Ngalaba na-ahazị ụgwọọnwa bụ‘Revenue
Mobilisation, Allocation and Fiscal Commission (RMAFC)’
ekwuola okwu ọhụrụ banyere ụzụ na-agba n’okwu atụmatụ iji pasentị 114 bulie ụgwọọnwa
onyeisiala, Osote ya, ndị gọvanọ, Osote ya, ndị mịnịsta, kọmishọna na ndị
omeiwu na ndị ọzọ ji ọkwa ọchịchị.
Ọnụ na-ekwuru ụlọọrụ kọwara na atụmatụ a
nọrọ n’aka gọọmentị etiti kemgbe, malite n’oge ọchịchị Buhari.
“Tupu onyeisiala Buhari apụọ ọchịchị, o
nyere anyị akwụkwọ si n’aka ọkaiwu gọọmentị etiti na ndị ọkaiwu ndị ọzọ bụ nke
sị ka anyị lebe anya n’okwu mbuli ụgwọ ọnwa a”.
Ọ gakwara n’ihu kwuo “ọgbakọ ime obi
gọọmentị nke ‘Federal Executive Council’ gwakwara anyị ka anyị tinye anya na
ego ụgwọ ọnwa a”.
Ọ kọwara na ndị ụlọomeiwu ga-ebuụzọ lebanya
n’atụmatụ ma binye ya aka tupu onyeisiala ebinye ya aka.
O kwukwara na a chọrọ ibuli ego ụgwọ ọnwa
onyeisiala.
“Na mba onyeisiala na-anata ego ụgwọ
ọnwa otu nde naịra na ụma kwa ọnwa mana atụmatụ a na-achọ ka ebulie ya gaa nde
abụọ naịra”.
Ọ gara n’ihu kwuo na ihe ndị e
tinyereaka tupu ewepụta atụmatụ a bụ etu ọnọdụ ihe dị na Naịjirịa.
Iji chịkọta okwu ọ gwara BBC o kwuru:
“Ka ọ dị ugbua, isi agabeghi aga n’okwu
a dịka onyeisiala kwesịrị itinye ya anya, zigara ya ndị omeiwu ka ha lebe ya anya
tupu ekwube okwu ma ọ ga-abụ ihe dị ire.”
Akụkọ kwuburu fegharịrị n’ụbọchị Wenezde
kwuburu na ụlọọrụ RMAFC na-akpọku ụlọọmeiwu dị na steeti 36 ka ha
hazigharịa iwu na steeti iji hụ na e weliri ego ndị ji ọkwa na steeti, ndị
ọkaikpe na ndị na-arụ na mịnịstrị ikpe nakwa ndị ọzọ ji ọkwa ọchịchị.
Na mkparịtaụka ụlọọrụ mgbasaozi Arise TV na onyeisi ụlọọrụ RMAFC bụ Hassan Mohammed Usman nwere n’ụtutụ Tọọzde, o kwuru:
‘E kwesịrị ị na-ahazighari egọ ụgwọ ọnwa ndị ndọrọndọrọ ọchịchị, ndị ọrụ gọọmentị na ndị ọrụ ikpe kwa afọ ise mana emebeghi nke a ruo afọ 15 ugbua’.
Ọ gara n’ihu kwukwa na ọnụahịa ihe n’ụwa riwanyere elu malite na afọ 2008 ruo 2022.
Nke mere ha jiri mee nga gaa mpaghara Naịjirịa niile mee nnyocha ma chọpụta ụzọ kacha mma iji bulie ego.
Ọ kọwara na etu ha siri bịa n’atụmatụ mbulie ego a ruo pasentị 114 bụ “ịgbakọ nchọpụta si ajụjụ ọnụ a gbara ndị okwu na-eru n’ọnụ na mpaghara Naịjirịa niile nakwa nnyocha ndị ọkaibe na ihe gbasara akụnụba”
N’okwu ya, Usman kọwara na nchọpụta ha gosiri na mgbakọ a ruru pasentị 200.
Ọ kọwara na ha mere mgbakọ na mwepu so ya ma tinye atụmatụ mbulie ego a n’ọnụ pasentị 114.
Mana akụkọ a akpata ọtụtụ okwu na soshal midia dịka ọha na-ajụ ihe mere gọọmentị agaghị e mere ndị ọrụ nakwa ndị ọzọ atụmatụ mbulie ego ụgwọ ọnwụ dị etu a ọkachasị n'oge a mwepu ego mbeleta mmanụ ụgbọala nakwa ọnọdụ akụnụba Naịjirịa na-eme ọnụ ego ihe a na-arị elu.
Ọtụtụ ndị ọzọ nwere agba ekwukwaala okwu banyere atụmatụ a dịka Peter Obi bụ aka chịburu Anambra steeti ma bụrụkwa onye zọrọ ọkwa onyeisiala Naịjirịa 2023 n'aha Labour Party.
Obi kwuru: "N'uche m, ana m eche na ndị ọchịchị na ndị ọrụ gọọmentị ga na-achọ ụzọ iji beleta ego ha ji arụ ọrụ nakwa ibelata ahụhụ ụmụafọ Naịjirịa na-ata."
"Oge a bụ oge e kwesịrị ịchepụta echiche ịgbapụta ndị mmadụ n'aka ụbịam".