Mkpebi gbochiri NLC ịgba abụbụọrụ ga-adịgịde - Ụlọikpe NIC
Ụlọikpe na-ahụ maka ndị ọrụ a na-akpọ 'National Industrial Court' enyela mkpebi ka otu jikọrọ ndị ọrụ bụ 'Nigeria Labour Congress' ghara ịgba abụbụọrụ ruo mgbe a ga-ekpebi ikpe dị n'etiti ha na gọọmentị Naịjirịa.
Cheta na gọọmentị wegara mkpesa n'ụlọikpe dịka otu NLC kwuru na ha ga-agba abụbụọrụ maka etu gọọmentị si kwụsị ịkwụ ụgwọ 'subsidy' bụ nke mere ka ọnụahịa mmanụ ụgbọala gbalie elu nke ukwuu.
Dịka ikpe ahụ malitere n'ụbọchị Mọnde, ọkaiwu gọọmentị Naịjirịa bụ Ochum Emmanuel kwuru na ha dị njikere maka ikpe ahụ ịga n'ihu, mana gọọmentị ndị NLC bụ Marshall Abubarkar kwuru na ha tinyeburu akwụkwọ iji rịọ ụlọikpe ka a akụchapụ ikpe ahụ.
Mana Abubakar kwuru na gọọmentị Naịjirịa nyere ha akwụkwọ ọzọ n'ụlọikpe n'ụbọchị Mọnde, bụ nke ha enwebeghị ohere lebaa anya nke ọma.
Abubakar rịọrọ ka ụlọikpe nyetụ ha ụbọchị olemole iji lebaa anya n'akwụkwọ ọhụrụ a ma saa ya etu o kwesịrị.
N'aka nke ya, Emmanuel kwuru na ọ bụrụ na ụlọikpe ga-ege ntị ma gbatịkwuo ụbọchị ikpe ahụ, ọ dị mkpa inye iwu na mkpebi ha n'ụbọchị ikpe gara aga, bụ nke gbochiri NLC ịgba abụbụọrụ, ga-adịgide ruo n'ụbọchị ọhụrụ a ga-eyigharị ikpe ahụ.
Ụlọikpe ahụ kwetara nke a ma yigharịa ụbọchị ikpe ahụ ka ọ bụrụzie n'ụbọchị 20 nke ọnwa Julaị, ma kwukwaa na mkpebi ahụ gbochiri NLC ịgba abụbụọrụ ga-adịgide.
Ikpe nke taa na-abịa dịka ndị isi NLC na gọọmentị etiti na-enwe mkparịtaụka ugbua n'ụlọ gọọmentị dị n'Abuja gbasara ihe ga-abụ ọnọdụ ndị ọrụ na Naịjirịa dịka gọọmentị kwụsịrịla ịkwụ ụgwọ 'subsidy'.
NLC chọrọ ka gọọmentị bulie ụgwọ ọnwa opekatampe a na-akwụ ndị ọrụ, nke bụ puku naịra 30 ugbua. Ha chọrọ ka e bulie ego a ruo puku naịra 150 maọbụ karịa, iji nyere ha aka maka etu ọnụahịa ihe nri na ihe ndị ọzọ ji gbalie oke elu na Naịjirịa.