You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.

Take me to the main website

Anyị enweghị atụmatụ iwepụ akwụkwọ ego naịra ọhụrụ - Ụlọakụ etiti

Ụlọakụ etiti Naịjirịa kwuru na a ga-akwụsị iri ego ochie n'ụbọchị 31 nke ọnwa Disemba afọ a dịka ụlọikpe kachasi si nye ha iwu.

Mkpuchi Na Eme Ozugbo

Ikechukwu Kalu and Chukwunaeme Obiejesi

  1. Ụmụ Naịjirịa si mba Sudan ga-abata Abuja echi bụ Fraịde - Nema

    Ngalaba gọọmentị Naịjirịa na-ahụ maka ọnọdụ gbatagbata bụ 'National Emergency Management Agency' (Nema) ekwuola na otu nke mbụ nke ụmụ Naịjirịa nọ na mba Sudan bụ ndị gọọmentị etiti gbatara ọsọ enyemaka iji zọpụta ha, ga-alọbata n'Abuja echi bụ Fraịde, ụbọchị 28 nke ọnwa Eprel 2023.

    Ozi si'akara Twitter nke Nema kwuru na ọnụọgụgụ ụmụakwụkwọ ndị a na-ele anya ha na Fraịde bụ mmadụ 1,600.

    "Ụgbọala bus iri na atọ si obodo Khartoum nke Sudan wee buru ụmụakwụkwọ ahụ na-aga na mpaghara Aswan nke mba Egypt ugbua bụ ebe a ga-eji ụgbọelu bulata ha Naịjirịa," ozi ahụ kwuru.

    "Nema na ụlọọrụ ụgbọelu Air Peace, bụ ndị wepụtara ụgbọelu ha iji bulata ụmụ Naịjirịa ndị a, na-enwe mkparịtaụka ugbua."

    Nema kwuru na ọ bụ eziokwu na ọnọdụ nchekwa na mba Sudan ugbua dị oke njọ mana ha na-agba mbọ niile ha nwereike iji nyere ụmụ Naịjirịa nọ na mba ahụ aka site na njikọta aka ọnụ nke ụlọ nnọchite anya Naịjirịa na Sudan

    "Anyị na ụfọdụ ụlọọrụ ụgbọala na mba Egypt enweela nkwekọrịta iburu ụmụ Naịjirịa si Khartoum ruo Aswan. Anyị na-arịọ ụmụ Naịjirịa niile ka ha nọrọ jụụ maka na ndị ọrụ na-agba mbọ ịhụ na ụmụnne anyị ndị nwoke na ndị nwaanyị ga-alọta n'udo," ka akwụkwọ ozi ahụ kwuru.

  2. Mmadụ 25 anwụọla n'ọgbaaghara ndị ọchịehi na ndị ọrụ ubi na Taraba

    Ihe ruru mmadụ 25, nke gụnyere otu onye agha, anwụọ n'ọgbaghara akwụsị akwụsị dapụtara n'etiti ndị ọchịehi Fulani na ndị ọrụ ubi na mpaghara Ussa na Takum dị na Taraba steeti.

    Ọ bụ ọnụ na-ekwuru ndị uweojii steeti ahụ bụ Abdullahi Usman kwuru nke a n'akwụkwọ ozi o wepụtara n';ụbochị Tọzde.

    Usman kwuru na otu onye agha ahụ nwụrụ anwụ na-alaghachi n'ogige ndị agha 93 Battalion oge ndị amaghị ndị ha bụ wakporo ya ma gbuo ya mana onweghị ihe ya ọbụla ha weere.

    "Anyị amabeghị ndị mere mwakpo a mana anyị amalitela nnyocha gbasara ya," ka Usman dere.

    "Ọnụọgụgụ etu ihe dị ugbua gosiri na ndị obodo Kuteb mmadụ 20 anwụọla ebe ndị ọchịehi Fulani atọ anwụkwaala n'ihi ọgbaaghara a."

    "Ihe na-ese okwu ugbua nke mere na ọgbaaghara a akwụsịbeghị bụ na ndị ọchịehi Fulani na-ekwu na ndị ọrụ ubi obodo Kuteb jichiri ọtụtụ ehi ha, mana ndị obodo na-ekwu na nke ahụ abụghị eziokwu."

    "Ndị obodo na-atụkwanụ egwu ịgaghachi n'ubi ha dị icheiche n'ihi ụjọ na ndị ọchịehi Fulani nwereike ịwakpo ha."

  3. Gọọmentị etiti akagbuola atụmatụ iwepu ‘subsidy’ mmanụ ụgbọala

    Ngalaba gọọmentị etiti a kpọrọ ‘National Economic Council (NEC) nọọrọ n’ụbọchị Tọzde akagbuola atụmatụ iwepu ego gọọmentị na-akwụ iji bubata mmanụ ụgbọala na Naịjirịa a kpọrọ ‘subsidy’ na ngwụcha ọchịchị Onyeisiala Muhammadu Buhari.

    Minista na-ahụ maka akụnaụba bụ Zainab Ahmed kwuru nke a mgbe ọ na-agwa ndị ntaakụkọ okwu na ngwụcha nzuko ha mere n’Abuja nke osote onyeisiala Yemi Osinbajo nọ n’isi ya.

    O kwuru na ha kpebiri na oge ahụ abụghị oge dị mma iji mee mwepu ahụ.

    O kwuru na ndị NEC tụgharịrị uche n’okwu ahụ ma kpebie na agaghị ewepụ ya ugbua, mana ha gara n’ihu kwuo na a ga na-eleba anya n’okwu banyere ya.

  4. Ụgbọala bu anyị agbahapụla anyị n'ọzara - Ụmụ akwụkwọ Naịjirịa nọ Sudan

    Ụfọdụ ụmụ akwụkwọ Naịjirịa nọ mba Sudan ekwuola na ụgbọala bu ha si mba Sudan gawa Egypt kwụsịrị ha n'etiti ọzara "maka na ndị ọkwọ ụgbọala ahụ keuru na gọọmentị Naịjirịa akwụghị ha ụgwọ ọbụla".

    Otu nwata akwụkwọ Naịjirịa nọ na Sudan gwara BBC na ọtụtụ ndị enyi ya ka tọro n'ọzara.

    Nwata nwaanyị a dị afọ 22 onye achọghị ka a kpọọ aha ya kwuru na n'ime ụgbọala bus 14 nke gọọmentị Naịjirịa sị na ha ga-ebute iji buru ha gaa Egypt, naanị 10 bịaruru na Khartoum n'ụbọchị Wenezde nke pụtara na ọ bụghị mmadụ niile banyere.

    Ya onwe ya ka nọ na Khartoum na-eche, ya na ụmụ Naịjirịa ndị ọzọ ọnụọgụgụ ha karịrị 1000 bụ ndị ka nọ n'ụlọakwụkwọ 'International University of Africa' dị na Khartoum, mana ha ahụbeghị ihe ọbụla gosiri na ụgbọala ka na-abịa iburu ha.

    Nwata akwụkwọ a na-ekwu na ụjọ na-atụ ha na a ga-asị ha pụọ n'ụlọ akwụkwọ ahụ taa.

    Otu onyonyo na Twitter gosikwara ebe ụfọdụ ụmụ Naịjirịa na-ekwu na ha tọrọ atọ n'etiti ọzara n'ihi na ụgbọala ha kwụsịrị dịka ndị ọkwọ ụgbọala ha na-ekwu na akwụbeghị ha ụgwọ.

    Mana onyeisi ngalaba na-ahụ maka ọdịmma ụmụ Naịjirịa bi na mba ofesi bụ Abike Dabiri mechara depụta na Twitter na ụmụakwụkwọ ahụ amalitekwala njem ha.

    Abike Dabiri kwuru sị: "Mụ na onyeisi Nema ekwuola okwu ugbua, ọ gwara m na ụgbọala ndị ahụ amalitekwala njem ha dịka ha kpazichara ihe niile."

  5. Etu ndị omekome si tọrọ ma gbuo Dons Udeh zọrọ ọkwa Gọvanọ Enugwu n'APGA

    Ndị ojiegbe egbuola otu onye ndọrọndọrọ ọchịch ama ama n'Enugwu bụ Dons Udeh dịka ndị uweojii steeti ahụ si kwuo.

    Dons Ude so wee zọọ ọkwa gọvanọ Enugwu steeti na ntuliaka nke e mere na steeti ahụ n'ụbọchị 18 nke ọnwa Maachị 2023, mana tupu oge ahụ ọ rụburu ọrụ dịka ode akwụkwọ nke otu ndọrọndọrọ ọchịchị 'Peoples Democratic Party' n'Enugwu.

    N'ozi si n'aka ọnụ na-ekwuru ndị uweojii Enugwu Steeti bụ Daniel Ndukwe, o kwuru na ọ bụ n'ụbọchị Satọde, bụ ụbọchị 22 nke ọnwe Eprel 2023 ka ndị ntọrị buuru ya Dons Ude, mana nwunye ya na ụmụnne ya gara nye mkpesa n'ụlọọrụ ndị uwe ojii ụbọchị Sọnde.

    Ndị uweojii malitere nnyocha ma chọwa nwoke a ebe nille, mana ọ bụ n'ụbọchị Tuzde, 25 Eprel 2023, ka a hụrụ ozu ya na erezi ere n'akụkụ ọhịa dị na mpaghara 9th mile Enugwu.

    Ndị uweojii kwuru na agbanyeghị na ya bụ ozu na erezị ere, nnyocha gosiri na e tiri ya bụ nwoke nnukwu ihe tupu ọnwụ ọ.

    E mechara hụkwa ụgbọala ya bụ Toyota Highlander Jeep na mpaghara Ngwo.

    "Kọmishọna ndị uweojii Enugwu Steeti bụ Ahmed Ammani enyela iwu ka a malite nnyocha zuru oke iji chọpụta etu e si gbuo Engr Dons Udeh nakwa ndị gburu ya iji nye ha ntaramahụhụ dịịrị ha n'oge na-adịghị anya," Daniel Ndukwe dere.

  6. Ịkpọpụta ndị Briten tọrọ na Sudan ga-esi ike ma taa gafee - Gọọmentị UK

    Gọọmentị mba UK na-ekwu na ọ ga-esiri ha ike ịkpọpụta onye Briten ọbụla ka nọ na Sudan ma ọ bụrụ na taa bụ Tọzdee gafee.

    Nke a bụ maka na ọ bụ n'etiti abalị taa ka nkwekọrịta nke otu ndị agha abụọ na-alụ ọgụ na Sudan nwere maka ịkwụsịtụ ọgụ iji nye ohere ka ndị mbịarambịara pụọ na mba ahụ, ga-akwụsị.

    Odeakwụkwọ na-ahụ maka mmekọrịta mba Briten na mba ndị ọzọ bụ James Cleverly, dọrọ aka na ntị na ọ bụrụ na nkwekọrịta ahụ bịa n'isi njedebe, ọgụ ga-amalite ọzọ, nke pụtara na ọ gaghị adị mfe ịkpọpụtazi onye ọbụla ka nọ na Sudan.

    Cleverly kwuru sị: "Anyị nwebụrụ atụmatụ ịkpọpụta ndị be anyị tọrọ na Sudan, n'agbanyeghị etu ọbụla ọnọdụ si dị ebe ahụ.

    "Mana nkwekọrịta ịkwụsịtụ ọgụ, bụ nke anyị na mba ndị ọzọ rịọrọ maka ya, emeela ka ọ dịwanye mfe ịkpọpụ ndị mmadụ.

    "Anyị agaghị enwe ike ikwu kpọmkwem ihe ga-eme ma ọ bụrụ na oge nkwekọrịta a gafee, mana anyị ma na ọ ga-esi nnukwu ike, maọbụ bụrụ ihe agaghị ekwe omume ịkpọpụta ndị mmadụ.

    "Ya mere, ndụmọdụ anyị na-enye ndị mba Briten bụ ndị ka na-atule ihe ha ga-eme bụ ka ha soro mpaghara Wadi Seidna ugbua nkekọrịta nkwụsị ọgụ ka na-aga n'ihu.

    "Anyị nwere ụgbọelu nakwa ndị ga-efe ya. Anyị ga-ebupu ụnụ.

    "Mana ọ bụrụ na oge nkwekọrịta ịkwụsị ọgụ gafee, agaghị m enwe ike ikwe ụnụ nkwa ndị a ọzọ."

    Akụkọ na-ekwu na ọgụ ka na-agakwa n'ihu na mpaghara mba Sudan dị icheiche n'agbanyeghị nkwekọrịta ịkwụị ọgụ bụ nke e nwere abalị atọ gara aga, nke ga-abịa n'isi njedebe n'etiti abalị taa bụ Tọzde.

  7. China ezigala ndị agha mmiri ịzọpụta ndị be ha tọrọ na Sudan

    Mba Chaịna ezigala ndị agha mmiri ha maka ịzọpụta ọtụtụ ndị mba ha tọrọ atọ na mba Sudan.

    Nke a na-abịa dịka otu ndị agha abụọ na-alụ ọgụ na mba ahụ nwere obere nkwekọrịta ịkwụsịtụ ịkwa mgbọ iji nye ohere ka ndị mbịarambịara pụọ.

    A na-eche na nkwekọrịta ahụ ga-akwụsị n'etiti abalị taa bụ Tọzde, Eprel 27 2023, nke mere ọtụtụ mba dị icheiche ji anwa ike ịkpọpụ ndị mba ha niile ngwangwa.

    Mịnịstrị mba Chaịna na-ahụ maka mmekọrịta ha na mba ndị ọzọ kwuru na na ha ga-akpọpụ ndị mba ha ruru 800 tupu etiti abalị.

    Ọtụtụ ndị mba Sudan jikwa ohere a na-agbapụ na mba ahụ agbaga mba South Sudan, Chad, Ethiopia, Egypt na Djibouti.

    Ndị ọrụ enyemaka na-akpọ oku enyemaka maka ọtụtụ ndị na-agba ọsọ ndụ, maka na ọgụ a na-alụ na Sudan emeela ka ọtụtụ mmadụ nọrọ n'ụkọ ihe oriri, mmiri ọṅụṅụ nakwa ọtụtụ ihe ndị ọzọ e ji enyere ndụ aka.

    Ọtụtụ ụlọọgwụ dị na Khartoum, isi obodo Sudan, emechikwaala n'ihi ọgbaaghara a.

  8. Ekele ụtụtụ

    Igbo ndị ọma, ụnụ asaala chi.

    Daalụ maka isonyere anyị na mgbasaozi nke taa.

    Ka anyị gaa n'ihu.

  9. Anyị ji $1.2m zụta ụgbọala 'bus' iri anọ ga-ebulata ndị Naịjirịa site na Sudan

    Gọọmentị etiti sị na ha azụtala ụgbọala ‘bus’ iri anọ maka iji akpọlata ndị Naịjirịa tọrọ na mba Sudan bụ ebe a na-alụ ọgụ ugbua.

    Minista na-ahụ maka mmekọrịta mba na ibe bụ Geoffery Onyeama kwuru nke na Wenezde sị na ụgbọala ndị nwereike ifu ego dị otu nde dọla na ụma abụọ ($1.2m).

    Na ngwụcha ọgbakọ ndịisi ọchịchị gọọmentị mere, Onyeama sị na ha ga-eji ohere ụbọchị atọ e nyere ka a kwụsị ịgba na Sudan kpọlata ndị a.

    O kwuru na gọọmentị na ndị ndu Sudan enweela mkparịtaụka banyere ya na ha ghọtakwara onwe ha.

    O kwuru na ndị mbụ a ga-ebu ụzọ leba anya bụ ụmụaka na ụmụnwaanyị na ọ bụghị ndị ọrụ gọọmentị ọbụla.

    Osote Onyeama n’ọrụ minista bụ Zubairu Dada kwuru na onweghi onye Naịjirịa ọbụla nwụrụ kamgbe ọgụ a dapụtara na Sudan.

    Ọ sị na e burula ụfọdụ ndị Naịjirịa ugbua na-aga mba Ijipt bụ ebe ụgbọelu ga-ebu ha alọta Naịjirịa.

    O kwukwara na ụfọdụ ndị Naịjirịa ka e bu n’ụgbọelu gawa mba Saụdi Arabia.

  10. Nwale ọgwụ mgbochi ọrịa ịba ọhụrụ ga-amalịte n’izu isii na Naijirịa

    Onyeisi ụlọọrụ ‘National Agency For Food and Drug Administration and Control (Nafdac)’na-enye ikike ịṅụ ọgwụ na Naijirịabụ ọkamụta Mojisola Adeyeyeekwuola na ọgwụ mgbochi ọhụrụ nke Naijirịa nabatara ọgbụgba ga-abụ ihe a nwaletukwuru tupu ọha amalite ịgba ya.

    Adeyeyekwuru nke a na mkparịtaụka ya na ụlọ ntaakụkọ Channels TV nwere na Wenezde ebe ọ kọwara na nwale ga-amalite n’izu isii na-abịa abịa.

    Naijirịa sochiri Ghana n’azụ n’ịnabata ọgwụ a nke a kpọrọ R21/Matrix-M bụ nke e kwuru na ịdị ire ya ruru pasentị75.

    O kwuru:

    "Banyere R21, mgbe m gụchara akwụkwọ maka ya, ekwenyere m na Nigeria kwesịrị isonye nabata ya. Nke a bụ n'ihi na anyị nwere nnukwu ohere ọgbụgba ya ịga nke ọma. Ọ bụrụ na ihe dị ire ruo pasent 75 na mmalitenke a pụtara na ya bụ ihe dị mma nke ọma.”

    Ọ gara n’ihu kwuo na ọgbụgba ọgwụ a bụ maka ụmụaka ma kwuo na agaghị agba ya ndị okenye nakwa ndị ntorobịa.

    O kwukwara na nyochi ha gosiri na ọgwụ mgbochi RTS,S bụ nke otu ahụike ụwa WHO nabatara na 2022 adịghị ire ruo nke a.

  11. Onye ọchịchị Sudan nọ n’ụlọ nga ‘agbapụla’ nga dịka ọgbaghara na-ada

    Onye bụbu onye ndọrọndọrọ ọchịchị na Sudan nke a na-achọ maka ebubo ịma ụma kpata ọnwụ ọtụtụ ndị mmadụ ekwuola na ya na ụfọdụ ndị ọru ya anọghịzi n'ụlọ mkpọrọ - ka akụkọ na-agbasa na e mere mgbapụ n’otu ụlọ mkpọrọ.

    Ahmed Haroun so na ndị a kpọchiri n'ụlọ mkpọrọ Kober n’isiobodo Sudan bụ Khartoum bụ onye ndị ụlọikpe ụwa nke ‘International Criminal Court (ICC)’ na-ebo ebubo a.

    Otu ndị abụọ na-alụ ọgụ na Sudan nwere nkwekọrịta ịkwụsitụ ọgụ ha ruo abalị atọ mana e nwere obi abụọ ma otu abụọ ahụ a ga-ekwe ka udo dịgide ebe ahụ.

    Esemokwu a nọ n’etiti ndị ọrụ nchekwe abụọ na Sudan nke malitere n’ụbọchị 15 n’ọnwa Eprel - sitere na ndọrọndọrọ gbasara usoro ọchịchị nakwa onye ga-achị n’etiti ndị agha Sudan na otu ndị ọrụ nchekwa ‘Rapid Support Forces (RSF)’.

    Akụkọ pụtara na mbido izuụka a maka mwakpo na mgbapụ ndị mmadụ mere n’ụlọ mkpọrọ, Kober - ebe akpọrọchị Ahmed Haroun nakwa Omar al-Bashir, onye bụbu onyeisiala Sudan.

    Na Tuzde, Haroun gbara ama na nkwupụta nke pụtara n’ozi ụlọntaakụkọ Tayba TV nke mba Sudan kesara ma kwuo na ya na ndị ọrụ ibe ya bụbu ndị rụrụ ọrụ n'okpuru Bashir apụọla ụlọ mkpọrọ ahụ - ma kwuo na ọ ga-adị njikere ịpụta n'ihu ụlọikpe mgbe ha malitere ọrụ ọzọ.

    N'ozi nke olu ya dapụtara na-efesa na soshal midia ugbua, Harun kwuru na ya na ndị ọrụ ya kpebiri ịpụ ebe ụlọ mkpọrọ ahụ site n'enyemaka nke ndị nche ụlọ mkpọrọ na ndị agha.

    Haroun gwara al-Sudani, otu ụlọmgbasaozi na Sudan nke a maara na ha na Bashir nwere njikọ sị:

    "Anyị mere mkpebi ichekwa ndụ anyị n'ihi enweghị nchekwa, enweghi mmiri, nri na ọgwụ, yana ọnwụ ọtụtụ ndị mkpọrọ na Kober,"

    Ndịagha weghara ọchịchị ma chụpụ Bashir mgbe ọtụtụ ngagharịiwe dapụtara na Sudan dịka akpọchịrị ya maka okwu nrụrụaka.

  12. Nnọ n'ọbaozi anyị taa

    Ị saala chị?

    Soro akụkọ ndị dị mkpa ịkọ taa bụ ụbọchị 26 nke ọnwa Eprel ebe a.

  13. Apata gwara ụlọikpe ka o wepu akwụkwọ Peter Obi gbara maka ntuliaka – Labour Party

    Otu Labour Pati tiri mkpu n’oke olu maka agwa otu onye sị na ọ bụ onyeisi ha a chụrụ achụ bụ Lamidi Apata bụ onye degaara ụlọikpe ‘tribunal’ akwụkwọ ma sị ka a kagbuo akwụkwọ Peter Obi ji aha pati ahụ zọọ ọkwa onyeisiala gbara n’ụlọikpe megide mmeri Bola Ahmed Tinubu nke All Progressive Congress (APC).

    Onye na-arụ ọrụ ka odeakwụkwọ Labour Pati bụ Obiora Ifoh kwuru nke a n’ozi o wepụtara na Tuzde ma gwa ụlọikpe ‘tribunal’ dị n’Abuja ka ọ ghara ịna ntị n’ihe Apata bụ onye ha chụrụ achụ dere.

    “Anyị na-agwa ngalaba ikpe niile gụnyere ‘tribunal’ na ụlọikpe ndị ọzọ ka gbaa ndị a nkịtị n’ihe ha na-eme. Anyị na-agwa ndị uweojii, DSS na EFCC ka ha nwuchie ndị a na-achọghị ọganihu ọchịchị onye kwuo uche ya.

    Ifoh sị na Apata na ndị otu ya na-agba mbọ imezu ebumnobi ndị ha na-arụrụ ọrụ bụ ndị chọeọ imebi ọchịchị onye kwuo uche ya.

    “ịga gwa ụlọikpe ka o wepụ akwụkwọ Labour Pati gbara bụ agwa imegide ọchịchị dị adị, ndị Naịjirịa ga-egbochi nkata a chọrọ ibute ọgbaghara.

    “Agwa ha gosiri na ha na-achọ imebisi pati anyị. Ọ bụrụ ha na ndị ọchịchị pati nwere nsogbu, ha na onye na-azọ ọkwa o nwekwara nsogbu?

    Kedụ ihe onye na-azọ mere, ha jiri chọrọ ka e wepu akwụkwọ ọ gbara n’ụlọikpe.”

    Cheta Apata kpọpụtara onwe ya ka onyeisi Labour pati mana ndịisioche pati a na steeti dị iche iche jụrụ ịnabata ya ma kwụrụ n’azụ Julius Abure dịka onyeisi ha.

    Mana Apata siri ọnwụ na ọ bụ ya bụ onyeisioche maka na ụlọikpe chuturu Abure.

  14. Uche m dị n'ịzọ ọkwa onyeisiala Amerịka ọzọ - Joe Biden

    Onyeisiala mba Amerịka bụ Joe Biden ekwupụtala ebumnobi ya ịzọ ọkwa ahụ ọzọ nke nwereike ime ka ya Donald Trump maa aka ọzọ.

    A tụrụ anya na onye pati Demoratic a ga-eme nkwupụta a nke o mere n’ụbọchị Tuzde n’ihe onyonyo.

    Ọ sị na nke a bụ oge mwereonwe na ikike dịịrị onye nọ n’ihe iyiegwu. “ọ bụghị oge inwe ojuju afọ nke ọnwe, ọ bụ ya mere m ji azọ ọkwa a.”

    Osote ya bụ Kamala Harris dị afọ 58, ga-eso ya zọọ ọkwa ahụ ọzọ.

    Biden dị afọ 80 bụ Onyeisiala mba Amerịka kachasị mee okenye kamgbe ọchịchị mba ahụ malitere, ndị mmadụ nwereike ịjụ ya ajụjụ banyere afọ ole ọ dị.

    Cheta na Biden na Trump zọrọ ọkwa a n’afọ 2020, ma merie ya dịka o kwere nkwa iweghachite ugwu dịịrị mba Amerịka.

  15. Onụọgụgụ ndị ụka nwụrụ n’ime ọhịa ebe ha na-ebu ọnụ akarịala 80

    N’ime oke ọhịa dị nso na Kenya ka a hụrụ ọtụtụ ili na-emighi emi bụ ebe e liri ọtụtụ ozu ndi mmadụ dịka ndị nyocha si kwuo.

    O were ndị a ụbọchi anọ n’iji gwupụta ozu ndị mmadụ dị n’ili a, otu onye ọrụ ikike dịịrị onye gwara BBC na ebe ahụ na-esi isi ọjọọ.

    A na-eche na ozu a bụ nke ndị ụlọụka ‘Good News International Church. A sị na a gwara ndị a ka ha buo ọnụ nwụọ ka ha gaa eluigwe tupu ụwa emebie.

    Ebe ihe a mere zoro ezo n’ime ọhịa Shakahola nke mere na ndị gara ebe ahụ sụchara ọhịa iji nyafee ụgbọala ha ebe ahụ.

    A bọpụtala ozu ruru iri asatọ na itoolu (89) mana ụlọọrụ Red Cross kwuru na ọṅụọgụgụ a nwereike ịkarị maka a na-achọ mmadụ otu narị na iri na otu.

    Ndị uweojii kwuru na a hụrụ mmadụ iri abụọ na itoolu ka dị ndụ mana ọ bụghị ha niile chọrọ ka a zọpụta ha, ihe a gwara ha maka ụwa mmebi doro ha anya.

    Ụkọchukwu a aha ya bụ Paul Mackenzie Nthenge nọzị n’aka ndị uweojii dịka a na-eche ka ọ pụta n’ụlọikpe bịa zara ọnụ ya.

  16. Etu otu nwoke siri tọgbuo enyi ya ma lie ya n'ime ọhịa n'Enugu steeti

    Ndị uweojii n’Enugu steeti ezipụtala ozi etu ha siri nwụchie otu nwaamadị a sị tọgburu otu enyi ha ma lie ya dịka hagachara hụ otu dịbịa.

    Daniel Ndukwe bụ ọnụ na-ekwuru ndị uweojii steeti ahụ kọwara na nwaamadị a anwụchịrị dị afọ 24 nke bụ onye Ebonyi steeti ma biri n’Ogidi, Anambra steeti gburu otu enyi nke dị afọ 44 malie ya n’akụkụ Amori nke okpuruọchịchị Nkanu West n’ụbọchị mbụ nke ọnwa Eprel a.

    O kwuru na nwoke a ha nwụchirila nọzị n’ime ụlọ nga in Enugu Custodial Centre ugbua bụ ebe ọ ga-esi na-abịa azara ọnụ ya n’ụlọikpe.

    Ndukwe kwuru na nwaamadị ahụ kwupụtara na ya na enyi ya gara Enugu ga ịhụ otu onye dịbịa.

    Mana ka chi jiri ha abụọ si n’ụlọ ebe ha nọ pụọ gawa ebe ọzọ, ndị mmadụ malitere ịchọ ha ruo ụtụtụ.

    Ndị obodo Obe bụ ebe ha gara hụ dịbịa ahụ mechara hụ otu nwoke ahụ, nwụchie ya ma malite ịjụ ya ajụjụ banyere ebe ogbo ya nọ.

    Oge ahụ ka ọ ji kwupụta na ọ tọgburu enyi ahụ ma lie ya n’ime ọhịa dịka a gara ebe ahụ gwupụta ozu ya ma buga ya ụlọọgwụ ebe a malitere inyocha ime ahụ ya.

    Ngalaba uweojii nke na-eme nnyocha bụ Homicide Section of the State CID n’Enugu bụzị ndị okwu a nọ n’aka ha ugbua.

  17. Nnọọ n'obaozi anyị taa

    Soro akụkọ ndị dị mkpa ịkọ taa.

  18. Onyeisiala a họpụtara ọhụrụ, Bola Tinubu, alọghachila Naịjirịa

    Bola Ahmed Tinubu, bụ onyeisiala a họpụtara ọhụrụ na Naịjirịa alọghachila njem o mere gaa mba ofesi.

    Ụgbọelu bu Tinubu tụrụ ụkwụ n'ọdọụgbọelu Nnamdi Azikiwe dị n'Abuja n'ebe elekere anọ na ọkara nke ehihie taa bụ Mọnde.

    Tinubu hapụrụ Naịjirịa kamgbe otu ọnwa gara aga (Maachị 22) gawa mba Europe, dịka a kpọpụtachara aha ya dịka onye meriri ntuliaka ọkwa Onyeisiala Naịjirịa bụ nke e mere n'ụbọchị 25 nke ọnwa Febrụwarị 2023.

    Ndị enyemaka mgbasaozi ya kwuru na ọ gara mba Fransị izu ike maka mgbagharị niile ọ gbagharịrị n'oge ntuliaka. Ha kwukwara na ọ ga-esi ebe ahụ gaa mba Saudi Arabia isonye n'emume Hajj nke ndị okpukperechi Islam.

    Mana ndị malitere ịjụ ajụjụ ebe Tinubu nọ dịka ọtụtụ kwuru na enwebeghị onyonyo ọbụla pụtara iji kọwaa kpọmkwem ebe ọ nọ.

    N'ụbọchị 29 nke ọnwa Mee 2023 ka a ga-edu Tinubu n'iyi ọrụ ka ọ malite ọrụ kpọmkwem dịka onyeisiala Naịjirịa.

    Mana ndị ya na ha so zọọ ọkwa ahụ, nke gụnyere Atiku Abubakar nke Peoples Democratic Party nakwa Peter Obi nke Labour Party, etinyela akwụkwọ n'ụlọikpe na-agba mpụtara ntuliaka ahụ.

    Ha kwuru na nrụrụaka karịrị na ya bụ ntuliaka, ma kpọkuo ụlọikpe ka e nye iwu ka ahazigharịa ntuliaka ọzọ.

    Lee onyonyoo gosiri oge Tinubu lọtara.

  19. Etu aka si kpara ndị liri agadi nwoke na n'ebubo ịta amusu

    Ndị uweojii Benue steeti sị ha anwụchiela mmadụ abụọ n’okpuruọchịchị Konshisha dịka ndị ntoroọbịa liri ndị agagdi nwoke na ndu maka ebubo ịta amusu.

    Nsogbu malitere mgbe ndị ntoroọbịa liri otu abụọ na ndụ maka ebubo na ha zitere egbe eluigwe ka ọ gbaa nwa ya nwoke bụ Henry Ihwaka, nwunye ya na ha e ku n’aka.

    Akụkọ kwuru na ụbọchị ise gara aga, oke mmiri zoro, nke mere egbe eluigwe jiri gbaa ma gbagbuo Henry Ihwaka, nwunye ya na nwa ha.

    Ndí ntoroọbịa obodo ahụ boro nna Henry ebubo maka iji egbe eluigwe taa ha amusu butere ọnwa ha.

    Ha gara nwuchie agadi nwoke ahụ na otu onye ọzọ tie ha ihe ma lie ha na ndụ.

    Mgbe ndị uweojii bịara bọpụta ndị a ya bụrụ na ha anwụọla.

    Ọnụ na-ekwuru ndị uweojii na Benue Steeti bụ Catherine Anene sị na ọ bụ eziokwu na ha nwuchiri mmadụ abụọ a na-enyo enyo.

    Anene sị na ọ nụrụ na ọ bụ otu naani otu onye ka e liri na ndụ, kwuo na ndị ntoroọbịa ahụ lusoro ndị uweojii ọgụ tupu a nwụchie mmadụ abụọ.

    Anene gara n’ihu kwuo na tupu ihe a emee na ndị na-ahụ maka ihu eluigwe gbara ama na mmiri ga-ebu amụma na egbe eluigwe ga-ezo n’ụbọchị ahụ.

    Ọ katọrọ agwa ọjọọ a ma dọo ndị mmadụ aka na ntị iji aka ha etigbu mmadụ na-emeghi mkpesa n’aka ndị uweojii.

  20. Etu anyị si agba mbọ ịkpọlata ụmụ Naịjirịa tọrọ na Sudan – Gọọmentị etiti

    Minista na-ahụ maka mmekọrịta mba na ibe ha bụ Geoffrey Onyeama kwuru nke a mgbe ụlọọrụ ntaakụkọ Channels TV gbara ya ajụjụ ọnụ.

    O kwuru na gọọmentị na-agba n’ụtụtụ ma n’abalị iji hụụ na a kpọlatara ndị Naịjirịa dị puku ise na narị ise (5,500) ndị kachasị n’ụmụakwụkwọ.

    Onyeama kwuru na otu n’ime he merela bụ ịgwa ndị ọrụ gọọmentị Naịjirịa nọ na Sudan ka ha mepee ohere n’ịtanetị ebe ụmụafọ Naịjirịa nọ na mba ahụ nwereike idebanye aha ha.

    Na nke a ga-eme ka e nwee ike kpọkọlata ha niile ọnụ nakwa mgbasaozi banyere usoro a ga-eji kpọpụta ha.

    Ọ gara n’ihu kwuo na dịka ụgbọelu anaghịzi efe na Sudan n’ihi ọgụ ahụ na otu ụzọ enwereike iji akpọlata ndị a bụ site n’okporoụzọ.

    O kwuru na njem okporoụzọ a bụ ihe ga-achọ ezigbo nchekwa maka na ụzọ dị ọjọọ, nke mere gọọmentị ji achọ enyemaka gọọmentị Sudan maka inye ohere ka a kpọlata ndị a.

    O kwuru na o degarala gọọmentị Sudan akwụkwọ maka nke a na ha ga-eleba ya anya ma nye ya nzaghachị ha.

    Onyeama kwuru na oke ihe cheere gọọmentị aka mgba bụ ọnụọgụgụ ndị Naịjirịa nọ ebe ahụ nke buru ezigbo ibu (5,500)

    O kwuru n’ụzọ ebe abụọ a na-atụ anya isi akpọlata ndị a bụ okeala Egypt, nakwa ebe a kpọrọ ‘Sudan port’.

    N’otu aka ahụ onyeisi ụlọọrụ ‘National Emergency Management Agency (NEMA)’ kwuru na ha ga-ebido n’ụbọchị Tuzde kpọlata ndị Naịjirịa puku abụọ site na Khartoun bụ isiobodo Sudan.

    Onye ọrụ a bụ Onimode Bandele kwuru nke a n’ihe onyonyo Channels TV.

    O kwuru na gọomentị na-agba mbọ iji ụgbọala ‘bus’ ebulata ndị a, na onyeisi ụlọọrụ ha bụ Mustapha Habib nọ na Cairo, Egypt iji sụọ ụzọ ebe ndị a ga-esi apụta.