Ka ọ dị echi
Igbo nwe mmadụ, anyị abịala n'isi njedebe mgbasaozi nke taa.
Sonyere anyị ọzọ n'elekere asatọ nke ụtụtụ echi.
Ka chi fonu.
You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.
Ụlọakụ etiti Naịjirịa kwuru na a ga-akwụsị iri ego ochie n'ụbọchị 31 nke ọnwa Disemba afọ a dịka ụlọikpe kachasi si nye ha iwu.
Ikechukwu Kalu and Chukwunaeme Obiejesi
Igbo nwe mmadụ, anyị abịala n'isi njedebe mgbasaozi nke taa.
Sonyere anyị ọzọ n'elekere asatọ nke ụtụtụ echi.
Ka chi fonu.
onye bụbu gọvanọ Enugwu steeti bụ Chimaroke Nnamani agwala Peter Obi ka o wepụta akwụkwọ o tinyere n'ụlọikpe megide Bola Tinubu bụ onye a kpọpụtara dịka onye meriri ntuliaka ọkwa onyeisiala Naịjirịa e mere n'ọnwa Febrụwarị afọ a.
Nnamani kwuru nke a site n'akwụkwọ ozi o wepụtara n'ụbọchị Sọnde, bụ ebe o kwuru na "akwụkwọ obi gbara n'ụlọikpe enweghị isi, ọ bụ n'ihi oke mpako, ọ bụ ịkpa ọchị gafere oke".
Ọ gara n'ihu kwuo na Peter Obi ma na o nwetaghị vootu dịka iwu Naịjirịa si kwuo iji bụrụ Onyeisiala, "akwụkwọ o tinyere n'ụlọikpe (megide Tinubu) bụ n'ihi anya ụfọ nakwa iji metọọ aha ya ọma ya".
"Obi kwesịrị iritu n'oke ịnyịnya nke mpako ya iji nye ohere ka ndị ọzọ gaa nwee mkparịtaụka maka ọdịmma nke mpaghara Ọwụwa Anyanwụ nakwa etu anyị ga-esi nweta oke nke anyị na akụnụba Naịjirịa," Nnamani dere.
"Ọ dị mkpa ka anị sonye n'ebe ihe na-eme ma tinye aka n'iwulite Naịjirịa ọhụrụ, Ndị Igbo kwesịrị ịgbado anya ugbua n'ihe na-emenụ maọbụkwanụ anyị ga-abụ ndị nke ikpeazụ oge ọbụla a kọrọ akụkọ Naịjirịa. Oge iji mee ihe bụ ụgbua."
Cheta na Peter Obi, onye zọrọ ọkwa Onyeisiala Naịjirịa na Labour Party, wepụrụ mkpesa n'ụlọikpe mkpegharị gbasara ihe ọ sị bụ nrụrụaka e mere na ntuliaka 2023.
Obi chọrọ ka ụlọikpe kagbuo mmeri nke Inec nyere Bola Tinubu nke APC n'ihi na, dịka o si kwuo, Tinubu etozughị etozu ịbụ onyeisiala.
Labour Party gbara ndị nke atọ na ntuliaka ọkwa onyeisiala Naịjirịa nke e mere n'ụbọchị 25 nke ọnwa Febrụwarị 2023, dịka Peter Obi nwetara vootu 6,101,533.
Mana ọ na-ekwu na ọ bụ nrụrụaka ka Inec ji were ụfọdụ vootu ya nye Tinubu. Dịka Peter Obi si kwuo, "anyị meriri ntuliaka a, anyị ga-eweta ihe akaebe iji gosi nke a."
Mba dị icheiche amalitela ịkpọpụ ndị nnochite anya ha na mba Sudan dịka nnukwu ọgụ na-ada n'isi obodo mba ahụ bụ Khartoum.
Mba Amerịka na UK kwupụtara n'ụbọchị Sọnde na ha ebupụla ndị ọrụ ha na mba ahụ.
Ndị isi mba Amerịka kwuru na ha zitere ụgbọelu 'Chinook helicopter' olemole iji bupụ ndị mba ha n'ụtụtụ ụbọchị Sọnde.
Ụlọọrụ nnọchite anya mba Amerịka na Sudan emechiela ugbua, dịka ha dere n'akara Twitter ha na ọ ga-ara ahụ ịkpọpụta ndị mba ha ndị ọzọ na-abụghị ndị ọrụ gọọmentị ka tọrọ na Sudan.
Gọọmentị mba UK kwukwara na ha gbara mbọ ịkpọpụ ndịọrụ ha nakwa ndị ezinụlọ ha n'ụbọchị Sọnde.
Mịnịsta na-ahụ maka mmekọ mba UK na mba ndị ọzọ bụ James Cleverly kwuru na ohere ịkpọpụta ndị mba Briten ndị ọzọ tọrọ na Sudan pere ezigbo mpe.
Mba France kpọpụrụ ndị mba ha ruru 100 site n'ikuku, tinyekwara ụfọdụ ndị mba UK na Germany. Ụfọdụ ndị mba Netherlands sonyekwara n'ụgbọelu ahụ bupụrụ ndị mba France, mana gọọmentị mba Netherland kwuru na ha ga-ezite ụgbọelu nke ha na mgbede ụbọchị Sọnde.
Ihe karịrị mmadụ 150 ndị mba dị icheiche nke gụnyere Egypt, Pakistan na Canada jikwa ụgbọmmiri bupu ụfọdụ ndị mba ha gaa Jeddah dị na Saudi Arabia n'ụbọchị Satọde.
Otu WHO na-ekwu na ihe karịrị mmadụ 400 anwụọla kamgbe ọgụ a malitere na mba Sudan ihe dịka izuụka abụọ gara aga.
Mana a na-eche na ọnụọgụgụ a ga-akarị dịka ọtụtụ na-enwe nhịahụ ịnata ọgwụgwọ n'ụlọọgwụ maka na ọtụtụ ụlọọgwụ dị na Khartoum emechiela n'ihi ọgụ a na-alụ.
Ndị uweojii Ebonyi Steeti ekwupụtala etu ha si memilaa otu onye ntọrị mmadụ ma jidekwa ndị otu ya abụọ ọzọ na mpaghara Isieke nke dị n'okpuruọchịchị Ebonyi.
Onome Onovwakpoyeya, bụ ọnụ na-ekwuru ndị uweojii Ebonyi kwuru nke a n'ụbọchị Sọnde, ma kwukwaa na ha zọpụtara otu onye ndị ntọ ahụ tọọrọ.
Onovwakpoyeya kwuru sị: "Ndị ọrụ anyị nwetara ozi taa bụ ụbọchị 23 nke ọnwa Eprel na ndị ntọ wakporo ma tọrọ otu ụkọchukwu. Anyị wee chụọ ndị ahụ ọsọ ma gbachie ha ihu na mpaghara Edufu Isieke dị n'okpuruọchịchị Ebonyi, ebe ha nọ gbahapụ ụgbọala ha nakwa onye ahụ ha tọọrọ ma were ụkwụ gbawa ọsọ."
"Ndị uweojii chụwara ha ọsọ, ha wee bido ịgba egbe, ebe ha na ndị uweojii na-akwarịta mgbọ, otu onye n'ime ndị ntọ ahụ nwụrụ ebe anyị jidere mmadụ abụọ ndị ọzọ.
"Ndị uweojii napụtara egbe AK47 abụọ na otu egbe 'Lar, na ụgbọala abụọ (tinyere nke onye ahụ ha tọọrọ) n'aka ndị ekperima ahụ.
Onovwakpoyeya dọrọ ndị omekome aka na ntị ka ha debe ngwaọgụ ha ma soro ụzọ udo, maọbụ ha ahapụ Ebonyi steeti, n'ihi na anya ndị uweojii dị n'ahụ ha oge niile.
O kwukwara ka ndị mmadụ zitere ndị uweojii ozi n'akara ekwentị 07064515001 oge ọbụla e nwere mwakpo ọbụla na mpaghara ha.
Ụmụakwụkwọ anọ bụ ndị na-agụ n’ụlọakwụkwọ gọọmentị nke ụmụnwaanyị nọ na Birnin Yauri, Kebbi Steeti abụrụla ndị nweereonwe ha dịka ndị omekome ‘Bandits’ tọọrọ kembe ọnwa 22 gara aga tọhapụrụ ha.
Ntọhapụ a mere ka ọ fọdụ mmadụ asaa n’ime ha nọ n’aka ndị omekome a dịka a wakpọrchara ụlọakwụkwọ Federal Government College (FGC) Birnin Yauri n’afọ abụọ gara aga.
Dịka onye na-ekwuru otu jịkọrọ nne na nna ndị a tọrọ ụmụ ha n’ụlọakwụkwọ ahụ bụ Salim Kaoje siri kwuo, ọ bụ otu onye n’ime ndị isi ndị omekome ahụ a ma ama dịka Dogo Gide bụ onye mere ntọhapụ a n’abalị Fraịde a.
Kaoje kwuru n’ozi banyere nke a sị:
“E ji abalị isii n’ime ọhịa na-eme nkwụkọrịta banyere ịgbapụta ụmụaka tuou e mechaa tọhapụ ha”
“Mmadụ asaa ka nọ n’aka ndị a, ndị nne na nna mmadụ abụọ n’ime ha ka nọ n’ime oke ọhịa na-agba mbọ ịgbapụta ndị a.”
Ndị a tọhapụrụ so n’ime ụmụakwụkwọ na ndị nkuzi a tọọrọ n’ụbọchị 17 nke ọnwa Juun 2021 mgbe ndị omekome wakporo ụlọakwụkwọ ahụ.
Cheta na e nweela ụfọdụ ndị ọzọ a tọhapụrụ n’ime afọ abụọ gara aga dịka ndị omekome jichisiri mmadụ 11 ejiche kemgbe ahụ.
Kaoje gbara ama na ndị nne na nna ahụ kwụrụ ego mgbapụta nke ọ na-akpọpụtaghi.
O kwukwara ndị ụfọdụ n’ime ha rere akụnụba ha ma mee emume nkụkọta ego were nweta ego ha nyere maka mgbapụta a.
Kemgeb afọ olemole gara aga, ndị ojiegbe malitere na-atọ ndị mmadụ, ụmụakwụkwọ (ọkachasị ụmụnwaanyị) ma na-ana ndị ezinaụlọ ha ego mgbapụta.
Minista ọrụ na owuwe ọrụ na Naịjirịa bụ Festus Keyamo agọpụla aka n’ụkwụ n’ebubo na-efegharị nke kwuru na o ji ego ọ nwetere site na nrụrụaka zụta ụlọ ya na mba Amerịka.
Keyamo wepụtara ozi kwuo na ụlọ ndị o gosiri ka ọ nọ ezimuike na mba Amerịka bụ ihe obere ego ma atụnyere ụlọ nakwa akụnaụba ya ndị ọzọ.
O kọwara na o ji nke a asaa ndị ọ sị na-enwere ya anya ụfụ maka akụnụba ya
Ozi ya kwukwara na ọ bụ site na ọrụ ọkaiwu ya nakwa itinyego n’azụmahịa ụlọ na ala kemgbe afọ olemole bụ onye nyere ya ego o jiri zụta ihe ndị ma kwukwa na ime ihe ndị a ka enye ya ego karịa ịrụ ọrụ gọọmentị.
Kayomo wepụtara ozi iji saa nkatọ nakwa okwu ndị dapụtara ka o kesara ihe onyonyo ebe ọ nọ na mba Amerịka na nso nso a.
O kwuru:
“Abalị abụọ gara aga a sị kam chọọ ọnụ okwu ndị na-achataghị aja na ntuliaka gara aga mgbe m kesara ihe onyonyo nke gosiri OTU N’IME ỤLỌ M ndị nọ na mba ofesi dịka m nọ na-emegharị ahụ.”
“Dịka m siri chee, ebumnobi m mezuru dịka ha kwuru ọtụtụ okwu. Iji gosi na ha bụ ndị na-enweghi ezi ụkpụrụ, ha na-ele mmadụ niile anya dịka etu ndụ nke ha dị. Ọ bụrụ ha ka enyere ohere isonye ọchịchị, a ma na ha ga-eme nrụrụaka. Nke a mere ha jiri chere na mmadụ niile dị ka ha”.
O gara n’ihu kwuo na ọ gbasiri mbọ ike n’afọ 30 gara aga were zute ụlọ ndị a ma gwa ọha ka ha chee aka ghọrọ ihe onyonyo na-egosi akụnụba ya ndị ọzọ nke ọ ga-ekesa.
Keyamo na-arụkwa ọrụ ugbua dịka onye mgbasaozi nke otu nọ n'ọchịchị bụ otu All Progressives Congress (APC).
Ndị uweojii na mba Kenya egwupụtala ozu mmadụ 21 n’obodo Malindi dịka a na-eme nnyocha n’isi otu ụkọchụkwụ si ndị otu ya malite ibu ọnụ ruo mgbe ha nwụrụ.
Ozu ụmụaka so n’ihe e gwupụtara ebe ahụ dịka ndị uweojii na-ekwu na a na-atụ anya egwupụtakwu ndị mmadụ ebe ahụ.
A hụrụ ili ebe e liri ndị n’ime oke ọhịa Shakahola bụ ebe agbapụtara mmadụ 15 nke ụka Good News International Church n’izu gara aga.
Ụkọchukwu a aha ya bụ Paul Mackenzie Nthenge nọzị n’aka ndị uweojii dịka a na-eche ka ọ pụta n’ụlọikpe bịa zara ọnụ ya.
Ụlọ mgbasaozi mba ahụ bụ KBC kpọrọ ya onyeisi ‘otu nzuzo’ ma kwuo na e nyochapụtala ili 58 ebe ahụ.
Otu n’ime ili ahụ nwere ozu mmadụ ise bụ ezinaụlọ ụmụaka atọ na nne na nna ha.
Maazị Mackenzie ekwuola na aka dị ọcha dịka ndị uweojii jụrụ ịtọhapụ ya ka o si n’ụlọ na-abịa ikpe ya. O kwukwara na o mechiri ụka ahụ n’afọ 2019.
A na-ebo ya ebubo na ọ gwara ndị nso nso ya ka malite ibu ọnụ maka atụmatụ ‘izute Jizọs’.
E kwuru na ndị dọkịnta ga-enyocha ime ahụ ndị a egwupụtara iji mara ma ọ bụ ibu ọnụ bụ ihe gburu ha.
A nwụrụchiri ụkọchụkwụ a n’abalị 15 nke ọnwa Eprel a dịka a hụrụ ozu mmadụ anọ a na-eche agụụ gburu n’ime ọhịa bụ ndị e che bụ ndị ụka ahụ.
Gọvano Babajide Sanwo-Olu nke Legọs steeti enyela iwu ka akwatuo ụfọdụ ụlọ ndị arụcharala na ụfọdụ arụchabeghi na mpaghara Banana Island nke steeti ahụ.
Gọvanọ Sanwo-Olu na ụfọdụ ndị ọchịchị ya ndị ọzọ gara mpaghara ahụ leta otu ụlọ ogogo ya ruru asaa nke dara na nso nso ebe ahụ.
Onye ọrụ mgbasaozi ya bụ Gboyega Akosile kwuru nke a n’akara Twitter ya n’abalị Satọdee ebe ọ nọ gbaa ama na e nweela ụfọdụ ndị nọ ebe etinyere akara uhe na-egosi na a ga-akwatụ ha dịka e mechara njem nleta ahụ.
Ozi ya kwuru:
:Ụfọdụ ụlọ ndị no ebe ahụ arụcharala nakwa ụfọdụ a ka na-arụarụ abụrụla ihe etinyere akara mwepụ n’akụkụ Banana Islanmd taa dịka Gọvanọ Babajide Sanwo-Olu siri nye iwu ka agachara njem nleta na mpaghara ahụ.
Cheta na n’ụbọchị 12 nke ọnwa Eprel Minsitri na-ahụ maka mwulite ụlọ nakwa nhazị obodo na Legọs gbara ama na otu ụlọ a ka na-arụ arụ dara n’akụkụ Banana Island bụ ebe ndị ọgaranya bịkasị na Legọs steeti
Nnọnụ n'ọbaozi anyị taa bụ ụbọchị ụka, abalị 23 nke ọnwa Eprel, 2023.
Soro akụkọ niile dị mkpa ịkọ ebe a taa.
Igbo ndị ọma, anyị ga-awụsa ọwa ebe a.
Sonyekwara anyị ọzọ echi.
Ya gazie.
Alex Otti bụ onye Gọvanọ ọhụrụ a họpụtara n'Abia steeti akọwaala akụkọ na-ekwu na ya kpọrọ aka chịburu Naịjirịa bụ Ọchịagha Yakubu Gowon (larala ezumike) ka ọ bịa kpeere ya ekpere, dịka akụkọ ụgha.
Otti kwuru nke a site n'akwụkwọ ozi si n'aka onye enyemaka mgbasaozi ya bụ Ferdinand Ekeoma wepụtara n'ụbọchị Satọde.
Ekeoma kọwara na Otti amaghị ihe ọbụla gbasara nhazi ọgbakọ ekpere ahụ ruo mgbe o nwetara ozi ka o sonye n'ọgbakọ ahụ dịka onye ọbịa pụrụ iche.
"Otu a kpọrọ "Nigeria Prays" bụ nke aka chịburu Naịjirịa n'oge ọchịchị ndị agha bụ Yakubu Gowon hibere, zisara ozi na ha nwere ọgbakọ ekpere n'ụbọchị ụka, Eprel 23, 2023. N'ime akwụkwọ ozi ahụ, ha tinyere aha Gọvanọ Okezie Ikpeazu dịka onyeisi ma tinyekwa aha Alex Otti dịka onye a ga-ekpere ekpere n'ụzọ pụrụ iche," Ekeoma na-akọwa.
"Mana ọ bụ ihe ịgba gharịị na ụfọdụ tụgharịrị akụkọ ahụ ma na-ekwu na Dr Otti kpọrọ Gowon ka ọ bịa kpee ekpere iji duo ya n'iyi ọrụ, ha ji akụkọ a gaa n'ihu ịbọlite akụkọ dị icheiche merela ọtụtụ afọ gara aga."
"Ajụjụ anyị na-ajụ bụ: 'kedu etu Otti ga-esi kpọọ Gowon ka ọ bịa kpeere ya ekpere, ebe ọ bụ na ya onwe ya amaghị maka ya bụ ọgbakọ ruo mgbe e ziteere ya ozi dịka onye ọbịa pụrụ iche?
"Kedu etu Gowon ga-esi duo Otti n'iyi ọrụ n'ụbọchị 23 nke ọnwa Eprel, ebe ọ bụ na ụbọchị a ga-edu ya n'iyi ọrụ dịka gọvanọ bụ n'ụbọchị 29 nke ọnwa Mee 2023?"
Ekeoma kwuru na akụkọ ụgha ndị a na-efesa gbasara Alex Otti bụ akaọrụ ndị PDP bụ ndị ọ ka dị ka na nrọ na ọchịchị Abia Steeti apụọla ha n'aka.
Cheta na oge akụkọ pụtara na otu 'Nigeria Prays' nke Yakubu Gowon hibere, na-akwado ikpe ekpere maka ọchịchị Abia steeti, nakwa na Gowon n'onwe ya ga-abịa Abia Steeti, ụfọdụ ndị otu PDP katọrọ ya bụ akụkọ ma kwuo na ọ bụ ihe mkparị na nleda anya nye ọtụtụ ụmụ Naịjirịa nwụrụ n'oge agha Biafra.
Yakubu Gowon bụ onyeisiala Naịjirịa n'oge ahụ.
Ndị nkatọ a kwukwara na aka Gowon dị n'ọnwụ Ọchịagha Aguiyi Ironsi bụbu onyeisiala Naịjirịa, onye ndị agha ibe ya gburu ma napụ ya ọchịchị n'ike n'afọ 1966. Ironsi bụkwa onye Abia Steeti.
N'otu aka ahụ kwa, otu na-azọ nnwereonwe Biafra bụ 'Indigenous People of Biafra' (Ipob) katọkwara akụkọ ahụ kwuru na Gowon na-abịa njem nleta n'Abia Steeti, ma kpọọ oku ka ọ ghara ime.
Gọọmentị Naịjirịa ehibela kọmiti ga-arụ ọrụ iji kpọlata ọtụtụ ụmụ Naịjirịa tọrọ atọ na mba Sudan ebe ọgụ na-ada ugbua.
Ọ bụ ọnụ na-ekwuru otu gbatagbata nke Naịjirịa a kpọrọ 'National Emergency Management Agency' (Nema) bụ Manzo Ezekiel kwupụtara nke a n'akwụkwọ ozi o wepụtara n'ụbọchị Satọde.
Nke a na-abịa dịka ụfọdụ ndịọrụ gọọmentị, nke gụnyere Abike Dabiri-Erewa, bụ onyeisi ngalaba na-ahụ maka ọdịmma ụmụ Naịjirịa bi n'ofesi, kwuru na ha na-enwe nhịahụ ịkpọpụta ụmụ Naịjirịa tọrọ na Sudan dịka otu ndị agha mba ahụ malitere ibuso onwe ha agha.
Mana Manzo Ezeikel kwuru na kọmiti nke a ehibere nwere ọtụtụ ndị bụ ọkacha mara n'ọrụ gbatagbata ndị ọrụ ha ga-abụ "inyocha etu ọnọdụ si dị na Sudan ma chọpụta ụzọ kacha mma iji kpọpụta ụmụ Naịjirịa tọrọ ebe ahụ, ọ bụrụgodi isite na mba ọzọ dị Sudan nso".
Ezeikel kwuru na ka ọ dị ugbua, n'ihi ọgụ na-ada n'etiti otu ndị agha Sudan, emechiela ọdọ ụgbọelu niile nakwa oke ala niile na mba ahụ, "mana Nema na-agba mbọ oge niile ịmata ọnụọgụgụ ụmụ Naịjirịa nọ na Sudan kpọmkwem, nakwa etu ọnọdụ ha ebe ahụ si dị," ka o kwuru.
It noted that the current emergency situation in Sudan is very complex with fighting between waring factions going on and all airports and land boarders closed.
Onyeisi Nema bụ Mustapha Ahmed kwere nkwa na ha na-eme ihe niile ha nwereike iji hụ na onweghị onye Naịjirịa ọbụla ga-enwe mmerụ ahụ ọbụla na mba Sudan, mana ha ga-enwe ohere ịlọghachikwute ndị ezinụlọ ha n'udo.
A na-eche na ihe karịrị narị mmadụ anọ anwụọla ebe ọtụtụ ndị ọzọ merụrụ ahụ dịka nnukwu ọgụ malitere n'ụbọchị 15 nke ọnwa Eprel n'etiti ndị agha Sudan, nke onyeisi ha bụ ọchịagha Fattah al-Burhan, na ndị ọgụ 'Rapid Support Forces' nke onyeisi ha bụ Mohamed Hamdan "Hemedti" Dagalo.
Ọgụ a bụ n'ihi nghọtahie gbasara etu ha chọrọ ka ọchịchị Sudan si dịrị dịka ndị agha weghaara ọchịchị n'aka ndị nkịtị n'afọ 2021.
Anyị ga-enye ohere ka ndị mbịarambịara pụọ na Sudan - Ndị agha
N'ụbọchị Satọde, ndị agha Sudan wepụtara akwụkwọ ozi ma kwe nkwa na ha ga-enye ohere ka gọọmentị mba dị icheiche kpọpụ ndị mba ha nọ Sudan.
Onyeisi ndị agha bụ Fattah al-Burhan kwuru na atụmatụ a ga-amalite n'awa olemole na-abịanụ.
Ọtụtụ mba dị icheiche, tinyere mba UK, US, France na ndị ọzọ, enwebeghị ike ịkpọpụ ndị mba ha nọ na Sudan, mana a na-atụ anya na nke a ga-ekwezi omume ugbua.
Onye omeiwu a họpụtara ọhụrụ ịnọchite anya mpaghara Jalingo/Yorro/Zing nke Taraba Steeti n'ụlọ omeiwu nta, aha ya bụ Isma'ila Maihanci, alaala mmụọ.
Nke a na-abịa dịka ọ fọdụrụ ihe dịka izuụka ise tupu e duo ndị omeiwu ọhụrụ n'iyi ọrụ ka ha malite ọrụ ha n'uju.
Maihanci, onye meriri ọkwa ahụ n'okpuru otu ndọrọndọrọ ọchịchị 'Peoples Democratic Party' (PDP), nwụrụ n'ụbọchị Satọde n'Abuja dịka ọ rịachara obere ọrịa.
Otu onye ezinụlọ ya gwara BBC na ọnwụ Maihanci bụ nnukwu ihe mwute, ọbụghị naanị maka ndị ezinụlọ ya kama maka ndị Taraba niile.
Onye ahụ na-achọghị ịkpọpụta aha ya kwuru na nke a bụ nke mbụ Maihanci na-emeri ntuliaka ịbụ onye omeiwu, dịka ọ kụchapụrụ onye nọbụ n'ọkwa ahụ bụ Kasimu Bello Maigari nke pati 'All Progressives Congress.
Maihanci bụ otu n'ime ndị afọ ha dị nta na-abanye n'ụlọ omeiwu. A mụrụ ya n'ọnwa Ọkụtoba afọ 1986 nke pụtara na ọ gaara adị afọ 37 n'ọnwa Ọkụtoba afọ a.
Ndị ezinụlọ ya kwuru na a ga-esi Abuja bulata ozu Maihanci na Jalingo taa bụ Satọde, ebe olili ya ga-abụ echi bụ Sọnde, dịka usoro olili ozu ndị okpukperechi Islam si dị.
Daalụ maka isonye anyị taa bụ Satọdee abalị 22 nke ọnwa Eprel, 2023.
Soro akụkọ ndị dị mkpa ịkọ ebe a taa.
Mmadụ iri si n’otu ezinaụlọ alaala mmụọ n’otu ugboro mgbe ndị ojiegbe wakporo ha n’ụlọ ha dị na Saụt Afrịka dịka ndị uweojii si kwuo.
Ọdachi a mere na mpụta obodo Pietermaritzburg nke mpaghara KwaZulu-Natal n’ụtụ Fraịde.
Ndị a ojiegbe a gburu gụnyere ụmụnwaanyị asaa na ụmụnwoke atọ.
Ndị agbataobi kpọtụụrụ ndị uweojii mgbe ha nụchara ụda egbe dịka ọkụ latrik nyụrụ n’obodo Imbali.
Minista ndị uweojii bụ Bheki Cele kwuru na ha anwụchiela mmadụ abụọ a na-enyo enyo, ha gbagburu otu ebe otu onye ọzọ gbara ọsọ.
Saụt Afrịka so na mba ndị kachasị nwee akụkọ ogbugbu mmadụ n’ụwa.
Cele kwuru na otu n’ime ndị a egburu bụ nwata dị ebe afọ 13, ma sị na: “nke a bụ igbu ọchụ. Ọtụtụ mmadụ ka e gburu.
“A nwụchiela mmadụ abụọ, otu onye anwụọla, otu gbara ọsọ nakwa ọtụtụ ngwa egbe a akpachiri.”
Akụkọ kwuru na e burula otu nwata gawa n’ụlọọgwụ.
Nke a ga-abụ ugboro abụọ a ga-agbagbu ọtụtụ mmadụ na KwaZulu n’izuụka dịka a gbagbuchara mmadụ anọ na Tọzde n’otu ụlọ dị na mpaghara Ugwu n’obodo Durban.
A gbagbukwara mmadụ asatọ n’ọnwa Jenụwarị ebe a na-eme emume ncheta ọmụmụ n’obodo Gqeberha nke Eastern Cape.
Nke a na-eso mwakpo nkere n’ụlọ oriri n’afọ gara aga ebe e gburu ihe ruru mmadụ 15 n’otu ugboro.
Ndị mmadụ bi n’ụwa na-eme emume Eid al-Fitr nke 2023 dịka ha buchara ọnụ.
Ọnwa nsọ Ramadan bụ mgbe ndị mọslem n’ụwa na-ebu ọnụ na ekpere nakwa emume ndị so ya n’elu.
Sultan nke Sokoto bụ onyeisi ndị Mọslem na Naịjirịa nọọrọ n’ụbọchị Fraịde kwuo na a hụla ọnwa ọhụrụ nke na-ewete obubu ọnụ Ramadan na njedebe.
Ndị Mọslem n’ụwa na-enwe aṅụrị n’emume Eid al-Fitr bu nke pịachiri ọnwa nsọ Ramadan nke ndị Alakụba.
Nke a bụ foto ndị gosiri ka ya bụ emume si aga n’ụwa
Akụkọ oke ogbugbu nakwa mwakpo malitere ịdapụta n’akụkụ Enugu dị iche iche na nso nso a mana ndị uweojii ezipụtala ozi na ha anwụchiela ụmụnwoke mmadụ 26 a na-enyo maka okwu metụtara esemokwu otu nzuzo na otu nzuzo bụ ndị e che nọ n’isi mwakpo ndị a.
Otu onye bi n’Enugu gwara BBC Igbo n’izu gara aga ọ bịaziri dị ka kwa ụbọchị, akụkọ ogbugbu ndị mmadụ na-adapụta aghara aghara mana enweghi ihe ndị ọchịchị na-eme.
N’okwu ya ọ sị:
“A na-agbagbu ndị mmadụ kwa ụbọchị n’akụkụ dị iche iche n’Enugu. O ruola ihe ruru mmadụ 10 e gburu n’otu izu gara aga.”
“Ụfọdụ na-ekwu na ọ bụ esemokwu ndị otu nzuzo na-akpata mwakpo ndị a”
Ozi si n’aka ọnụ na-ekwu ndị uweojii steeti abụ bụ Daniel Ndukwe gbara ama na nnyocha ha gosiri na ọ bụ ndị otu nzuzo Black Axe na Supreme Vikings nọ n’isi mwakpo ndị a.
O kwuru n’ụbọchị Tọọzde “A kpụpụla ndị a ụlọikpe dịka ha ga-anọzị nga ruo mgbe ha zaara ọnụ ha”
Gọọmentị etiti Naịjirịa agbaala ama na ha natara ozi si n’aka ụmụakwụkwọ Naịjirịa nọ na Sudan nke na-arịọ ka a bịa gbapụta ụmụafọ Naịjirịa ndị tọọrọ na mba ahụ dịka ọgbaghara na-adasiike ebe ahụ ọkachasị n’isiobodo mba ahụ bụ Khartoum.
Cheta na kemgbe izu gara otu nchekwa abụọ na mba ahụ malitere ibuso onwe ha agha bụ otu ndịagha ha nakwa otu nchekwa nke a kpọrọ ‘Rapid Support Forces’.
Onyeisi ngalaba Nigerians in Diaspora Commission, (Nidcom) bụ ngalaba na-ahụ maka ndị Naịjirịa nọ na mba ndị ọzọ nke aha ya bụ Abike Dabiri-Erewa gbara ama nke a ma kwuo na ọnọdụ a ụmụakwụkwọ Naịjirịa bụ ihe na-eche ha oke echiche.
“Ụlọọrụ gbatagbata Naịjriịa bụ National Emergency Management Agency, (Nema) bụ ndị ọ bụ ọrụ ha ịgbapụta ndị nọ n’ọnọdụ ọjọọ nakwa ụlọọrụ Naịjriịa na Sudan nakwa ngalaba ndị ọzọ okwu a metụtara amalitela nkwụkọrịta maka okwu a.”
Nke a bụ pụtara n’ozi si n’aka ụlọọrụ Nidcom nke Gabriel Odu zipụtara.
Ọ kọwara na ha natara ozi si n’aka otu jịkọrọ ụmụakwụkwọ Naịjirịa nọ na Sudan bụ ‘National Association of Nigerian Students Sudan’.
Ọ gara n’ihu dụọ ụmụakwụkwọ ndị nọ ebe nakwa ndị Naịjriịa ndị ọzọ ka ha gbado anya n’oge a ma nọrọkwa jụụ.
Ọgbaghara na-ada na Sudan ataala isi ọtụtụ dịka tigbuo zọgbuo ka na-aga n’ihu agbanyeghi oku udo a na-akpọ ebe ahụ.
Nnọọnụ n'ọbaozi anyị taa bụ ụbọchị 21 nke ọnwa Eprel, 2023.
Soro akụkọ ndị dị mkpa ịkọ taa ebe a.
Ndị uweojii Bayelsa Steeti amalite inyocha ihe butere ọnwụ mmadụ abụọ na mpaghara Kpansia nke obodo Yenezue-Epie.
Ọnụ na-ekwuru ndị uweojii na steetị ahụ bụ Asinim Butswat sị na ndị ọrụ eweghachịtela udo n’ebe ahụ maka ogbugbu eotu onye ọkwọ Keke gburu otu nwokoroọbịa n’ihi nghọtahe.
Nke a na-eso ihe mere na Wenezde 19th Eprel 2023 mgbe onye na-anya keke ji mma sugbuo nwokoroọbịa obodo ahụ n’ihi naịra iri ise (N50).
N’ihi nke ahụ, ndị ntoroọbịa obodo ahụ kugburu onye ọkwọ keke, ma banye n’okporoụzọ malite ịgba ọtụtụ keke ọkụ.
Anya hụrụ ka o si mee kwuru na onye keke bu nwokoroọbịa ahụ, mgbe e ruru ebe ọ na-aga, o nyere onye keke naịra iri ise ma sị na ebe e si buru ya adịghị anya.
Onye keke gbara isi akwara na ọ bụ otu narị naịra bụ ego ya, nke mere ha jiri malite ịlụ ọgụ. Onye keke wepụtara mma sụọ nwokoroọbịa hụ n’apata.
Ndị mmadụ gbakọtara buru ya gawa n’ụlọọgwụ mana ọ nwụrụ n’ụzọ dị ka ha na-aga.