You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.

Take me to the main website

Anyị enweghị atụmatụ iwepụ akwụkwọ ego naịra ọhụrụ - Ụlọakụ etiti

Ụlọakụ etiti Naịjirịa kwuru na a ga-akwụsị iri ego ochie n'ụbọchị 31 nke ọnwa Disemba afọ a dịka ụlọikpe kachasi si nye ha iwu.

Mkpuchi Na Eme Ozugbo

Ikechukwu Kalu and Chukwunaeme Obiejesi

  1. Ọgbaaghara egbuola ihe ruru mmadụ 56 na mba Sudan

    Ọgụ dapụtara n'etiti ndị otu agha abụọ na mba Sudan egbuola ihe ruru mmadụ 56 ebe mmadụ 595 merụrụ ahụ ọkachasị n'ịsị obodo Khartoum mba ahụ.

    Ọ bụ okwu maka ịnyefe ọchịchị n'aka ndị nkịtị bidoro ọchịchị bidoro esemokwu n'etiti ndị agha gọọmentị na ndị otu agha Rapid Support Forces (RSF).

    Ọgụ a bụ n'etiti ndị agha na-akwado onye nọ n'ọchịchị bụ Abdel Fattah al-Burhan na pnye chịagha ndị agha RSF bụ osote onyeisi ọchịchị mba Sudan bụ Mohamed Hamdan Dagalo, e ji Hemedti mara.

    Kamgbe ndị agha napụrụ ndị nkịtị ọchịchị n'ike n'afọ 2021, ọ bụ ndị ọchịagha na-achị mba ahụ kamgbe.

    Ugbua ndị agha abụọ na-ekwu na ọ bụ ha ji ọdọ ụgbọelu na ebe ndị ọzọ dị mkpa n'ebe ahụ.

    Taa bụ ụbọchị sụnde, ndị mmadụ na-anụ ụda ogbunigwe na mpaghara Omdurman bụ mpaghara jikọrọ Khartoum na Bahri.

    Ugbua, Hemedti na-ekwu na ndị agha ya ga-alụgịde ọgụ tutu ha anapụ ndị agha gọọmentị.

    Ebe ndị agha gọọmentị na-ekwu na ha agaghị enwe mkparịtaụka ọbụla tutu ndị agha RSF etisaa.

  2. Unu abọọla chi

    Sonye anyị taa maka akụkọ ga-amasị gị sị mpaghara dị iche iche n'ụwa

  3. Nwoke Victor Chidi nke PDP enwetela mmeri ịbụ onye nnọchite anya mpaghara Ebonyi North

    Inec akpọpụtala aha Chidi Nwoke Victor nke otu Peoples Democratic Party (PDP) dịka onye ga-anọchite mpaghara Ebonyi North n’ụlọomeiwu.

    Nke a so na mpụtara ngụkọ ntuliaka mgbakwunye e mere n’akụkụ ụfọdụ n’Ebonyi steeti n’ụbọchị Satọdee, abalị 15 nke ọnwa Eprel, 2023.

    Lee ka ngụkọ si ebe ahụ siri dị dịka Inec siri kpọpụta ha:

    - PDP (Nwoke Victor Chidi) – Vootu 5,988

    - APC (Umahi Maxwell) – Vootu 5,664

    - AA - 19

    - ADC – 26

    - ADP – 30

    - APGA - 4,221

    - APM – 10

    - LP - 2,465

    - NNPP – 51

    - NRM – 10

    - ZLP – 14

    Ọkammụta Smart Otu bụ onye nọ n’isi ọrụ ngụkọ Inec bụ onye mere mkpọpụta a.

    Ka akpọpụtara ha Maazị Nwoke, ọ gwara BBC Igbo:

    “Obi jụpụtara m n’aṅụrị, ana m eleke ndị nkwadoro ma tụnyere vootu. A na-arịọ ndị ọha mmadụ ka ha nọrọkwa m n’azụ mgbe malịtere ọrụ.”

    Ọ gara n’ihu kwee nkwa na ọ ga-ahụ na o mepụtara iwu ndị ga-adịrị mpaghara Ebonyi North bụrụ ebe mepere emepee.

    Ọtụtụ ndị nkwado pati ahụ nakwa ndị nkwado Nwoke pụtara na-agụ egwu ọṅụ ma na-agba egwu n’ogige ebe e mere mkpọpụta a.

    Inec kwuru na e mere ntuliaka mgbakwunye a n'ihi mkpamkpa dị iche iche nke mere ka a kagbuo ntụliaka a nke emeburu n'ụbọchị 18 nke ọnwa Maachị afọ 2023.

    N'Ebonyi Steeti, mpaghara a ebe ndị e mere ntuliaka a metụtara okpuruọchịchị asaa nọ n'Ebonyi steeti nke gụnyere Abakaliki, Afikpo North, Afikpo South, Ezza North, Ezza South, Ikwo na Ivo.

  4. A malitela ịgụkọ vootu n'akụkụ Yola North nke Adamawa steeti

    Ntuliaka kwụsịrị n’akụkụ ụfọdụ na Yola, Adamawa steeti ebe a ka na-atụkwa vootu n’ebe ndị ọzọ agbanyeghi na elekere abụọ na ọkara bụ oge e tinyere iji kwụsị ntuliaka gafechara.

    A malitere ịgụkọ vootu n’akụkụ Yola North ngwa ngwa ka oge ahụ ruru.

    Inec hibere ntuliaka mgbakwụnye n’ọgbọ ntuliaka 67 na steeti ahụ nke bụ ebe ndị ọgbaghara dapụtara n’ụbọchị ntuliaka nke ọkwa gọvanọ e mere n’ụbọchị 18 nke ọnwa Maachị 2023.

    N’ihi ihe ndị a mere ebe ahụ, Inec kwupụtara na ntuliaka e mere na steeti ahụ akapighị ọnụ (Inconclusive).

    Site na mkpọpụta Inec mere n’oge ahụ tupu a kwụsị ngụkọ gọvanọ ji ọkwa na steeti ahụ ugbua bụ Gọvanọ Ahmadu Fintiri nke PDP bụ onye kacha na-enweta vootu dịka o nwetere vootu 421,524 ebe Sịnetọ Aishatu Dahiru onye ọha ji Binani mara ji vootu 390275 na-esote ya n’azụ.

  5. Lee ka o si aga n'Adamawa Steeti

    Ndị nchekwa pụtara n'ujui ha dịka ndị mmadụ pụtakwara ịtụ vootu na mpaghara dị iche iche na Yola.

    Ngalaba Independent National Electoral Commission (INEC) kagburu ya ma sị ka atụgharị vootu n'ọgbọ ntuliaka 67 n'Adamawa Steeti dịka akagburu ha maka ọgbaaghara dapụtara ebe ahụ.

    Na mpaghara Ajiya, Maazị Husseni Mohammed dị afọ 67 tụrụ vootu nke mbụ n'ụbọchị 18 nke ọnwa maachị afọ a kama akagburu ya, o kwuru sị, "Ọ sọkwa ya bụrụ ugboro iri, a ga m apụta tụọ vootu. A chọrọ m ọdịmma steeti m, a chọrọ m ọdịmma Naịjirịa".

    Ebubo nrụrụaka sitere n'aka otu Peoples Democratic Party na otu All Progressive Congress jupụtara n'oge ntụliaka nke e mere na mbụ

    Inec kpọpụtara mpụtara ntụliaka sị na gọvanọ steeti ahụ bụ Ahmadu Fintiri nwetara vootu 421,524 ebe onye omeiwu Aishatu Dahiru e ji Binani mara ji vootu 390, 275 achụ ya n'azụ.

    Dahiru merie ọ ga-abụ nwaanyị mbụ meriri ntụliaka ọkwa gọvanọ na Naịjirịa.

  6. Lee ka o si aga na Rumuwoji nke Rivas Steeti

    Ebidola ịtụ vootu n'ụfọdụ mpaghara na Naịjirịa. Lee ka o si aga na mpaghara Rumuwoji Ward 12 unit 8 ebe a na-eme ntuliaka mgbakwunye ụlọomeiwu nke steeti na nke ukwu.

  7. Unu abọọla chi

    Gụọ akụkọ niile ga-amasị gị taa ebe a

  8. A nwụchịela ndị ụkọchukwu abụọ maka ebubo iyi uwe ndịagha Angola

    A nwụchịela ndị ụkọchukwu abụọ nke otu otu okpukperechi Kraịst na mba Angola maka ebubo iyi uwe ndịagha mba ahụ dịka ụlọọrụ mgbasaozi ha siri kwuo.

    Websaịtị Novo Jornal na-ekwu na ngalaba ndị uweojii mba a nke Criminal Investigation Service (SIC) nwụchiri ha abụọ na Wenezde maka "iyi uwe nwere ntụtụ uhie yiri nke ndị ọchịagha ndịagha na-eyi".

    E kwuru na onye na-ekwuchitere SIC Manuel Halaiwa na-ekwu na a ga-akpụpụ ha ụlọikpe maka ebubo iji uwe ndịagha n'ụzọ iwu na-akwadoghị nakwa ime ihe omume okpukperechi a na-akwadoghị "n'ihi n’ụlọakụ ahụ edenyeghị aha ha inweta ikike ịrọ ọrụ".

    Nke a pụtara dịka otu ihe onyonyo dapụtara na soshal midia nke gosiri ebe ndị ụkọchukwu abụọ ahụ nọ na-elekọta emume ụka nke ihe karịrị ndị ntorobịa 80 bịara - ụfọdụ n'ime ha yikwa uwe yiri nke ndịagha.

    Ụlọ mgbasaozi VOA kwuru na n'oge na-adịbeghị anya na gọọmentị mba a malịtere itinye anya ma na-ejibodo ụlọụka ndị na-edebanyeghị aha ha maka ịrụ ọrụ nakwa ndị ọzọ na-ekwu na ha na-arụ ọrụ ebube.

  9. Adọtịla oge otu nwoke ikpe mara maka iwakpo nwata dị 11 ga-anọ na nga na Morroco

    Otu ụlọikpe mkpegharị na mba Morocco atọtịala oge ụmụnwoke atọ ga-anọ na nga a. Ikpe mara ha n’okwu idina nwata nwaanyị dị afọ 11 ugboro ugboro n’ike.

    N'ikpe a nke kpalitere iwe ọha, ụlọikpe dị ala n’ọkwa mara mmadụ atọ a ikpe izu abụọ gara aga, maka ịkpaaka na-ekwesịghị ekwesị, ma tụọ ha mkpọrọ abụọ na ọnwa 18.

    Ụlọikpe mkpegharị nke dị na Rabat atụgharịala mkpebi ntarahụhụ ndị a ga-anata ma kwuo onye ikpe a kacha metụtụa ga-aga mkpọrọ afọ 20 ebe mmadụị abụọ ndị nke ọzọ ga-aga nga afọ 10.

    Ụlọikpe ahụ nụrụ na nwa agbọghọ ahụ, bụ onye dị afọ iri na abụọ ugbua, mụrụ nwa n'afọ gara aga, nnyocha ime ahụ ndị dọkịnta mere gosiri na otu n'ime ụmụnwoke ndị ahụ wakporo ya bụ nna nwa ọ mụrụ.

  10. Mmadụ anọ ndị na-ebu ọnụ ‘izute Jịzọs’ na Kenya anwụọla

    Ahụrụ ozu mmadụ anọ na Tọzdee bụ ndị nwụrụ anwụ dịka ọtụtụ ndị ọzọ nọ n'ụlọ ọgwụ na mpaghara Kilifi nkeKenya, dịka a gbapụtara ha ebe ha nọ na-eche mbibi ụwa.

    Ndị uweojii kwuru na a chọtara ndị otu ụka a n'ime ọhịa ebe ha nọọrọ kemgbe ọtụtụ ụbọchị ka otu onyeisi ụka gwachara ha ka ha malite ibu ọnụ dịka ha "na-eche izute Jizọs".

    Ndị ọchịchị mba a kwuru na ha gbapụtara mmadụ 11 - isii n'ime ha ataala oke ahụ ma mịkpọ amịkpọ ma nọrọ n'ọnọdụ ahụike dị oke egwu.

    Ndị uweoji kwuru na ha ga-amalitekwa ịchọ ndị otu a ndị ọzọ n'ụtụtụ Fraịde dịka akụkọ na ndị ọzọ ka nọ n'ime ọhịa ahụ pụtara.

    Akụkọ na-ekwu na ndị uweojii chọtara ili ọhụrụ n'ime ọhịa ahụ nke a ga-enyocha ya na Fraịde a.

    Ndị a bụ ndị ụka ‘Good News International Church’ nke otu pastọ mba ahụ bụ onye ndu ha bụ onye ndị uweojii na-enyo kamgbe maka ebubo ịgwa ndị ụka ya ka ha kwụọ agụụ ruo mgbe ha nwụrụ iji ruo eluigwe ngwa ngwa.

    Ndị uweojii mba a tọhapụrụ ụkọchukwu a ka o si n’ụlọ na-abịa ikpe ya dịka e boro ya ebubo n'ọnwa gara aga maka aka ya ịnọ n’ọnwụ ụmụaka abụọ nke ndị nne na nna ha so na ụmụazụ ya.

  11. Chibok Girls: A ka na-achọ ụmụakwụkwọ ụmụnwaanyị 96 Boko Haram tọọrọ na 2014 achọ

    Afọ itoolu ka a tọrọchara ihe karịrị ụmụakwụkwọ ụmụnwaanyị narị abụọ n’Obodo Chibok nke Bornu steetu, mmadụ 96 n’ime ha ka na-efu efu.

    Ụlọọrụ ikike dịrị onye ndị mmadụ n’ụwa bụ Amnesty International ewepụta ozi banyere ihe a mere n’ụbọchị Fraịde ma katọọ gọọmentị Naịjirịa na-arụ ha aka maka ‘ịkpụ afọ n’ala n’okwu nchekwa ụmụaka’.

    N’otu aka ahụ, otu ruru ọrụ ịkpọ oku nakwa ime ngagharịiwe banyere ntọrọ n’oge ahụ bụ Bring Back Our Girls (#BBOG) zipụtakwara ozi ma kwuo na ọ bụ ‘ihe ihere’ na gọọmentị enweghị ike gbapụta ụmụaka ụmụnwaanyị ndị a.

    Ha kpọkwara oku ka gọọmentị chọọ ụzọ nye ndị ezinaụlọ ihe a metụtara ihe iti aka n’obi.

    Cheta na n’ụbọchị 14 nke ọnwa Eprel, 2014 mgbe ndị agha nnupụisi otu alakụkụ bụ Boko Haram ka na-akpa ezigbo ike na mpaghara ugwu Naịjirịa na ha wakporo otu ụlọakwụkwọ Sekọndịrị nke gọọmentị nwee n’obodo Chiboko ma tọrọ ụmụakwụkwọ ụmụnwaanyị mmadụ 276. Ụfọdụ n’ime ha mechara si n’ebe e dobere ha gbafuo ebe atụmatụ nchekwa gọọmentị Naịjirịa hụru na a tọhapụrụ ndị ọzọ.

    Ozi Amnesty International nke onyeisi ọrụ ha na Naịjirịa bụ Isa Sanusi zipụtara na Fraịdee kwuru:

    “E kwesịrị ịkpọlata ụmụaka ụmụnwaanyị ndị a na-efu efu nye ndị ezinaụlọ ha ma hụ na ndị niile aka nọ n’ajọ ihe a natara ntaramahụhụ dịrị ha.”

    Amnesty International akpọọla oku ka gọọmentị Naịjirịa mee ihe niile ha kwesịrị iji buso ndị agha Boko Haram nakwa ndị omekome na-ebugharị egbe na Naịjirịa agha dịka ọ bụ ọrụ dịịrị ha ichekwa ndị mmadụ nakwa ụmụaka bi na mba a.

    Ha gara n’ihu kwuo na “enweghi ndị a na-ejide maọbụ taa ahụhụ na mwakpo ndị a so akwanye ọkụ na mbụba ya.”

    Ndị otu ndị agha nnupụisi nke ụka Alakụba nakwa ndị omekome ndị ọzọ na-ebugharị egbe gụnyere ndị nke a na-akpọ ‘Bandits’ ka na-akpa ike n’akụkụ Naịjirịa dị iche iche. Malite n’ọnwa Disemba 2022 ruo Maachị 2021, opekatampe, akụkọ ntọrọ ndị mmadụ dapụtara ugboro ise nke gụnyere ntọrọ ụmụakwụkwọ n’ụlọakwụkwọ Kankara, Kagara, Jangebe, Damishi Kaduna, Tegina nakwa Yawuri ebe mmaja na ntọrọ ndị ọzọ ga-eme mere emechie ihe karịrị ụlọakwụkwọ 600 n’akụkụ ụfọdụ na mpaghara ugwu Naịjirịa.

  12. Onye agha elu mba Amerịka a na-enyo na mwepụta akwụkwọ mba ahụ zoro ezo ga-apụta ụlọikpe

    Otu nwoke dị afọ 21 aha ya bụ Jack Teixeria abụrụala onye a ga-apụta ụlọikpe taa bụ Fraịdee abalị 14 nke ọnwa Eprel, 2023. Nke a bụ maka okwu metụtara mwepụta akwụkwọ nchekwa mba Amerịka zoro ezo banyere agha Ukraine nakwa ihe ndị ọzọ.

    Ngalaba uweojii mba ahụ pụrụiche bụ FBI nwụchiri na be ya dị na Dighton nke mpaghara Massachusetts n’ụbọchị Tọọzde.

    Ndị ọrụ nchekwa bu ọtụtụ ngwa agha duru ya dupụ.

    Enyochapụtala na Teixeria bụ onye nọ n’isi otu ọbaozi ọgbakọ n’ịntanetị ebe ozi ndị zoro ezo bu ụzọ dapụta.

    A na-akpụpụ ya ụlọikoe maka iwepụta ma kesaa akwụkwọ zoro ezo ebe ọ na-enweghị ikike ịme nke a. A na-atụ anya na ọ ga-apụta n’ụlọikpe dị na Boston, Massachusetts maka okwu a n’ụbọchị Fraịdee a. Cheta na ọtụtụ akwụkwọ zoro ezo banyere ọrụ nchekwa mba Amerịka, etu mba Amerịka si enyocha agha Ukraine, nakwa ozi ndị ọzọ mechuru ihu mba nke mere ndị mmadụ ji ajụ ọtụtụ ajụjụ dapụtara n’ọha na nso nso a.

    Teixeria onye ruburu ọrụ dịka onye ọkaibe n’ihe gbasara ozi teknezụ na ngalaba oke amamihe ndị ọrụ nchekwa Massachusetts National Guard. Massachusetts National Guard a bụ otu ndị ọrụ nchekwa agha elu mba Amerịka e dopụrụ iche a na-eziga ịrụ ọrụ nchekwa ma e nwee ihe mere iche.

    Ka ozi a pụtara n’ọha, mba Amerịka malitere nnyocha ngwa ngwa nke mere ya bụ okwu jiri dasa ya n’isi ugbua.

    Ewezuga afọ ole ọ dị bụ nke dị obere, a na-enyo ihe nwereike ịbụ ebumnobi ya enyo ugbua.

    Ndị enyi a kwuru na agbanyeghi na ọ na-enyo agwa gọọmentị enyo kemgbe, na ọ bụghị onye ọ gbaa ama maọbụkwanụ onye na-arụrụ ndị mba ọzọ ọrụ.

    Mba Amerịka ekwuola na ha ga-ahazigharị etu ha si ekesa ozi ha zoro ezo dịka otu ọnụ na-ekwuru ha kwuru “ihe bụ agwa” ndị agha mba Amerịka inye ndị dị obere n’ọrụ ibu ọrụ dị arụ.

  13. A chụọla ndị uweojii atọ n'ọrụ atọ maka ịgba egbe aghara aghara ebe ndị mmadụ juru

    Ndị uweojii Naịjirịa achụọla ndị ọrụ mmadụ atọ n’ọrụ maka iji aka ike emekpa ndị mmadụ ahụ, ịgba egbe aghara aghara na Kano Steeti.

    Mmadụ atọ bụ ndị ọrụ nke ngalaba Special Protection Unit (SPU) dara iwu ndị a n’ụbọchị 7 nke ọnwa Eprelụ, 2023 mgbe e nyochara ihe akaebe si n’onyonyo.

    Ha gụnyere Dahiru Shuaibu, Abdullahi Badamasi na Isah Danladi bụ ndị a gbakwụnyere ka ha na-chekwa otu onye otiegwu na Kano.

    Mgbe ndị na-arụ ọrụ ha n’ụbọchị ahụ n’obodo Kahutu, Katsina steeti, ha gbaliri egbe elu aghara aghara ebe ndị gụnyere ụmụaka juru, na-agbanyeghi iwu ndị uweojii megidere onye ọrụ ịkpa ụdịrị agwa a.

    Agwa a ha kpara megidere iwu, dịka agwa ndị ohi ma bụrụ ihe mmechu iwu nye ndị uweojii niile.

    N’ihi nke a ndị uweojii Naịjirịa dọrọ ndị ọrụ ha aka na ntị ka ha rụọ ọrụ n’ụzọ kwesịrị ekwesi, ka ha ghara ịnata ntaramahụrụ ọbụla.

  14. Lee Foto ebe ụlọ ogogo asaa dara na Banana Island, Legọs

    Ụlọ ogoogo asaa dara na mpaghara Banana Island nke dị na Legọs steeti n'ụbọchị Wenezde.

    Ngalaba gbatagbata nke Legọs steeti bụ Lagos State Emergency Management Agency (LASEMA) na-ekwu na ọ bụ dịka gwongworo gbabara n'ime ya bụ ụlọ butere ọdịda ya.

    LASEMA kwukwara na e nweghị ndị nwụrụ na ya bụ ụlọ dara nụ.

    Kama ha kwuru na mmadụ asaa merụrụ ahụ ma sị na ụfọdụ na-anata ọgwụgwọ ebe ụfọdụ n'ime ha alaala ụlọ ha.

    Ha kwuru na e nwere otu onye ọzọ aha ya so na ndị baịara ọrụ ebe ahụ kama ha amaghị ma ọ pụrụ apụ ka ọ tọrọ n'ime ụlọ ahụ dara nụ

    Dika o siri dị ugbua, LASEMA kwuru na ha na-agba mbọ iji hụ na ya bụ ụlọ ebuteghị ihe mberede ọzọ ma sịkwa na ha etinyela igwe eji achọpụta ma e nwere onye ka tọrọ n'ime ụlọ ahụ.

    Cheta kwa na e nwere ihe onyonyo nke nọ na soshial midia nke gosiri ebe otu onye setere mgbe ụlọ a na-ada.

  15. Unu abọọla chi

    Sonye anyị taa maka akụkọ niile si akụkụ uwa niile

  16. Lee ndịisi okpotokpo Alex Otti họpụtara maka idu ya n'iyi ọrụ

    Onye a họpụtara dịka gọvanọ Abia Steeti bụ Alex Otti ehiwela kọmitii ndị ga-ahụ na o weere ọchịchị na-enweghi nsogbu ọbụla a kpọro ‘transition committee’.

    Ndị a ọ họpụtara bụ ndị nwere agba na ngalaba dị icheiche gụnyere; azụmaahịa, ihe banyere ụlọakwụ nakwa akụnaụba, mmanụ agbidi dgz.

    Ha gụnyere Victor Onyenkpa nke ụlọọrụ KPMG, Ifueko Okauru, onye bụbu onyeisi FIRS, Arunma Oteh bụbu onyeisi ngalaba Nigeria’s Securities and Exchange Commission (SEC) ma rụbuo ọrụ n’ụlọakụ mbaụwa.

    Ndị ọzọ bụ Ndubuisi Ekekwe, onye rụrụ ọrụ n’ụlọọrụ ekwentị Apple, Uche Orji bụbu onyeisi Nigeria Sovereign Investment Authority (NSIA), Victor Okoronkwo onyeisi ụlọọrụ mmanu agbidi Aiteo Oil and Gas, Frank Nneji so nwere ụlọọrụ ụgbọala ABC, Ide John Udeagbala onye ojiego achụntaego n’Aba.

    A ga-edu ha n’iyi ọrụ n’ụbọchị Fraịde 14 Eprelụ, 2023 n’ọdọ azụmaahịa Abia steeti bụ Aba.

    Otti kwuru na ọ ga-eme ya n’Aba maka atụmatụ pụrụiche o nwere ịhụ na Aba ga-abụ ezi obodo ụlọọrụ na azụmaahịa n’ọchịchị ya.

  17. Akwụkwọ ekpuhere na-egosi na mba Briten nwere ndị agha nọ na Yukren

    Akwụkwọ ndị ekpughere na-egosi na mba Briten so na mba ndị nwere ndị agha pụrụiche na-alụ ọgụ na mba Yukren.

    Ya bụ ekpughere gosiri na mba Briten nwere ndị agha 50, Latvia ndị agha 17, Fransị ndị agha 15, Amerịka ndị agha 14 ebe Netherlands nwere otu onye agha na mba Yukren.

    Kama akwụkwọ a ekpughere ekwughị ebe ndị agha a nọ na mba Yukren.

    Gọọmentị mba Amerịka na-ekwu na ha na-eyocha ị chọpụta ebe e siri kpughe akwụkwọ a e zoro ezo.

  18. Unu abọọla chi

    Daalụ dịka ị na-esonye anyị taa maka akụkọ niile ga-amasị gị

  19. Ihe mberede okporoụzọ ataala isi ọtụtụ ndị mmadụ n’Ebonyi steeti

    Akụkọ pụtara na otu ndị njem nọ n’ụgbọala bọọsụ bu mmadụ 22 nakwa otu nnukwu ụgbọala sụkọrọ isi ọnụ n’akụkụ Ezillo nke Ebonyi steeti.

    Ndị njem a nọ n’okporoụzọ Abakaliki-Enugu mgbe ihe a mere.

    Ozi n’aka ụlọọrụ na-ahụ maka njem okporoụzọ bụ Federal Road Safety Corps (FRSC) na steeti ahụ nke onyeisi ha bụ Uche Chukwurah binyereaka gbara ama na mmadụ 12 nwụrụ n’ihe mberede a ebe mmadụ abụọ merụrụ ahụ.

    Ihe mere n’ụtụtụ Tuzde a dịka Chukwurah kwuru na mmadụ abụọ a ndị merụrụ ahụ na-anata ọgwụwgọ n’ụlọọgwụ ugbua.

  20. Otu Super Falcons nke Naịjirịa ji goolu anọ bọkasịa otu New Zealand

    Otu egwu bọọlụ ụmụnwaanyị nke Naịjirịa bụ Super Falcons ejirila ọkpụ goolu atọ asataghịọ nchancha merie otu egwu bọọlụ nke New Zealand n'asọmpị enyi na enyi.

    Ọ bụ Onome Ebi, Jennifer Echegini na Desire Oparanozie nyere goolu atọ ndị a.

    Cheta na mba New Zealand sọ na ndị ga-ahazi egwuregwu iko mba ụwa nke egwuregwu bọọlụ ụmụ nwaanyị.