You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.

Take me to the main website

France Riots: Nnukwu ọgbaaghara adapụtala na mba Fransị n'ihi ogbugbu otu nwa okorobịa

Lee akụkọ ndị gbara ọkpụrụkpụ n'akụkọ na-eme na mba ụwa..

Mkpuchi Na Eme Ozugbo

Adline Okere, Ikechukwu Kalu, Chukwunaeme Obiejesi and Uche Akolisa

  1. Lee aha ndị ga-azọ ọkwa gọvanọ Imo steeti Inec wepụtara

    Ụlọọrụ na-ahụ maka ntuliaka na Naịjirịa bụ Independent National Electoral Commision (Inec) ewepụtala aha ikpeazụ nke ndị ga-azọ ọkwa gọvanọ n’Imo, Bayelsa nakwa Kogi steeti n’ụbọchị 11 Nọvemba, 2023.

    Ọnụ na-ekwuru ụlọọrụ a bụ Festus Okoye sị a nke a so n’isi mkparịtaụka ụlọọrụ ha nwere n’ụbọchị Tuuzde n’Abuja.

    “Ọ bụ ihe dị n’iwu Naịjirịa na e wepụtara aha ndị ga-azọ ọkwa ka ọ fọrọ ụbọchị 150 ka e mee ntuliaka.

    A ga-etinye aha ndị ga-azọ ọkwa ahụ n’ọbaozi websaịt ụlọọrụ Inec bụ ebe mmadụ niile ga-ahụ ya.”

  2. "Gọọmenti bitere ụgbọelu Nigeria Air ahụ site n’aka ụlọọrụ Ethiopian Airlines"

    Onye na-arụ ọrụ dịka onyeisi ụlọọrụ Nigeria Air bụ Dapo Olumide kwuru na ụgbọelu ahụ gọọmentị ji mee ngosi bụ ụgbọelu e bitere n’aka ụlọọrụ Ethiopian Airlines.

    Olumide onye kwuru nke n’isi kọmitii ụlọomeiwu na-ahụ maka njem ụgbọelu sị na e bughachịrịla ndị Ethiopian Airlines ụgbọelu ahụ dịka e kpughechara ya.

    Onyeisi kọmitii ahụ bụ Biodun Olujimi gbarụrụ ihu ihe mere Hadi Sirika bụbu minista njem ụgbọelu jiri mee ngwa ngwa gosi ụgbọelu ahụ n’ụbọchị Onyeisiala Buhari na-arịtu n’ọkwa.

    Onyeisi kọmitii ụgbọelu a n’ụlọomeiwu nta bụ Nnolim Nnaji kwuru na mkpughe ahụ bụ ihe aghụghọ.

    Olumide kwuru na e mere mkpughe ụgbọelu Nigeria Air ahụ iji gwa ndị Naịjirịa na ụgbọelu ahụ abụghị akụkọ aja mbele.

    Kedụ ihe kọmitii a kpebiri?

    • Ha kpebiri ka ministri na-ahụ maka njem ụgbọelu kagbuo atụmatụ ụlọọrụ Nigeria Air nakwa ihe ọbụla gbasara ya.
    • Ha gwara Onyeisiala Bola Tinubu ka o hiwe kọmitii ga-enyocha ihe ọbụla gbasara ụlọọrụ Nigeria Air nakwa ego ndị e mefurula na ha.
    • Ha kwuru na a ga-agba mbọ hụụ na a tara ndị niile aka ha dị n’aghụghọ ikpughe ụgbọelu Nigeria Air ahụhụ ruuru ha.
  3. Ndewo nụ

    Igbo ndị ọma anyị na-anabata unu n'obi ọma n'ọgbakọ anyị taa.

    Bịa nọnyere anyị ka ịhụ ka o si aga.

  4. Gụrụ gbadaa maka kụkọ ụbọchị Tuzde

    Daalụ rinne maka isonyere anyị na mgbasaozi nke taa.

    Gụrụ gbadaa maka kụkọ niile dị mkpa mere ụbọchị Tuzde, June 6.

    Maka akụkọ ndị ọzọ ga-amasị gị, gaa na bbc.com/igbo.

    Ka ọ dị echi.

  5. Etu ọkụ si gbarie ụlọikpe Majie dị n'Ebonyi, laa ọtụtụ ihe n'iyi

    Ọkụ agbariela ụlọikpe 'magistrate' dị n'Ebonyi Steeti ma lakwaa ngwa ụlọ ọnụego ya ruru nde kwuru nde naịra n'iyi.

    Onye ji ọkwa 'Chief Registrar' n'ụlọikpe ahụ bụ oriaku Onuoha gwara onye ntaakụkọ anyị na ọkụ ahụ malitere n'ebe elekere iri na abụọ maọbụ elekere mbụ nke isi ụtụtụ ụbọchị Fraịde, ụbọchị abụọ nke ọnwa June 2023.

    "Dịka ị na-ahụ ebe, ọkụ a lara ọtụtụ ihe anyị ji arụ ọrụ n'iyi, ihe karịrị nde naịr 40 lara n'iyi n'ọkụ a," Oriaku Onuoha kwuru.

    "Naanị ebe na-agabghị ọkụ bụ ebe a na-akpọ 'rgistry' n'ihi na ndị ọrụ mgbanyụ ọkụ gbatara n'oge iji menyụọ ya bụ ọkụ."

    Ọ kọwara na a na-eche na ọ bụ igwe na-enye ọkụ a na-akpọ 'transformer' na bekee, nke dị nso n'ụlọikpe ahụ, kpatara ọkụ a.

    Onweghị onye ọbụla nwụrụ maọbụ merụọ ahụ n'ihe mberede a.

  6. Ọgbaaghara obodo na obodo ataala isi mmadụ abụọ n'Ebonyi Steeti

    Mmadụ abụọ alaala mmụọ n'isi ụtụtụ taa bụ Tuzde dịka ọgbaaghara na-ada n'etiti ndị obodo Abaomege na Ishinkwo nke dị n'Ebonyi Steeti.

    Ọnụ na-ekwuru ndị uweojii steeti ahụ bụ Onome Onovwakpoyeya kwuru na otu onye uweojii merụkwara ahụ na ya bụ ọgbaaghara.

    N'akwụkwọ ozi si n'aka ndị uweojii, Onovwakpoyeya kwuru na "mmadụ atọ, nke gụnyere otu onye uweojii, na-alọta ọrụ n'isi ụtụtụ oge ndị agha obodo Ishinkwo wakporo ha ma gbaa ha egbe. Oge e bugara ndị a ụlọọgwụ, achọpụtara na mmadụ abụọ n'ime ha anwụọla ebe onye uweojii ahụ na-anata ọgwụgwụ n'ụlọọgwụ."

    Ndị uweojii akọwaghị ihe kpatara nsogbu a n'etiti obodo Abaomege na Ishinkwo, mana ọgbaaghara n'etiti obodo na ibe ya na-eme oge ụfọdụ na mpaghara Ebonyi steeti.

    N'afọ 2022, mmadụ asaa tụfuru ndụ ha na nsogbu dapụtara n'etiti obodo abụọ a dịka akụkọ kwuru na ọ bụ ihe gbasara oke ala na-esere ha.

  7. Ihe m gaara eme gbasara iwepụ ego 'fuel subsidy' - Peter Obi

    Onye zọburu ọkwa onyeisiala Naịjirịa n'otu ndọrọndọrọ ọchịchị 'Labour Party' bụ Peter Obi ekwuola ihe ọ gaara ime ma ọ bụrụ na ọ bụ ya bụ onyeisiala Naịjirịa, gbasara mwepụ ego gọọmentị na-akwụ iji butuo ọnụahịa mmanụ ụgbọala, a na-akpọ 'fuel subsidy' na bekee.

    Obi kwuru na ya gaara ebu ụzọ tinye atụmatụ dị icheiche iji belata ahụhụ ndị mmadụ ga-ata n'ihi mgbali elu ọnụahịa mmanụ ụgbọala.

    "Ọ bụrụ na i na-eso m nke ọma, malite n'oge m so na ndị ndụmọdụ nye onyeisiala (Goodluck) Jonathan, ekwuola m ugboro ugboro na 'subsidy' bụ ohi ka ọtụtụ ndị mmadụ ji ya ezu. Ekwukwara m na m ga-akwụsị ya," Obi kwuru.

    "Ọbụladị mgbe m na-achụ nta vootu, ekwukwara m na m ga-akwụsị ịkwụ ụgwọ subsidy."

    "Mana e kwenyere m na e kwesịrị ịkwụsị 'subsidy', mana gọọmentị kwesịrị itinye ihe dị icheiche ga-ebelata ahụhụ ndị mmadụ, ma kọwaara ha kpọmkwem ihe a ga-eji ego si na ya mee."

    "Ọbụladị oge onyeisiala Jonathan kwụsịrị 'subsidy', ọ bụ oge ahụ ka e wepụtara atụmatụ 'Sure-P' na ụfọdụ ihe ndị ọzọ."

    "Oge m bụ Gọvanọ Anambara Steeti, emere m ụfọdụ ihe yitere nke a, ya bụ ịkwụsị ụfọdụ ihe iji mepụta ihe ndị ọzọ, mana a ga-eme ya n'ụzọ ga-edo ndị mmadụ anya.

    "Ọ bụrụ na gọọmentị na-agwa ndị mmadụ ka ha nwee ndidi na-ata ahụhụ, o kwesịrị ka ndị mmadụ ghọta kpọmkwem uru ahụhụ ha na-ata ga-abara ha n'ọdịnihu."

    Chetakwa na Atiku Abubakar, onye zọrọ ọkwa onyeisiala na otu 'Peoples Democratic Party' kwukwara na ọ bụrụ ya bụ onyeisiala, ọ karaghị akwụsị ịkwụ 'subsidy' n'otu ntabi anya, kama ọ gaara ebu ụzọ nwee mkparịtaụka ya na ndị ọrụ nakwa ndị ọzọ iji mata usoro a ga-eji mee ya ka ọ ghara ibute nnukwu ihe isi ike n'obodo.

    N'ụbọchị e duru ya n'iyi ọrụ, Onyeisiala Bola Ahmed Tinubu kwuru na "Ịkwụ ụgwọ subsidy akwụsịla", nke a mere ka ọnụahịa mmanụ ụgbọala rịa elu n'otu ntabi anya, mekwaa ka ọnụahịa ọtụtụ ihe ndị ọzọ gbalie.

    N'ihi nke a, otu jikọrọ ndị ọrụ Naịjirịa bụ 'Nigeria Labour Congress' na 'Trade Union Congress' kwuru na ha ga-agba abụbụọrụ, mana gọọmentị gara ụlọikpe ma nata ikike iji gbochie abụbụọrụ a.

    Ka ọ dị ugbua, gọọmentị etiti na ndị NLC na TUC na-enwe ọgbakọ iji mara etu a ga-esi belata ihe nhịahụ nke ndị ọrụ na-agabiga ugbua.

    Gọọmentị kwuru na ha dị njikere ibuli ụgwọọnwa ndị ọrụ.

  8. Ụlọikpe akụchapụla ikpe sị na Tinubu enweteghi vootu 25% n’Abuja

    Ụlọikpe Ukwu dị n’Abuja akụchapụla akwụkwọ mmadụ ise ndị bi n’Abuja gbara nke sị ka a ghara idu Bola Tinubu n’iyi ọrụ dịka onyeisiala.

    Ọkaikpe Inyang Ekwo nọ n’isi ikpe ahụ nyere ọkaiwu na-anọchite mmadụ ise a ka ọ kwụọ nde naịra iri (N10m) n’otu n’otu nye ọkaiwu gọọmenti nakwa Ọkaikpe ukwu Naịjirịa.

    Ndị a gbara akwụkwọ sị na Tinubu enweteghi vootu ruru pasentị iri abụọ na ise (25%) n’isiobodo Naịjirịa bụ Abuja.

    O kwuru na ndị a e nweghi ikike ịgba akwụkwọ.

    Ọ gakwara n’ihu kwuo na ọ bụ naanị n’ụlọikpe ‘presidential election petition tribunal’ ka e nwere ike ịgba ụdịrị akwụkwọ na ọ bụghị n’ụlọuikpe ukwu.

    Cheta na ikpe ka na-aga n’ihu ugbua n’ụlọikpe na-ahụ maka ntuliaka banyere etu ntuliaka onyeisiala si gaa n’ọnwa Febụwarị.

  9. Ụlọomeiwu anabatala atụmatụ Tinubu ịhọpụta ndị ndụmọdụ 20 pụrụiche?

    A na-atụ anya na onyeisiala Naịjirịa bụ Bola Ahmed Tinubu ga-ekpọpụta aha ndị ga-abụ isi ntọala ọchịchị ya. Akụkọ na-ekwu na onyeisiala anatala ikike n’aka ndị ụlọomeiwu ịhọpụta ihe dị ka ndị ndụmọdụ 20 pụrụiche dịka otu izuụka gachara ka e duchara iyi n’ọrụ.

    A na-atụ anya nhọpụta ndị a nwereike igosi ụmụafọ Naijiria ma nye ntụzịaka ụdịrị ụzọ ọchịchị gọọmentị ọhụrụ a nwereike iso ọkachasị n’okwu ihazi nchekwa na akụnaụba Naịjirịa so n’ihe aka mgba na-eche Naịjirịa ihu ugbua.

    Gọọmenti na-agbasi mbọ ike ịdaju nsogbu ndị na-ada nke so ọkwa onyeisiala ọhụrụ mara n'izu gara aga maka mwepụ mbelata mmanụ ụgbọala (fuel subsidy). Ọkwa kpatara iri elu ọnụego mmanụ ụgbọala n’akụkụ Naịjirịa dị iche iche ruo ụzọ anọ etu o dịbụ.

    Otu jịkọrọ ndị ọrụ Naịjirịa kweburu nkwa ịgba abụbụọrụ nakwa ime ngagharịiwe mana ha ga-akwụsịtụla mkpebi a ka ha na gọọmentị etiti nwechara mkparịtaụka nakwa ka ụlọikpe nyere n'iwu ka ya bụ atụmatụ ghara ime n’ụbọchị Wenezde.

    Cheta na mmeri Onyeisiala Tinubu na ntuliaka bụ ihe ụfọdụ pati nakwa ụfọdụ ndị na-agbagha n’ụlọikpe dịka a na-ebo ebubo ma na-arụ aka na usoro ntuliaka ahụ nwere ntuliaka ma ghara iso usoro ziri ezi.

  10. Ogbunigwe agbapuola mgbidi mmiri n'Ukarine dịka idemmiri so ya na-akpata egwu ebe ahụ

    Mba Ukraine na-ebo ndị ọru nchekwa Russia ebubo iwakpo ma tụọ ogbuniwe gbapuru mgbidi mmiri dị na mpaghara Kherson mana Russia gọrọ aka ha na ukwu ha na ha emeghi ihe dị etu a.

    Dịka mmiri na-awụpụ site n’ime mgbidi mmiri ahụ, lee ihe ndị ị kwesịrị ima:

    • Otu mgbidi mmiri ebe a na-emepụta ọkụ latrịk bụ n’obodo Ukraine nke Nova Kakhovka ebe ndị Russia nọjuru abụrụla ebe mmiri juru n’ime ya kemgbe abalị dịka mmiri ka na-awụba ebe ahụ
    • Ụlọọrụ ntaakụkọ Russia na-ekwu na ya bụ mwakpo dị oke egwu ma na-ekwu na obodo ahụ abụrụla ebe mmiri tojuru
    • Onyeisiala Ukraine bụ Volodymyr Zelensky na-ebo ndịagha Russia ebubo ịgbapụ ya bụ ụlọọrụ site n’ime ya n’ebe elekere 2:50 ebe Russia na-ekwu na nke a bụ atụmatụ mba Ukraine iji megharia ọha anya. BBC enwebeghiike mata nke bụ eziokwu doroanya n’okwu ndị a.
    • A na-agba mbọ ibupụ ndị mmadụ ebe ahụ dịka Zelenksy na-ekwu na obodo ruru 80 enwereike ịbụ ndị idemmiri so mgbapụ mgbidi mmiri ga-emetụta.
    • Ihe metụtara ihe ruru ebe mpaghara obibi asatọ ebe ahụ.
    • E tinyere ọnọdụ gbata gbata nke ‘state of emergency’ na Nova Kakhovka dịka ụlọ ntaakụkọ Russia siri kwuo.
    • Mgbidi mmiri a bụkwa ebe ọtụtụ ndị mmadụ na-adabere maka inweta mmiri ha ji eme ihe ndị ha mkpa gụnyere ụlọ mmepụta ọkụ nke ‘Zaporizhzhia nuclear power station’
    • Onyeisi ngalaba UN na-ahụ maka mmepụta ikike nuklịa bụ IAEA na-ekwu na ọ bụrụ na enweghi dajụọ ọkụ na-ekpo n’ụlọọrụ mmepụta ọkụ nke Zaporizhzia ọkụ nwereike ịgbapụ ebe ahụ - mana a na-ekwu na ọnọdụ ihe rubeghi nke gbata gbata ebe ahụ
    • Odeakwụkwọ ukwu otu ụwa Nato bụ Jens Stoltenberg kwuru na mwakpo a “dị egwu” bụ ihe akaebe na “Agha Russia na-alụ na Ukarine bụ nke tigbuo zọgbụọ” dịka otu EU katọrọ mwakpo ahụ ma kpọọ ya “agwa ọjọọ n’agha” nke Russia na-akpasa Ukraine.
  11. Etu ndị ọrụ nọọsụ si awụpụ Ghana awụga UK maka ọrụ

    Ngụkọ n’afọ 2022 gosiri na ndị ọrụ nọọsụ si mba Ghana kariri 1,200 wụbara mba UK maka ọrụ.

    Nke a na-abịa dịka mba otu ahụike nke mba Briten bụ National Health Service (NHS) na-adabere na mba ndị na-abụghị mba ndị nọ n’okpuru European Union (EU) maka ịchụta ndị ọrụ.

    Agbanyeghi na mba UK kwuru na achụmnta ndị ọrụ na Ghana abụghị ihe a nabatara, oge soshal midia a emeela ya ọ bụrụ ihe dị mfe na ndị nọọsụ (gụnyere ndị nke Ghana) nwereike ịhụ ohere ebe ọrụ dị site NHS trusts. Nke a pụtara na ha nwereike tinye akwụkwọ maka ọrụ ndị ahụ ozugbo.

    Mana ka ọ dị, Howard Catton nke otu jịkọrọ ndị ọrụ nọọsụ ụwa bụ International Council of Nurses (ICN) kwuru na ọnụọgụgụ ndị nọọsụ na-awụpụ Ghana bụ ihe ha na-eche ha echiche.

    O kwuru na o na-eche na ndị na-awụpụkarị mba ha bụ mba ebe ndị ọnọdụ ihe na-adakpo.

    Ọnọdụ akụnụba Ghana n’oge na-adasiike.

    Echiche ọzọ na-echekwa ndị na-ewe ọrụ bụ etu ọnọdụ ọpụpụ ndị nọosụ ga-esi metụta ahụike ndị mmadụ na mba Ghana.

    Onyeisi ndị ọrụ nọọsụ n’otu ụlọọgwụ Ghana nke Greater Accra Regional Hospital bụ Gifty Aryee kwuru na n’ime ọnwa isii gara aga ndị nọọsụ 20 apụọla ma wụba mba Amerịka na Briten bụ ndị si na ngalaba ebe a na-eleta ndị nọ n’ọnọdụ ahụike ọjọọ anya.

    Ghana so na mba otu ahụike ụwa (WHO) tinyere akara uhie dịka mba ebe ndị ọnụọgụgụ ndị nọọsụ ezughi ezu ma a tụnyere ọnụọgụgụ ndị bi na mba ahụ ugbua.

    Ihe dị etu a na-emekwa na mba agbataobi Ghana bụ Naịjirịa dịka mba UK wepụtara ha mba abụọ nakwa mba ndị ọzọ dịka ebe ha agaghịzị na-eme achụmnta iwe ọrụ ndị ọrụ ahụike maka ozi WHO.

    Ndị mere ndị ụlọomeiwu jiri chọọ ime iwu ga-eme ga ndị ọrụ ahụike natara ọzụzụ na Naijirịa gharazie inweta akwụkwọ ikike ọrụ n’uju ruo mgbe ha ruru n’ụlọọgwụ Naịjirịa afọ ise.

    Atụmatụ iwu a ka bụ ihe a na-atule n’ụlọọmeiwu Naịjirịa.

  12. Ihe mere otu jịkọrọ ndị ọrụ ahụike ji kagbuo abụbụọrụ ha

    Ndị ọrụ ahụike Naịjirịa nọ n'ụlọọgwụ gọọmentị akwụsịla abụbọ ọrụ ha nọrọla ụbọchị 12 ka onyeisiala Bola Tinubu kwere nkwa imezu ihe niile ha chọrọ.

    Otu jịkọrọ ndị ọrụ ahụike bụ Joint Health sector Union (Johesu) bụ ndị zutere Onyeisiala na Mọnde kwuru na ha ekpebiela inye gọọmentị izuụka atọ iji lebeanya n’ihe niile ha chọrọ.

    Onye osote onyeisi otu ahụ bụ Dkt Obinna Ogbonna kwuru na "ọgaihu pụrụtara" n'oge ha na onyeisiala nwere mkparịtaụka.

    "Inye mmadụ ohere ntụkwasị obi bụ ihe nwereike ire isi na-abụ mana ebe ọ bụ na anyị na Onyeisiala ọhụrụ na-akpakọrịta nke bụ onye gwara anyị ka anyị nye ya oge iji dozie nsogbu niile, anyị ga-enye ohere a”

    Dr Obinna gwara BBC na "Mgbe abalị 21 gachara, anyị ga-enyocha ihe e merela n’okwu ihe anyị na-achọ ma mee kpebie usoro ọzọ anyị ga-eso.

    "Ndị ọrụ ahụike na-arịọ gọọmentị ka akwado ma binyeaka ozugbo ozugbo na atụmatụ usoro ịkwụ ụgwọ ọnwa ndị ahụik, ịkwụ ha ụgwọ ọnwa ha sị e ji ha nakwa megharị afọ ezumike nka ndị ọru ahụike nakwa ihe ndị ọzọ.

    Johesu bụ otu ndị ọrụ ahụike Naịjirịa na-ahụ n’ụlọọgwụ gọọmentị ma na-agụnyeghị ndị dọkịta, ndị dọkịta eze na ndị nọọsụ.

  13. NLC na TUC akagbuola abụbụọrụ ha chọrọ ịmalite na Wenezde

    Otu jikọtara ndị ọrụ na Naịjirịa bụ Nigeria Labour Congress (NLC) akagbuola abụbụọrụ ha chọrọ ịgba n’ụbọchị Wenezde 7 Juun, 2023.

    Onyeisi otu a bụ Joe Ajaero kwuru nke a n’abalị Mọnde dịka ha na gọọmenti etiti nwechara mkparịtaụka ma sị na mkpebi a bụ ka e nye ohere maka mkparịtaụka ọzọ.

    NLC na ogbo ha bụ Trade Union Congress (TUC) na gọọmenti ga-ezukọ ọzọ n’ime izuụka abụọ na-abịa (ụbọchị 19 Juun, 2023).

    Ha kwekọrịtara ime nzukọ a iji mara etu a ga-esi e nyere ndị mmadụ aka maka ọnuego mmanụ ụgbọala nke rịrịla elu ugbua.

    N'otu aka ahụ onyeisi ndị ọrụ Onyeisiala Bola Tinubu bụ Femi gbajabiamila wepụtara akwụkwọ ozi gosiri nkwekọrịta gọọmentị na ndị ọrụ NLC na TUC

    Cheta na ụlọikpe na-ahụ maka ndị ọrụ bụ Industrial Court nyere iwu ka ndị ọrụ kagbuo atụmatụ ọbụla ha nwere n’ịgba abụbụọrụ ruo mgbe a ga-eleba anya n’akwụkwọ gọọmentị etiti gbara ha.

    Ụfọdụ ihe ndị ọrụ ana-achọ n’aka gọọmenti bụ ka e bulie ụgwọọnwa opekatampe ha nakwa iwepụrụ ha ụfọdụ ụtụisi.

    Nsogbu niile a malitere mgbe ndị na-ere mmanụ ụgbọala ji ego karịrị pasentị narị abụọ (200%) bulie ọnụego mmanụ ụgbọala n’ịzuụka gara aga.

    Nke a emeela ka ego ụgbọala rịa elu, tinyere ego nri nakwa ihe ndị ọzọ e ji ebi ndụ, ebe ụgwọọnwa opekatampe ka bụ puku naịra iri atọ (30,000).

  14. Igbo ndị ọma anyị na-ekele unu n'ụtụtụ ọma

    Obi ọcha ka anyị ji anabata unu n'ọgbakọ anyị n'ụbọchị taa.

    Buru oche gị bịa gụọ akụkọ ndị gbapụtara ihe na Naịjirịa, Afrịka nakwa ụwa niile.

  15. Gụrụ gbadaa maka akụkọ ụbọchị Mọnde

    Anyị ga-amalite ọzọ n'elekere asatọ nke ụbọchị Tuzde.

    Maka akụkọ ndị ọzọ ị chọrọ, gaa na bbcigbo.com.

    Ka chi fo.

  16. Ihe karịrị mmadụ 350 merụrụ ahụ na ngagharịiwe na mba Senegal - Red Cross

    Otu gbatagbata a na-akpọ 'Red Cross' wkeuola na ihe karịrị mmadụ 350 merụrụ ahụ n'ọgbaghara dapụtara n'ụbọchị Tọzde gara aga na mba Senegal, dịka ụlọikpe tụrụ onyeisi ndị pati na-anọghị n'ọchịchị bụ Ousmane Sonko mkpọrọ afọ abụọ.

    Opekatampe mmadụ 16 anwụọla n'ọgbaaghara a dapụtara n'etiti ndị nkwado Sonko na ndị ọrụ nchekwa na Dakar, isi obodo Senegal, nakwa na Zinguinchor nke bụ obodo Sonko.

    Ndị nkwado Sonko na-ekwu na mkpọrọ ahụ a tụrụ onyeisi ha maka "imetọ" nwata nwaanyị abụghị eziokwu kama ọ bụ iji gbochie ya ịzọ ọchịchị ọ na-azọ.

    Ha katọkwara nnukwu aka ike nke ndị ọrụ nchekwa ji ebuso ndị na-akatọ gọọmentị agha.

    N'ụbọchị Sọnde, ebe niile datụrụ jụụ, dịka gọọmentị kpachiri ịntanetị iji kwụsị nkesa ozi bụ nke ha kwuru na ọ bụ ya na-akpata ọgbaaghara ahụ.

  17. Ụlọikpe dị n'Abuja amachiela NLC ịgba abụbụọrụ

    Otu ụlọikpe ukwu dị n'Abuja amachiela otu jikọrọ ndị ọrụ Naịjirịa bụ 'Nigeria Labour Congress' ịga n'ihu ịgba abụbụọrụ n'ụbọchị Wenezde, bụ ụbọchị asaa nke ọnwa June 2023, dịka ha si kwụpụta.

    Ọkaikpe O.Y Anuwe nyere mkpebi a ta dịka gọọmentị etiti wegara mkpesa n'ụlọikpe maka abụbụọrụ NLC sị na ha ga-agba.

    Gọọmentị etiti kwuru na abụbụọrụ ahụ ga-emetụta ngalaba dị icheiche na Naịjirịa, tinyere ule WAEC ụmụakwụkwọ sekọndịrị, agụmakwụkwọ ụmụakwụkwọ mahadum bụ ndị ka si n'abụbụọrụ nke ndị otu ASUU gbara apụta, nakwa ahụike ọtụtụ ụmụ Naịjirịa.

    Ọkaikpe Anuwe nyere iwu ka ndị NLC ghara ịga n'ihu n'abụbụọrụ ahụ ha chọrọ ịgba. O tinyekwara ụbọchị Mọnde izuụka abụọ na-abịanụ, nke bụ ụbọchị 19 nke ọnwa Jun, dịka ụbọchị a ga-ekpe ikpe ahụ.

    NLC kwuru na ha ga-amalite abụbụ ọrụ n'ụbọchị asaa nke ọnwa Jun maka etu gọọmentị etiti si kwụsị ịkwụ ego ha na-akwụbu iji butuo ọnụahịa mmanụ ụgbọala, bụzi nke mere ka ọnụ ahịa mmanụ ụgbọala, nakwa ọnụahịa ọtụtụ ihe ndị ọzọ gbalie oke elu.

    Joe Ajaero, bụ onyeisi NLC nakwa ndị isi ndị ọrụ ndị ọzọ, na-ekwu na gọọmentị echeghị maka ọnọdụ ndị ọrụ oge ha kpebiri ịkwụsị 'fuel subsidy'.

  18. NUPENG, NASU, esonyela abụbụọrụ nke ụbọchị Wednesday

    Otu jikọrọ ndị ọrụ na-arụ na ngalaba mmepụta na nkesa mmanụ ụgbọala bụ 'Nigerian Union of Petroleum and Natural Gas Workers (Nupeng), ekwuola na ha ga-erube isi n'iwu ịgba abụbụọrụ bụ nke otu jikọrọ ndịọrụ na Naịjirịa bụ NLC tinyere, malite n'ụbọchị Wenezde, bụ ụbọchị asaa nke ọnwa June afọ 2023.

    Nupeng kwuru nke a site n'akwụkwọ ozi nke odeakwụkwọ ha bụ Afolabi Olawale binyere ajka na ya n'ụbọchị Mọnde.

    N'otu aka ahụ kwa, otu jikọrọ ndịọrụ na-abụghị ndị nkuzi n'ụlọakwụkwọ dị elu dị icheiche na Naịjirịa, a kpọrọ 'Non-Academic Staff Union of Educational and Associated Institutions (Nasu), kwukwara na ha ga-esonye n'abụbụ ọrụ a nke NLC nyere iwu ya.

    Cheta na otu jikọrọ ndịọrụ ọkụ latrik bụ 'National Union of Electricity Employees' bụ ndị bu ụzọ wepụta akwụkwọ ozi iji gosi na ga-esonye n'abụbụ ọrụ a.

    Mana gọọmentị etiti agwala ndị NLC na ndị otu ha ka ha chegharịa echiche maka abụbụọrụ a ha na-achọ ịgba.

    Gọọmentị kwuru na ha dị njikere ileba anya ma bulie ụgwọ ọnwa opekatampe a na-akwụ ndị ọrụ, nke nọ na puku naịra iri atọ ugbua.

    Ndị ọrụ na-ewe iwe maka mwepu gọọmentị wepụrụ ego ha na-akwụbu iji butuo ọnụ ego mmanụ ụgbọala, bụ nke a na-akpọ 'fuel subsidy' na bekee, bụkwa nke mere ka ọnụahịa mmanụ ụgbọala rịa elu ihe ruru ugboro atọ, ma mekwaa ka ọnụ ahịa ihe dị icheiche, tinyere njem okporoụzọ, gbalie elu nke ukwuu.

  19. Kathleen Folbigg: A gbagharala nwaanyị a tụrụ nga maka ọnwụ ụmụ ya anọ

    A gbagharala otu nwaanyị ọha nyeburu aha dịka “Nwaanyị kacha gbuo mmadụ na Australia” dịka nnyocha ọhụrụ na-arụ aka na o gbughi ụmụ ya anọ etu e siri chebuo.

    Kathleen Folbigg nọrọ afọ 20 n'ụlọ mkpọrọ mgbe ndị otu ikpe chọpụtara na o gburu ụmụ ya nwoke abụọ bụ Caleb na Patrick na ndị nke nwaanyị abụọ bụ Sarah na Laura n’ihe karịrị afọ iri.

    Mana site na ajụjụ ọnụ a jụrụ n’oge nnyocha, ndị sayensi gbara ama na ha kwenyere na o nwereike ịbụ na ụmụaka ahụ nwụrụ ọnwụ chi ha.

    A na-ekwuzi ugbua a na ikpe a metụtara nwaanyị a dị afọ 55 ga-abụ ndahie aka n’ikpe kacha elu na mba Australia.

    Oriakụ Folbigg, onye kwudosiri ike na aka ya dị ọcha, natara ịga nga afọ 25 na 2003 maka okwu igbu mmadụ atọ n'ime ụmụaka ya, nakwa inwe aka n’ọnwụ nwa mbụ ya bụ Caleb.

    Ụmụaka ahụ nwụrụ na mberede n'etiti afọ 1989 na 1999, dịka ha dị agbata afọ 19 na ọnwa 19, dịka ndị ọkaiwu nọ n’ikpe ya boro ebubo na ọ nọpịara ha.

    Ajụjụ na nnyocha ọhụrụ e mere na 2019 achọpụtaghị ihe akaebe ọbụla na aka oriakụ Folbigg nọ n’ọnwụ ụmụaka a nke mere e jiri malite inyocha okwu a ọzọ.

    N'okwu onye ikpe larala ezumike nka bụ Tom Bathurst duziri, ndị ọkaiwu kwenyere na nnyocha sanyesi banyere mmụgharị mkpụrụ ndụ agbanweela nke nyere nghọta ọhụrụ banyere ọnwụ ụmụaka ahụ.

    Nke a na-arụ aka na o nwereike ịbụ n’ezie na ya bụ nwaanyị egbughi ụmụ ya.

  20. Ọchịchịrị nwereike ịgba na Naịjirịa maka abụbụọrụ ndị NLC

    Ọchịchịrị nwereike ịgba na Naịjirịa dịka ndị ọrụ ọkụ latrik na-akwado ịgba abụbụọrụ n’ụbọchị Wenezde 7 Mee, 2023.

    Otu a kpọrọ ‘National Union of Electricity Employees (NUEE)’ enyela ndị otu ha iwu ka ha kwụsị inye ọkụ maka mwepu ego enyemaka ibelata ọnụego mmanụ ụgbọala nke gọọmentị wepuru.

    Nke a na-abịa site na ndụmọdụ otu jikọtara ndị ọrụ na Naịjirịa bụ ‘Nigeria Labour Congress (NLC)’ nyere sị ka ndị otu ha niile malite abụbụọrụ n’ime izuụka.

    Otu NUEE site n;akwụkwọ ozi ha wepụtara gwara ndị otu ha kwụsị ọrụ n’isiụtụtụ ụbọchị Wenezde.

    Otu NLC nyere gọọmentị malite ugbua ruo ụbọchị Tuuzde iweghachị ọnụego mmanụ ụgbọala n’ebe ọ dịbu na mbụ ma ọ bụghị ya na ha ga-amalite abụbụọrụ na ngagharịiwe.

    Cheta na Onyeisiala Bola Tinubu n’ụbọchị 29 Mee, 2023 e duru ya n’iyi ọrụ kwuru na ‘subsidy’ alaala kpam kpam.

    N’ihi nke a ụlọọrụ na-ahụ maka mmanụ agbidi bụ ‘Nigerian National Petroleum Company Limited (NNPCL)’ jiri ihe karịrị pasentị narị abụọ bulie ọnụego mmanụ ụgbọala.