You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.

Take me to the main website

France Riots: Nnukwu ọgbaaghara adapụtala na mba Fransị n'ihi ogbugbu otu nwa okorobịa

Lee akụkọ ndị gbara ọkpụrụkpụ n'akụkọ na-eme na mba ụwa..

Mkpuchi Na Eme Ozugbo

Adline Okere, Ikechukwu Kalu, Chukwunaeme Obiejesi and Uche Akolisa

  1. Mkpebi gbochiri NLC ịgba abụbụọrụ ga-adịgịde - Ụlọikpe NIC

    Ụlọikpe na-ahụ maka ndị ọrụ a na-akpọ 'National Industrial Court' enyela mkpebi ka otu jikọrọ ndị ọrụ bụ 'Nigeria Labour Congress' ghara ịgba abụbụọrụ ruo mgbe a ga-ekpebi ikpe dị n'etiti ha na gọọmentị Naịjirịa.

    Cheta na gọọmentị wegara mkpesa n'ụlọikpe dịka otu NLC kwuru na ha ga-agba abụbụọrụ maka etu gọọmentị si kwụsị ịkwụ ụgwọ 'subsidy' bụ nke mere ka ọnụahịa mmanụ ụgbọala gbalie elu nke ukwuu.

    Dịka ikpe ahụ malitere n'ụbọchị Mọnde, ọkaiwu gọọmentị Naịjirịa bụ Ochum Emmanuel kwuru na ha dị njikere maka ikpe ahụ ịga n'ihu, mana gọọmentị ndị NLC bụ Marshall Abubarkar kwuru na ha tinyeburu akwụkwọ iji rịọ ụlọikpe ka a akụchapụ ikpe ahụ.

    Mana Abubakar kwuru na gọọmentị Naịjirịa nyere ha akwụkwọ ọzọ n'ụlọikpe n'ụbọchị Mọnde, bụ nke ha enwebeghị ohere lebaa anya nke ọma.

    Abubakar rịọrọ ka ụlọikpe nyetụ ha ụbọchị olemole iji lebaa anya n'akwụkwọ ọhụrụ a ma saa ya etu o kwesịrị.

    N'aka nke ya, Emmanuel kwuru na ọ bụrụ na ụlọikpe ga-ege ntị ma gbatịkwuo ụbọchị ikpe ahụ, ọ dị mkpa inye iwu na mkpebi ha n'ụbọchị ikpe gara aga, bụ nke gbochiri NLC ịgba abụbụọrụ, ga-adịgide ruo n'ụbọchị ọhụrụ a ga-eyigharị ikpe ahụ.

    Ụlọikpe ahụ kwetara nke a ma yigharịa ụbọchị ikpe ahụ ka ọ bụrụzie n'ụbọchị 20 nke ọnwa Julaị, ma kwukwaa na mkpebi ahụ gbochiri NLC ịgba abụbụọrụ ga-adịgide.

    Ikpe nke taa na-abịa dịka ndị isi NLC na gọọmentị etiti na-enwe mkparịtaụka ugbua n'ụlọ gọọmentị dị n'Abuja gbasara ihe ga-abụ ọnọdụ ndị ọrụ na Naịjirịa dịka gọọmentị kwụsịrịla ịkwụ ụgwọ 'subsidy'.

    NLC chọrọ ka gọọmentị bulie ụgwọ ọnwa opekatampe a na-akwụ ndị ọrụ, nke bụ puku naịra 30 ugbua. Ha chọrọ ka e bulie ego a ruo puku naịra 150 maọbụ karịa, iji nyere ha aka maka etu ọnụahịa ihe nri na ihe ndị ọzọ ji gbalie oke elu na Naịjirịa.

  2. Onyeisiala Tinubu ga-aga Fransị isonye n'ọgbakọ mba ụwa

    Onyeisiala Bola Ahmed Tinubu ga-esonyere ndị isi ala mba ụwa dị icheiche n'ụbọchị Tọzde, Jun 22, n'ọgbakọ a ga-enwe n'obodo Paris nke mba Fransị iji tulee ọnọdụ akụnụba ụwa nọ na ya ugbua.

    Ọnụ na-ekwuru onyeisiala bụ Dele Alake wepụtara ozi a ma kwuo na ya bụ ọgbakọ ụbọchị abụọ (Jun 22 na 23) ga-eleba anya n'ohere mba dị icheiche nwereike iji wulite akụnụba ha, dịka ụwa gabigara ọdachi dị icheiche n'ọdị nso a nke gụnyere mgbanwe ihu eluigwe, nsogbu mmanụ agbịdị, nakwa mfesa ọrịa Covid-19.

    Ọgbakọ a nke onyeisiala Emmanue Macron nke mba Fransị ga-abụ onyeisi ya ga-eleba anya n'etu mba ndị ka na-emepe emepe ga-esi nweta enyemaka ha ga-eji kwalite onọdụ akụnụba ha, nakwa ụzọ ọgbara ọhụrụ a ga-eji emepụta ike na-esighi na mmanụ agbịdị, bụ nke a na-akpọ 'green energy' na bekee.

    Ụfọdụ ndị welitere isi na gọọmentị ga-eso Tinubu mee njem a, dịka a na-atụ anya na ọ ga-alọghachite na Naịjirịa n'ụbọchị Satọde.

  3. Sit at home: Ndị Enugwu ji nwayọọ nwayọọ amalite ịga ọrụ na Monde

    BBC Igbo mere njem gagharịa n’akụkụ Enugu dị iche iche n’ụbọchị 12 nke ọnwa Juun ịma ma ndị mmadụ a na-erubere iwu onye nọrọ n’ụlọ isi na steeti ahụ.

    Nke a na-abịa dịka gọọmentị steeti ahụ gwara ndị Enugwu na ha atụla egwu ọbụla, kama ka ha kaa obi malitekwa ịga ọrụ kwa ụbọchị Mọnde ọbụla.

    Gọvanọ steeti ahụ bụ Peter Mbah nyere iwu n’ụbọchị ise nke ọnwa Juun ma kagbuo atụmatụ onye nọọ n'ụlọ nke a kpọrọ ‘Sit-at-home’.

    Cheta na Gọvano Peter Mbah gagharịrị izuụka abụọ gara aga ga ụfọdụ ahịa iji gosi nkwado ya n’atụmatụ nkagbuo a.

    Onye ọrụ BBC n’Enugu gbara ama dịka o mere ọtụtụ ngagharị nnyocha na steeti ahụ sị:

    “Ụfọdụ ebe n'Enugwu tọgbọọ chakoo, ebe ndị mmadụ na-agagharị ebe ndị ọzọ”

    O kwuru na ndị Enugu amalitela ịpụta aga mkpa ha n'uju etu ha kwesịrị n’ụbọchị Mọnde.

    Mana ọ hụrụ n’ụbọchị Mọnde a na ebe akụkụ GRA, Secretariat na IMT tọgbọọ chakoo dịka akụkụ Ogui road na New haven gosiri na ndị mmadụ na ụgbọala ha agagharị nwayọọ nwayọọ.

    Ahịa Artisan emepeghị nke ọma, kama ndị n'ere akwụkwọ nrị n’ihu ya bụ ahịa kpọsachara ngwa ahịa ha na-ere ihe.

    Gọvanọ Peter Mba zigara onye nnochite ya gaa n’isi ụlọọrụ ọgbakọ ndị ọrụ oyibo dịka ọ gwara ndị ọrụ okwu.

    Chidi Onyia gwara ndị ọrụ gbakọrọ n’isi ụlọọrụ gọọmentị na onye ọbụla gaa n'ụlọọrụ ya malite ọrụ na-egbughi oge ọbụla.

    Otu onye ọrụ n’ogige ahụ kwuru na “atụmatụ a amaka, Mọnde a dị anyị mkpa, ma dị Enugu steeti nakwa mpaghara ọwụwa anyanwa mkpa.”

    Onye ọzọ sị na “e nwere etu obi ka dị ndị mmadụ dịka ha ka ji otu ụkwụ kwụrụ”

    Ọ kọwara na uche nke ya na ọ ma na o na-efu ha ihe kwa ụbọchị Mọnde ọbụla ha agaghị ọrụ.

    Ihe ị kwesịrị ima maka ‘Sit at home’

    Ọnọdụ 'sit-at-home' bụ iwu ndị otu nnwereonwe a na-akpọ 'Indigenous People of Biafra (Ipob) tinyere na mpaghara Ọwụwa Anyanwụ Naịjirịa niile, kamgbe ọnwa Ọgọst afọ 2021, iji gosi iwe ha maka etu gọọmentị Naịjirịa si jide onyendu ha bụ Mazi Nnamdi Kanu na mba Kenya ma kpụlata ya n'ike na Naịjirịa.

    Ipob mechara kwuo na ha ewepụla iwu ahụ, mana ọtụtụ ndị ekperima na ndị ojiegbe malitere ịgagharị na mpaghara dị icheiche na-amanye iwu a, site na iwakpo ndị mmadụ, na-agba ụgbọala ọkụ, na-awakpo ndị ọrụ gọọmentị, ụlọọrụ gọọmentị, ndị ọrụ nchekwa ma na-egbukwa ụfọdụ ndị mmadụ bụ ndị pụtara ịga ahịa, mkpa ha maọbụ ọrụ n'ụbọchị Mọnde ọbụla.

    Kamgbe ahụ, ụbọchị Mọnde bụzi ụbọchị ‘ezumike’ nke gọọmentị etinyeghi na mpaghara Ọwụwa Anyanwụ maka na ụjọ anaghị ekwe ndị mmadụ pụta iro.

  4. Nwaanyị ahụ biliri n'ọnwụ mgbe a chọrọ ili ya anwụọla kpam kpam

    Otu nwaanyị onye Ecuado nwụrụ ma bile oge a chọrọ iliya anwụọla kpam kpam.

    Dọkịta kwupụtara ọnwụ Bella Montoya dị afọ 70 n’ụlọọgwụ dị n’obodo Babahoyo n’izuụka gara aga.

    Mana mgbe ndị mmadụ na-ebe akwa n’oge olili ya, ọ malitere ịkụ aka n’ime igbe ozu ya, nke mere e jiri bupụta ya ma bugaa ya n’ụlọọgwụ.

    N’ime ụbọchị asaa ọ nọchara n’ụlọọgwụ ebe a na-elekọta ya, minista ahụike na Ecuador kwupụtara ọnwụ ya n’ụbọchị Fraịde site n’ọrịa ‘Ischemic stroke’.

    Minista a kwuru na a na-enyocha ahụ oge niile n’ụlọọgwụ ruo mgbe ọ nwụrụ.

    Nwa nwaanyị a bụ Gilbert Barbera gwara ndị ntaakụkọ “nne m anwụọla n’ezie na nke ikpeazụ a. Ndụ agaghị adịzi ka ọ dị na mbụ.”

    Site n’ọnwụ ya nke ụbọchị 16 Juun, e burula ozu Montoya gawa n’ụlọ ebe a na-akwa ozu ka e lie ya n’ihu ọha.

    Akụkọ kwuru na nwaanyị a nwere ọrịa a kpọrọ catalepsy – ebe ahụ mmadụ na-akpọnwụ, onye agaghịzi ama ihe ọ na-eme.

    Ministri ahụike ehiwela ndị ọkachamaara ga-eme nyocha banyere ọnwụ nwaanyị a.

  5. Gọọmenti kwesịrị inye ụmụakwụkwọ ego n’efu karịa na mbinye – ASUU

    Otu jikọtara ndị nkuzi Mahadum bụ Academic Staff Union of Universities (ASUU) agwala onyeisiala Bola Tinubu ka ọ gbanwee iwu ibinye ụmụakwụkwọ ego ahụ ka ọ bụrụ inye ha n’efu ọkachasị ndị nke ụwa na-atụ n’ọnụ.

    Onyeisi otu a bụ Emmanuel Osodeke kwuru nke a na mkparịtaụka ya na ndị Channels TV nwere n’ụbọchị Sọnde.

    “Ọ gaara aka mma ma ọ bụrụ na e nye ụmụakwụkwọ ndị ụwa na-atụ n’ọnụ ego ahụ, e kwesịrị ịkpọ ya enyemaka n’efu ‘grant’ ọ bụghị ego mbinye ‘loan’.

    O kwuru na ebe ọ bụ na o si n’aka n’akpa gọọmenti etiti na e kwesịrị ịkpọ ya ego enyemaka, na ọ bụghị nwata akwụkwọ nata ego, o jiri ụgwọ ma ọ bụrụ na ọ kwụghị ya a tụọ ya nga.

    Osodeke kwuru na ọ bụ ya mere o ji dị mkpa na ndị niile nke a metụtara kwesịrị ịnọkọ ma kpaa nkata ọfụma banyere ya.

    Ọ gara n’ihu kwuo na ihe banyere ibinye ụmụakwụkwọ ego malitere n’afọ 1972 mana o nweghi isi rute ugbua kama ka a na-atụle etu nke a ga-esi adị iche.

    Cheta na Onyeisiala Tinubu tinyere aka n’akwụkwọ iwu ibinye ụmụakwụkwọ ego bụ nke o kwere na nkwa mgbe ọ na-azọ ọchịchị.

    Iwu ga-ahụ na ụmụakwụkwọ dara ogbenye ga-enwete ego iji agụ akwụkwọ kama ha ga-akwụghachị ya ma ọ bụrụ ha gụchaa akwụkwọ rụwa ọrụ.

  6. Igbo ụtụtụ ọma ndị e ji eme ọnụ

    Anyị na-anabata unu n'ọgbakọ anyị nke taa maka akụkọ na-eme na Naịjirịa, Afrịka nakwa mbaụwa.

  7. Sonyekwara anyị ọzọ n'ụtụtụ Mọnde

    Daalụ maka isonyere anyị taa, anyị ga-amalitekwa ọzọ n'elekere asatọ nke ụtụtụ Mọnde.

    Ya gaziere onye ọbụla.

  8. Naịjirịa ejirila ntakịrị ihe lafere Sierra Leone ma tozuo isonye n'iko mba Afrịka

    Ndị otu bọọlụ Super Eagles nke Naịjirịa etozuola isonye n'iko mba Afrịka nke afọ 2023 dịka ha ji ojisi ike merie mba Sierra Leone n'asọmpi itozu oke bụ nke ha gbara taa na mba Liberia.

    Ọkpụ goolu atọ a satara abụọ ka Naịjirịa ji merie, dịka Kelechi Iheanacho nyetere goolu na ngwụcha asọmpi ahụ.

    Naịjirịa bu ụzọ malite ịcha ọkụ n'asọmpi a dịka Victor Osimhen nyere goolu abụọ n'ime agba nke mbụ, mana ndị Sierra Leone nyetere otu goolu na nkeji 41 site n'aka Mustapha Bundu.

    Ọtụtụ ohere bịaara ndị Super Eagles inyekwu goolu abụọ maọbụ atọ ọzọ iji mee ka mmeri a dịrị ha mfe, mana ha gbafuru ohere ndị a ruo mgbe Sierra Leone nyere goolu nke abụọ ha site n'aka Augustus Kargbo na nkeji 84, dịka ọ fọdụrụ naanị nkeji isii ka asọmpi a kwụsị.

    Mmeri bụ ihe dị Sierra Leone mkpa n'asọmpi a, mana ọ bụrụgodi na ha gbara nhatanha, Naịjirịa gakwaara itozu ịga Afcon.

    Mana dịka nkeji 90 rurula, e tinyekwuru obere oge iji gbazuo maka oge e gburu mgbe asọmpi na-aga n'ihu, ọ bụ n'oge a ka Kelechi Iheanacho nyeteere Naịjirịa goolu nke atọ iji mee ndị Sierra Leone ka ha dị Aaron gbara aka laa.

    Mmeri a pụtara na Naịjirịa etozuola isonye n'Iko mba Afrịka a na-akpọ Afcon n'ịchafụ, bụ nke a ga-agba na mba Cote D'Ivoire malite n'ụbọchị 13 nke ọnwa Jenụwarị ruo ụbọchị 11 nke ọnwa Febrụwarị afọ 2024.

    Ọ bụ eziokwu na asọmpi a ga-adị n'afọ 2024, mana a na-akpọ ya Afcon nke 2023, n'ihi na ọ bụ n'afọ a ka e kwesịrị ịgba ya, mana otu na-ahazi egwuregwu bọọlụ n'Afrịka bụ Caf n'ịchafụ yigharịrị ya n'ihi na ọnọdụ ihu eligwe ga-akatụ mma n'ọnwa Jenụwarị na mba Cote D'Ivoire karịa etu ọ gaara adị n'oge e kwesịburu ịgba asọmpi ahụ n'afọ a.

  9. Ọgbaaghara na PDP Imo Steeti dịka ọtụtụ ndị isi ha gbara arụkwaghịm

    Mmadụ asaa so na ndị isi otu ndọrọndọrọ ọchịchị 'Peoples Democratic Party' (PDP) n'Imo Steeti agbaala arụkwaghịm ma kwuo na ha apụọla na pati ahụ.

    Ha kwuru na nke a bụ maka na ha enweghị ntụkwasịobi ọbụla n'ebe Samuel Anyanwu nọ, bụ onye pati ahụ họpụtara ịnọchite anya ha na ntuliaka ọkwa gọvanọ Imo Steeti bụ nke a ga-enwe n'ọnwa Nọvemba afọ a bụ 2023.

    Mmadụ asaa a gụnyere: Ray Emeana bụ odeakwụkwọ pati ahụ; Greg Nwadike - onyeisi ndị ntorobịa; Martin Ejiogu - osote onyeisi; Maria Mbakwe - onyeisi ụmụ nwaanyị; Josiah Eze - ojide ego; Chibuisi Obido - Osote onyeisi maka mpaghara Orlu, na Collins Opuruozor - ọnụ na-ekwuru pati PDP n'Imo Steeti.

    Mmadụ asaa a ekwughị patị ọhụrụ ha na-abanye, kama ha sị na ha ga-eme ka ọha mata nke a n'ụbọchị ndị na-abịanụ.

    "Anyị na-ekwupụta taa na odeakwụkwọ PDP nke Naịjirịa bụ Sinetọ Samuel Nnaemeka Anyanwu (Samdaddy) egbuola pati a n'Imo Steeti kpamkpam nke na ọ gaghị ekwe mmezite," Opuruozo bụ ọnụ na-ekwuru ndị otu a kwuru.

    Ha kwuru na Anyanwu ji ike ya dịka onye ọkwa ya gbalitere na pati ahụ n'Abuja na-ebuso ndị ọchịchị pati ahụ n'Imo Steeti agha iji hụ na ya onwe ya bụụrụ onye ga-azọ ọkwa Gọvanọ n'aha PDP.

  10. Bello Matawalle abụghị onye a na-achọ achọ - EFCC

    Ngalaba na-ahụ maka mgbochi nrụrụaka bụ 'Economic and Financial Crimes Commission' (EFCC), ekwuola na akụkọ pụtara n'akwụkwọ ụfọdụ na Naịjirịa n'ụbọchị Sọnde, nke kwuru na EFCC akpọpụtala aha Bello Matawalle dịka onye a na-achọ achọ, bụ akụkọ ụgha.

    Ọnụ na-ekwuru EFCC bụ Wilson Uwajuren kwuru nke a site n'akwụkwọ ozi o wepụtara n'ehihie Sọnde, dịka o kwuru na EFCC anaghị achọ Matawalle achọ.

    Bello Matawalle bụ aka chịburu Zamfara steeti, onye rịturu n'ọchịchị n'ụbọchị 29 nke ọnwa Mee afọ a. Mana Gọvanọ Steeti ahụ ugbua bụ Dauda Lawal ebola ya ebubo nrụrụaka nakwa ibukọrọ ụgbọala niile o ji ego gọọmentị zụọ mgbe ọ nọ n'ọchịchị.

    Lawal wegara mkpesa gbasara nke a n'ụlọikpe, ebe a nọrọ nye iwu ka ndị orụ nchekwa gaa n'ụlọ Matawalle dị na Gusau, isi obodo Zamfara, ga bute ụgbọala niile ha hụrụ ebe ahụ.

    Mana Matawalle gọrọ na ọ bụghị ego gọọmentị ka ya ji zụọ ụgbọala ahụ, ma kọwaa na ya na-azụbu ahịa ụgbọala tupu ya abụrụ gọvanọ.

    Ọnụ na-ekwuru EFCC bụ Uwajuren kwuru sị: "Ọ bụ eziokwu na anyị na-enyocha Matawalle maka ebubo ụfọdụ e boro ya, mana onweghị mgbe anyị ji kpọpụta aha ya dịka onye a na-achọ achọ."

    "EFCC nwere usoro doro anya ha na-eso tupu ha akpọpụta mmadụ dịka onye a na-achọ achọ, ọ bụghị site n'aka onye ọrụ nchekwa a na-amaghị aha ya."

  11. E nwere ndị na-agba gọọmenti mgba okpuru maka nwuchi Emefiele - DSS

    Ndị uweojii nzuzo a kpọrọ Department of State Services (DSS) ekwuola na ha enyochapụtala ndị mmadụ nakwa otu chọrọ ịgba mgba okpuru megide gọọmentị maka nwuchi ha nwuchiri Godwin Emefiele bụbu onyeisi ụlọakụ etiti.

    N’ozi ọnụ na-ekwuru ha bụ Peter Afunanya wpụtara, o kwuru na otu ndị a chọrọ ịgbakọta na mpaghara dị iche iche n’Abuja nakwa Legọs n’izuụka na-abịa, na ha ga-eji akwụkwọ e dere ihe ndị ga-egosi gọọmenti n’ụzọ ọjọọ na kpọọ oku ka a tọhapụ Emefiele.

    O kwuru na e nwere atụmatụ iji ụfọdụ ndị ọrụ ha akwara nkwa ọrụ iji mebie ebumnobi ndị ndu.

    Ọ dọrọ ndị na-akpa nkata a aka na ntị ka ha kwụsị ya ma gaa n’ihu kwuo anya ha dị n’ebe ndị ndu na aka ga-akpara ha.

    Ụlọọrụ DSS kwuru na ha enyela ezinaụlọ Emefiele, ndị dọkịta ya ohere ka ha leta ya n’ụlọ mkpọrọ ha tupu ụlọikpe enye iwu ime nke a.

  12. Peter Obi ka bụ nwoke kwesịrị ịchị Naịjirịa – Olusegun Obasanjo

    Na mkparịtaụka ọhụrụ aka chibụrụ Naijirịa bụ Olusegun Obasanjo na onye ntaakụkọ Chude Jideonwu nwere nke gbara n’ọha n’izuụka a, o kwuru ụfọdụ okwu dara ụda banyere Onyeisiala ọhụrụ Naịjirịa bụ Bola Ahmed Tinubu, aka chibụrụ Naịjirịa bụ Goodluck Jonathan na Muhammadu Buhari, Peter Obi onye o nyere kwado ya n’oge ntuliaka 2023, atụmatụ ya ịchọ ịchị Naịjirịa nke ugboro atọ nakwa ihe ndị ọzọ.

    Maka okwu ntuliaka 2023 na Peter Obi

    Mgbe a jụrụ ya ‘Kedụ ihe mere Peter Obi ji dị gị oke mkpa’

    Ọ kụchapụrụ okwu ahụ kwuo na ihe ka ya mkpa bụ ọdịnma Naịjirịa kama na ọ bụghị maka Obi.

    “Ọ bụghị Peter Obi dị m mkpa, ọ bụ Naijiria ka m mkpa. Ọ bụ maka Naijiria na ọchịchị m che ga-aka anyị ma n’oge a mere m ji kwuo na Peter Obi ka bụ nwoke ahụ kwesịrị ịchị Naịjirịa.”

    N’okwu banyere ihe ọ che maka ndị chibụrụla Naịjirịa

    Obasanjo kọwara na mmekọ ya na mmadụ abụghị ihe ga-egbochi ya ikwu ihe ọ chee maka ọchịchị nakwa agwa ndị ahụ.

    Ọ kọwara etu o si katọọ ọchịchị Goodluck Jonathan nakwa Muhammadu Buhari mana na nke a emeghi ka ha ghara ị na-enwe mmekọ .

    Mgbe a jụrụ ya ihe ọ chee maka ọchịchị ndị isi ala Naịjirịa so ya n’azụ o kwuru:

    “Enweghị onye m na-ahụ dịka dike m, ma e wezụga Jizọs Kraịst”

    Ọ gara n’ihu kwuo,

    “Ma ya onwe ya (Jịzọs Kraịst) akụkụ ya dịka mmadụ abụghị ihe na-enweghi ntụpọ.”

    Maka atụmatụ ya ịchọ ichi Naịjirịa nke ugboro atọ

    Obasanjo kọwara na enweghi mgbe o jiri kwuo na ọ chọrọ ịchị ugboro atọ kama na ọ bụ ụfọdụ ndị gọvanọ nọ na-akpa ya bụ nkata ma na-agbasa ya bụ ozi n’ihi na atụmatụ ahụ mịta mkpụrụ ha onwe ha ga-aga n’ihu chịa ugboro atọ.

    N’okwu ya, ọ sị:

    "Ndị gọvanọ, ụfọdụ n'ime ha nọ na-eme ya maka onwe ha."

    "N'ihi na ọ bụrụ na onyeisiala chịa oge nke atọ, ha onwe ha ga-enwekwa ohere maka oge nke atọ."

    Obasanjo gọpụrụ onwe ya n’atụmatụ ahụ mana cheta na n’ebe afọ 2006, iwu iji megharịa usoro iwu 1999 nke chọrọ ka agbatịa oge ọchịchị ndị ọchịchị gafee afọ asatọ kpụrụ afọ n’ala n’ụlọomeiwu Naịjirịa mgbe ahụ.

    Obasanjo chịrị Naijirịa dịka onyeisiala Naịjirịa nke mbụ n'agba ọchịchị onye kwuo uche ya anọ. Ọ chịrị dịka onyeisiala n'aha patị Peoples Democratic Party (PDP) from 1999 to 2007.

    Maka Onyeisiala Bola Ahmed Tinubu

    Na mkparịtaụka a, mgbe a jụrụ ya maka ebubo na ya (Obasanjo) nwara ịkpachị akụnaụba Legos steeti oge Tinubu bụ gọvanọ, Obasanjo kwuru na: Nke ahụ bụ nkọgheri”

    Ọ kọwara na atụmatụ nkwado Tinubu chọrọ ka onye steeti ahụ n’oge ahụ megidere iwu ma kwuo:

    “Ọ bụrụ na ọ (Bola Tinubu) maghị nke a, mara na ọ maghị ihe ọ bụla.”

    Ọ gara n’ihu jụọ ajụjụ maọbụ site na ikwalite akụnụba steeti ahụ ka o si hibe otu ụlọọrụ

    "Ọ bụ nke ahụ mere ka o nwee ALPHABETA?"

    Ọ gara n’ihu kwuo na ndị na-asị na ọ bụ onye na-abọ ọbọ na-akọ ihe mmasiri ha.

    Oge a jụrụ ihe ochee maka etu ọchịchị Tinubu ga-esi aga nakwa etu o ga-esi metụta ụmụafọ Naịjirịa, o kwuru:

    ‘E nweghi ihe m ga-ekwu ugbua n’okwu a’.

  13. Etu onyenweụlọ si kpọta ndị ohi gburu onye bi n'ụlọ ya, dinaa abụọ n'ike

    Aka ndị uweojii akparala otu onwenwe ụlọ kpọbatara ndị ekperima wakporo ndị bi n'ụlọ ya,gbuo nwoke ma dina ụmụ ya abụọ.

    A nwụchiri Adebayo Salami maka ịkpọ ndị ohi gburu nwoke bi n'ụlọ ya a kpọrọ, Makanjuola Ogedengbe ma dinaa n'ike ụmụ Ogedengbe abụọ bụ dị gbara afọ 14 na 10 n'ike ụlọ ha n'Ibadan,Oyo steeti.

    Ọ bụ dịka a nwụchiri ndị ekperima ahụ ebe ọzọ ha gara ohi ka ha gbara ama na ọ bụ ha kpara mkpamkpa butere ọnwụ nwoke ahụ nakwa onye nyere ha ozi ha ji

    Ọnụ na-ekwuru ndị uweojii Oyo steeti bụ Adewale Osifeso, onye gbara ama a kwuru sị, “N'abalị 16 nke ọnwa Juun, afọ 2023, ebe Elekere atọ na ọkara, a nwụchiri otu nwoke a kpọrọ Adebayo Salami, onye mgbama nakwa onye na anabata ihe e zuru n'ohi bụ onye nwe ụlọ n' Ajara Olohunda, Akobo in Ibadan."

    “Ka a gbara ya ajụjụ ọnụ, o kwupụtara na ya kpọrọ ndị bịara ohi na mpaghara Apaatuku ebe e gburu Ogedengbe ma metọọ ụmụ ya abụọ.

  14. Ndị ekperima egbuola mmadụ 40 n'ụlọakwụkwọ na Uganda

    Ihe ruru mmadụ 40, ọtụtụ n'ime ha bụ ụmụakwụkwọ, alaala mmụọ dịka ndị ekperima nwere alaka n'otu 'Islamic State' wakporo ụlọakwụkwọ ha.

    Mmadụ asatọ merụrụ ahụ na mwakpo ahụ ka nọ n'ọnọdụ ọjọọ ugbua n'ụlọọgwụ.

    Ụmụakwụkwọ ụmụ nwoke ndị bi ebi n'ụlọakwụkwọ so na ndị nwụrụ na mwakpo a.

    A na-ebo ebubo na ọ bụ otu nnupuisi a na-akpọ 'Allied Democratic Forces' (ADF) - otu ndị Uganda mana ha nọ na mba Democratic Republic of Congo - mere mwakpo a n'ụbọchị Fraịde.

    Mwakpo a malitere n'ebe elekere 11 na ọkara nke abalị Fraịde n'ụlọakwụkwọ a dị na mpaghara Kasese nke dị n'ọdịda anyanwụ Uganda.

    Ihe karịrị mmadụ 60 nọ n'ụlọakwụkwọ ahụ, ọtụtụ n'ime ha bi ebe ahụ.

    Ndị ọgụ ADF gbara ụlọ obibi ụmụ akwụkwọ ahụ ọkụ, ma burukwa nri niile dị n'ụlọ nchekwa nri ha, dịka ọnụ na-ekwuru ndị uweojii bụ Fred Enanga si kwuo.

    "Anyị ebugala ọtụtụ ozu ndị mwakpo a n'ụlọ ozu dị n'ụlọọgwụ Bwera Hospital."

    "Ụfọdụ n'ime ha ka e ji mma gbuo, ndị ọzọ bụ ndị ọkụ gbagburu nke na ọ ga-ara ahụ ịmata ha ma ewepụ site na nnyocha DNA," ọnụ na-ekwuru ndị agha bụ Dick Olum kwuru.

    Ndị ekperima ahụ tọrọkwaara ụfọdụ ụmụ nwaanyị bụ ndị ha hụrụ n'ụlọakwụkwọ ahụ.

    O dochabeghị anya mmadụ ole kpọmkwem nwụrụ na mwakpo a, maka na a na-eche na ụfọdụ ndị nkịtị na-abụghị ndị na-agụ n'ụlọakwụkwọ ahụ so na ndị nwụrụ.

    Ndị agha achụrụla ndị ekperima ahụ ọsọ banye n'oke ọhịa 'Virunga National Park' - nke bụ ọhịa kacha buo ibu n'Afrịka ebe e nwere ọtụtụ ụmụ anụmanụ anaghị ahụkarị, nke gụnyere Ozodimgba.

    "Ndị agha anyị na-achụ ndị iro a ọsọ iji zọpụta ndị ha tọọrọ ma lakwaa ha n'iyi," ọnụ na-ekruru ngalaba nchekwa bụ Felix Kulayigye kwuru na Twitter.

    Ndị agha Uganda ezipụkwala ụgbọelu dị icheiche iji nye aka chọta ndị ekperima ahụ.

  15. E kwesịrị iwepụ Mahmood n'ọkwa- Agbakoba

    Dịka Onyeisiala Bola Ahmed Tinubu wepụrụ Godwin Emefiele bụ Onyeisi ụlọakụ Etiti nakwa onyeisi EFCC bụ Bawa, ọkaiwu nwere agba bụ Olisa Agbakoba akpọọla ya oku ka o wepụ Yakubu Mahood n'ọkwa onyeisi Inec.

    Agbakọba, onye kwuru nke a n'ozi mgbasaozi nke binyere aka, sịrị:

    "Dịka anyị na-eche mkpebi ụlọikpe, e kwesịrị ka a malite ịhazigharị eusoro e si eme ntuliaka mana ihe nke a pụtara bụ na onyeisioche Inec kwesịrị ịpụ noche site na ịgba arụkwaghịm maọbụ mwepụ."

    "E meghị etu a, mbọ ịhazigharị usoro ntuliaka agaghị enwe isi."

    Agbakoba gara n'ihu sị," Onye ọbụla ga-ekwekọrịta na a bịa na nhazi, ntuliaka 2023 bụ nke kachasị njọ."

    "Anaghị m ekwu maka mpụtara ntuliaka ahụ bụ nke dị n'ụlọikpe puru iche e hiwere maka ntuliaka."

    Cheta na otu PDP na Labour Party na ndị feere ha ọkọlọtọ na ntuliaka 2023 gbara Inec na Bola Tinubu, nke APC akwụkwọ n'ụlọikpe ịgbagha mpụtara ntuliaka 2023 nke Inec kwuru na ọ bụ Tinubu meriri.

  16. Onye gbara afọ 40 abụrụla onyeisi Ụlọomeiwu Imo steeti

    A họpụtala Chike Olemgbe gbara afọ 40 dịka onyeisi ọhụrụ Ụlọomeiwu Imo steeti dịka e hibere ụlọ omeiwu nke iri nke steeti ahụ n'ụbọchị Fraide.

    Olemgbe, onye bụ mbụ ya ịbata dịka onyeomeiwu, na-anọchite anya mpaghara Okpuru Ọchịchị Ihitte/Uboma.

    A họpụtara Olemgbe, bụbu Onyeisioche nchereoge lekọtara Okpuru Ọchịchị Ihitte/Uboma, na-enweghị onye ọbụla zọsaara ya ọkwa ahụ.

    Amara Iwuanyanwu, bụbu Osote Onyeisi Ụlọọmeiwu ahụ, laghachikwara dịka osote ọzọ.

  17. E buliela Frank Mba, Bala Ciroma n'ọkwa 'DIG'

    Ngalaba na-ahụ maka okwu metụtara ndị uweojii Naijiria bụ ‘Police Service Commission’ (PSC) ebinyela aka ka e bulie Frank Mba na Bala Ciroma dịka Osote onyeisi ndi uweojii Naijiria (Deputy Inspectors General of Police (DIGs).

    Ọnụ na-ekwuru PSC bụ Ikechukwu Ani onye gbara ama n’ozi o wepụtara ụbọchị Fraide kwuru na Mba ga-eweghara ọkwa DIG John Amadi lara ezumike nka bụ onye na-anọchitebu Ọwụwa Anyanwụ.N’aka nke ọzọ, Ciroma ga-anọchi Ali Janga lara ezumike nke na-anọchitebu Ọwụị̀a anyanwu Ugwu Naijiria(North East) .

    PSC bulikwara ndị kọmishọna ndị uweojii 14 n’ọkwa “Assistant Inspectors General”.

    E mekwara ndịuweojii 22 bụbụ Osote Komishona ndị uweojii(Deputy Commissioners of Police (DCPs), Kọmishọna.

  18. Ndị uweojii anwụchiela onye dere na Twitter "anyị ga-egbu ndị Igbo niile"

    Ndị uweojii Osun steeti anwụchiela otu nwa okorobịa dị afọ 28, aha ya bụ Kehinde Adesogba Adekusibe, bụ onye dere ihe na Twitter na-akpọ oku ka e "gbuo ndị Igbo niile".

    N'ụbọchị 18 nke ọnwa Mee ka nwa amadị a depụtara ozi a na Twitter ma kwuo sị: "Ka anyị gbuo ndị niile. Ka anyị kpochapụ ha n'ala Yoruba. Akpọrọ m ndị a asị n'obi m niile. Ha bụ ndị ọgbaaghara, ha bụ ndị ọjọọ, ha kpọrọ anyị asị. Ka anyị kpọkwaa ha asị."

    Ọnụ na-ekwuru ndị uweojii bụ Olumuyiwa Adejobi kwuru na ndị uweojii Osun Steeti malitere ime nnyocha na nzuzo gbasara nwa amadị a, ma mechaa chọta ya ebe o zoro na mpaghara Ilesha nke steeti ahụ.

    "Nwa amadị a ekwetala na o mere ihe a n'eziokwu, a ga-akpụpụ ya ụlọikpe ma anyị mechaa nnyocha," Adejobi kwuru.

    Ọ gara n'ihu dọọ ndị ọha mmadụ aka na ntị ka onye ọbụla kpachapụ anya maka ụdị ihe ọ na-ede na soshal midia, maka na "onye ọbụla ga-azarịrị azịza maka ihe ọjọọ o mere".

  19. Greece boat disaster: Ụgbọ mmiri dakporo bu ụmụaka ruru otu narị

    Ndị azọtara ndụ ha n'ụgbọ mmiri n'akụkọ osimiri dị n'akụkụ ndịda Greece nke a kpọrọ ihe mberede kacha njọ mere na Yurope na nsonso a. Akụkọ na-apụta na-asị na o bu ụmụaka narị.

    Ihe dịka mmadụ 78 anwụọla n'ihe mberede a.

    A hụbeghịkwa ọtụtụ mmadụ dakporo n'ime mmiri ahụ dịka akụkọ si kwuo, mmadụ 750 dị n'ụgbọmmiri ahụ.

    A taana ndị ụlọọrụ na-echekwa mmiri ụta maka ịhapụ inyeaka mana ha sị na ha anabataghị enyemaka ha.

  20. Cyclone Biparjoy: Ihe karịrị mmadụ 170,000 agbahapụla ụlọ ha na mba India na Pakistan maka oke ifufe

    Ihe karịrị mmadụ 170,000 na mba India na Pakistan agbahapụla ebe obibi ha maka oke ifufe nke a kpọrọ 'cyclone' a na-atụ anya nwereike bụrụ ha mbuze na oke ifufe na mba ndị ahụ n'ụbọchị Tọzde.

    Ndị na-elebaanya n'ihu igwe adụọla ndị bi ebe ya bụ oke ifufe a ọdụ na ifufe a kpọrọ 'Cyclone Biparjoy' - pụtara ihe mberede n'asụsụ Bengali - nwereike imemina ọtụtụ ụlọ, ugbo dị n'ụzọ ya.

    A tụrụ anya na Biparjoy ga-ebu uzọ ruo steeti Gujarat na mba India na mgbede Tọzde n'oge obodo ha.

    Dịka ihe a hụrụ si obodo ahụ gosiri oke mmiri ozuzo makwa oke mmiri ozuzo.

    A na-atụ anya oke ifufe a kwesịrị irute ọdọmmiri Jakhau n'etiti Mandvi na Gujarat na Keti Bandar n'obodo Sindh na mba Pakistan .

    Na nsonso a, ndị na-elekọta ihe gbasara ihu ugwe n'India si na mbuze a tụrụanya "nwereike ibido taata ya bụ [n'oge obodo] ma na-emekwa ruo n'ime abalị".

    Ụlọọrụ na-elekọta mberede na mba Pakistan adụọla ndị mba ahụ ọdụ na oke ifufe ahụ nwereike iru ihe karịrị mịta 3-4 ya bụ (ọbada ụkwụ mmadụ si 10 ruo 13) n'obodo dị n'akụkụ mmiri a kpọrọ Karachi ruo ebe a maara ka steeti Gujarat n'India.