You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.

Take me to the main website

Anyị enweghị atụmatụ iwepụ akwụkwọ ego naịra ọhụrụ - Ụlọakụ etiti

Ụlọakụ etiti Naịjirịa kwuru na a ga-akwụsị iri ego ochie n'ụbọchị 31 nke ọnwa Disemba afọ a dịka ụlọikpe kachasi si nye ha iwu.

Mkpuchi Na Eme Ozugbo

Ikechukwu Kalu and Chukwunaeme Obiejesi

  1. Eze Charles nke Briten akwadola ka e nyochaa mbọ ezinaụlọ ha gbara n’ire ohu

    Obieze Burkingham ekwuola na ha na ndị nyocha na-arụkọ ọrụ iji nyochapụta etu aka ezinaụlọ Eze Briten si banye n’ire ohu n’agbata afọ 17th na 18th Centuries.

    Obieze a sị na Eze Charles ji okwu banyere nke a ‘kpọrọ mkpa’.

    Ndị na-eme nyocha ahụ bụ Mahadum Machester nakwa ngalaba na-ahụ maka akụkọ banyere Obieze.

    Obieze na-enye ndị nyocha ohere inyocha akwụkwọ nakwa akụkọ niile e dere banyere ha bụ nke e chekwara echekwa.

    Akwụkwọ a bụ nke ọkọ akụkọ bụ Camilla de Koning na-ede ka a na-atụ anya ga-apụta n’afọ 2026.

    Eze na Ọkparaeze nke Wales adịla na mbụ kwupụta nwute ha nwere banyere ahụhụ ndị mmadụ na-ata n’ihi ire ohu.

    Mgbe Eze na-eme njem na Rwanda n’afọ gara aga, o kwuru na ọ gaghị akọwanwu mwute o nwere maka ahụhụ ndị mmadụ na-ata n’ihi ire ohu.

    N’otu aka ahụ, Ọkparaeze Williams mgbe ọ gara Jamaica sị na ire ohu bụ ihe ọjọọ na-ekwesighi ime na ntụpọ ya ka dị n’akụkọ banyere ụwa ruo ebighiebi.

  2. El-Rufai ekeleela Wike maka inye Tinubu mmeri na Rivers Steeti

    Gọvanọ Kaduna Steeti bụ Nasir El-Rufai ekeleela ogbo ya nke Rivers Steeti bụ Nyesom Wike maka mmeri Bola Tinubu nke APC meriri na Rivers n’oge ntuliaka ọkwa onyeisiala Naịjirịa.

    El-Rufai kwuru nke a mgba o mere njem na River maka ịgbape okporoụzọ Eneka-Igbo Etche nke okpuruọchịchị Obio-Akpo.

    “Eji m aha pati anyị na onye zọọrọ anyị ọkwa onyeisiala na-ekele ndị Rivers Steeti maka ịtụrụ Bola Ahmed Tinubu vootu.

    Nke a bụ Peoples Democratic Party (PDP) enwetenwughi vootu 25 pasenti na Rivers Steeti kamgbe afọ 1999 ọchịchị onye kwuo uche malitere. Nke a gosiri na ndị Rivers maara mgbe ha kwesịrị ịtụrụ ezi agwa vootu karịa achịkọta ekwe ọnụ. Anyị na-ekele gị (Wike) maka ime ka nke a bịa na mmezu.”

    APC nwetere vootu dị 231,591 na Rivers Steetị, Labour Pat nwetere 175,071 ebe PDP nwetere 88,468 na ntuliaka ọkwa onyeisiala e mere n’ụbọchị 25 Febụwarị 2023.

  3. E kpeela oke ọkpa ikpe ọnwụ na Kano Steeti

    Ụlọikpe nọ na Kano steeti ekpeela ikpe sị ka onye nwe otu oke ọkpa gbuo ya na-agafeghị ụbọchị frịde maka ime mkpọtụ.

    Nke a na-eso mkpesa ndị agbatobi abụọ kpere nke kwuru na ya bụ oke ọkpa anaghị ekwe ha hie ụra.

    Otu onye bụ Yusuf Muhammed kwuru na oke ọkpa a na-emegide ikike dịirị onye maka ihi ụra.

    N'aka nke ọzọ ka onye nwe ya bụ oke ọkpa bụ Isyaku Shu’aib kwuru na ọ zụtara ya maka ọrịrị na ọṅụṅụ mmemme Ista ma sị ka a hapụ ya bụ oke ọkpa tutu ruo oge mmemme Ista.

    Ọkaikpe Halima Wali kwetere ma kwuo ka Isyaku gbochie oke ọkpa a ịgagharị ma na-enye ndị agbataobi nsogbu dịka ndị ụlọ ntaakụkọ Daily Trust siri dee.

    Wali nyekwara iwu ka Isyaku gbuo ya bụ oke ọkpa n'ụbọchị frịde ma ọbụghị ya na ọ ga-anata ntaramahụhụ maka ya.

  4. Ụtụtụ tụtụrụ unu ihe ọma!

    Anyị amalitela inye unu ezigbo akụkọ si mba ụwa niile.

  5. Ụlọikpe enyela Alex Otti ikike iso PDP nyochaa akwụkwọ ntuliaka ndị Inec

    Ụlọikpe na-ahụ maka ikpe banyere ntuliaka bụ ‘Tribunal’ enyela Alex Otti nke Labour Pati ikike inyocha akwụkwọ ntuliaka nke ụlọọrụ Inec na-ahazi ntuliaka.

    Ụlọikpe a dị n’Umuahia nyere Labour Pati ikike isonye Peoples Democratic Party nyochaa akwụkwọ ndị a ma nyekwa LP ikike inyocha akwụkwọ PDP jiri họpụta ndị ji ọkọlọtọ ha zọọ ọkwa Gọvanọ na osote ha site n’oge Uchenna Ikonne nwụrụ anwụ ruo na nke Okey Ahiwe.

    Cheta na PDP gara n’ụlọikpe ịma mpụtara ntuliaka ọkwa Gọvanọ e mere bụ nke nyere Alex Otti nke LP mmeri. N’ihi nke a ụlọikpe nyere ha ikike inyocha akụrụngwa e jiri mee ntuliaka a.

    Mmeri Otti mere butere oke mkpọtụ na ọṅụ n’Abia Steeti maka na ọ bụ mbụ Pati na-anọghị n’ọchịchị ga-emeri ntuliaka ọkwa Gọvanọ n’Abia kamgbe afọ 24 ọchịchị onye kwuo uche ya malitere na Naịjirịa.

  6. Ahụtazila onwe gị dịka onyeisioche Labour Pati - Ụlọikpe

    Ụlọikpe Ukwu dị n’Abuja enyela iwu nke machiri Julius Abure na Fayrouk Ibrahim ịhụta onwe ha dịka onyeisioche nakwa odeakwụkwọ ukwu nke Labour Pati.

    Ndị ọzọ iwu a machịrị gụnyere odeakwụkwọ nhazi ọgbakọ bụ Clement Ojukwu nakwa onye njikọ ego bụ Oluchi Opara.

    Ọkaikpe Hamza Muazu nyere iwu dịka ọ na-eleba anya n’akwụkwọ mkpesa James Onoja gbara n’ụlọikpe megide ndị a.

    Na mkpesa ahụ, Onoja sị na ndị a kpụrụ asambodo adịgboroja dị iche iche si n’ụlọikpe nke ha jiri banye n’ọkwa n’ike n’oge pati ha mere ntuliaka ịhọpụta ndị ndu.

    Onoja gara n’ihu kwuo na ndị uweojii mere nyocha ma chọpụta na aka ndị a adịghị ọcha na e nyela akwụkwọ ikike e ji anwụchi ha.

    Ọkaikpe Muazu sị na akwụkwọ ndị a kwesịrị ka e leba ya anya ma nye iwu sị ka mmadụ anọ ndị a kwụsị igosi onwe ha dịka ndị ndu Labour Pati.

  7. A nwụchịela ụmụnwoke abụọ maka ịraba otu nwaanyị dị ime n'ọhịa ma kegbuo ya

    A nwụchịla ụmụnwoke abụọ dịka a hụrụ ozu otu nwaanyị dị ime n’okpuruọchịchị Bebeji nke Kano steeti.

    Ndị uweojii steeti ahụ gbara ama nke a n’ụbọchị Tuzde dịka a nwụchịrị ha abụọ e kwuru dịcha afọ ebe 20.

    Ọnụ na-ekwuru ndị uweojii ebe ahụ bụ Abdullahi Kiyawa kwuru “ndị mmadụ hụrụ ebe nwaanyị a tọgbọ n’okporo ụzọ were wetere ndị uweojii ozi nke mere anyị ji bụga ya ụlọọgwụebe ndị dọkịnta gbara ama na ya bụ nwaanyị anwụọla.”

    Dịka ndị uweojii si kwuo, ihe mere kpọm kwem n’ụbọchị 28 nke ọnwa Maachị n’obodo Andariya n’akụkụ mpaghara dị nso ụzọ Kano-Jos n’okpuruọchịchị Bebeji nke Kano.

    E kwuru na nwaanyị a nwụrụ dị afọ 20 dịka aha ya bụ Theresa Yakubu onye bụkwa onye obodo Andraiya.

    Kiyawa kọwara na mmadụ abụọ a na-enyo kwupụtara ihe mere e ji arụ ha aka dịka otu n’ime ha nke ya na nwaada ahụ nọ na-ayị kwuru na ọ chọghị ime a sị ọ dị dịka ha gbara mbọ iwepụ afọ ime ya.

    Kiyawa kwụkwara na n’oge mkwupụta nwoke ahụ a na-enyo nke bụ enyi nwoke nwaada a kwuru na “Ya na enyi ya ọzọ raara nwaanyị ahụ baa ime ọhịa, kie ya aka n’ụkwụ ma were ịchafụ ya kegbuo ya n’olu.”

    E kwuru na nwaanyị ahụ dị ime ọnwa abụọ dịka nnyocha ime ahụ ya siri gosi.

    A nwụchiri enyi ya nwoke dị afọ 20 nakwa enyi ya ozọ dị afọ 25.

    Ndị uweojii kwuru na a ga-akpụkpụ mmadụ abụọ ụlọikpe ka ha zara ọnụ ha n’okwu ọnwụ nwaada ahụ.

  8. Ụlọọmeiwu Naịjirịa anabatala ka ụlọakụ China weta ego a ga-eji rụọ okporo ụgbọokolo ọhụrụ

    Ụlọomeiwu Naịjirịa anabatala ụlọakụ mba Chaịna bụ ‘China Development Bank’ dịka ụlọakụ ga-ewepụta ego a ga-eji rụọ ọrụ okporo ụgbọoloko ọhụrụ ekwuru ga-eri ego ijeri kwuru ijeri naịra.

    Nke a bụ dịka ụlọakụ mba Chaịna ọzọ nke kabụrụ iweta ego a ga-eji rụọ okporo ụgbọolokho ga-esi Kaduna gaa Kano bụ steeti ndị mmadụ kacha biri n’ime ya na mpaghara ugwu Naịjirịa kwuru na ha agaghịzị eme nke a n’afọ 2020.

    Ịrụ okporo ụgbọoloko nakwa ụlọọrụ ha so n’ihe onyeisiala Muhammadu Buhari gbara oke mbọ ime kemgbe ọ banyere ọchịchị mana ego eji arụ ya bịa bụrụ ihe aka mgba na ya bụ atụmatụ.

    Ndị ụlọomeiwu Naịjirịa ebinyelaka n’ọtụtụ nkweọrịta ga-ahụ na e bitere ego dọla ijeri kwuru ijeri n’aka mba Chaịna nakwa mba ofesi ndị ọzọ mana ọtụtụ n’ime ego ndị a erubeghi Naịjirịa aka ugbua.

    E duo onye a họpụtara ịchị Naịjirịa bụ Bola Tinubu iyi ọrụ n’ọnwa Mee, ọchịchị ga-anata ọtụtụ ihe aka mgba nke gụnyere ndakpo akụnụba Naịjirịa nakwa enweghị nchekwa.

  9. NCC aghọọla aka ha n'okwu ige ihe ndị mmadụ na-ekwu n'ekwentị ha

    Ụlọọrụ na-ahụ maka ikike ndị ọrụ mgbasaozi ịrụ ọrụ na Naịjirịa bụ Nigerian Communications Commission (NCC) akụchapụla ebubo na ha na-esi n’azụ na-enyo ma na-ege nkata ndị mmadụ na ibe ha na-akpa n’ekwentị ha dịka ha kwuru ha akụkọ a bụ akụkọ ụgha ma bụrụkwa ihe enyeghi ha ikike ime.

    Ọnụ na-ekwuru ha bụ Reuben Muoka zipụtara ozi n’abalị Tuzde ma kọwa na ọtụtụ ndị mmadụ kọpọrọ oku ma jụọ ha ọtụtụ ajụjụ banyere ebubo a nke mere ha jiri pụta gbaa okwu a n’anwụ ma kwuo hoo ha na ‘akụkụ iwu Nigerian Communication Act (NCA) 2003 hibere ụkpụrụ ọrụ” ha enyighi ha ikike ige, izobe maọbụ zipụta ozi maọbụ okwu ndị mmadụ kwuru n’ekwentị ha”

    Muoka kwuru na “ebubo a na-ebo anyị abụghị ihe anyị ga-eji gwuo egwu dịka anyị enwegarala ya ndị ụlọọrụ nchekwa dị iche iche maka nnyocha.”

    Nke a na-abịa dịka n'ọdị nso akụkọ pụtara gbasara mkparịtaụka nke wepụtara olu a sị bụ nke Peter Obi zọọrọ Labour Party ọkwa onyeisiala Naịjirịa na ụkọchukwu David Oyedepo bụ nke e kwuru si na nkata ha kpara n’ekwentị n'oge a na-eme ntuliaka ọkwa Onyeisiala Naịjirịa n'ọnwa Febrụwarị afọ a.

    BBC amatabeghị ma olu a nụrụ na mkparịtaụka a fesara na soshal midia ọ bụ eziokwu, mana ọ na-agbagwoju ọtụtụ mmadụ anya etu ndị wepụtara olu ahụ si nweta ya nke mere ebubo jiri dakwasị ụlọọrụ NCC n’isi dịka ọha ndị mmadụ rụrụ aka dịka ndị nwere ikike ige, izobe nakwa wepụta olu si na nkata ndị mmadụ kpara n’ekwentị ha.

  10. Achọpụtala ụdị ọrịa gonorrhoea ọhụrụ na mba Kenya

    Ndị nnyocha sayensị achpụta ụdị ọrịa gonorrhoea na chlamydia ọhụrụ na mpaghara ọdịda anyanwụ nke mba Kenya.

    Gonorrhoea na chlamydia so n'ọrịa abụọ ụmụ nwaanyị kacha ebute site na mmekọ ahụ, mana nnyocha gosiri na ihe karịrị ụmụnwaanyị 400 na obodo Busia, nke dị nso n'oke ala Kenya na Uganda, nwere ọrịa ndị a ụdị nke ọhụrụ a na-ahụbeghị mbụ.

    Ndị ọkachamara sayensị na-ekwu na ọ bụrụ na a kpachaghị anya, ọrịa ndị a ga-abanye na mba Uganda.

    Ha na-ekwu na ndị nwere ụdị nje ndị a ga-enweike ibute nje HIV ngwangwa.

    A ka na-eme nnyocha ịmata ma ụdị nje gonorrhoea na chlamydia nke a ọ bụ nke a ga-agwọta site n'inye ọgwụ 'antibiotics' ndị nke dị ugbua.

  11. Enweghị nwaanyị na-amabeghị nwoke a hụrụ ga-enweta ihe mmeri 'Virginity' anyị – Ozi New Vision

    Otu achịbịshọpụ ụka Anglịkan n’Uganda ahụghị onye ọbụla nwereike inweta ihe mmeri o kwupụtara na ọ ga-enye nwaanyị ọbụla na-amaghị nwoke tupu ọ lụọ di na mba ahụ dịka websaịtị ‘New Vision’ bụ nke ọchịchị mba ahụ nwee siri kwuo.

    Achịbịshọpụ Stephen Kaziimba Mugalu kwuru na ihe nrita gbadoro ụkwụ n’isi ụmụnwaanyị dịka amaghị-nwaanyị abụghị ihe nwere ihe ịgba n’ahụ ụmụnwoke dịka etu okwu siri dooanya n’ahụ ụmụnwaanyị.

    Websaịtị a kwuru na ‘ihe nrite a gụnyere ọkpụrụkpụ ego’ nke enwebeghi onye a hụrụ nye ya.

    Otu ụmụnwaanyị ụka kwesịrị inyocha ime ahụ ụmụnwaanyị ndị chọrọ ịlụ di tupu a hụ onye a ga-enye ya.

    Achịbịshọpụ ahụ kwuru n’izu gara aga “Nke a bụ atụmatụ mbụ m na-echepụta nke gụnyere inye onyinye ego mana enwebeghị onye a hụrụ nye ya bụ onyinye.”

    O kwuru na ọ bụ site na nzụmụkwụ nne Jesu bụ Mary ka o si chepụta echiche ihe a dịka ndị okpukperechi Kraịst kwenyere na Mary amaghị nwoke tupu ọ tụrụ ime ma mụọ Jesu.

  12. A tọrọla ihe ruru ụmụakwụkwọ 10 na Kadụna steeti

    Akụkọ ọhụrụ apụtala nke gbara ama na ndị omekome atọrọla opekatampe, ụmụakwụkwọ 10 n’otu ụlọakwụkwọ gọọmentị dị n’akụkụ obodo Awon nke Kaduna steeti n’ụbọchị Mọnde.

    Kaduna steeti so na steeti ebe ndị omekome na-apaghari egbe ma na-awakpo ndị mmadụ n’akụkụ mpaghara ugwu Naịjirịa.

    N’afọ 2021, a tọrọrọ narị kwuru narị ụmụakwụkwọ n’akụkụ ebe ahụ dị a nara ndị ezinaụlọ ha ego mgbapụta.

    Na nso nso a, akụkụ mwakpo na ntọrọ ndị a belataturu.

    Cheta na otu n’ime ihe gọọmentị Naijirịa kwuru mere e jiri gbanwee akwụkwọ ego Naịra bụ iji hụ na ya bụ atụmatụ busoro ndị ntọ na-ana ego agha.

  13. Finland esonyela n'otu NATO: Lee ihe nke a pụtara maka nchekwa na Europe

    Finland abụrụla mba nke 31 sonyere n'otu nchekwa Nato dịka e buliri ọkọlọtọ mba ahụ n'isi ụlọọrụ otu ahụ.

    Nato bụ aha ịchafụ maka 'North Atlantic Treaty Organization' (Nato) nke bụ otu jikọrọ ndị agha mba dị icheiche na Europe.

    Mịnịsta na-ahụ maka mmekọrịta mba Finland na mba ndị ọzọ zutere odeakwụkwọ mba Amerịka bụ Antony Blinken ma hafee ya akwụkwọ nkwekọrịta gosiri na ha esonyerela otu Nato.

    Nsonye Finland na-esonyere Nato bụ ihe ịdọghachi azụ nye onyeisiala mba Russia bụ Vladmir Putin bụ onye na-ekwu na ya achọghị ka e nwee ọtụtụ ndị so na mba Nato n'oke ala Russia.

    Nke a bụ maka na iwu Nato bụ na mba ọbụla wakporo otu n'ime mba so na Nato, mba Nato niile ga-ebuso mba ahụ agha

    Russia na Finland nwere oke ala ruru kilomita 1,340.

    Ọ bụ n'ọnwa Mee afọ 2022 ka Finland na Sweden tinyere akwụkwọ isonye n'otu Nato

    Ọnụ na-ekwuru mba Russia bụ Dmitry Peskov dọrọ aka na ntị na Russia ga na-ele anya ịmata ihe ga-eme na Finland, ma kwuo na Finland isonyere Nato "megidere atụmatụ nchekwa nke mba anyị".

    Finland na Sweden malitere ịchọ isonye Nato dịka Russia wakporo mba Ukraine n'ọnwa Febrụwarị afọ 2022.

    Nke a pụtara na ọ bụrụ na mba ọbụla wakpoo Finland ugbua, mba niile so na Nato - tinyekwara mba Amerịka - ga-agbatara ha ọsọ enyemaka.

    Onyeisi otu Nato b Ọọchịagha Jens Stoltenberg gwara ndị ntaakụkọ na nsonye a Finlad sonyere n'otu Nato "ga-eme ka Finland siwanye ike ma wepụkwa ụjọ".

    "Onyeisiala Putin kwuburu na ihe o ji wakpoo Ukraine bụ iji belata mba Nato nọ nso n'oke ala ha, mana ugbua, ọ hụla na ha na-abawanye."

  14. Trump ọ ga-enwe ike ịzọ ọkwa onyeisiala ugbua a kpụpụrụ ya ụlọikpe?

    A na-atụ anya na Donald trump bụbu onyeisiala mba Amerịka ga-apụta n'ụlọikpe taa bụ Tuzde.

    A na-ebo Trump ebubo na ọ kwụrụ otu nwaada na-eme ejije aramara ụgwọ akaazụ ka o wee mechie ọnụ gbasara mmekọ ahụ ha abụọ nwere n'oge gara aga.

    Ya bụ ihe mere ọtụtụ afọ tupu Trump abụrụ onyeisiala Amerịka.

    Ọ bụ eziokwu na ịkwụ ụgwọ dị otu a emegideghi iwu mba Amerịka, mana ihe megidere iwu bụ na Trump na ndị ọkaiwu ya kpuchiri ya bụ ihe ma dee na ego ahụ ha kwụrụ bụ ụgwọ ndị ọkaiwu (legal fees).

    Trump n'onwe ya na ọ daghị iwu ọbụla, mana ụlọikpe ga-amalite ya bụ ikpe taa.

    Trump ọ ga-aga mkpọrọ?

    Ọ bụrụ na ụlọikpe kwuo na ikpe mara Trump, ihe a na-atụ anya bụ na a ga-ada ya nha, mana obere ohere dị na e nwere ike ịtụ ya mkpọrọ.

    Ọ bụrụ na ebubo ọbụla e boro ya siri ike - nke a na-akpọ 'felony' na mba Amerịka - mkpọrọ a ga-atụ ya agaghị agafe afọ anọ.

    Mana ndị ọkachamara n'iwu Amerịka gwara BBC na ha echeghị na a ga-atụ Trump mkpọrọ.

    Nke a ọ ga-egbochi Trump ịzo ọkwa Onyeisiala?

    Mba. Enweghị ihe dị n'akwụkwọ iwu mba Amerịka nke gbochiri Trump ịga n'ihu n'ịzọ ọkwa Onyeisiala ugbua a kpụpụrụ ya ụlọikpe.

    Ọbụrụgodi na a tụọ Trump mkpọrọ, ọ ka nwekwara ike ịzọ ọkwa onyeisiala ma merie.

    Mana e nwere ọdachi ụfọdụ nwereike ichere ya aka mgba.

    Ogologo oge n'ụlọikpe bụ ihe nkụsa anya n'achụmnta vootu maka ntuliaka ọkwa onyeisiala.

  15. Kenya na-akwado izipụ Satilaịt nke ga na-agba ụwa ugburugburu

    Mba na-akwado i zipụ satilaị mbụ ha nke ga na-agba ụwa gburugburu na mbara igwe.

    Nation-1 maọbụ Taifa-1 n'asụsụ Swahili bụ aha eji mara satilaịt a bụ izuụka na-abịa ka a ga-ezipụ ya eluigwe.

    Ọ bụ n'ogige Vandernberg,ụlọọrụ na-ahụ maka njem eluigwe nke dị na Kalịfọnịa ka a ga-esi ezipụ ya bụ satilaịti.

    Ọ bụ ndị ọkaibe sayensi mba Kenya tuziri ma mmepụta ya bụ satlaịt ebe ndị ngalaba njem eluigwe mba Bulgaria nyere ha aka.

    Mba Kenya na-akwado izipụ ngwa teknụzụ mbụ ha ga na-esete ihe onyonyo ndị na-eme n’ụwa nakwa akụkụ site n’ime eligwe nke a kpọrọ oke ihe gbara okpụrụ n’okwu iwụba ime eligwe na mba ahụ.

    E hibere izipụ ngwa a kpọrọ ‘Nation-1’ maọbụ Taifa-1 n’asụsụ Swahili n’izu na-abịa abịa.

    A ga-eji ụgbọelu pụrụ eji eziga ihe n’ime eligwu bụ SpaceX Falcon 9 site n’ọdọ Vandenberg Space Force Base na Califonia nke mba Amerịka.

    Dịka ozi ụlọọrụ nọ n’isi okwu a siri kwuo, ngwa onyonyo a nwereike inyote ozi ga-abara mba Kenya uru n’ọrụ ugbo ha, ọrụ ịzụ ụmụanụmanụ, ichekwa na mmepụta nrị, itinye anya n’ọdịmma gburu gburu ha nakwa ọrụ nchekwa nke ministri nchekwa ha.

    A na-atụ anya iziga otu ndị a họpụtara na Kenya ka ha gaa mba Amerịka maka nzipụ ngwa a.

    Nke a bụ oke ihe nye ndị ọrụ sayensị na teknụzụ mba a ọkachasị dịka ụkọ mmiri ozizo na-anyụ ha ịkpakwụ kemgbe afọ ise gara aga.

    N’afọ 2018, mba Kenya zipụrụ ngwa onyonyo nke e ji nwaala ya bụ okwu site n’ọdọ nziga nke International Space Station.

  16. Donald Trump awuchiela New York maka ikpe nrụrụaka

    Onye bụbu onyeisiala mba Amerịka bụ Donald Trump awụchiela New York dịka a ga-ekpe ya ikpe nke hiwere ụkwụ na nyocha gosiri na ọ kwụrụ onye na-eme ihe ejije aramara ama ama ụgwọ ka ọ mechie ọnụ maka mmekọ a sị na ha abụọ mere.

    Nke a mere tupu emee ntuliaka nke afọ 2016, ya bụ nwaanyị eji Stormy Daniels mara kwuru na ya na Trump nwere mmekọrịta nwoke na nwaanyị.

    Trump ga-abụ onye isiala Amerịka mbụ a ga-ekpe ikpe maka nrụrụaka.

  17. Mba Malaysia ewepụla ịma mmadụ ikpe ọnwụ n'iwu ha

    Ndị omeiwu na mba Malaysia ewepụla ịma mmadụ ikpe ọnwụ maka ndị kpara arụ dị icheiche na mba ahụ.

    Ọ bụ n'ọgbakọ ndị omeiwu n'ụbọchị Mọnde ka ha nwere nkwekọrịta a dịka ha mere ntuliaka gbasara ya.

    Mana dịka mkpebi ha si dị, ndị ọkaikpe ga-enwe ikike ịma mmadụ ikpe ọnwụ ma ọ bụrụ na onye ahụ kpara nnukwu arụ, kama nke a dị n'aka ọkaikpe na-ekpe ya bụ ikpe.

    Mkpebi a azọọla ndụ ihe karịrị mmadụ 1,300 bụ ndị a marala ikpe ọnwụ mana ha nọ na mkpọrọ na-eche ụbọchị a ga-egbu ha.

    Ugbua, a ga-atụgharị ikpe a mara ndị dị otu a ka ọ bụrụzie ịnọ ogologo oge na mkpọrọ.

    Nke a pụtara na arụ dịka iyi ndụ egwu maọbụ igbu mmadụ ga-abụzi ihe a ga-eji tụọ mmadụ mkpọrọ ogologo afọ nwereike iru afọ 40 maọbụ ndụ ya niile kama igbu onye ahụ egbu.

    A na-atụ anya na ụlọ omeiwu ukwu nke mba Malaysia ga-eleba mkpebi a anya ma kwadokwaa ya.

    N'ọgbakọ ndị omeiwu n'ụbọchị Mọnde, osote mịnịsta na-ahụ maka ikpe ziri ezi na mba Malaysia bụ Ramkarpal Singh kwuru na ịma ikpe ọnwụ akwụsịbeghị mpụ dị icheiche ndị mmadụ na-eme na mba ahụ ya mere na o kwesịrị ka e lebaa ya anya.

    Ha dị mpụ 34 nke e nwereike iji maa mmadụ ikpe ọnwụ na mba Malaysia, 11 n'ime ha bụ nke ga-abụrịrị ikpe ọnwụ.

    Dịka ụlọọrụ na-agba mbọ maka ikike dịịrị mmadụ bụ Amnesty International si kwuo, mmadụ 1,341 bụ ndị a mara ikpe ọnwụ na mba Malaysia.

    Ọ bụrụ na ebinye iwu a aka, ndị a mara ikpe ọnwụ ga-enwe ụbọchị 90 iji tinye akwụkwọ ke e lebagharịa okwu ha anya.

  18. Ụlọikpe atọhapụla 'Portable' nwa mgbe nta

    Ụlọikpe ukwu dị n'Ifo, Ogun Steeti enyela iwu ka ndị uweojii tọhapụ otiegwu aha ya bụ Habeeb Okikiola, onye e ji 'Portable' mara.

    Ndị uweojii jichiri 'Portable' n'ụbọchị Fraịde, Maachị 31, dịka ha kwuru na mmadụ wetara mkpesa megide ya.

    Ebubo e boro 'Portable' gụnyere imerụ onye uweojii aha ya bụ Hameed Moshood ahụ, nakwa ịjụ ajụ oge ndị uweojii bịara ijide ya.

    Ụlọikpe kwuru ka Portable kwụọ ego dị puku narị naịra atọ (N300,000) ma kpọtakwa mmadụ abụọ ga-ana ya n'akaebe, bụ ndị nwere ala na mpaghara Ogun Steeti.

    Ọkaikpe ahụ bụ A.S Shoneye nyere iwu ka e jide Portable n'ụlọ mkpọrọ dị n'Ilaro ruo mgbe o mezuru ihe niile a sị ya mee tupu atọhapụ ya.

    O tinyekwara ụbọchị Eprel 26 dịka ụbọchị a ga-amalite ikpe ya bụ ikpe.

  19. Atọrọla ụmụnwaanyị ụmụ akwụkwọ abụọ na Zamfara Steeti

    Ndị omekome awakpola ụlọakwụkwọ Federal University nke Gusau dị na Zamfara Steeti.

    Ya bụ ihe mere n'ụtụtụ sụnde dịka ndị ojiegbe a wakporo ebe obibi ụmụakwụkwọ dị na Sabon-Gida,obodo nọ n'akụkụ ụlọakwụkwọ mahadum ahụ.

    Akụkọ na-ekwu na ndị ojiegbe a kpọchịrị ndị nche mmadụ abụọ nọ ebe ahụ, napụ ha ekwe ntị ha tupu ha atọrọ ndị ha tọorọ.

  20. Ndị ojiegbe egbuola otu onye ma tọrọ ụkọchukwu na Benue Steeti

    Akụkọ na-ekwu na ndị ojiegbe awakpoola ụlọụka Christian Pentecostal Church dị n'obodo Akenawe -Tswarev dị n'okpuruọchịchị Logo nke Benue steeti n'abalị satọde.

    Ndị a gburu otu onye ma tọrọ ụkọchukwu na mmadụ atọ ọzọ dịka ha na-aka ụka imu anya abalị.

    Ugbua, egwu nọ na mpaghara a maka ọnọdụ enweghị nchekwa kamgbe emechara ntụliaka.