You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.

Take me to the main website

A tụọla onyeisi otu 'Proud Boys' nga afọ 17 maka ịkpalite ọgbaghara na Capitol

Akụkọ kachasị dị mkpa n' Afrịka nakwa mba ụwa niile.

Mkpuchi Na Eme Ozugbo

Ikechukwu Kalu, Uche Akolisa and Adline Okere

  1. Niger Coup: Onyeisiala Mohamed Bazoum nọ n'ọnọdụ 'Obi obi ụtọ' agbanyeghi na e ji ya eji

    Dọkịnta onyeisiala Niger kwuru na ọ nọ “n’ọnọdụ obi ụtọ’ agbanyeghi na ndịagha Niger weghaara ọchịchị ji eji tinyere ya n’ọnọdụ “na-adịghị mfe ịnọ”.

    O kwuru nke a dịka o zutechara ya.

    Kemgbe ụbọchị 26 nke ọnwa Jụlaị bụ ụbochị ndịagha a weghaara ọchịchị na mba a, ha tinyere Mohamed Bazoum, nwunye ya na nwa ya nwoke n’okpuru ụlọ obi gọọmentị ya dị na Niamey.

    O gwara ụlọ ntaakụkọ mba France a kpọrọ RFI na “Ọnọdụ e tinyere ya bụ ọnọdụ na-adịghị mfe ịnọ dịka enweghi ọkụ latrịk nọ ebe ahụ ma ncha”.

    Ndịagha a mechara kwee ka dọkịnta ya bịa hụ ya dịka ọtụtụ ndị ọchịchị na mba ofesi dị iche iche na-akpọ oku ka atọhapụ ya.

    Ụlọntaakụkọ RFI kwuru na nke a bụ mbụ a na-ekwe onye ọbịa ọbụla izute Bazoum kemgbe ndịagha weghara ọchịchị ebe ahụ.

    E kwuru na Bazoum dị afọ 63 a bụrụla onye tara oke ahụ ugbua n’ụzọ ‘dị oke egwu’ dịka e kwebeghi nwa ya nwoke dị afọ 20 nke nwere ezigbo ọrịa ọjọọ ka ọ hụ dọkịnta ọbụla.

    RFI kwuru na “Dọkịnta a nwereike kwuturu onyeisiala, nwunye ya na nwa ya nwoke”.

    “O kwuru na ihe niile na-aga nke ọma dịka dọkịnta ahụ wetere ha nri na ọgwụ”.

    Ụlọntaakụkọ ahụ kwukwara na ka dọkịnta a gachara zute ha na ezinaụlọ ya kwuru na obi ha koburu n’elu ekudaala.

    A na-eche na ndịagha a weghaara ọchịchị Niger nke ọchịagha Abdourahmane Tchiani na-edu kpebiri ikwe dọkịnta a ka ọ bịa hụ onyeisiala maka etu ọtụtụ ndị mmadụ si akatọ njibodo ya nke ha mere kemgbe ha weghara ọchịchị.

    Onyeisi ọrụ ikike dịrị onye n’ụlọọrụ UN bụ Volker Turk kwuru na na ọnọdụ e tinyere abụghị ọnọdụ e kwesịrị itinye mmadụ n’ime ya ma kwuo na ọ bụ ọnọdụ na-akwanyeghịrị ya ugwu dịka o kwuru na nke a megidere iwu ikike dịrị onye nke mbụ ụwa.

    Zazia bụ nwa ya nwaanyị dị afọ 34 onye nọ njem ezumike na mba France mgbe ndịagha weghara ọchịchị Niger gwara ụlọ ntaakụkọ Guardian n’izuụka a na nna ya, nne ya na nwanne ya nwoke enweghi mmiri ọṅụṅụ dị ọcha ịnụ, ha enweghi ọkụ latrịk dịka a na-enye naanị osikapa na nrị ‘pasta’ ka ha rie kemgbe ahụ.

    O kwuru na nri ndị nọ n’ime igwe ntụ oyi ha amalitela imebisi n’ihi na ọkụ latrịk anọghị ebe e tinyere ha.

    N'agbanyeghị etu e siri jibido ya, Maazị Bazoum nwereike bipụta ozi site n’aka ụlọntaakụkọ Washington Post ebe o kwuru na ọ bụ onye e ji eji ma kwukwaa na mweghara ọchịchị a na-eme a “ga-emetụta mba anyị, mpaghara anyị na ụwa dum n’ụzọ jọgburu onwe ya”.

    Ọ karịala otu izuụka kemgbe Onyeisiala mba Amerịka bụ Joe Biden kpọrọ oku ka a tọhapụ Maazị Bazoum "ngwa ngwa" maka atụmatụ "nchekwa ọchịchị onye kwuo uche ya gbasiri ike na Niger".

    Nke a so ozi ịdọ aka na ntị ruru abalị asaa otu jịkọrọ mba Ọdịda Anyanwụ Afrịka bụ Ecowas nyere ka ndịagha tinyeghachi ọchịchị onye kwuo uche ya na mba ahụ.

    Ecowas dọrọ aka na ntị na ha ga-eziga ndịagha ha ebe ahụ maka atụmatụ imanye ndị a ka ha mee ihe ha chọrọ mana ha mechara ghara ime nke a dịka ndịagha a weghara ọchịchị leghara ozi ha nakwa oku ha na-akpọ ka atọhapụ Bazoum anya.

    N’ụbọchị Satọdee, Ecowas kwuru na ha na-atụ anya iziga kọmịtiị ha ka ha gaa mba Niger gaa zute ndịagha a weghara ọchịchị.

  2. Ndị ojiegbe agbaala ụlọ Eze ọdịnala ọkụ n'Arondizuogu, Imo steeti

    Ndị ojiegbe a na-amaghị ndị ha bụ agbaala ụlọ Eze Kanu Ikenolu bụ Eze ọdịnala ndị obodo Ndia Iche Arondizuogu dị n’Ideato nke Imo steeti ọkụ.

    Akụkọ kwuru na ndị a tụrụ ogbunigwe n’ime ụlọ Eze ahụ nke mere ụlọ ya, ngwongwo dị n’ime ya nke gụnyere ụgbọala jiri malite ịgba ọkụ.

    Mgbe nke a na-eme, ọtụtụ ndị bi n’obodo gụnyere ezinaụlọ Onyeze gbara ọsọ ma gbaba n’ime ọhịa.

    Otu nwafọ obodo ahụ na-achọghị ka a kpọọ ya aha kwuru na akụnaụba ndị a lara n’iyi ruru ọnụego ọtụtụ nde naịra.

    Ọnụ na-ekwuru ndị uweojii Imo Steeti kwuru na nke a mere n’ezie na ha na-eme nyocha tara ọchịchị banyere ya iji nwuchie ndị kpara arụ a.

    Nke a abụghị mbụ ndị ojiegbe na-agba ụlọ ndị Eze ọdịnala ọkụ na nso nso a, ọkachasị n'Imo steeti.

  3. Igbo ndị ọma e ji eje mba daalụ nụ ooo!

    Daalụ maka ị nọnyere anyị n'ụbọchị ndị gara aga aga.

    Ugbua anyị na-anabata unu n'ọgbakọ anyị nke taa, maka akụkọ ndị gbapụtara ihe.

  4. Kaduna mosque collapse: Opekatampe mmadụ asaa anwụọla n’ụlọ Alakabụ dara na Zaria

    Otu ụlọụka ekpere ụka Alakụba dị na Zaria nke Kaduna steeti adaala dịka ndị mmaọ̄ụ nọ n’ime ya na-ekpe ekpere. Ndị ọchịchị ebe ahụ agbaala ama na ihe ruru mmadụ asaa nwụrụ n’ihe ọdachị a.

    A na-ekwu na ihe ruru narị kwuru narị ndị mmadụ nọ n’ime ụlọ a oge ọ dara n’ụbọchị Fraịdee.

    A gbapụtara ọtụtụ ndị mmadụ na ndụ n’okpuru ụlọ a dara.

    A na-eme nnyocha imata kpọm kwem ihe mere ụlọ a jiri daa mana Emir na-achi mpaghara ahụ gwara ndị ntaakụkọ na a hụrụ ebe aja ngwuru (wall) ụka ahụ gbawara agbawa.

    A na-ekwukwa na e gwuru ụka ahụ ihe ruru afọ 100 gara aga maọbụ karịa.

    Otu onye ọchịchị obodo ahụ bụ Abdullahi Kwarbai gwara ụlọ ntaakụkọ Reuters na “e gwupụtara ozu mmadụ anọ na mbụ ka ụlọ a dachara”.

    “E mechara ahụ mmadụ atọ ndị ọzọ n’okpuru ụlọ a oge ndị ọrụ gbata gbata bịara ebe ahụ malite ọrụ ngwupụta”

    Emir Mallam Ahmed Nuhu Bamalli kwuru na a kpọọlarị ndị ọrụ ngwulite ụlọ ka ha bịa nyachie ya bụ ngbawa mere na ngwuru ụlọ a tupu ihe ọdachị a emee.

  5. Hawaii fires: Ọnụọgụgụ ndị ọkụ na-agba n’ọzara gbagburula n’obodo Maui eruola 80

    Ndị ọchịchị n’obodo ikpere mmiri nke Hawaii ekwuola na mmadụ 80 anwụola ebe ahụ dịka ọkụ na-gba n’ọzara gbagburu ha.

    A na-eche na ọnụọgụgụ ndị ọkụ a ga-agbagbu nwereike iri elu karịa etu ọ dị ugbua dịka ndị ọchịchị mba Amerịka na-ekwu na ihe a nwereike ịbụ ihe ọdachị kacha njọ na mba ahụ kemgbe ụwa.

    Kemgbe ọkụ a malitere ịgba n’ụbọchị Tuzde, ndị ọrụ mmenyụ ọkụ na-agba mbọ imenyụ ya ọkachasị n’obodo Lahaina bụ obodo ebe ndị njem nlereanya na-abịakarị n’ihi ihe ngosi ihe ndị mere n’oge mgbe ochie nọ ebe ahụ.

    Ọkụ agbariela ọtụtụ akụkụ obodo ahụ dịka mkpa ugbua.

    Ọkaiwu Hawaii ebinyeala aka n’ọrụ imegharị etu ndị ọrụ gbata gbata si agbata ọsọ enyemaka ma ihe ọdachi mee ebe ahụ.

    Nke a na-abịa dịka ọtụtụ na-ajụ ma ndị ọchịchị e mere ngwa ngwa dọọ ọha aka na ntị ka ha gbapụ ebe ahụ oge ọkụ a malitere ịgba.

    E jirila nwanyọ nwayọ malite ịkwe ụfọdụ ndị nwere akwụkwọ ikike ibi na Lahaina ka ha lọghachite ebe ahụ.

    A na-ekwu n’obodo Lahaina bụ ebe dị oke mkpa dịka ndị njem nlereanya ruru nde abụọ na-abịa abụ kwa afọ.

    Ụfọdụ ndị obodo a na-ekwu na ha na-eche na ndị mmadụ awụbala n’ime be ha zuru ngwo ngwa ha mana ndị uweojii agbaghi ama nke a.

  6. Ihe mere ndị dọkịnta na-arụ n’ụlọọgwụ gọomentị nwe ji kagbuo abụbọ ọrụ ha nwa mgbe nta

    Otu jịkọrọ dọkịnta ndị na-arụ n’ụlọọgwụ gọomentị nwee n’okpuru aha Nigerian Association of Resident Doctors (Nard) agbauola abụbọọrụ ha nwa mgbe nta dịka ha ga-amalite ọrụ n’ụbọchị Satọdee a.

    Onyeisi otu a bụ Innocent Orji gbara ama nke a n’abalị Fraịdee.

    Nke a na-abịa dịka ndị otu a gbara abụbọọrụ a n’akụkụ Naịjirịa ruo ihe karịrị izuụka abụọ.

    Orji kwuru na:

    “Anyị kpebiri ịkwụsịtu abụbọọrụ anyị n’ihe na gọọmentị etiti amalitela ịgba mbọ ime ihe ndị anyị na-achọ”

    “Anyị hụkwara na gọọmentị etiti ebinyelaaka ka a kwụọ anyị ụgwọ ọzụzụ nke 2023 ‘Medical Residency Training Fund (MRTF)’ dịka ha malitee ọrụ inwe ndị dọkịnta ọhụrụ n’ọrụ”

    Mana site n’ihe anyị hụrụ, ọ ga-ewee gọọmentị etiti ihe ruru izuụka abụọ imezu ihe ndị a.

    O kwuru na ọ bụ ihe ndị a mere ha ji sị ka ha kwụsịtụ abụbọọrụ ha ugbua karịa iche ruo izuụka abụọ.

    Cheta na otu Nard malitere abụbọọrụ mbụ ha n’oge ọchịchị onyeisiala Bola Tinubu n’ụbọchị 26 nke ọnwa Jụlaị maka okwu gụnyere ibuli ego ụgwọ ọnwa ha, iwee ndị dọkịnta ọhụrụ n’ọrụ nakwa ihe ndị ọzọ.

  7. Ọnọdụ edobere onyeisiala Niger a chụrụ n’ọkwa abụghị ihe anyị ga-anabata – Otu AU

    Otu jịkọrọ mba ndị Afrịka bụ African Union (AU) ekwuola na “ọnọdụ ọjọọ e dobere” onyeisiala Niger a napụrụ ọkwa bụ Mohamed Bazoum bụ “ihe na-eche ha oke echiche” dịka a ka ji ya eji.

    AU kwuru na ị mee onyeisiala nwetere ọkwa ọchịchị site n’ụzọ ntuliaka etu a bụ ihe “ha agaghị anabata”.

    Nke so akụkọ na-ekwu na ndịagha weghaara ọchịchị na Niger tinyere Bazoum nọ n’ọnọdụ na-abụghi nke nkwanye ugwu, nọrọ n’ọchịchịrị ma bụrụ onye ndịagha ewebeghi ka ọ hụ ndị ọrụ ahụike ọbụla.

    Onyeisi AU Moussa Faki Mahamat zipụtara ozi na Twitter gwaa ndị nọ n’isi mweghara ọchịchị a ka ha mee ngwa ngwa ịhụ na ha na ndị Ecowas nwere mkparịtaụka banyere iweghachite ọchịchị onye kwuo uche ya.

    Ọ gara n’ihu kpọọ oku ka a tọhapụ onyeisiala Bazoum dịka ọ rịọrọ mba ndị ọzọ ka ha tinye aka hụ na “agbapụtara ugwu ya”.

    Otu UN nakwa mba Amerịka ekwuolarị na ọ bụ ihe na-eche ha oke echiche etu ọnọdụ ahụike Bazoum nke ndị a ji eji kemgbe izuụka abụọ dị ugbua dka ha kwukwara na ọnọdụ nchekwa ya bụ ihe na-eche ha echiche.

    Ecowas n’ụbọchị Tọọzde binyere aka n’atụmatụ ka ndịagha ha “kwụrụ chịm” ma na-eche maka atụmatụ ịga mba Niger manye ndịagha weghara ọchịchị ka ha tọhapụ ikike ọchịchị ha weghaara.

    Ndịagha a adọọla aka na ntị na-ekwu na ha ga-ebuso ndịagha ọbụla bịara ime nke a agha.

  8. Ọ bụ ihe rara oke ahụ anyị na ndịagha weghaara ọchịchị na Niger inwe mkparịtaụka – Onye ọrụ Ecowas

    Ndị isi ọchịchị mba ndị nọ mpaghara Ọdịda anyanwụ Afrịka bụ Ecowas ekwuola na ha amalitela ịtụkọta ndịagha maka atụmatụ iziga ha mba Niger iji hụ na ha tinyere aka na mbọ ha na-agba iweghachite ọchịchị onye kwuo uche na mba ahụ.

    Ha kwuru na ha ga-akagbu atụmatụ iziga ndịagjha mba a ma ndịagha a weghaara ọchịchị kwee ịgwa ha okwu.

    Kọmịshọna ihe gbasara udo, na nchekwa nke Ecowas bụ Abdel Fatau Musah gwara BBC na mkparịtaụka ha nwere na ndịagha a weghaara ọchịchị ekwebeghi ka ha hụ ihu na ihu ma nwee mkparịtaụka nke na-eme ka atụmatụ mkparịtaụka udo ha na-achọ bụrụ ihe tara oke akpụ ugbua.

    O dobeghi anya mgbe Ecowas ga eziga ndịagha ha mana ha kwuru na agaghị achọ isi ụzọ mkparịtaụka ruo oge ebighi ebi.

    Maazị Musah kwuru na Ecowas agaghị enwe ndịagha a weghaara ọchịchị ka ha gaa n’ihu na-achị nwa mgbe nta dịka ndị nke weghaara ọchịchị na mba Burkina Faso na Mali.

    Musah kwukwara na ha esila n’ụzọ na-abụghị ụzọ dị mfe nata ozi n’aka onyeisiala Mohamed Bazoum nke a napụrụ ọchịchị dịka ha kwuru na Bazoum nọ n’ọnọdụ na-abụghi nke nkwanye ugwu, nọrọ n’ọchịchịrị ma bụrụ onye ndịagha ewebeghi ka ọ hụ ndị ọrụ ahụike ọbụla.

    Ecowas na-ekwukwa na ndịagha a anwaala iji aka ike manye Bazoum ka o binyeaka n’akwụkwọ arụkwaghịm mana o kwebeghi mee nke a.

    Dịka ndịagha weghaara ọchịchị tinyerela ndị ọchịchị ọhụrụ nke ha n’oche, ọ bụrụla ihe ọha chi obi n’aka eche imata etu ọchịchị onye kwuo uche ya ga-esi lọghachite na mba Niger ugbua.

    Ọ bụ ego mba ndị Ecowas ka a ga-eji ziga ndịagha a mba Niger dịka Ecowas na-ekwu na ha agaghị ana ndị mba ndị ọzọ ego ọbụla banyere nke a mana ha ga-anabata ndị ọbụla ego ọbụla e ziteere ha maka atụmatụ a.

  9. Ethiopia amalitela iwakpo ụlọ ndina ebe ndị 'LGBT' na-aga edina na mba ha

    Ndị ọchịchị nEthiopia ekwuola na ha na-awakpo ụlọ ndịna nakwa ebe oriri na nkwarị ha sị na ndị mmadụ na aga edịna ndị okike ibe ha na mba ahụ, ọkachasị n’isi obodo mba a bụ Addis Ababa.

    Ụlọọrụ gọọmentị na-ahụ maka udo na nchekwa mba a kwuru na ha na-ebu agha megide “ụlọọrụ niile ebe ndị mmadụ na-aga edina ndị okike ibe ha”.

    N’ozi ha wepụtaran’akara Facebook ha, ha kwuru na ha na-eme mwakpo ndị a site n’ozi ama ndị mmadụ na-agbara ha.

    Ha gara n’ihu rịọ ọha ka ha mee mkpesa nye ndị uweojii banyere ebe ọbụla ụdịrị ihe a na-eme na mba ahụ.

    A machiri ndị mmadụ idina ụdịrị okike ibe ha na mba Ethiopia mana enwebeghi ndị mere mkpesa e ji nwụchịe ndị mmadụ maka okwu a na nso nso a.

    Na mmalite izuụka a, otu ụlọọrụ na-alụ ọgụ ikike dịrị onye nye ndị nwere mmasị idina ndị ụdịrị okike ibe ha a kpọrọ House of Guramayle, kwuru na mba Ethiopia amalitela ịhụ “mwakpo megide ndị e che na-edina okike ibe ha nakwa ndị nwere mmasị idina okike ibe jha n’ụzọ na-ari oke elu”.

    Ụlọọrụ a rịọrọ ndị otu ụwa na-alụ ọgụ ikike dịrị onye ka ha tinye aka katọọ ihe a na-esilite isi na mba a dịka ha rịọrọ ụlọọrụ soshal midia dị iche iche ka ha tinye aka megide ndị na-eji ọba ozi ha ekwu okwu akpọmasị nye ndị ‘LGBT’ na mba ahụ.

  10. Etu ndị uweojii si nwụchie nwoke tọọrọ ụmụnne nwaanyị abụọ na otu onye ọzọ n’Abịa

    Ndị uweojii n’Abia steeti anwụchiela otu nwoke a sị tọọrọ ụmụnwaanyị atọ maka atụmatụ ire ha.

    Ndị uweojii steeti a kọwara na ha natara ozi ofufu ụmụaka ụmụwaanyị atọ n’aka otu nne na nna.

    Ha kọwara na ha mara ime n’ala ma si n’ụzọ amamihe pụrụiche were nyochapụta ebe nwoke ahụ na nke mere ha ji nwụchie ya.

    Mmadụ abụo n’ime ndị a a tọọrọ bụ ụmụnne, otu gbara afọ 15 ebe onye nke ọzọ gbara afọ 16, nwata nwaanyị nke ọzọ gbara afọ 13.

    Ọnụ na-ekwuru ndị uweojii steeti ahụ bụ Maureen Chinaka kọwara na

    “Mgbe anyị nwụchiri nwaamadị a o kwupụtara na ọ tọrọ ụmụnwaanyị atọ a ma na-achọ ire ha gaa mba Ghana”

    “Anyị ka na-eme nnyocha n’okwu a dịka ọ ga-apụ ụlọikpe n’oge adịghị anya”.

    Ka ọ dị ugbua, amabeghi ebe ụmụnne abụọ a nọ ugbua.

  11. Ọkụ na-agba n’ọzara agbagbuola mmadụ 53 na Hawaii

    Ọnụọgụgụ ndị ọkụ na-gba n’ọzara n’obodo ikpere mmiri Maui nke mpaghara Hawaii nke bụ steeti na ma mpaghara Ọdịda anyanwụ mba Amerịka.

    Gọvanọ mpaghara ahụ bụ Josh Green ji obi mgbawa zipụta ozi si na ihe a mere ebe ahụ bụ “ihe ọdachi meere onwe ya nke kacha njọ na steeti ahụ kemgbe ụwa”. O kwukwara na 80% akụkụ Lahaina nke mba ebe bụ ebe nlereanya e chekwara maka ihe ndị mere mgbe ochie ‘alaala’.

    Ka ọkụ a malitere ịgba na Lahaina, ọtụtụ ndị mmadụ bịara njem nlereanya wụbara n’ime oke osimiri ma gwuo mmiri awa olemaole.

    E bupụla puku kwuru puku ndị mbịarambịara ebe ahụ dịka mmadụ 11,000 ndị tọrọ ebe ahụ enweghizi ọkụ latrịk.

    Ndị ọrụ mmenyụ ọkụ ka na-agba mbọ imenyụ ọkụ ndị a malitere ịgba n’oke ọzara ebe ahụ kemgbe ụbọchị Tuzde dịka oke ifufe ‘Hurricane Dora’ na-akwanyesi ya bụ ọkụ ike.

    Onyeisiala mba Amerịka bụ Joe Biden ebinyeala aka ka e tinyere ọnọdụ “Major disaster declaration” nke bụ mkpọpụta ebe ihe ọdachi ukwu na-eme dịka a ga-enye mpaghara ego eneyemaka iji kwalite ya ọzọ.

  12. Nnọọ nu ndị be anyị

    Igbo mma mma nu o!

    Unu asaala chi.

    Soro akụkọ ndị dị mkpa ịkọ taa bụ ụbọchị 11 nke ọnwa Ọgọọstụ ebe a.

  13. Ndịagha weghaara ọchịchị na Niger ahọpụtala ndị ọchịchị ọhụrụ nke ha

    Onyeisi otu ndị agha weghara ọchịchị na Niger bụ Ọchịagha Abdourahmane Tchiani ahọpụtala ndị ọchịchị ọhụrụ nke nye dịka ha ekwebeghi mee he otu Ecowas na-achọ nke bụ itinyeghachi onyeisiala Mohamed Bazoum nke ha napụrụ ọchịchị n’ọkwa ya.

    Tchiani mere mkpọpụta aha ndị ọchịchị a n’ọkwa ọ mara site n’ihe onyonyo n’igwe TV n’abalị ụbọchị Tọọzde.

    Ndị ọchịchị ọhụrụ a gụnyeree ndị minista mmadụ 21, ndị minista steeti abụọ nakwa otu onye minista pụrụiche ga-anọ n’okpuru ụfọdụ minista ndị ọzọ.

    Praịm minista ọhụrụ mba a nke e tinyere dịka onye nchereoge bụ Lamine Zeine Ali Mahamane ga-anọ n’isi ndị ọchịchị ọhụrụ a dịka ọ ga na-arụkwa ọrụ dịka minista akụnụba nakwa ego mba a.

    Onye bụbụ onyeisi ndị ọrụ gọọmentị bụ ọchịagha Salifou Mody ga-amalite ọrụ dịka minista nchekwa mba a.

    Ọtụtụ na-ahụta Salifou Mody dịka osote Ọchịagha Tchiani.

    Kọnelụ Abdourahmane Amadou bụ onye na-agụpụtakarị ozi banyere ndịagha a n’igwe onyonyo nke mba a nwee kemgbe ụbọchị 26 nke ọnwa Jụlaị natara ọkwa minista ndị ntorobịa na egwuregwu.

    Cheta na otu ndịagha weghaara ọchịchị na Niger akpọpụtalarị aha ndị isi ọrụ nchekwa ọhụrụ ma chụọ ọtụtụ ndị isi agha nke gọọmentị Bazoum n’ọrụ.

  14. Fernando Villavicencio: Etu e siri gbagbuo ya dịka ọ nọ na-azọ ọkwa onyeisiala Ecuador

    A gbagbuola otu onye na-azọ ọkwa onyeisiala na ntuliaka ọkwa onyeisiala mba Ecuador na-abịa abịa n’ogige ebe a na-eme achụmnta vootu.

    A wakporo Fernando Villavicencio onye a ma dịka onye achụmnta vootu ya na-akatọ nrụrụaka na ndị omekome ibu egbema bụrụkwa onye ọkaiwu mba a.

    Mwakpo a mere ka o si n’ọgbakọ achụmnta vootu e mere na Quito bụ isi obodo Ecuador n’ụbọchị Wenezde.

    Nwoke a so n’otu n’ime ndị na-azọ ọkwa na-ekwu na e nwere ihe jịkọrọ ndị na-eme mpụ na ndị ọrụ gọọmentị na mba Ecuador.

    Gọọmentị mba a etinyela ọnọdụ gbata gbata nke ‘state of emergency’ ebe ahụ dịka a gbagbuchara ya.

    Ecuador bụ ebe dị jụụ na mpaghara Latin Amerịka amalitela ịhụ mwakpo dị iche iche na nso nso a – dịka a na-ekwu na ndị na-ebu ọgwụike amalitela ịwụju ebe ahụ - Nkatọ ihe a na-eme so n’okwu ọtụtụ ndị na-azọ ọkwa gbadoro ụkwụ na achụmnta vootu ha.

    Otu onye nọ ebe ahụ ya bụ mwakpo mere kwuru na a gbara Villavicencio egbe ugboro atọ . Villavicencip bụ onye ụlọomeiwu ma rụkwa ọrụ n’oge gara aga dịka onye ntaakụkọ.

    Otu onye ọrụ mgbasaozi ya gwara ndị ntaakụkọ mba a na nwaamadị dị afọ 59 chọrọ ibanye ụgbọala na otu nwoke wụpụtara gba ya egbe n’isi.

    Ihe onyonyo si n’ogige ahụ gosiri ka ọha ndị nso nso ya gbapụrụ ọsọ na-ezo onwe ha dịka akwụkwọ achụmnta vootu juru n’ala ebe ahụ niile.

    Onye ọkaiwu mba ahụ kwuru na ndị ọrụ nchekwa gbara onye a na-enyo mere ihe a egbe nke mere ọ mechaa nwụọ.

    Dịka ọgbaghara dapụtara mmadụ itoolu ndị ọzọ merụrụ ahụ nke gụnyere onye na-azọ ọkwa ịbụ onyeisi ụlọomeiwu mnba nakwa ndị uweojii abụọ - Nke a bụ ihe ndị ọkaiwu gọọmentị kwuru.

    Ha kwukwara na a nwụchiela mmadụ ndị a na-enyo enyo na aka nwereike ịdị na mwakpo a dịka ndị ọrụ nchekwa mara imi n’ala n’akụkụ Quito.

    Villavicencioa lụọla nwunye ma jiri ụmụ ise. O so n’ime mmadụ asatọ na-azọ ọkwa agbanyeghi na o soghi na ndị aha ha na-ada n’ihu, mkpọtụ aha ya na-adakwa.

    Ewezuga okwu nkwalite nchekwa, ozi achụmnta vootu Villavicencio gbadoro ụkwụ na ibuso nrụrụaka ọgụ bụ isiokwu ọrụ ya dịka onye ntaakụkọ gbara mgbọrọgwụ n’ime ya ma gụnyere nkwụsị mmetọ gburu gburu ndị mmadụ.

    N’izuụka gara aga o kwuru na e nwere onyeisi ndị na-ebu ọgwụike majara ya na ndị otu ya.

  15. Gọvanọ Alex Otti ehiwela otu nchekwa 'Operation crush' n'Abia Steeti

    Gọvanọ Abia Steeti bụ Alex Otti ehiwela otu nchekwa a kpọrọ “Operation Crush”.

    Ndị nchekwa mejupụtara otu a gụnyere ndịagha, ndị uweojii, ndị DSS nakwa ndị ‘civil defence’.

    Gọvanọ Otti sị na ọrụ ndị a bụ ịhụta, inyochapụta nakwa igbochi mpụ na ihe ọbụla megidere nchekwa na steeti ahụ.

    O kwuru na ndị a ga-ekpocha ma zaachaa ime ọhịa nakwa ebe nzuzo niile dị n’Aba, Umuahia, Ohafia, Umunneochi, Isiukwuato nakwa ebe ndị ọzọ.

  16. Ndị dọkịta akagbuola ngagharịiwe ha chọburu ime na Wenezde

    Ndị ọrụ ahụike a kpọrọ Nigerian Association of Resident Doctors (NARD) akagbuola ngagharịiwe ha chọburu imalite na Wenezde 9 Ọgọọst, 2023.

    Onyeisi ha bụ Innocent Orji kwuru nke a na mkparịtaụka ya na ụlọọrụ Channels TV nwere n’ụtụtụ Wenezde.

    O kwuru na agbanyeghi nke a na abụbụọrụ ha malitere ịgba kamgbe ka ga-aga n’ihu.

    “N’ezie anyị akagbuola ngagharịiwe ahụ kwesịrị ịkwụsị taa mana abụbụọrụ anyị ka na-aga n’ihu. Anyị ga-eleba ya anya ọzọ n’ime ụbọchị atọ; nke a bụ ebe ndịisi anyị kwụụ”.

    Orji kwuru na ọ bụ ihe asatọ ka ndị otu ha na-achọ n’aka gọọmentị nke gụnyere mkpa ọ dị ka gọọmentị were ndị ọhụrụ n’ọrụ iji dochie anya ndị ahụ pụrụ apụ.

    “Ndị ọrụ anyị na-ata ahụhụ, ndị Naịjirịa na-atakwa ahụhụ. Mgbe e nweghi ndị ọrụ ahụike zuruoke n’ụlọọgwụ, enweghi etu ị ga-esi nwee ezi ahụike zuruoke. O nwegbeghi onye bịara kwuo na ihe a abụghị eziokwu.”

    “Gọọmentị kwuru na ha hiwere kọmitii ga-eleba anya n’usoro a ga-eji were ndị mmadụ n’ọrụ kamgbe Febụwarị afọ a, gịnị mere na o nwebeghi ozi e wepụtara banyere ya?” o kwuru na ọ bụ ihe ndị a mere ndị ọrụ ahụike ji na-ahapụ Naịjirịa apụ.

    Orji kwuru na gọọmentị egosibeghi na ha chọrọ ime ihe ọbụla banyere ihe ndị dọkịta a na-achọ.

  17. A tụọla Tory Lanez nga afọ 10 maka ịgba Megan Thee Stallion egbe

    A tụọla onye oti egwu mba Canada a ma ama bụ Tory Lanez nga afọ iri maka ịgba ogbo ya bụ Megan Thee Stallion egbe.

    Lanez gbara Megan Thee Stallion egbe n’ụkwụ mgbe ha na-arụrịtaụka ebe ha gara ịkụ nkwọrị n’afọ 2020.

    Ikpe maara ya n’ebubo ọnụ atọ metụtara ibu egbe n’ọnwa Disemba ebe ọ nọ na nga kamgbe ahụ.

    Egbe ọ gbara ya butere ọgbaghara na ịda mba n’etiti ndị niile na-eti egwu na mba ofesi dịka a wara ya Thee Stallion ụkwụ iji wepụta mgbọ egbe ahụ.

    Ọkaikpe nke mpaghara ahụ na ngwụcha ikpe ahụ kwuru na mgbapụta ihe ya mere ka eleba anya n’ihe banyere mwakpo a na-eme ụmụnwaanyị.

    A gbara egbe ahụ dịka ha na-ala site n’emume ikpori ndụ n’akụkụ ọdọmmiri ‘swimming pool’ nke onye a ma ama bụ Kylie Jenner haziri.

    Ndị ọkaiwu gwara ọkaikpe ka a tụọ Lanez nga ruru afọ iri na atọ. Ha kwuru na e kwesịrị ịtụ ya nga ogologo oge maka ịgba onye na o nweghi ihe o mere ya egbe n’ebe obibi ndị mmadụ dị jụụ nakwa ime mkpesa iji mechuo ya ihu dịka ọ gbachara ya egbe a.

    Onyeisi ngalaba na-ahụ maka ndị ihe metụtara na Los Angeles bụ Tanishia Wright gwara ndị ntaakụkọ na ‘mwakpo megide ụmụnwaanyị isi ojii bụ nsogbu zuru ụwa ọnụ a na-anaghị elebaara anya dịka o kwesịrị.”

    Ezigbo aha Lanez bụ Daystar Perterson, o tiela ọtụtụ ewere egwu wuru ewu na mba Amerịka n’ime afọ asaa gara aga.

    Megan onye ezigbo aha ya bụ Megan Pete, gwara ụlọikpe na ya nwamadị a nwere esemokwu maka mmekọrịta ha nwere n'oge gara aga nke mere ha abụọ jiri na-akọ ibe ya ọnụ.

  18. Ihe mere ndịagha Niger jiri gbaa isi akwara na Ecowas agaghị abata na mba ahụ

    Ndị ndu ndịagha Niger weere ọchịchị n’ike ekwuola na ha agaghị anabata ndị mbịarambịa ọkwa ha dị elu bụ maka ihe izendụ banyere nchekwa ndị a.

    Ụfọdụ ndị ozi otu Ecowas, African Union nakwa United Nations zipuru ka ha gaa mba Niger adịla njikere ifebata taa.

    Mana onyendu ndịagha a weere ọchịchị n’ike gwara Ecowas na mmachi ahụ e nyere ha nakwa iji ndịagha eyi ha egwu emeela ka obi jọọ ndị mba ahụ njọ nke mere na agaghị enwenwu ike ịnabata ha n’udo nakwa nchekwa.

    Ha gbakwụnyere na e mechiela ụgbọelu maọbụ ụgbọala ịbata okeala Niger niile.

    Akụkọ si na Niamey bụ isioboso Niger kwuru na ọtụtụ ndị mmadụ hụtara mweghara ọchịchị n’ike ahụ dịka ihe ikuru ume ndụ na-agbanyeghi e ji ntuliaka họpụta Onyeisiala Mohamed Bazoum.

    Obi ọchịchị mba Amerịka ekwuola na ọ na-abụ ihe izendụ maka ndịagha Wagner nke Russia ga-ejiri ihe na-eme na Niger bata ebe ahụ.

  19. Unu asaala chi eeee?

    Igbo mụrụ nze mụọ ọzọ, anyị na-ekele na-anabata unu n'ọgbakọ BBC Igbo taa.

    Buru oche bịa nọnyere anyị maka akụkọ ndị pụtara ihe.

  20. Pastọ Taiwo Odukoya alaala mmụọ, Akwụkwọ ozi ụlọụka ya kwuru na ọ nwụrụ na mba Amerịka n'ụbọchị 7 Ọgọst 2023

    Ụlọụka Fountain of Life Church amaala ọkwa ọnwụ Ụkọ Chukwu Taiwo Odukoya ọ lara mmụọ n'ụbọchị asaa n'ọnwa Ọgọst 2023 dịka edemede ha si wee kwuo.

    Ụlọụka ya zipụtara ozi a n'akara Instagram ha n'ụbọchị 8 Ọgọst 2023.

    Cheta na ụkọ Chukwu Taiwo Odukọya liri nwunye ya nke abụọ bụ Ụkọ Chukwu Nomthi Odukọya bụ onye mba Kenya n'afọ 2021. Nomthi bụ nwunye Ụkọchukwu Odukọya lụtara n'afọ 2010; ka o mere afọ ise nwunye ya nke mbụ (Ụkọchukwu Bimbo Odukoya) nwụrụ.

    Odukoya jiri aka ya depụta ọkwa nwunye ya nke abụọ bụ Nomthi Odukọya mgbe ọ nwụrụ n'ọnwa Nọvember 2021.

    Pastọ Bimbo Odukoya bụ nwunye Pastọ Taiwo Odukọya nke mbụ.

    Ọ nwụrụ n'afọ 2005 n'ihe mberede Sosoliso ebe mmadụ 108 gụnyere ụmụakwụkwọ Loyola Jesuit College.

    Ha si ụlọakwụkwọ ha dị n'Abuja aga Pọt Hakọt ebe ụgọelu ha fedara n'udo wee gba ọkụ gbagburu ha niile.

    Ihe e ji echetakarị Bimbo Odukọya bụ etu o si ezi oziọma Chukwu nye ndị na-akwado ịlụ di maọbụ nwunye.

    N'oge ahụ ndị ntoroọbịa bere ezigbo akwa arịrị maka ihunaya ha nwere ebe Pastọ Bimbo Odukọya nọ.