You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.

Take me to the main website

France Riots: Nnukwu ọgbaaghara adapụtala na mba Fransị n'ihi ogbugbu otu nwa okorobịa

Lee akụkọ ndị gbara ọkpụrụkpụ n'akụkọ na-eme na mba ụwa..

Mkpuchi Na Eme Ozugbo

Adline Okere, Ikechukwu Kalu, Chukwunaeme Obiejesi and Uche Akolisa

  1. Ka chi fo

    Igbo ndị ọma, sonyere anyị ọzọ n'elekere asatọ nke ụtụtụ Mọnde.

    Daalụ maka isonyere anyị taa.

    Ka ọ dị echi.

  2. Ohaneze Ndigbo ekwughị ihe ọbụla gbasara njide e jidere Emefiele - Iwuanyanwu

    Onyeisi otu Ohaneze Ndigbo bụ Emmanuel Iwuanyanwu ekwuola na akụkọ na-efegharị gbasara ihe Ohaneze Ndigbo kwuru banyere njichi ndị ọrụ nchekwa jichiri Godwin Emefiele, bụ okwu ụgha.

    Akụkọ malitere ifegharị nke kwuru na Ohaneze Ndigbo katọrọ etu ndị DSS si jichie Emefiele, bụbu onyeisi Ụlọakụ Etiti nke Naịjiria, ma kwuo na o gosiri mmegbu na mkpagbu ndị Igbo na-agabiga na Naịjirịa.

    Onye wepụtara akwụkwọ ozi ahụ bụ nwa amadị aha ya bụ Chima Uzor, onye kwuru na ya ji ọkwa 'Director National Interest Matters' n'otu Ọhaneze.

    Mana Emmanuel Iwuanyanwu, onyeisi ndị Ohaneze, kwuru na akụkọ ahụ bụ ụgha maka na otu ahụ enweghị mmasị ọbụla n'okwu gbasara Emefiele na ndị DSS.

    "Achọrọ m ikwupụta ka o doo onye ọbụla anya na:

    • Otu Ọhaneze Ndigbo Worldwide amaghị onye ọbụla a na-akpọ Mazi Chima Uzor
    • Onweghị ọkwa ọbụla n'otu Ọhaneze Ndigbo a na-akpọ 'National Interest Matters'
    • Ohaneze enweghị mmasị ọbụla itinye anya na nnyocha nke DSS maọbụ ndị ọrụ nchekwa ọbụla na-eme na Naịjirịa
    • Ohaneze enweghị mmasị ọbụla itinye anya na nnyocha nke ngalaba gọọmentị ọbụla na-eme
    • Onye ọbụla na Naịjirịa nwere ikike ịga ụlọikpe iji gosi na aka ya dị ọcha n'ebubo ọbụla e boro ya; ọ bụrụ na ụlọikpe ekwuo na aka onye ahụ dị ọcha, otu Ọhaneze ga-eme ihe niile ha nwereike iji nyere onye ahụ aka, mana ọ bụrụ na ikpe mara onye ahụ n'ezie, onweghị ihe ọbụla otu Ọhaneze nwereike ime maka ya

    Iwuanyanwu kwuru na ihe a Mazi Chima Uzor mere bụ iji aghụghọ gosi onwe ya ka onye ọ bụghị, nke bụ ihe mere megidere iwu.

    Ọ kpọkuru ndị ọrụ nchekwa ka ha nwuchie nwa amadị ahụ n'ihi ihe a o mere.

    "Anyị jikwa ohere a na-agwa ndị ọha obodo ka ha kpachapụ anya maka ọtụtụ ndị ekperima na-eji aha otu Ọhaneze Ndigbo na-ezipụ ozi ụgha dị icheiche, anyị nwere olileanya na site n'enyemaka ndị ọrụ nchekwa, a ga-ekpochapụ ndị ekperima niile ndị a," Iwuanyanwu kwuru.

  3. Ọ bụ ohi ka gọọmentị Zamfara bịara zuo n'ụlọ m - Matawalle

    Gọọmentị Zamfara steeti ekwuola na ọ bụ ụlọikpe nyere ha ikike ịwakpo ụlọ Muhammed Matawalle bụbu gọvanọ ha.

    Mustapha Jafaru Kaura bụ onye ndụmọdụ gọvanọ Lawal Dauda Dere na-achị ugbua gwara BBC na ndị ọrụ nchekwa gara n’ụlọ onye bụbu gọvanọ site n’iwu ụlọikpe nyere ma buru ụgbọala iri anọ (40) nọ n’ime ụlọ ya.

    “Ụlọikpe nyere iwu ka a wakpoo ụlọ ya dị na Gusau nakwa nke dị na Maradun ibute ụgbọala ndị ahụ”

    Matawalle bụbu gọvanọ akatọọla mwakpo ahụ e mere n’ụlọ ya kwuo na gọvanọ Dauda agwaghị ya tupu ha na-abịa.

    O boro ndị ọrụ nchekwa ebubo ịwakpo ma zuo ngwo ngwa nwunye ya na ụmụ ya.

    “Anọ m n’Abuja, onweghi onye gwara na ụlọikpe nyere iwu ka e nyochaa ụlọ. Ihe kachasị ewute m bụ na ụlọ m dị na Gusau ebe ngwo ngwo nwunye m na ụmụ dị ka ha wakporo.

    N’ụlọ m nke dị na Maradun, ha buuru ụgbọala niile ndị mmadụ nyere m maka ndọrọ ndọrọ ọchịchị bụ nke foto mụ na Onyeisiala Tinubu nọ na ha, tinyekwara ndị m zụrụ na mba Amerịka tupu m bụrụ gọvanọ. Ị mana a na-ere ụgbọala. Agaghị m asị ha bughachị ya maka onye ọbụla maara na m nwere ọtụtụ ụgbọala.

    “Nke a bụ ohi ka ha bịara zuo n’ụlọ m, uwe nwa m nwaanyị jiri gbaa akwụkwọ e zuuru ya.”

    "Kama Dauda ga-eleba nsogbu dị na steeti anya, ya na-achọ itinye nsogbu ọzọ maka na ọ maara na ndị nkwado m agaghị agba nkịtị na-ekiri n’anya."

  4. Dragos Tigau: Romania akpọchitela onye nnọchite ya na Kenya azụ maka okwu 'ikpeoke agbụrụ'

    Mba Romania akpọghachila onye nnọchianya ya nọ na Kenya azụ ma rịọ mgbaghara ka ya bụ nwoke kwuchara okwu gosiri ntunyere ndị Afrịka na enwe.

    Dragos Tigau kwuru nke a n'oge nzukọ e mere n’otu ụlọ UN dị n’isiobodo Kenya, Nairobi, n’ụbọchị 26 nke ọnwa Epreel.

    Dịka ụlọọrụ mgbasaozi AFP siri kwuo, Maazị Tigau kwuru na "otu ndị Afrika esonyela anyị" mgbe ọ hụrụ enwe silitere isi n’opio ụlọ ahụ.

    Onye ọrụ na-ahụ maka ihe gbasara mba ofesi na Kenya bụ Kamau Macharia gbara okwu a Tigau n’anwụ n’ụbọchị Tọzdee.

    N’akara Twitter ya Macharia kwuru na ihe ahụ mere “sọrọ ya oyi ma mejụọ ya”, ma kwuo na a nwara ikpuchi agwa Tigau kpara.

    Ndị nnọchianya mba Africa n’ụbọchị Fraịde gwara ya rịọ mgbaghara n’ihu ọha, dịka akwụkwọ mgbasaozi ụwa Standard nke Kenya siri kwuo, dịka ha kwuru na ịrọ mgbaghara n’ime ụlọ agaghị ezu imezi ihe a.

    N’ụbọchị Satọde, mba Romania kwupụtara na ọ bụ naanị n’izu a ka ha na-anụ maka ihe a mere ma kwuo na ha amalitela "usoro ịkpọghachi onye nnọchianya ya".

    "Anyị na-arịọ mgbaghara nke ukwuu maka ihe a mere a ma na-arịọ ndị niile ihe a metụtara mgbaghara," nke a nọ n’ozi onye na-ahụ maka ihe gbasara mba ofesi Romania zipụtara.

    Ọ gbakwụnyere, "omume ma ọ bụ okwu ọbụla nke na-egosi ịkpaókè agbụrụ bụ ihe a na-anabataghị kpamkpam," ọ gara n’ihu kwuo na ọ na-atụ anya na ihe a mere agaghị emetụta njikọ mba ha na mba Afrịka.

    Romania na mba ndị Afrịkaa na-akpakọrịta site na nsonye ha n’ime otu European Union, mana ya na Egypt na-emekọrịta ihe n'ahịa nakwa mba ndị ọzọ.

    Gọọmenti Kenya ekwubeghị okwu ọbụla banyere mkpebi ịkpọlata Maazị Tigau.

    Ndị mgbasaozi Romania katọrọ omume ya, na-ekwukwa na nke a abụghị nke mbụ ndị nnọchiteanya ha na-emechu mba ha ihu.

    Cheta na n'afọ 2014, onye nnọchianya Romania n’Armenia mara njakịrị megidere ndị agbụrụ Juu nke rụrụ ndị isi Juu aka ma rụọ ha aka maka okwu metụtara ndịna ndị na okike ibe ha.

    N'afọ sochirinụ, mba ahụ rịọkwara mgbaghara mgbe a kpọchara òkù ka ọ bịa oriri n'ụlọọrụ nnọchiteanya Paris nke akwụkwọ ịkpọ oku ahụ depụtara ụfọdụ ndị ọbịa dịka – ndị “dị egwu ile anya” ndị "adịghị mma" n'etiti ihe ndị ọzọ.

  5. Unu asaala chi?

    Nnọọ n'ọbaozi anyị taa bụ ụbọchị ụka, abalị 11 nke ọnwa Juun, 2023.

    Soro akụkọ ndị dị mkpa ịkọ taa niile ebe a.

  6. NUC enyela 'Maduka University' ikike ịbụ mahadum

    Ngalaba na-ahazi agụmakwụkwọ mahadum na Naijiria bụ National Universities Commission (NUC) enyela mahadum ọhụrụ bụ Maduka University dị n'Ekwegbe-Nsukka, Enugwu steeti, ikike ịbụ mahadum.

    Mahadum ahụ natara ikike ahụ n' emume e mere n'Abuja n'ụbọchị Fraide.

    Onye nwe mahadum ahụ bụ Samuel Maduka Onyishi , onye gbara ama n'akara ọbaọzị ya na Facebook, kelere Gọọmentị Etiti maka inwe ntụkwasị obi na ya bụ mahadum ma kwee nkwa na ụlọakwụkwọ ahụ ga-abụ ọkachamma n'agụmakwụkwọ.

    Ọ gbara ama na mahadum ahụ adịla njikere ịnabata ụmụakwụkwọ mbụ maka agụmakwụkwọ ga-amalite n'ọnwa Sepụtemba afọ n'a ngalaba dị iche gụnyere; Civil Engineering, Computer Engineering, Electrical and Electronics Engineering, Mechanical Engineering, Mechatronics Engineering, information Technology, Cyber Security, Computer Science na Software Engineering.

    Ndị ọzọ bụ Accounting, Economics, Mass Communication, International Relations, Transport Management, Physiotherapy, Medical Laboratory Science na Nursing.

  7. Grace Umezurike abụrụla nwaanyị mbụ ga-abụ odeakwụkwọ Ebonyi Steeti

    Gọvanọ Ebonyi Steeti bụ Francis Nwifuru ahọpụtala Ọkammụta Grace Umezurike dịka odeakwụkwọ nke steeti ahụ.

    Ọ bụ Monday Uzor, onye bụ onyeisi ntaakụkọ nke gọvanọ Ebonyi, kwupụtara nke a n'akwụkwọ mgbasaozi o zipụrụ n'ụbọchị Fraịde.

    Uzor kwuru na aga-edu ọkammụta Umezurike n'iyi ọrụ n'ụbọchị Tuzde, bụ ụbọchị 13 nke ọnwa June afọ 2023.

    Umezurike, onye bụ ọkammụta na ngalaba 'Philosophy & Religion' na Mahadum Ebonyi Steeti dị n'Abakiliki, ga-abụ nwaanyị mbụ ga-eji ọkwa odeakwụkwọ gọọmentị Ebonyi Steeti.

    Ọ bụ onye Uburu nke dị n'okpuruọchịchị Ohaozara n'Ebonyi Steeti.

  8. Anyị eliela ihe ruru mmadụ 150 n'ime izuụka atọ gara aga - Gọvanọ Plateau Steeti

    Gọvanọ Plateau Steeti bụ Caleb Mutfwang ekwuola na opekatampe mmadụ 150 anwụọla na mwakpo ndị ojiegbe mmadụ ndị ha bụ n'okpuru ọchịchị Mangu na steeti ahụ n'ime izuụka atọ gara aga.

    Mutfwang kwuru nke a na mkparịtaụka ya na ndị ntaakụkọ Channels n'abalị ụbọchị Fraịde

    "N'abalị ụnyaahụ (Tọzde, Jun 8) mmadụ anọ ka e gburu na Mangu. Aga m asị na anyị elile opekata mpe mmadụ 150 n'ime izuụka atọ gara aga," ka Gọvanọ ahụ kwuru.

    "Dịka mụ na gị na-ekwu okwu ugbua, ndị mmadụ karịrị 30,000 gbasara n'ụlọ nchekwa ndị gbara ọsọ ndụ dị icheiche."

    Mutfwang gara n'ihu kwuo na ihe kpatara ọgbaaghara a bụ nghọtahie n'etiti ndị obodo, bụzi nke mepere ụzọ ka ndị ekperima bata, mana ka ọ dị ugbua, "pasentị 80 ihe na-emezi kịtaa bụ mkpochapụ agbụrụ ndị Plateau".

    Gọvanọ ahụ kwuru na ya gara leta Onyeisiala Bola Ahmed Tinubu n'ụbọchị Tọzde iji kọọrọ ya maka ihe a na-emenụ, "o gere mụ ntị nke ọma mw kwuputakwa njikere ọ dị iweta ogbugbo".

    "Ọsịsa Onyeisiala nyere m juru m afọ, nghọta o nwere gbasara nsogbu a kasiri m obi, eji m n'aka na Onyeisiala egosila mkpebi siri ike ileba anya n'ihe niile na-ebute ọgbaaghara a," Gọvanọ Mutfwang kwuru.

  9. Etu e si chọta ụmụaka na ndụ n'ime oke ọhịa ọtụtụ izuụka dịka ụgbọelu ha kpọkasịrị

    A chọtala ụmụaka anọ lanarịrị mkpọkasị ụgbọelu ma nọọ ihe karịrị otu ọnwa naanị ha n'ime oke ọhịa Amazon nke mba Colombia.

    Onyeisiala Colombia bụ Gustavo Petro kwuru na nzọpụta a bụ nnukwu ihe ọṅụ nye ndị niile bi na mba ahụ.

    Ụmụaka anọ ahụ na nne ha nọ n'ime obere ụgbọelu na-aga njem n'ụbọchị mbụ nke ọnwa Mee 2023, oge ụgbọelu ha kpọkasịrị, nne ha na onye ọkwọ ụgbọelu ahụ nwụrụ.

    Mana ha anọ dị ndụ ma nọrọzie naanị ha n'ime oke ọhịa ebe ụgbọelu ahụ kpọkasịrị, ha nọrọ ihe ruru ụbọchị 40 ebe ahụ tupu ndị ọrụ gbatagbata achọta ha.

    Ụmụaka ahụ dị afọ afọ 13, itoolu, anọ, ebe nke kacha nta dị naanị otu afọ.

    "Ha nọ naanị ha ma dị ndụ, nke a bụ ezigbo ọmụmaatụ maka nzọpụta bụ nke ga-adịgide n'akụkọ mba anyị," Onyeisiala Petro kwuru.

    Oke ọhịa ebe ụgbọelu ahụ kpọkasịrị bụ ebe obibi ụmụ anụọhịa dị icheiche dịka 'jaguar', agwọ ọjọọ dị icheiche na ọtụtụ anụ ndị ọzọ.

    N'otu oge, n'ọnwa Mee, onyeisiala Colombia dere na Twitter na achọtala ụmụaka ahụ, mana o mechara hichaa ihe ahụ o dere, rịọọ mgbaghara, ma kọwaa na ọ bụ nghọtahie kpatara ya.

  10. 2023 Election: Mahmood kwesịrị ịrịọ ụmụ Naijiria mgbaghara

    Otu jikọrọ ndị na-agba mbọ maka ikike dịịrị onye bụ ndị lenyere anya ka ntuliaka si gaa a kpọrọ' Nigeria Civil Society Situation Room' akpọọkuola onyeisioche ngalaba na-ahụ maka ntuliaka bụ 'Independent National Electoral Commission' (INEC) bụ Mahmood Yakubu, ka ọrịọ mgbaghara maka etu ntuliaka 2023 siri gaa.

    Ejiro Joyce Otive-Igbuzor bụ onye kwuru nke a n'aha ndị otu ahụ dịka ha wepụtara ọha ozi ha banyere ihe ha hụrụ na ntuliaka 2023, siri, "Obi jụrụ anyị oyi etu ihe si gaa n'ihi na anyị nweburu nkwenye na kwesịrị ịka mma karịa etu o si gaa."

    "Anyị na-asị onyeisioche Inec ka ọ rịọ ụmụ Naijiria mgbaghara maka etu ntuliaka ahụ sị gaa."

    Otu ahụ gara n'ihu jụọ ihe mere na Inec nyere ohere ka e zipụ mpụtara ntuliaka nke gọvanọ nakwa nke ụlọomeiwu n'ọbaozi ha site n'ọgbọ atụmvootu mana ha enyeghị ohere ahụ n'atụmvootu nke ọkwa onyeisiala.

    Cheta na Naijiria mere ntuliaka onyeisiala n'abalị 18 nke ọnwa Febuwari afọ 2023 nke ha kpọpụtara Bola Tinubu nke APC dịka onye meriri.

  11. Ọ na-anọ m ọkụ n'obi iwulite ụlọahụike n'Abia- Otti

    Aka na-achị Abia steeti bụ Alex Otti ekwupụtala mmasị ya ịwulite ụlọahụike gọọmentị dị na steeti ahụ.

    Otti kwuru nke a site n'ọnụ onye ndụmọdụ ya pụrụ iche n’ihe gbasara ahụike bụ Dkta Ngozi Okonkwo oge ya na ndị otu ya gara njem ileta ka ihe siri kwụrụ n’ụfọdụ ụlọọgwụ gọọmentị dị na steeti ahụ ụbọchị Tozde.

    Ebe ndị ha gara gụnyere ; Umunnato General Hospital, dị n’Okpuru Ọchịchị Bende ; General Hospital Abariba, dị n’Okpuru Ọchịchị Ohafia nakwa Isuikwuato General Hospital.

    Okoronkwo, onye kwara arịrị maka ọnọdụ ndakpọ nke ụfọdụ n'ime ụlọọgwụ ndị ahụ, kwupụtara na ọ na-anọ gọọmentị Alex Otti ọkụ n’obi ịkwalite ọnọdụ ụlọahụike na steeti ahụ.

  12. Etu e si tọrọ ma gbuo otu onye uweojii n'Imo Steeti

    Ndị uweojii Imo Steeti ekwuola etu ndị ekperima si tọrọ ma gbuo otu onye otu ha dịka a chọtara ozu ya na mpaghara okpuruọchịchị Oguta.

    Onye uweojii a bụ onye e nyere aha ya naanị dịka Charles, bụbu onyeisi nchekwa nke Chiji Collins, bụbu onyeisi ndị omeiwu Imo Steeti.

    Dịka ndị uweojii si kọwaa, n'izuụka olemole gara aga ka ndị ekperima tọọrọ Charles na otu onye ọkwọ ụgbọala na mpaghara Ohaji/Egbema dịka ha bu ụgbọala hilux aga n'ụzọ.

    E mechara hụ ozu onye ọkwọ ụgbọala ahụ, mana ndị uweojii achọtaghị Charles n'onwe ya, ruo n'ụbọchị Tọzde dịka a hụrụ ozu ya n'akụkụ ọhịa n'otu obodo dị n'okpuru ọchịchị Oguta.

    Otu onye n'ime ndị uweojii ahụ gwara onye ntaakụkọ anyị na ọ bụ ihe mwute etu e si gbuo onye otu ha.

    "Ahụ ya ebidola ire ure oge anyị chọtara ya," onye uweojii a na-achọghị ka a kpọọ aha ya kwuru. "Ha gburu ya n'ụzọ dị njọ nke ukwuu. Anyị hụrụ na ha bere ya mma n'olu ya."

    Henry Okoye, bụọnụ na-ekwuru ndị uweojii Imo Steeti kwukwara na ya bụ ihe mere n'eziokwu.

    "Kọmishọna uweojii Imo Steeti bụ Muhammed Berde ehibela otu ndị uweojii iji nyochaa ma jide ndị a gburu onye otu anyị, ma nye ha ntaramahụhụ kwesịrị ha." Okoye kwuru.

    Akụkọ mwakpo na ogbugbu ndị ọrụ nchekwa na mpaghara ọwụwa Anyanwụ Naịjirịa abụrụla ihe a na-anụ kwa mgbe kwa mgbe.

    Ọ rara ahụ otu izuụka ịgafe ka a ghara ịnụ otu ebe maọbụ abụọ ebe ndị ojiegbe wakporo ma gbuo ndị ọrụ nchekwa.

    Gọọmentị Naịjirịa na-ebo ebubo na ọ bụ ndị otu 'Indigenous People of Biafra' (Ipob), ndị na-alụ ọgụ maka nnwereonwe mpaghara Ọwụwa Anyanwụ ha kpọrọ Biafra, na-eme mwakpo na ogbugbu ndị a.

    Mana ndị Ipob sị na aka ha adịghị na ọgbaaghara maọbụ nkwafu ọbara ọbụla, kama ha na-eji ụzọ udo iji nweta ebumnuche ha.

  13. Sudan asapeghị aka nabata ndị ọrụ UN bịara ikpere ha ikpe udo

    Gọọmenti Sudan ekwuola na ndị ọrụ UN bịara ikep udo na mba ha ebe e nwere ọgbaaghara; Maazị Volker Perthes bụ "onye abaghị uru", nke a pụtara na Sudan e nweghị ihe ha kpọrọ ọrụ ya na Sudan.

    "Goọmenti mba Sudan agwala Odeeakwụkwọ ndị United Nations na o nweghị ihe ha jiri Maazị Volker Perthes kpọrọ ka ọ dị taata," ministri na-ahụ maka mmekọrịta mba na mba kwuru n'edemede ha zipụtara n'ụbọchị Tọọzde ka ha na-enwe mkparịtaụka dịka ndị ọrụ UN dere n'akara Twitter ha.

    Ndị isi agha Sudan - na onyeisi nnupuisi na mba Sudan - Ọchịagha Abdel Fattah al-Burhan, na nsonso a ka e boro Maazị Perthes na na-awụnye mmanụ n'ọkụ na-ere ere n'ebe ọgbaaghara dị.

    Ọchịagha Abdel Fattah al-Burhan demanded he be replaced.

  14. Ebola Donald Trump ebubo asaa ọzọ maka ijigide akwụkwọ nzunzo gọọmentị

    E bola aka chịburu mba Amerịka bụ Donald Trump ebubo ọzọ gbasara etu o si jie akwụkwọ nzuzo ụfọdụ gbasara gọọmentị Amerịka dịka ọ rịtuchara n'ọchịchị.

    Ebubo ndị a gụnyere ijigide akwụkwọ nzuzo ụfọdụ nke bụ ihe megidere iwu onye nkịtị ijide, mana ekwupụtabeghị ebubo ndị a n'ọha.

    Nke a bụ ebubo nke abụọ a na-ebo Trump, ọ bụrụ na a ma ya ikpe, o nwereike ịga mkpọrọ afọ iri.

    Trump amalitela achụmnta vootu maka ịzọ ọkwa onyeisiala Amerịka ọzọ na 2024 dịka ndị ọkachamara n'iwu kwuru na ebubo ndị a egbochighi ya ịzọ ya bụ ọkwa ọzọ.

    N'ọbaozi soshal midia nke ya a kpọrọ 'Truth Social', Trum sị na aka ya dị ọcha, ma kwuo na a gwara ya ka ọ bịa n'ụlọikpe dị na Miami, Florida, n'ehihe ụbọchị Tuzde, ebe a ga-ejichi ya ma kpee ya bụ ikpe.

    "Amaghị m na ụdị ihe a nwereike ime onye bụbu Onyeisiala Amerịka," Trump dere.

    "Nke a bụ oge nnukwu ọchịchịrị n'Amerịka. Anyị bụ mba na-alaghachiazụ n'ike n'ike, mana ọ bụrụ na anyị jikọọ aka, anyị ga-eme ka Amerịka dịkwa ukwu ọzọ."

  15. Ihe Gọvanọ Peter Mbah gwara Onyeisiala Tinubu maka ntọhapụ Nnamdi Kanu

    Gọvanọ Peter Mbah nke Enugu steeti ezigarala Onyeisiala ọhụrụ Naịjirịa bụ Bola Tinubu ozi banyere ntọhapụ onye ndu otu Indigenous People of Biafra (Ipob) bụ Nnamdi Kanu ma rịọ ya ka o tinyesie anya ike n’atụmatụ nhọhapụ ya n’ihi na ọ ga-abụ iwepụta aka udo nye ndị Ọwụwa Anyanwụ Naijirịa.

    Dịka o zutechara onyeisiala Naịjirịa, o gwara ndị ntaakụkọ obi gọọmentị okwu na Tọọzde abalị asatọ nke Juun, 2023 kwuo:

    “Anyị kpakwara maka ntọhapụ Nnamdi Kanu. Ị ma na mpaghara Ọwụwa Anyanwụ Naijirịa ejịkọla aka ọnụ na-achọ ka a tọhapụ Nnamdi Kanu.”

    “Anyị na-arịọ ka onyeisiala nke a bụ onye ụbọchị e duru ya iyi n’ọrụ kwere nkwa na o ga-akwalite ọgwụgwọ ma jiri ọmiiko chịa”

    Mbah kwukwara sị: “Anyị na onyeisiala kpara nke a. Anyị amasiela ọkwa ike, anyị amachiela iwu nọrọ n’ụlọ kwa ụbọchị Mọnde n’Enugu. Nke a pụtara na anyị ga-achọ ka a kwalite nchekwa iji buso ihe aka mgbe ga-eso nke a agha.”

  16. Ụtụtụ ọma nu o!, Ọ ga-adịrị anyị niile mma!!!

  17. Kedụ ihe e jiri mara Senator Annie Okonkwo nwụrụ na 7 Juunu?

    Senator Annie Okonkwo anwụọla.

    Senator Annie Okonkwo bụ onye Ojoto, Anambra steeti.

    A mụrụ ya na-afọ 1960, owee nwụọ ụnyịahụ bụ wenezde 7th June 2023 ka ọ gbara afọ 63years.

    Ka o siri too ma gụọ akwụkwọ Amụrụ senator Annie Okonkwo na 23rd May n'afọ 1960 na Ojoto, Anambra steeti. Ọgụrụ akwụkwaọ na mahadun Harvard nke Amerika, Mahadum univeesity of Lagos, ebe ọgụrụ maka azụmahịa.

    Ụlọ ọrụ ndị onwere Annie Okonkwo nwere ụlọ ọrụ ebe mmadụ karịrị puku asaa na-arụrụ ya ọrụ.

    Ụlọ ọrụ ndị ahụ gụnyere; Reliance Telecomm, Clemco Industries, Mordern Communucations(satellite TV Network), MacClemm Marketing Communications, Sunflower Nigeria nakwa Pentagon oil.

    Ndọrọndọrọ ọchịchì Senator Annie Okonkwo merịrị na ndọrọndọrọ ọchịchị na afọ 2007-2011 na party PDP, dịka senator na-anọchite anya Anambra Central na ụlọ ome iwu senate nke Naijiria.

    Ọ zọrọ ọkwa Gọvanọ na afọ Febụwarị 2010, nke Peter Obi bụ Gọvano mgbe ahụ meriri ya. Ọnwụ Senator Annie Okonkwo Ọnwụ nwa amadị a bịara dịka ihe mgbgwoju anya nye ọtụtụ mmadụ n'ihi na amaghị na ọjighi ahụ.

    Ụnyịahụ bụ wenezde 7th nke ọnwa june ka Senator Annie Okonkwo nwụrụ ka ogbara afọ 63. Nwa ya nwoke bụ Uchenna Harris Okonkwo kwuputara na nna ya na aya ahụ na mba USA.

    Mana oji nwayọ nwayọ na agbake n'ute ọrịa mgbe ọnwụrụ n'ike ụnyịahụ.

    Nwa ya nwoke kwuru na ọ bụ ihe nnukwu nwute nye ezinaụlọ ya.

  18. O nweghị mgbe gọvanọ Abia steeti jiri kwuo na ọ gaghị akwụ ndị Abia ụgwọ ọnwa Epreel

    Kazie Uko bụ ọnụ na-ekwuchitere Gọvanọ Abia steeti sị na akụkọ na gọvanọ Alex Otii agaghị akwụ ndị ọrụ gọọmenti Abia ụgwọ ọnwa Epreel bụ nnukwute asị.

    Cheta na akụkọ malitere fegharịwa na gọvanọ Abia steeti sị na ọ gaghị akwụ ndị ọrụ gọọmenti Abia ụgwọ ọnwa Epreel n'izua, mana nke nke nnyocha BBC mere maka ya bụ akụkọ hụrụ na nke a bụ asị.

    Cheta na Alex Otii bụ gọvanọ Abia steeti kwuru na ọ ga na-akwụ ndị ọrụ gọọmenti ụgwọ ọnwa n'ụbọchị 28 kwa ọnwa, ma sịkwa na ha ga-enyocha ma ndị niile kpọrọ onwe ha ndị ọrụ gọọmenti ha bụ ya n'ezie.

    Maazị Uko sị na akụkọ a nwereike isi n'ọnụ ndị ọchịchị Otii amasịghị.

    Ha sị na ha na-agba mbọ niile ịhụ na ihe niile ga-agata nke ọma na steeti.

  19. Anya niile na-agụ ihe a ga-adị ka echi maka na echi anaghị agwụ agwụ, Sonye anyị ebe a maka akụkọ niile na-akpọtụ n'ụwa taa...

  20. Idinotu steeti na Gọọmenti Etiti ga-ebi ụbịam na Naijiria- Tinubu

    Onyeisiala Bola Tinubu ekwupụtala mkpa ọ dị ka steeti na Gọọmentị Etiti jịkọọ aka na mbọ imeri ụbịam na agaghị n'ihu.

    Tinubu kwuru nke a taa bụ Wenezde dịka ya na ndị gọvanọ bụ nddị onyeisi oche otu jikọrọ ndị gọvanọ bụ Abdulrahman Abdulrazaq nke Kwara Steeti nwere ọgbakọ n'obi Gọọmentị n'Abuja.

    Tinubu, onye gbara ama nke a n'akara Twitter ya rụtụrụ aka na mkpa ọ dị ka e nwee ịdịnotu n'etiti steeti na ibe ya nakwa steeti na gọọmentị etiti iji weta ọganihu.