elu.”

    Ngwa ngwa Onyeisiala Tinubu gbasachara ozi na enyemaka mmanụ ụgbọala agwụla, ọnụego mmanụ ụgbọala ji pasentị 200 rigooro elu ebe o jikwa pasentị 22 rigoro ọzọ n’ọnwa Julaị.

    E wezuga ihe dọla na-ada n’ahịa, nsogbu ibu mmanụ agbidi e bubatara na Naịjirịa site na Legọs gawa mpaghara Naịjirịa ndị ọzọ so na nsogbu mere ọnụego mmanụ ji arị elu ọkachasị na mpaghara Ugwu Naịjirịa.

    N’ihi nke a ndị Naịjirịa na-ata ahụhụ dịka ọnụego nri, ụgbọala nakwa ihe ndị ọzọ e ji ebi ndị na-arụ elu.

  20. Igbo ndị ọma daalụ nụ

    Ị bịala n'ọgbakọ anyị taa maka akụkọ ndị gbapụtara ihe n'ụwa niile.