You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.

Take me to the main website

France Riots: Nnukwu ọgbaaghara adapụtala na mba Fransị n'ihi ogbugbu otu nwa okorobịa

Lee akụkọ ndị gbara ọkpụrụkpụ n'akụkọ na-eme na mba ụwa..

Mkpuchi Na Eme Ozugbo

Adline Okere, Ikechukwu Kalu, Chukwunaeme Obiejesi and Uche Akolisa

  1. Ka chi fonu

    Ndewo maka ụbọchị taa.

    Cheta sonyere anyị ọzọ n'ụbọchị Wenezde, n'elekere asatọ nke ụtụtụ.

    Ị chọọ ịma maka ọkpụrụkpụ akụkọ ndị ọzọ nke ụbọchị Tuzde, gụrụ gbadawa maọbụ lee anya na bbc.com/igbo

  2. Ụlọakụ Mbaụwa enyela gọọmentị Naịjirịa mgbazinye $500m iji kwalite ọdịmma ụmụnwaanyị

    Ụlọakụ mbaụwa enyela nkwado maka ịgbazinye gọọmentị Naịjirịa nde naịra 500 iji nye aka kwalite obibi ndụ ụmụnwaanyị na Naịjirịa.

    N'akwụkwọ ozi si n'aka ụlọakụ, ha kwuru na ego a ga-enye aka "ịkwalite nhatanha n'etiti ụmụ nwoke na ụmụnwaanyị site n'inye ụmụnwaanyọ ohere inweta ezi agụmakwụkwọ, ezi ahụike, nakwa inye ezinụlọ ha nri nke ọma, nakwa inye ụmụnwaanyị ikike ikwụdosi ike n'ibu agha megide mgbanwe ihu eligwe.

    Ego mgbazinye a so n'atụmatụ a kpọrọ 'Nigeria for Women Programe Scale Up (NFWP-SU)

    Onyeisi ụlọakụ mbaụwa na Naịjirịa bụ Shubham Chaudhuri kwuru na ha "ahụla mpụtara ọma si n'atụmatụ NFWP nke mbụ ha mere, bụ nke nyere ọtụtụ ụmụnwaanyị bi n'ime obodo aka ịkwalite ọnọdụ obibi ndụ ha ma nyekwa ha ohere isonye na ndị ọnụ na-eru n'okwu n'obodo ha dị icheiche.

    "Anyị nwere olileanya na atụmatụ nke a nke bụ nkwalite n'atụmatụ nke mbụ ga-enyere anyị irutewanye nso na ebumnobi anyị," Chaudhuri kwuru.

    Onyeisi atụmatụ NFWP bụ Michael Ilesanmi kwukwara na atụmatụ ahụ emeela ka ruo ọtụtụ ụmụnwaanyị dara ụbịam aka inye ha ohere inweta ego nke ha ji kwalite ọnọdụ obibi ndụ ha.

    O kwuru na ihe karịrị ụmụnwaanyị 427,887 eritela uru n'atụmatụ NFWP na steeti isii na Naịjirịa, dịka e kewara ha n'otu 20,506.

    Cheta na ụlọakụ mba ụwa enyebuola nkwado maka ịgbazinye Naịjirịa ego dị ijeri naịra 800 iji nyere ndị mmadụ aka wetulata ihe nhịahụ ha ga-agabiga n'ihi nkwụsị gọọmentị kwụsịrị ịkwụ ego ha na-akwụbi iji butuo ọnụahịa mmanụ ụgbọala bụ nke a na-akpọ 'fuel subsidy' na bekee.

  3. Ụlọakụ mbaụwa akwadola mwepu ‘subsidy’ mmanụ ụgbọala nke Naịjirịa mere

    Ụlọakụ mbaụwa bụ World Bank akwadola nwepu Gọọmenti etiti na nwepu ego e nyemaka mmanụ ụgbọala a kpọrọ ‘subsidy’ nakwa nhazigharị mgbanwe naịra na dọla.

    Onye dịrektọ ụlọọrụ a na Naịjirịa bụ Subham Chadiri kwuru na atụmatụ ndị a na-enye ndị mmadụ nsogbuo mana ha dị mkpa na nwulite akụnaụba Naịjirịa.

    Chadhuri kpọrọ oku ga-ehi atụmatụ ndị ga-ebelata ahụhụ ndị mmadụ n’ihu mwepu a.

    Ọ gara n’ihu kwuo na ego Ụlọakụ Mbaụwa na-enye Naịjirịa nọ n’ọnụego ijeri dọla iri ($10bn).

    Otu onye ụlọọrụ ụlọakụ a bụ Alex Seinart kwuru na nwepu ego enyemaka mmanụ ụgbọala ga-amụtara Naịjirịa ego dị tarịị naịra atọ na ụma (N3.9trn) n’afọ 2023.

    Ọ gbakwụnyere na ego ahụ nwereike ịkarị tarịị naịra iri abụọ na otu site n’afọ 2023 ruo 2025.

    O kwuru na ọ bụ eziokwu na ọnụahịa nwereike ịrị elu n’ọnwa ndị na-abịa abịa mana ha ga-emechaa gbatuo ala n’ọdịnihu.

    Seinart kwuru na ọ bụ enweghi ezi usoro mgbanwe naira na dọla n’oge gara aga mere ọnụahịa jiri rịa elu mere akụnaụba etoghi eto.

  4. Etu ejije imetọ obere nwata nwaanyị jiri tinye nwamadị a na nsogbu

    Ụlọikpe Magistrate dị n’Ibadan Oyo steeti enyela iwu ka e tinye otu onye ọkpa ọchị bụ Maruf Abdullahi e ji ‘trinity guy’ maara n’ụlọ mkpọrọ maka ebubo ịmetọ nwata nwaanyị dị afọ iri.

    Ndị uweojii kpụpụrụ nwamadị n’ụlọikpe, tinyere nna nwata ahụ bụ Isiaka Ahmed na nne ya bụ Rofiat maka ebubo ịkpa nkata ịmetọ nwata ahụ.

    Ihe onyonyo na-efegharị na soshal midia gosiri ka Trinity na-ajụ nwata ahụ ma ọ hụrụ amụ ya, ka ọ kọwaa etu amụ ya na-acha.

    Ọtụtụ ndị mmadụ katọrọ ihe onyony a ma kpọọ oku ka a nwụchie nwamadị a.

    Ọkaiwu P.O Adetuyibi jụrụ ịnabata arịrịọ Trinity rịọrọ sị na ha ewepụla okwu ahụ na ministri na-ahụ maka ikpe nke Oyo steeti.

    Adetuyibi kpochiri mmadụ atọ a n’ụlọ mkpọrọ dị na Agodi nke Ibadan ruo ụbọchị 11 Julaị mgbe a ga-eleba anya n’ikpe ahụ ọzọ.

    Ọkaiwu gọomenti bụ Arowosaye gwara ụlọikpe na Trinity wakporo otu nwata nwaanyị n’ụbọchị 17 Disemba, 2022 na mpaghara Kuola dị n’Ibadan.

    O kwuru na nne na nna nwata ahụ so kpaa nkata ka Trinity metọọ nwata ahụ.

    A sị na agwa megidere iwu ime mpụ na Naịjirịa nke ngalaba 516

    Abdullahi Maruf bụ onye e ji Trinity maara dị afọ 31 bụ onye a ma ama n’ime ihe ejije dị aṅaa na-eyija ndị mmadụ egwu a kpọrọ ‘prank’.

  5. Ihe mere Buhari ejighi aka ya wepụ ‘subsidy’ mmanụ ụgbọala - Garba Shehu

    Garba Shehu bụbu ọnụ na-ekwuru Muhammadu Buhari bụbu Onyeisiala Naịjirịa akọwaala ihe mere ha jiri aghara iwepụ ego enyemaka mmanụ ụgbọala bụ ‘subsidy’.

    Shehu kwuru nke a n’ime otu ọnwa Buhari nyefere Bola Tinubu ọchịchị onyeisiala sị na ha mere iji chere oge kachasị mma.

    “Anyị hazichara atụmatụ iwepu ego enyemaka mmanụ ụgbọala ma dosa ya maka oge kachasị mma iji wepụ ya.

    “Ọ dịghị mma iwepụ ya n’oge obi kooro onye ọbụla n’elu na Naịjirịa, o nweghi onye ndu uche ya zuruoke ga-akwanye nkụ n’ọkụ na-enwu enwu.”

    Mgbe a jụrụ ya ihe mere Onyeisiala Tinubu jiri wepụ ya n’otu ntabi anya ọ bara ọchịchị, Shehu na ọ naanị ọchịchị banyere ọhụrụ nwereike ime nke a.

    “Ịgwa gị eziokwu Buhari agaghị eme ụfọdụ mkpebi ga-amaja obodo na ngwụcha ọchịchi ya maka na APC chọrọ imeri na ntuliaka.”

    O kwuru na a gaara achụpụ pati nọ n’ọchịchị n’ọkwa ma ọ bụrụ na ha mere mkpebi banyere mwepu ‘subsidy’ mmanụ ụgbọala.

    “Ugbua ntuliaka gachara ma e nwee onye ndu aka siri ike nwereike idu obodo gaa n’ihu. Obi siri anyị ike na ọ ga-eme mkpebi ndị a siri ike banyere akunaụba.

    Shehu gara n’ihu kwuo na ọ bụ eziokwu na Buhari ewepughi ego enyemaka mmanụ ụgbọala kama na o nwere ego enyemaka ndị ọzọ o wepụrụ.

    Ndị a gụnyere; ‘subsidy ọkụ latrik’, nke fatịlaịza, nke ndị njem ala nsọ, nke mmanụ dịzụlụ nakwa nke kerozin.

  6. Ọtụtụ ọma ndị Igbo e ji eme ọnụ

    Anyị na-anabata unu n'ọgbakọ anyị nke taa. Maka akụkọ ndị gbapụtara ihe.

    Biko bịa n'ọnyere anyị n'ọgbakọ BBC News Igbo.

  7. Ka chi bọọ

    Anyị abịala na njedebe mgbasaozi nke ụbọchị taa.

    Gụrụ gbadawa maka nnukwu akụkọ niile nke ụbọchị Mọnde.

    Anyị ga-amalite ọzọ n'elekere asatọ nke ụtụtụ echi.

    Ndewo.

  8. Nwata dị ọnwa asatọ anwụọla ka ụgbọala kụrụ ya n'ụlọọgwụ

    E ji ụgbọelu buru nwata Mabli Cariad Hall site n'ụlọọgwụ Withybush dị na Pembrokeshire gaa Kardif ka ụgbọala kụrụ ya na onye ji ụkwụ aga n'ụbọchị Wednezde.

    Ndị ọzọ ụgbọala a kụrụla ya na ha agbakewala ma pụta n'ụlọọgwụka ọ dị ugbua.

    Mabli "mara mma, na-amụ site n'obi ụtọ", otu onye ezinaụlọ ya si kwuo n'ozi ikpeazụ o denyerela nwata ahụ.

    E burula ya gaa ụlọọgwụ ụmụaka a kpọrọ Bristol Royal Children's Hospital mana ọ bụ ebe ahụ ka ọ nọrọ nwụọ n'ụbọchị Sọnde site etu o si wee merụ ahụ.

    Onye enyi ezinaụlọ ha sị na "N'agbanyeghị na Mabli merụrụ ahụ ebe dị ukwuu, ọ nwụrụ n'aka nne na nna ya n'udo n'ụbọchị Sọnde, Juunu 25, 2023."

    Nwaada Morris sị na ezinaụlọ ya "na-ekele ndị ọrụ ahụike n'ụlọọgwụ ahụ maka enyemaka ha niile kamgbe ihe mberede merela Mabli".

    Ndị mmadụ nyeburu ezinaụlọ Mabil onyinye ego maka ọdịnamma ya ruru ihe dịka £20,000.

  9. Lee ihe iwu ọhụrụ CBN kwuru gbasara akara soshal midia ndị ahịa ha

    Ụlọakụ Etiti nke Naịjirịa ewepụtela iwu ọhụrụ nke ha kwuru na ụlọakụ dị icheiche ga-agbaso tupu ha emepeere onye ahịa ha ọbụla akara ọbaego ọhụrụ.

    Otu ọkpụrụkpụ ihe dị n'iwu ọhụrụ a bụ 'Customer Due Diligence Regulations 2023' bụ na onye chọrọ imepe akara ọbaego ọhụrụ ga-eweta akara soshal midia ya dị icheiche nakwa ihe ndị ọzọ.

    Ha kwuru na nke a bụ otu ụzọ iji gbochie mpụ na ohi e ji ịntanetị ezu n'obodo. Ndị CBN gara n'ihu kọwaa na atụmatụ ọhụrụ a ga-akwalite usoro ibuso mpụ ego agha nakwa igbochi ndị na-eji ego ha akwado iyi ndụ egwu bụ nke bekee na-akpọ 'terrorism financing'.

    Lee ihe niile mmadụ ga-eweta iji mepee akara ọbaego ọhụrụ dịka iwu CBN a siri kwuo:

    • Ezigbo aha gị na aha ndị ọzọ ị na-aza (dịka aha nna gị maka ụmụnwaanyị lụrụla di)
    • Ebe obibi gị nke ọkpụ (permanent address)
    • Ebe obibi gi ugbua (residential address)
    • Akara ekwentị, akara e-mail, na akara soshal midia gị
    • Ụbọchị ọmụmụ gị na ebe a mụrụ gị
    • Akara njirimara ọbaego gị (BVN)
    • Akara ụtụisi gị (TIN)
    • Onye ebe ị bụ
    • Ihe ị na-arụ, ọkwa i ji ebe ahụ, nakwa aha ụlọọrụ gị
    • Akara njirimara gị nke dị n'akwụkwọ ọbụla nke gọọmentị nyere gị dịka bụ nke ga-enwe aha gị, foto gị na akara njirimara gị (signature). Akwụkwọ ndị a gụnyere akwụkwọ ime njem, akwụkwọ njrirmara nke Naịjirịa, akwụkwọ ikike ịnya ụgbọala, maọbụ ndị ọzọ dịka ha
    • Ụdị akara ọbaego ị chọrọ imepe
    • Akara mbinye aka gị, nakwa ozi gbasara mmekọrịta gị na onye nọ n'ọkwa ọchịchị

    Iwu ọhụrụ a ekwughị ihe ọbụla maka onye chọrọ imepe akara ọbaego mana o nweghị akara soshal midia ọbụla.

    Mana gbasara ndị nwerela akara ọbaego, iwu ọhụrụ a kwuru na ụlọakụ niile ga na-ewulite ozi ha nwere gbasara ndị ahịa ha kwa mgbe kwa mgbe.

    Cheta na Onyeisiala Bola Ahmed Tinubu ekwubuola na ọnọdụ nchịkọta ụlọakụ na Naịjirịa rere ure, nke mere o ji chụpụ onye bụbu onyeisi ụlọakụ etiti, Godwin Emefiele, onye nọ ugbua n'aka ndị ọrụ nchekwa nzuzo bụ DSS dịka a na-enyocha ya maka nrụrụaka.

    Ihe ndị a so na mgbanwe nke onyeisi ụlọakụ etiti ugbua bụ Folashodun Shonubi tinyerela kamgbe izuụka olemole ọ malitere ọrụ.

  10. Gọọmentị etiti etinyela ụbọchị 28 na 29 nke Jun dịka ụbọchị ezumike maka emume Salah

    Gọọmentị etinyela ụbọchị Wenezde na Tọzde, bụ ụbọchị 28 na 29 nke ọnwa Jun dịka ụbọchị ezumike maka emume Eid-El-Kabir nke afọ 2023.

    Oluwatoyin Akinlade bụ odeakwụkwọ ukwu nke Mịnịstrị nchekwa ime obodo kwupụtara nke a n'akwụkwọ ozi o zipụtara n'ụbọchị Mọnde.

    Gọọmentị kpọkukwara ụmụ Naịjirịa ka ha were oge emume Eid-El-Kabir kpee ekpere maka maka udo, idikọnotu na ọganihu nke Naịjirịa.

    Eid-El-Kabir bụ emume pụrụ iche nke ndị okpukperechi Alakuba ji echeta aja nke onye amụma Ibrahim chụnyeere Chineke, nnụ kwụrụ nnụ afọ gara aga.

    Ọ bụkwa oge ọtụtụ ndị Islam ji eme njem ekpere pụrụ iche gaa obodo Saudi Arabia, ịga kpee ekpere n'ụlọ ekpere dị na Makkah, ebe onye amụma Muhammad kpere ekpere imirikiti afọ gara aga.

    A tụrụ anya na ezigbo onye Alakụba ọbụla ga-emerịrị njem a opekatampe otu ugboro na ndụ ya.

  11. Ndị uweojii anwụchiela mmadụ itoolu a na-enyo maka ogbugbu onye ọrụ Inec n'Ebonyi

    Ndị uweojii n’Ebonyi steeti ekwuola na ha nwụchiri mmadụ itoolu a na-enyo n’okwu ịtọrọ ndị mmadụ dịka ha gbapụtara otu nwaanyị.

    Ọnụ na-ekwuru ndị uweojii steeti ahụ bụ Onome Onovwakpoyeya kwuru na site n’atụmatụ nnyocha ha na ha chọpụtara ndị a a na-enyo ma gbapụta otu nwaanyị ha ji ma hụkwa na aka ha nọ na ntọrọ na ogbugbu otu onye ọrụ Inec na steeti ahụ.

    O kwuru na ha nwụdoro mmadụ itoolu a n’ime oke ọhịa Lokpanta nke Abịa steeti dịka a kwukwara na ndị ahụ si akụkụ okpuruọchịchị Umunneochu nke steeti ahụ.

    A napụrụ ha igwe e ji ege egwu, ọtụtụ ekwentị na foto ndị otu ahụ sekọrọ ọnụ.

    Onyeisioche otu jịkọrọ ndị okpuruọchịchị Ivo bụ Emmanuel Ajah gbakwara ama nwụchi a ma kwuo na a na-enyo ndị a maka ogbugbu otu onye Inec ahụ n’akụkụ ụzọ Ishiagu-Mpu n’ụbọchị Sọnde gara aga.

    Cheta na akụkọ pụtara na a tọrọ nwunye onye ọrụ Inec ma gbuo nna onyeisi ndị ntorobịa nke otu Ohanaeze ebe ọ n’ugbo ya.

  12. CBN agwaala ụlọakụ ka ha malite ịna ọha akara soshal midia ha

    N’atụmatụ ọhụrụ nke ụlọakụ etiti Naịjirịa wepụtara nke a kpọrọ ‘Know Your Customer (KYC) policy’, ha enyere ụlọakụ ndị nọ ma na-arụ ọrụ na Naịjirịa iwu imalite inata ndị ji ụlọakụ ha azụ ahịa akara soshal midia ha iji hụ na ha matere ndị ji aha ụlọakụ azụ ahịa kpọm kwem ma kwalite agha ha na-ebuso mpụ, nzufu ego nakwa ihe ndị ọzọ dị ka ha.

    Ozi a nke gbara na websaịt ụlọakụ etiti Naịjirịa na nso nso a. Onye na-ahụ maka ngalaba iwu ụlọakụ bụ Chibuzo Efobi binyere aka n’ozi a ma kwuo na nke a bụ “iji kwalite ibuso atụmatụ nzufu ego nakwa iji ego akwalịte iyi ndụ egwu agha”.

    Iwu ọhụrụ a bụ maka ndị nkịtị nakwa aha ụlọọrụ ndị mmadụ.

    Iwu a kwukwara na onye ọbụla ga-enwerịrị "akara njirimara nkeonwe maọbụ ihe nchọpụta banyere ya pụrụiche nke ga-adị n'ime akwụkwọ nke ụlọọrụ gọọmentị nyere ya.

    Akwụkwọ ahụ ga-ebu aha, foto, na akara mbinyeaka nke onye ahịa ahụ, gụnyere foto ya, akwụkwọ ime njem, ikike obibi na mba a, maọbụ akwụkwọ ikike ịkwọ ụgbọala.”

  13. Ndewonu o!

    Nnọọ n'ọbaozi anyị taa bụ ahịa Orie nke ụbọchị Mọnde, abalị 26 ọnwa Juun.

    Soro akụkọ ndị dị mkpa ịkọ taa niile ebe a.

  14. Ndewo, ka ọ dị echi

    Igbo ndị ọma, ka anyị pịachie mgbasaozi nke taa ebe a.

    Sonyere anyị ọzọ n'elekere asatọ nke ụtụtụ Mọnde.

    Ya gaziere gị.

  15. Igwe mmadụ akụgbuola otu nwoke na Sokoto maka ebubo ikwutọ Onyeamụma Muhammad

    Igwe ndị mmadụ gbakọtara kụgbuo otu nwoke aha ya bụ Usman Buda, onye na-egbu anụ na Sokoto, maka ebubo na o kwutọrọ Onyeamụma Islam bụ Muhammad.

    Ihe a mere n'ebe elekere iri nke ụtụtụ Sọnde na Sokoto.

    Otu onye hụrụ ihe merenụ gwara ndị ntaakụkọ Premium Times na Mazị Buda kwuru okwu mkparị ahụ megide onye amụma Muhammad ugboro atọ.

    "Nwanne m nwoke nọ n'ahịa ahụ oge ya bụ ihe mere, oge Usman kwutọrọ onye amụma Muhammad," nwata nwoke ahụ aha ya bụ Aliyu kwuru.

    "Ụfọdụ ndị nọ ebe ahụ kwuru na nwoke ahụ bụ onye isi mgbaka, mana ndị ọzọ sị na ha ma na nwoke ahụ enweghị isi mgbaka ọbụla."

    "Ụfọdụ ndị ntorobịa nọ ebe ahụ gwara ya ka ọ kwụsị ma kwugharịa ihe ahụ o kwuru, mana ọ jụrụ, kama gaa n'ihu kwukwaa ya ugboro atọ ọzọ. Ọ bụ nke a kpatara ndị ntorobịa ahụ ji bido iti ya ihe."

    Aliyu ekwughị ihe bụ ihe ahụ Bode kwuru kpatara e ji tigbuo ya.

    Ndị uweojii Sokoto Steeti kwukwara na ya bụ ihe mere n'eziokwu dịka ha wepụtara akwụkwọ ozi n'ụbọchị Sọnde.

    Ahmad Rufai bụ ọnụ na-ekwuru ndị uweojii steeti ahụ kwuru na tupu ndị uweojii abịaruo n'ahịa ahụ, ndị mmadụ etiela Usman Buda ihe nke ukwuu nke na ọ tọgbọrọ n'ọnọdụ ọjọọ.

    "Anyị buuru ya gaa n'ụlọọgwụ Usmanu Danfodio Teaching Hospital maka ọgwụgwọ, bụ ebe ekwupụtara na ọ nwụọla, mana ebe niile ederela jii ugbua," Rufai kwuru.

    O kwuru na ha amalitela nnyocha maka ihe a merenụ.

    Ụdị ihe dị otu a mekwara n'ọnwa Mee 2022 dịka ndị mmadụ tigburu nwata akwụkwọ aha ya bụ Deborah Samuel, na-agụ n'ụlọakwụkwọ Shehu Shagari College of Education na Sokoto, n'ihi ebubo na o kwutọrọ Onyeamụma Muhammad.

  16. Mmadụ ise n'ime ndị Naịjirịa gara ekpere Hajj na mba Saudi Arabia alaala mmụọ

    Ngalaba na-achịkọta njem ekpere nke ndị okpukperechi Islam na-aga na mba Saudi Arabia, a na-akpọ Hajj, ekwupụtala na mmadụ ise n'ime ụmụ Naịjirịa mere njem ahụ n'afọ a, anwụọla na Saudi Arabia.

    Onyisi ngalaba 'National Hajj Commission' bke Baịjirịa bụ Usman Galadima, kwupụtara nke a n'ụbọchị Satọde n'ọgbakọ nke e nwere na Makkah, Saudi Arabia.

    Galadima kwuru na n'ime mmadụ ise a, mmadụ abụọ si Osun Steeti, mmadụ abụọ si Kaduna Steeti, ebe otu onye si Plateau Steeti.

    O kwukwara na mmadụ 30 n'ime ndị mere njem a ka a chọpụtara na ha nwere ọrịa isi mgbaka dị icheiche, mana ha na-ejikwa ndị ahụ n'ụlọọgwụ dịka ha nwere ndị dọkịta anọ bụ ọkachamara n'ahụike ụbụrụ.

    Hajj bụ njem ekpere pụrụ iche nke ndị okpukperechi Islam na-eme kwa afọ n'ụlọ nsọ ukwu dị na Saudi Arabia.

    Dịka okpukperechi Islam si dị, a tụrụ anya na ezigbo onye 'muslim' ga-emerịrị njem a ọbụladị otu ugboro na ndụ ya.

  17. Ihe onyonyo gosiri ntọrị ndị mmadụ n'ụzọ Enugwu-Ugwogo bụ asị ọcha - Uweojii

    Ndị uweojii Enugwu steeti ekwuola na ihe onyonyo ahụ gosiri ka ndị mmadụ na-agba ọsọ n’ime ọhịa na-ekwu na a na-atọrị mmadụ n’ụzọ Enugwu gawa Ugwogo bụ asị ọcha.

    Akụkọ ahụ kwuru na a tọọrọ ndị mmadụ ugboro atọ n’okporoụzọ ahụ n’otu ụbọchị malite n’elekere iri na abụọ, elekere abụọ na elekere isii nke ehihie.

    N’akwụkwọ ozi Daniel Ndukwe bụ ọnụ na-ekwuru ndị uweojii sị na ọ bụ asị na e nweghi akụkọ banyere ntọrọ ndị mmadụ n’okporoụzọ ahụ n’ụbọchị ahụ dịka ihe onyonyo ahụ si kwuo.

    O kwuru na nyocha e mere n’ihe onyonyo ahụ gosiri na o meghi na Naịjirịa ka ọfọdụzie ime n’Enugwu steeti.

    O kwuru na ọ bụ eziokwu na e nweela ugboro ole na ole a tọọrọ ndị mmadụ n’okporoụzọ ahụ kama na ọ bụ ihe ziri ezi ma e werezie ya na-ebusa akụkọ ụgha, na nke ahụ adịghị mma maka nchekwa ndị mmadụ.

    Ndukwu gara n’ihu kwuo na kọmishọna uweojii bụ Ahmed Ammani ezigala ndị ọrụ nchekwa na gburu gburu ụzọ ebe ahụ a kpọrọ aha nakwa ebe ndị ọzọ ma sị na ha na-agba mbọ ikpochapụ ụdị mpụ dị etu a.

    Ọ kpọkuru ndị Enugwu ka ha gbaa ama ebe ọbụla e nwere akụkọ mpụ maọbụ ntọrị mmadụ.

  18. Ụmụakwụkwọ atọ ka na-efu efu n’ụgbọmmiri kpuru na Calabar

    A zọpụtala ụmụakwụkwọ ‘Nigeria Medical Students Association’ iri na otu bụ ndị ụgbọmmiri ha kpuru n’ogige nlereanya ‘marina resort’ dị na Calabar, Cross Rivers State n’ụbọchị Satọde.

    Ọnụ na-ekwuru ndị uweojii na steeti ahụ Irene Ugbo kwuru n’ezie ya na a zọpụtara ndị a ma sị na a ka na-achọ mmadụ atọ so n’ụgbọmmiri ahụ.

    Ihe onyonyo na-efegharị na soshal midia gosiri oge ụgbọmmiri ahụ kpuru, ebe ụmụakwụkwọ ndị a nọ n’elu mmiri ma jide ụgbọ ha aka ka mmiri ghara iri ha.

    Ozo gosikwara ebe ndị ọzọ ji ụgbọ mmiri gara ịzọpụta ha.

    Akụkọ kwuru na ụmụakwụkwọ ji ụgbọmmiri sị ka ha kpagharịa n’elu mmiri ahụ mgbe ihe a mere n’elekere atọ nke ehihie.

    Ọtụtụ ụmụakwụkwọ ngalaba dọkịta si na mpaghara Naịjirịa dị iche iche bịa ebe ahụ maka ncheta izuụka ha a kpọrọ ‘Annual Health Week’ e mere na Calabar.

    Gọvanọ Cross River steeti bụ Bassey Otu enyela iwu ka e mee nyocha banyere ihe mere ụgbọmmiri ahụ jiri kpuo.

  19. Onyeisi Wagner Group ekpebiela ịpụ Russia

    Ihe dị egwu tụrụ ụwa n’anya mere n’ụbọchị Satọdee dịka onyeisi otu nchekwa Wagner bụ Yevgeny Prigozhin malitere ima onyeisiala Russia bụ Vladimir Putin aka ma na-achọ ịrụ ikike ya aka.

    N’ime abalị Satọde dịka Yevgeny Prigozhin, ndị nkwado Putin nakwa ndị nkwado onyeisiala Belarus bụ Alexander Lukashenko zutechara, o mere mkpebi na ọ ga-esi Russia pụọ ma gawazie Belarus bụ mba agbataobi Russia.

    Ndị ọrụ nchekwa Wagner so nọrọ n’isi agha Russia na Ukraine malitere ibuso mba Russia agha n’ụbọchị Satọdee iji gosi nnupụisi ha nye ikike Putin.

    N’ụbọchị Satọde, onyeisiala Putin katọrọ agwa Prigozhinma kpọọ ya ‘atụmatụ ịkụsa ọchịchị’ nakwa ‘ịgba mba okpuru’.

    Dịka o kwurula na ọ ga-apụ mba Russia, ọchịchị mba ahụ ekwuola na ha agaghị ata ya ndị otu ya ahụhụ ọbụla. Ha na-apụ akụkụ ogige ndịagha nọ na ndịda mba ahụ bụ ebe ha wegharara na Satọdee.

    Na Satọdee, n’okwu nkwupụta nye ọha, Putin kwuburu na ya bụ ihe bịara dịka ka agha ime obodo.

    Onyeisiala Ukraine bụ Volodymyr Zelenskyy kwuru na nke a gosiri na “ezigbo ọgbaghara” nọ na Russia dịka o kwuru na “ndị isi Russia enweghi ikike ichi ihe ọbụla ebe ahụ”.

    Mba Amerịka, mba Briten nakwa otu jịkọrọ mba ndị Europe bụ EU ekwuola na ha na-enyocha ihe na-eme ahụ n’ike, n’ike.

    E kwuru na ime obe gọọmentị Amerịka mara ọkwa maka ihe nnupụisi a ga-eme kemgbe ụbọchị Wenezde dịka ụlọ ntaakụkọ mba ahụ si ekwu.

    Ọha na-ele anya ugbua ime etu ihe ga-esi gaa n’izu a na-abịa abịa

    Gụọ maka etu ọgbaghara a siri dapụta ebe a.

  20. Jamb cut-off mark: Nwaafọ Anambara steeti kachasị mee ọfụma-Jamb, 140 bụ akara o pekata mpe e ji aba mahadum n'afọ a afọ a- Jamb

    Ụlọọrụ na-ahazi ule e ji aba mahadum bụ 'Joint Admissions and Matriculation Board' (JAMB) ekwuola na ọ bụ nwaafọ Anambara steeti bụ Nkechinyere Umeh bụ onye kachasi mee ọfụma n'ule ahụ n'afọ dịka o nwetara akara 360.

    Jamb hiwekwara 140 dịka akara o pekata mpe a ga-eji banye mahadum na Naijiria maka afọ 2022/23.

    Onyeisi Jamb bụ Ọkammụta Ishaq Oloyede gbara ama a n'ọgbakọ maka ndị isi ụlọakwụkwọ dị elu e nwere n'Abuja ụbọchị Satode.

    Mana ọ gara n'ihu kwuo na mahadum ọbụla nwere ohere itinye akara ha ji ewe mmadụ mana ọ gaghị epekarị 140.

    Onye nke abụọ kachasị mee ọfụma bụ Stephen Aguele si Edo steeti, bụ onye nwetara 358 ; Oluwafemi Ositade si Osun steeti bụ onye nwetara 358 gbara onye nke atọ.

    Oloyede gbakwara ama na 100 bụ akara maka ịbanye na ụlọakwụkwọ Politeknik nakwa koleg agụmakwụkwọ( colleges of education.)