You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.

Take me to the main website

France Riots: Nnukwu ọgbaaghara adapụtala na mba Fransị n'ihi ogbugbu otu nwa okorobịa

Lee akụkọ ndị gbara ọkpụrụkpụ n'akụkọ na-eme na mba ụwa..

Mkpuchi Na Eme Ozugbo

Adline Okere, Ikechukwu Kalu, Chukwunaeme Obiejesi and Uche Akolisa

  1. Igbo ndịọma anyị ekelela unu

    Anyị na-anabata unu n'ọgbakọ anyị n'ụbọchị taa.

    Biko buru oche gị bịa n'ọnyere anyị maka akụkọ ndị gbapụtara ihe na Naịjirịa, Afrịka nakwa ụwa niile.

  2. Ka chi fo

    Ụmụ Igbo, ka anyị kwụsịtụ ebe a taa, anyị ga-amalitekwa ọzọ n'elekere asatọ nke echi.

    Echi ga-aka mma.

  3. Nnukwu ntaramahụhụ ga-adịrị ndị kpatara ihe mberede ụgbo oloko - Gọọmentị India

    Ndị niile a mara ikpe maka ihe mberede ụgbọ oloko nke mere na mpaghara ọwụwa anyanwụ nke mba india n'ụbọchị Fraịde, ga-enweta "ntaramahụhụ siri ike', Praịm Mịnịsta India bụ Narendra Modi na-ekwu.

    Opekata mpe mmadụ 288 nwụrụ n'ihe mberede a mere na Odisha steeti, ebe ihe karịrị mmadụ narị asato merụrụ ahụ oge ụgbọloko abụọ bu ndị mmaọ̄ụ na otu ụgbọ oloko bu ibu takọtara isi.

    Narendra Modi gara njem nleta ebe ihe mberede a mere ma kwuo na ọ bụ "nnukwu ihe mgbu".

    Ọ gakwara leta ụfọdụ ndị nọ n'ụlọọgwụ, ma kwe nkwa na gọọmentị ga-eme ihe niile ha nwere ike iji hụ na ndị merụrụ ahụ natara ezi ọgwụgwọ.

    Odochabeghị anya ihe kpatara ihe mberede a bụ nke e kwuru na ọ bụ ihe mberede ụgbọ oloko kacha njọ na mba India.

    Amalitela nnyocha miri emi iji chọpụta ihe merenụ, mana nnyocha mbụ gosiri na o nwereike ịbụ na ihe na-enye akara arụghị ọrụ nke ọma, dịka onyeisi ngalaba ụgbọoloko nke mpaghara ọwụwa anyanwụ mba ahụ bụ KS Anand si kwuo.

    Ebe mmadụ puku abụọ nọ n'ime ụgbọ oloko abụọ ahụ takọtara isi n'ihe mberede a.

  4. Ndị dọkịta na mba Sudan na-eji ọkụ ekwentị ahụ ụzọ iji waa ụmụnwaanyị dị ime afọ

    Ọgụ na-ada n'obodo Khartoum nke mba Sudan ugbua emeela ka ọtụtụ ụlọọgwụ mechie, ebe ụfọdụ ndị mepere emepe enweghị ọkụ latrik ha ji arụ ọrụ nke ọma.

    Nke a emeela ka ọtụtụ ụmụnwaanyị dị ime na-enwe nnukwu nhịahụ n'oge ịmụ nwa, dịka ndị dọkịta na-ejizi ọkụ si n'ekwentị ahụ ụzọ iji waa ụmụnwaanyị dị ime afọ ma kuputa nwa ha.

    "Gịnị ọzọ ka anyị ga-eme? Anyị na-adabere n'ọkụ si n'ekwentị anyị iji waa ụmụ nwaanyị dị ime afọ,: Dọkịta Howaida Ahmed al-Hassan, bụ ọkachamara maka ahụike ụmụnwaanyị dị ime, gwara BBC.

    O ziteere BBC foto ebe ya na ndịọrụ ahụike ndị ọzọ jicha ọkụ ekwentị ha na-enyere nwaanyị dị ime aka.

    Dọkịta Hassan so n'otu n'ime ndị ọrụ ahụike ka nọ n'ụlọọgwụ Alban Jadeed nke dị na mpaghara ugwu nke obodo Khartoum, bụ ebe egbe na ogbunigwe na-ada aghara aghara akwụsịghị akwụsị kamgbe izu ụka atọ dịka ọgụ malitere n'etiti otu ndị agha abụọ nke mba Sudan.

    "Ọnọdụ dị ebe a dị oke njọ. Anyị anọọla n'ụlọọgwụ ebe a ọtụtụ ụbọchị. Anyị amaghịzị ihe bụ oge. Anyị amaghị mgbe chi jiri maọbụ mgbe chi foro," ka Dọkịta Hassan kwuru.

    "Ndịọrụ nọ n'ụlọọgwụ a ebughi ibu, ọkụ latrik adịghịkwa, anyị enwekwaghị mmanụ 'gasoline' anyị ga-agbanye n'igwe na-enye ọkụ iji waa ụmụnwaanyị dị ime afọ."

    "Anyị enweghị ndịọrụ nwere ọzụzụ nke ọma nakwa ndị ọkachamara ga-enye aka n'oge a na-awa ụmụnwaanyị afọ."

    "anyị na-ahapụ ụmụnwaanyị ka ha lawa ma ọ gachaa naanị awa iri e ji wachaa ha afọ, maka na ọnụọgụgụ ndị chọrọ enyemaka buru ibu."

  5. Anyị ga-emechi ụlọakwụkwọ, ụlọahịa ọbụla rubere isi n'iwu 'sit-at-home' - Peter Mbah

    Gọọmentị Enugwu Steeti etiela iwu ọhụrụ na ha ga-emechi ụlọakwụkwọ na ụlọahịa ọbụla rubere isi n'iwu 'sit-at-home' n'ụbọchị Mọnde na-abịanụ.

    Gọvanọ Enugwu bụ Peter Mbah tiri iwu a n'akwụkwọ ozi o kesara n'ụbọchị Satọde, ma gwa ndị mmadụ ka ha ghara ịtụ egwu ọbụla ịpụta gaa ebe dị ha mkpa n'ụbọchị Mọnde, maka na gọọmentị etinyela atụmatụ nchekwa zuru oke n'ebe dị icheiche.

    Akwụkwọ ozi ahụ gọvanọ binyere aka na ya kwuru sị: "Nke a bụ iji gwa ụlọakwụkwọ, ahịa, ụlọahịa, ụlọọgwụ, ndị ọkwọ ụgbọala, na ọha obodo niile, ka ha cheta na gọọmentị amachiela ma kagbuo ọnọdụ 'sit-at-home na mpaghara niile n'Enugwu steeti."

    "Gọọmentị na-adọ mmadụ niile aka na ntị ka ha rube isi na mmachi a. Ndị ọrụ gọọmentị ga na-akpagharị iji hụ na ndị mmadụ rubere isi n'iwu ọhụrụ a. Ụlọahịa ọbụla, ọdọ ụgbọala ọbụla, ụlọọrụ ọbụla, maọbụ ụlọakwụkwọ ọbụla nupuru isi ma kpọchie ogige ha n'ụbọchị Mọnde, gọọmentị nwereike imechi ogige ahụ kpamkpam."

    Ọnọdụ 'sit-at-home' bụ iwu ndị otu 'Indigenous People of Biafra (Ipob) tinyere na mpaghara Ọwụwa Anyanwụ Naịjirịa niile, kamgbe ọnwa Ọgọst afọ 2021, iji gosi iwe ha maka etu gọọmentị Naịjirịa si jide onyeisi ha bụ Mazi Nnamdi Kanu na mba Kenya ma kpụlata ya n'ike na Naịjirịa.

    Ipob mechara kwuo na ha ewepụla iwu ahụ, mana ọtụtụ ndị ekperima malitere ịgagharị na mpaghara dị icheiche, na-awakpo ndị mmadụ, na-agba ụgbọala ọkụ, ma na-egbukwa ụfọdụ ndị mmadụ bụ ndị pụtara ịga ahịa maọbụ ọrụ n'ụbọchị Mọnde.

    Kamgbe ahụ, ụbọchị Mọnde bụzi ụbọchị ezumike na mpaghara Ọwụwa Anyanwụ maka na ụjọ anaghị ekwe ndị mmadụ pụta iro.

  6. Fuel Subsidy removal: Abụbọ ọrụ NLC, ngagharịiwe na ihe ndị ọzọ nwereike ịdapụta n’izuụka

    Ọ bụghịzị akụkọ ọhụrụ na gọọmentị etiti ekwuola na a ga-ewepụ ego mbelata mmanụ ụgbọala na Naịjirịa. Nke a bụrụla okwu akpụ n’ọnụ n’akụkụ dị iche iche ọkachasị dịka okwu mwepụ ego a mere ka ọnụego mmanụ ụgbọala ria oke elu ugbua.

    Okwu a emeela otu jịkọrọ ndị ọrụ oyibo Naịjirịa bụ NLC n’ịchafụ jiri maa ọkwa ma gwa ọha ka ha kee nkwụcha maka abụbọọrụ nakwa ngagharịiwe ha sị ga-amalite n’ụbọchị Wenezde, abalị asaa nke ọnwa Juun, 2023.

    Nke a bụ etu ha siri saa atụmatụ gọọmentị nakwa ọkwa ibuli ego iri mmanụ ụgbọala ụlọọrụ ‘Nigerian National Petroleum Corporation’ (NNPC) wepụtara n’ụbọchị Tọọzde.

    Gịnị bụ iwe NLC?

    Otu jịkọrọ ndị ọrụ oyibo Naịjirịa bụ NLC n’ịchafụ kwuru n’izu gara aga na ha ga-agba abụbọ ọrụ nke enweghi onye ma oge nkwụsị ya n’izu a n'ihi iri elu n'ọnụego mmanụ ụgbọala na Naịjirịa ugbua. Ndị otu a jụrụ mgbanwe ego a na-ere mmanụ ụgbọala nke gọọmentị wepụtara dịka ha kpọrọ ya 'ihe mkpasu iwe' na 'ihe dịka mbakwudo n’ike’. Ọgbakọ gọọmentị etiti na n'ime abalị Wenezde ebighi na nkwekọrịta ọbụla.

    NLC nyere gọọmentị ruo abalị Tuzdee ka ọ gbanwee mbuli ego a maọbụ ha amalite ngagharịiwe nakwa abụbọ ọrụ:

    Onyeisi otu a bụ Joe Ajaero gwara BBC:

    “Gọọmentị ahọpụtaghị ndị ọrụ ọbụla nwereọkwa ga-agwa anyị okwu, ndị anyị na ha na-akpakọrịta enweghị ọkwa oche ọbụla zuruoke”

    Otu ahụ na-ekwu na ọ bụ naanị NNPC na-ebubata ngwaahịa mmanụ ala ugbua ma na-ekwu na ọ bụghị ihe dịịrị ha ihibe ọnụego mmanụ ụgbọala na-ada ugbua dịka ha abụghị ụlọọrụ gọọmentị kpọm kwem.

    Cheta na ụlọọrụ NNPC n’ụbọchị Wenezde, buliri ọnụego mmanụ ụgbọala site na N184 gaa ihe nọ n’agbata 488 - 557 naịra kwa lita.

    Naijiria bụ mba nke abụọ na-emepụta mmanụ n'Afrịka na-ada n'azụ Angola mana na-ebubata ihe karịrị pasentị 90 nke mmanụ mmanụ ya n'ihi enweghị ike nụchaa mmanụ n'ime mpaghara anọ n'ime ụlọ nrụpụta steeti nwere arụrụ arụ.

    Ọtụtụ na-atụkwa egwu na otu ndị ọzọ nwereike isonye na ngagharịiwe nakwa abụbọ ọrụ a na-abịa dịka ihe dị etu meburu n’afọ 2012 mgbe aka chiburu Naijirịa bụ Goodluck Jonathan nwara wepụ ego mbelata a. Ya bụ ngagharịiwe ‘Occupy Nigeria’ kpọturu karịa otu izu n’akụkụ Naịjirịa dị iche iche.

  7. Gọvanọ Rotimi Akeredolu ka dị ndụ - Gọọmentị Ondo Steeti

    Gọvanọ Ondo Steeti Rotimi akatọọla akụkọ kwuru na ọ nwụọla site n’ozi kọmishọna mgbasaozi ya bụ Bamidele Ademola-Olateju wepụtara.

    Ọ gwara ọha ndị steeti ya ka ha gbaa akụkọ ụgha ahụ nkịtị.

    Akụkọ na-ekwu na ahụ esichaghị gọvanọ ike, ugbua ọ nọghị na steeti ebe o nyefeghi osote ya bụ Lucky Aiyedatiwa ikike ọkwa.

    Mana kọmishọna kwuru na Akeredolu na-arụ ọrụ dịịrị ya dịka onyeisi steeti ha ma na-emekwa ya ọfụma.

    O kwetere n’ezie na gọvanọ anọghị nso ugbua.

    N’okwu ya “anyị anụla kepukepu na-ekwu maka ọnọdụ ahụike gọvanọ, anyị gbara ya nkịtị ruo ugbua ndị obi ọjọọ chọrọ iji akụkọ ụgha mee ndọrọ ndọrọ.

    “N’ezie gọvanọ anọghị nso ugbua mana ọ na-arụ ọrụ dịịrị ya dịka gọvanọ mgbe ọbụla ọ dapụtara.

    “Anyị na-asị ka onye ọbụla gbaa nkịtị n’akwụkwọ ụgha na-efegharị na-ekwu na ọ nwụọla.”

    Cheta ba pati Peoples Demcoratic Party (PDP) nke Ondo steeti gwara gọvanọ Akeredolu ka ọ rituo n’ọkwa ma ọ bụrụ na ike ọrụ agwụla ya.

    Nke a dị n’akwụkwọ ozi ọnụ na-ekwuru pati ahụ bụ Kennedy Peretei wepụtara, ma sị ka ha ejikwala ahụike Akeredolu azọ ndọrọ ndọrọ ọchịchị.

  8. Buhari ekwupụtala akụnaụba o nwe ka ọ chịchara Naịjirịa afọ asatọ

    Muhammadu Buhari bụbu Onyeisiala Naịjirịa ekwupụtala akụnaụba o nwe dịka ọ chịchara afọ asatọ.

    Nke a dị n’ime akwụkwọ o degaara ụlọọrụ Code of Conduct Bureau, CCB dịka iwu Naịjirịa.

    Ọnụ na-ekwuru ya bụ Garba Shehu depụtara ozi a na Twitter ya ma kwuo na ụlọọrụ a anabatala akwụkwọ nkwupụta akụnaụba.

    Shehu sị na akwụkwọ ahụ gosiri na akụnaụba Buhari amụbawanyeghi dịka ọ dịbu tupu ọ banye n’ọchịchị.

    O gosikwara na ọ bụ naanị otu ụlọakụ o nwere tupu ọ banye n’ọchịchị ka ọ ka nwe ugbua ọ rịturu.

    Ọ biirighi ego n’aka onye ọbụla maọbụ iji onye ọbụla ụgwọ.

    Ọnụọgụgụ Ụmụanụmanụ dị n’ọrụ ugbo ya gbaturu ala maka na na o nyere ụfọdụ n’ime ha n’onyinye.

    Cheta na Buhari bụ onye bara n'ọkwa ịchị Naịjirịa n'afọ 2015 rịturu n'ọkwa ahụ n'ọnwa Mee afọ 2023 ka ọ chịchara afọ asatọ.

  9. Ụlọakwụkwọ amachiela Akwụkwọ Nso

    Otu mpaghara n'Utah dị na mba Amerịka ewepụla Akwụkwọ Nso(Bible) n'ụlọakwụkwọ Praịmarị ha nakwa sekọndịrị maka "inwe okwu na-asọ ntị oyi" na "tigbuo-zogbuo".

    Komiti ahụ ekwughị akụkụ Nkwụkwọ Nso a sị nwere ihe arụrụala maọbụ tigbuo-zogbuo na ya.

    Nke a na-eso mkpesa nke otu onye nne na nna wetara sị n'Akwụkwọ Nso 'King James Bible' nwere ihe ndị e dere na ya adịghị mma maka ụmụaka.

    N'afọ 2022, Gọọmentị steeti Utah nke pati Republican nọ n'isi ya binyere aka n'iwu machiri akwukwọ ndị nwere ihe na-asọ oyi na ntị n'ụlọakwụkwọ.

    Akwụkwọ ndị a machiriela bụ ndị metụtara mmekọrịta nwoke na nwaanyị nakwa ịbụ nwoke maọbụ nwaanyị.

    Mmachi Akwụkwọ Nso na-abịa dịka ụfọdụ steeti machiri nkuzi megidere ikike dịịrị nwoke maọbụ nwaanyị ndị na-edina ibe ha.

    Mmachi ụfọdụ akwụkwọ a na-ele anya ọjọọ adịla ire na ụfọdụ ebe n'Amerịka dịka Texas, Florida, Missouri na South Carolina.

    A machikwara ụdị akwụkwọ ndị a n'ụlọakwụkwọ nakwa ọba akwụkwọ maka ebubo na ọ metụtara ịkpa oke agbụrụ.

    Mkpebi a mere n' Utah bịara ka ọ gachara izụụka ole na ole nke Davis School District dị n'ugwu Salt Lake City natara mkpesa n'ọnwa Disemba afọ 2022.

    Ndị okwu dị n'aka n'ụlọakwụkwọ ahụ kwuru na ha ewepụla Akwụwkwọ Nso asatọ dị n'ọba akwụkwọ ha, si na o soghị na akwụkwọ e ji akụziri ụmụakwụkwọ ha ihe.

    Otu akwụkwọ akụkọ a kpọrọ Salt Lake Tribune kwuru na onye wetara mkpesa ahụ sịrị na, Akwụkwọ Nso 'King James Bible'' enweghị uru ọbara ndị dị obere maka na ọ nwere ihe ndị na-asọ ntị oyi."

  10. Gọvanọ Zamfara steeti ebola gọvanọ nke pụrụ apụ ebubo iburu ụgbọala ego ya karịrị N2.7b

    Gọvanọ Dauda Lawal nke Zamfara Steeti ebola Bello Matawalle, bụ onye rituru ọhụrụ a n'oche gọvanọ steeti ahụ, ebubo imefu ego karịrị ijeri naịra abụọ na ụma asaa (N2.79 billion) iji gote ụgbọala, ma buru ụgbọala niile ahụ laa.

    Lawal kwuru nke a n'akwụkwọ ozi si n'aka onye enyemaka mgbasaozi ya bụ Sulaiman Bala Idris n'ụbọchị Satọde,

    O kwuru na ụgbọala ndị ahụ gụnyere ọtụtụ ụgbọala jeep ụdị nke mgbọ egbe na-enweghị ike ịbanye, ọtụtụ ụgbọala hilux, ọtụtụ ụgbọala peugeot 406, nakwa ndị ọzọ.

    "Onweghị kama otu n'ime ụgbọala ndị a nke dị n'ụlọ gọọmentị ugbua. Ihe a bụ nnukwu ihe ihere nye APC Zamfara steeti nakwa onye ọbụla na-akwado ihe a Matawalle mere," akwụkwọ ozi ahụ kwuru.

    "Anyị ezigarala Matawalle na osote ya ozi ka ha bughachite ụgbọala niile ndị a n'ime ụbọchị ise."

  11. Ihe karịrị mmadụ 230 alaala mmụọ n'ihe mberede ụgbọ oloko na mba India

    Opekatampe mmadụ 238 anwụọla ebe ihe ruru mmadụ 650 merụrụ ahụ oge ụgbọ oloko atọ takọtara isi na Steeti Odisha nke dị na mpaghara ọwụwa anyanwụ nke mba India.

    Otu onye nọ n'ime otu ụgbọoloko ahụ kwuru na ụgbọ oloko nke ha nọ n'ime ya gahiere ụzọ ma daa ebe ụgbọ oloko ọzọ na-abịa abịa kụrụ ha.

    Ihe mberede a mere na mgbede ụbọchị Fraịde metụtara ụlọọrụ ụgbọ oloko abụọ: Coromandel Express na Howrah Superfast Express.

    Ndị nchịkọta njem ụgbọ oloko nke mba India kwuru na nke a bụ ihe mberede kacha njọ merela na mba ahụ.

    Onyeisi ndịọrụ mgbanyụ ọkụ mpaghara Odisha bụ Sudhanshu Sarangi, kwuru na ọnụọgụgụ ndị nwuru n'ihe mberede a dị 288, mana ọnụ ọgụgụ ndị nke a kpọpụtarala bụ 238.

  12. Fuel subsidy: Anyị ga-amalite abụbụọrụ Juun 7 -NLC

    Otu jikọrọ ndị ọrụ na Naijiria bụ Nigeria Labour Congress(NLC) ekwuola na ndị ọrụ ga-ebido abụboorụ malite n'abalị asaa nke ọnwa Juun,afọ 2023.

    Akwụkwọ ozi nke odeakwụkwọ ukwu otu NLC bụ Emmanuel Udeaja binyere aka ma zigara ndịisioche otu ahụ na steeti 36 dị na Naijiria kwuru na nke a bụ maka ego e tinyere n'ọnụahịa mmanụ ụgbọala na Naijiria.

    Ozi ahụ sịrị, " Mata na malite n'ụbọchị Wenezde, na na Naijiria nile, abụbọọrụ ga-amalite."

    "Ya mere anyị ji enye nd iicioche na steeti ka ha gbaa mbọ hụ na ndị ọrụ ma ndị na-arụrụ gọọmentị ma ndị nkịtị rubere isi ma kwụsị ọrụ dịka ndị isi NLC etiti siri kpebie."

    Cheta na Gọọmentị ọhụrụ nke Bola Tinubu wepụrụ ego mbelata ọnụahịa mmanụ ụgbọala nke mere ka ọnụahịa mmanụ ria site na N194 gbaruo N488.

  13. 10th NASS: Inye Ọwụwa Anyanwụ Osote Onyeisi Ụlọomeiwu Nta bụ ihe mkpasu iwe- Ohaneze

    Otu Ohanaeze Ndigbo agbarụọla ihu etu e si kee ebe ndị ga-abụ ndị isi ụlọomeiwu Ukwu na nke Nta agba nke iri.

    otu ahụ rụtụụ aka na na ikenye Ọwụwa Anyanwụ ohere iwepụta Osote Onyeisi Ụlọnnọchiteanya bụ "ihe mkpasu iwe", nyere ndị omeiwu si mpaghara Ọwụwa Anyanwụ ntuziaka ka ha tụọọ onye masịị ha vootu na-gbanyeghị agbụrụ maọbụ okpukperechi onye ahụ si.

    Ozi nke ọnụ na-ekwuru Ohaneze bụ Alex Ogbonnia binyere aka ma wepụta ụbọchị Fraide, sị, " Anyị ji anya mwute ele etu e si na-eke ọkwa ndị ndu Ụlọomeiwu Ukwu na nke Nta.

    "Anyị hụrụ na otu All Peoples Congress (APC) kenyere Ọwụwa Anyanwụ Naijiria mpaghara Ọwụwa Anyanwụ.

    "Ọhaneze na-ekwu na inye Ọwụwa Anyanwụ ọkwa Osote ụlọomeiwu ekwesịghị ekwesịghị, ọ jọgburu onwe ya ma bụrụ ihe mgbasụ iwe."

    N'ihi nke a, Ohaneze Ndigbo nke Ichie Emmanuel Iwuanyanwu, na-edu na enye ndị Igbo niile bụ ndị omeiwu n'ụlọomeiwu agba nke iri ntuziaka ka ha jiri uche ha tụọrọ onye masịrị ha na-agbanyeghị steeti, okpukperechi maọbụ agbụrụ o si."

    Cheta na nsonso a, e duru Bola Ahmed Tinubu nke APC n'iyi ọrụ dịka onyeisiala n'abalị 29 nke ọnwa Mee, dịka a malitere agba nke Iri nke ụlọomeiwu mana a họbeghị ọrụ ndị ga-abụ ndị ndu ha.

  14. Tinubu ahọpụtala Gbajabiamila dịka 'Chief of Staff'

    Onyeisiala Bola Ahmed Tinubu akpọpụtala onyeisi ụlọ omeiwu nta bụ Femi Gbajabiamila dịka onyeisi ndị ọrụ ya nke a na-akpọ 'Chief of Staff na bekee.

    Tinubu mere nke a n'ọgbakọ nke ya na ndị gọvanọ nọ n'otu ndọrndọrọ ọchịchị 'All Progressives Congress' nwere n'Abuja taa bụ Fraide, dịka onyeisi ngalaba mgbasaozi nke isi ụlọọrụ gọọmentị bụ Abiodun Oladunjoye, siri kwuo.

    Gbajabiamila bụkwa onye meriri ọkwa ịnọchite mpaghara Surulere n'ụlọ omeiwu nta nke Naịjirịa n'Abuja, ma bụrụkwa onye ji ọkwa 'Speaker' n'ụlọ omeiwu ahụ ugbua.

    Ọ ga-eji ọkwa a ruo ụbọchị 13 nke ọnwa Jun afọ a oge ndị isi ọhụrụ nke ụlọ omeiwu ga-ewere ọchịchị.

    Ọ kpọpụtakwara aha Ibrahim Hassan Hadejia, dịka osote onyeisi ndị ọrụ ya. Hadejia bụbụ osote gọvanọ nke Jigawa Steeti.

    Tinubu kpọpụtakwara aha George Akume, bụ onye chịburu Benue Steeti, dịka ode akwụkwọ nke gọọmenti etiti.

  15. Ousmane Sonko: Ọgbaghara ataala isi mmadụ itoolu

    E gbuola o pekata mpe mmadụ itoolu n'ọghaghara dapụtara na mba Dakar isiobodo Senegal nakwa n'obodo Ziguinchor dịka ụlọikpe tụrụ otu onye ndụ pati anọghị n'ọchịchị mkpọrọ ụbọchị Tọzde maka ebubo imebi ndị na-eto eto.

    Ousmane Sonko bụ isi a hụrụ kwawa okpu na ndị pati anọghị na gọọmentị abịaghị ụlọikpe oge a mara ya ikpe mana mịnịsta na-ahụ maka ikpe na mba kwuru na a ga-akpụga ya n'ụlọmkpọrọ mgbe abụla mgbe.

    Ndị uweojii gbara ụlọ Sonko gburu gburu dịka ngwangwa a mara ya ikpe, ebe ndị na-akwado ya wujuru ama malite ngaghariiwe, bụ ebe ha na ndị uweojii kwatara nke taara isi ụfọdụ ndị mmadụ.

    Gọọmentị mba Senegal machiri soshal midia iji hụ n'obodo deere jụụ.

  16. Alex Otti ekposaala ndi isi okpuruọchịchị niile dị n'Abia Steeti

    Gọvanọ Alex Otti ekposaala ndị isi okpuruọchịchị 17 dị n'Abia Steeti nakwa ndị osote ha, ma kwuo na mkposa ha ga-amalịte ịdị iri na-egbughị oge ọbụla.

    Nke a bụ ozi si n'aka ọnụ na-ekwuru gọvanọ ahụ bụ Ferdinand Ekeoma n'ụbọchị Fraịde a, bụ ụbọchị abụọ nke ọnwa Jun 2023.

    N'otu aka ahụ kwa, Otti kposakwara ndị niile ji ọkwa Odeakwụkwọ na ngalaba agụmakwụkwọ n'okpuruọchịchị 17 dị n'Abia Steeti.

    "Ndị isioche okpuru ọchịchị niile n'Abia Steeti ga-ahafe ngwaọrụ gọọmentị niile ha ji n'aka ndị isi ọrụ bekee n'okpuru ọchịchị ha n'otu n'otu.

    "N'otu aka ahụ kwa, ndị odeakwụkwọ ngalaba agụmakwụkwọ niile ga-ahafe ngwaọrụ gọọmentị niile n'aka onye ọkwa ya kacha gbalite n'okpuruọchịchị ha.

    "Ntụziaka a ga-amalite ịdị ire ngwangwa na-egbughị oge, ya mere ndị niile o metụtara ga-erube isi ozugbo iji hụ na ọrụ na-aga nke ọma n'okpuru ọchịchị dị icheiche," Ferdinand Ekeoma dere.

    Cheta na dịka ọ fọdụrụ izu ụka olemole ka ọchịchị ya bịa na njedebe, Gọvanọ Abia Steeti pụrụ apụ bụ Okezie Ikpeazu chọburu ịhazi ntuliaka maka ọkwa ndị isi oche okpuruọchịchị, mana ụlọikpe kwụsịrị ya.

    N'aka nke ọzọ, Gọvanọ Alex Otti akpọpụtala aha mmadụ 22 bụ ndị ọ họrọ n'ọrụ n'ọkwa dị icheiche n'ọchịchị ya, bụ ndị ọrụ ha malitere n'ụbọchị Tọzde, bụ abalị mbụ nke ọnwa June 2023.

    Kazie Uko, bụ onyeisi ọrụ ntaakụkọ nke Gọvanọ Otti wepụtara ozi gbasara nke a.

    Ndị a e were n'ọrụ ọhụrụ gụnyere:

    1. Michael Akpara - Onye ndụmọdụ pụrụ iche maka okwu ego

    2. Uwanna Ikechukwu - Onye enyemaka n'okwu gbasara ụlọikpe

    3. Ọkammụta Uche Eme Uche - Onye ndụmọdụ pụrụ iche maka agụmakwụkwọ

    4. Ọkammụta Joel F. Ogbonna - Onye ndụmọdụ pụrụ iche n'okwu ngalaba mmanụ agbịdị

    5. Clifford C. Agbaeze - Onye enyemaka pụrụ iche n'okwu ọrụ ubi

    6. Chimereze Okigbo - Onye ndụmọdụ pụrụ iche maka inweta ego

    7. Uche Mark Nwosu - Onyeisi 'Protocol'

    8. Uche Ukeje - Onye enyemaka pụrụ iche maka mwugharị Aba

    9. Dodoh Okafor - Onye enyemaka pụrụ iche maka mgbasaozi ọha

    10. Uzor Nwachukwu - Onye ndụmọdụ pụrụ iche maka okwu okpuruọchịchị na echichi odịnala

    11. Kingsley Anosike - Onye ndụmọdụ pụrụ iche maka ịhazị atụmatụ gọọmentị

    12. Uzoma Nwagba - Onye enyemaka pụrụ iche n'okwu akụnụba na nkwalite ụlọahịa nta (SME)

    13. Rev Father Christian Uche Anokwuru, PhD - Onye ndụmọdụ pụrụ iche maka nke bekee kpọrọ 'Policies and Interventions'

    14. Ifeoma Thomas - Onye enyemaka pụrụ iche n'okwu gbasara mmela ụbịam na nkwalite ndị otu a na-emegide

    15. Pastor Dike Nwankwo - Onye enyemaka pụrụ iche maka ọrụ pụrụ iche

    16. Okey Kanu - Onye ndụmọdụ pụrụ iche maka mgbasaozi n'ụzọ pụrụ iche

    17. Dr. (Mrs.) Betty Emeka-Obasi - Onye enyemaka pụrụ iche maka ọrụ pụrụ iche

    18. Chinedu Ekeke - Onye enyemaka pụrụ iche maka okwu ndị ntorobịa nakwa egwuregwu

    19. Chuka Ofili - Onye enyemaka pụrụ iche maka ọrụ ime ụlọ (Domestic)

    20. Luke Ukara Onyeani - Onye enyemaka pụrụiche maka okwu gbasara ndị omeiwu

    21. Navy Commander Macdonald Ubah (Rtd) - Onye enyemaka pụrụ iche n'okwu nchekwa

    22. Dr. Chimezie Ukaegbu - Onye enyemaka pụrụ iche maka okwu azụmahịa

  17. Gọọmentị Abia amalitela ijichi ndị agboro na-enye nsogbu n'Aba

    Gọọmentị Abia Steeti amalitela ibuso ndị agboro na-enye ndị mmadụ nsogbu na mpaghara Aba agha, dịka ha kwuru na a machiela ndị nkịtị ọbụla ịnakọ ndị ahịa ụtụisi na steeti ahụ.

    Osote Gọvanọ Steeti ahụ bụ Ikechukwu Emetu na ụfọdụ ndị ọrụ nchekwa so kpagharịa na mpaghara dị icheiche n'Aba dịka Ehi road, Asaa, Azikiwe, Eziukwu, Ahịa Cemetry na ndị ọzọ.

    Ndị ọrụ nchekwa jidere ụfọdụ ndị ha boro ebubo na ha kachiri ntị na-anakọ ndị mmadụ ego na nnupuisi n'iwu ọhụrụ nke gọọmentị tiri.

    Ikechukwu Emetu, dịka ọ na-agwa ndị mmadụ okwu na mpaghara ndị a, kwuru na gọọmentị Abia Steeti agaghị agbachị nkịtị ka ụfọdụ ndị ekperima na-aga n'ihu na-ewetara ọchịchị Gọvanọ Alex Otti aha ọjọọ.

    "Anyị enyela ndị uweojii na ndị ọrụ nchekwa ndị ọzọ iwu ka ha hụ na ndị ọbụla na-enupu isi n'iwu gọọmentị tiri nwetara ntaramahụhụ kwesịrị ha dịka iwu obodo si dị," Emetu kwuru.

  18. Godwin Emefiele: O nweghị mgbe anyị jiri wedaa uru naịra ebe dọla nọ - Ụlọọrụ CBN

    Ụlọọrụ Central Bank of Nigeria bụ CBN adọọla ọha aka na ntị maka akụkọ ụlọọrụ Daily Trust dere n'ụbọchị Juunu 1, 2023, ebe ha sị na ụlọọrụ CBN ewedaala uru naịra ebe dọla nọ.

    N'edemede ha bipụtara ha sị "Anyị chọrọ ka ọha mara na akụkọ gbasara iweda uru naịra ebe dọla nọ bụ nnukwute ụgha, dịịrị ụlọọrụ ndị ntaakụkọ bipụtara ya dịka nnukwu akụkọ. Ọ bụ nnukwu asị na ọ bụ ihe si n'ụlọọrụ Nigerian Foreign Exchange Market."