You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.

Take me to the main website

Anyị enweghị atụmatụ iwepụ akwụkwọ ego naịra ọhụrụ - Ụlọakụ etiti

Ụlọakụ etiti Naịjirịa kwuru na a ga-akwụsị iri ego ochie n'ụbọchị 31 nke ọnwa Disemba afọ a dịka ụlọikpe kachasi si nye ha iwu.

Mkpuchi Na Eme Ozugbo

Ikechukwu Kalu and Chukwunaeme Obiejesi

  1. Ụlọọrụ na-emepụta Peak Milk arịọla mgbaghara maka ozi ‘Easter’ ha nke ọha katọrọ

    Ụlọọrụ na-emepụta mmiri ara ehi Peak bụ FrieslandCampina WAMCO Nigeria Plc arịọla otu jịkọrọ ndị ụka Kraịst na Naịjirịa bụ Christian Association of Nigeria (CAN) mgbaghara maka ozi ha zipụtara n’oge emume ncheta ọnwụ na mbilite Kraịst nke afọ a.

    Ozi ha gosiri ka ha ji obe nke Kraịst were tinye na ozi ire ahịa ha na soshal midia n’ụbọchị ‘Good Friday’.

    Ndị isi ụlọọrụ ahụ zipụta ozi na Twitter ha n’ụbọchị Tuzde rịọ ndị okpukperechi Kraịst na Naijirịa ka ha iwe dị ọkụ jụọ otu dịka ha kwuru na ha kwetere na ya bụ ozi bụ ihe nwereike ikpalite mmụọ nakwa iwe ndị mmadụ.

    Ha gara n’ihu kwuo na ọ bụghi ebumnobi ha iji aja Kraịst chụrụ were rite uru ahịa dịka ozi kwuru na ha ewepụla oziu ahụ kpatara okwu.

    Mgbe ozi gbara n’ọha, CAN wepụta ozi n’ụbọchị Mọnde ma kwuo na ya bụ ozi ụlọọrụ zipụtara na Fraịde ezighị ezi dịka ha kwuru na ha agaghị anabata ya ma ncha.

    Ozi a nke odeakwụkwọ ha bụ Joseph Daramola binyereaka kwuru:

    “Ụbọchị ‘Good Friday’ bụ ụbọchị dị nso nye ndị okpukerechi Kraịst n’ụwa niile... Ụbọchị a abụghị ụbọchị e ji eme ihe ire ahịa.”

    Ihe dị etu a emebuola n’afọ 2022 mgbe ụlọakụ Sterling Bank wepụtara ozi ncheta ụbọchị ọnwụ na mbilite Kraịst, ọha ndị okpukperechi katọrọ ozi ha dịka CAN rụrụ ha aka.

    Ozi ụlọakụ ahụ ji mbilite n’ọnwụ Kraịst tụnyere achịcha a ma ama na Legọs bụ achịcha ‘Agege’.

    Ha merechara rịọ mgbaghara maka ihe a mere ma wepụ ya na soshal midia ha.

  2. Ozi ndị zoro ezo pụtara n’ọha egosila na South Korea na-eche echiche inye Ukraine ngwaagha

    Akwụkwọ mba Amerịka zoro ezo nke dapụtara n’ọha na nso nso abụrụla ihe BBC hụrụ ma chọpụta na ya bụ akwụkwọ kpuhere atụmatụ ụfọdụ gosiri mkparịtaụka dị n’etiti ndị ọchịchị mba South Korea ndị nwere agba n’okwu ire ngwa ọgụ a ga-eji lụọ ọgụ n’agha Ukraine.

    Okwu a metụtara mkparịtaụka gara n’etiti mmadụ abụọ bụ ndị ndụmọdụ onyeisiala South Korea bụ Suk Yeol.

    Okwu a metụtara nrụrịtaụka ime mkpebi ka mba Amerịka siri chọọ, zigara ndị Ukraine ngwa ọgụ maọbụ iso usoro ọchịchị mba ha nke megidere izigara mba ndị nọ n’agha ngwa ọgụ.

    Ozi a gbara n’ọha gosiri na otu onye n’ime ndị ndụmọdụ a tụrụ alo ka e zigara mba agbataobi Ukraine bụ Poland ngwa ọgụ ndị a ka ọ ghara ịdị ka ha a na-ege ọkụ mba Amerịka na-akwanye ha n’ike ntị.

    Mba Amerịka na-agbagharị kemgbe ịchọpụta etu ozi a zoro ezo si gbaa n’ọha dịka ha na-ekwu na mpụta ya n’ihu ọha ga-emetụa nchekwa mba ha.

    N’afọ gara aga, South Korea kwetere izunye mba Amerịka ngwaagha mana dọọ ha aka na ntị ịghara izigara Ukraine ngwa ọgụ ndị ahụ kama ka ha dobe ya dịka nke ha.

    Na mkparịtaụka mba abụọ a nwere n’ụbọchị mbụ nke ọnwa Maachị, minista mba na mba nke onyeisiala Yoon bụ Yi Mun-hui gwara onye ndụmọdụ nchekwa bụ Kim Sung-han na gọọmentị ha “na-eche ezigbo echiche na mba Amerịka agaghị ịbụ ndị ga-emeche nwee ngwagha ndị ahụ”.

    Ha na-echekwa echiche na onyeisiala Amerịka bụ Joe Biden nwereike ịkpọ onyeisiala Yoon n’ekwentị maka okwu, nke bụ na South Korea gbanwere iwu ha banyere izigara Ukraine ngwaagha ọ ga-adị ka ha na-ele mba Amerịka anya n’ihu.

    South Korea ekwuola na ha na-enyocha etu akwụkwọ a siri pụta ma na-ekwu na ọbụghị ihe kwere omume nkata ha kpara n’ibe obi gọọmentị ha dịka ha kwukwara na mkparịtaụka ndị a emeghị n’ezi ime obi gọọmentị ha.

    Amerịka nakwa mba ndị ụwa ndị ọzọ na-enye Ukraine nkwado site na ịgba mbọ kọtọtara ha ngwa agha dịka Russia malitere iwakpo ha kemgbe Febrụwarị 2022.

    Mba ndị ofesi akatọọla mwakpo nakwa agha na-ada ebe ahụ mana Russia kwuru na nke a bụ iji chekwaa mpaghara ha.

  3. Ndewonụ ndị nso nso anyị

    Daalụ o!

    Leekwa akụkọ ihe ndị na-eme n'ụwa taa bụ Tuzde, ụbọchị 11 nke ọnwa Eprel, 2023.

  4. Onye bụbu osote gọvanọ Nasarawa Steeti apụtala n'aka ndị ntọ

    Onje Gye-Wado bụbu osote gọvanọ Nasarawa steeti enwerala onwe ya n'aka ndị ntọ tọọrọ ya n'ụbọchị Frịde.

    Ọnụ na-ekwuchitere ndị uweojii steeti ahụ bụ Ramhan Nansel gwara ndị ntaakụkọ Channles nke a ma sị na ọ bụ n'abalị sụnde ka ha tọhapụrụ ya.

    O kwuru na ọ bụ ọkụ akwanyere ndị ntọ ahụ dịka a na-agba mbọ ịzọpụta Gye-Wado mere ha jiri tọhapụ ya.

    Nansel kwuru na ọ bụ mbọ ndị uweojii na ngalaba ndị nchekwa ọzọ mere e jiri tọhapụ ya.

  5. Mmadụ ise anwụọla dịka onye ojiegbe wakporo obodo Louisville

    Ndị uweojii mba Amerịka ekwuola na onye ojiegbe egbuola mmadụ ise na Louisville, Kentucky nke mba Amerịka.

    Ndị uweoji na ekwu na ọ bụ n'ụlọakụ ka ya bụ mkpamkpa kpara ma sịkwa na onye ojiegbe a rụburu ọrụ n'ụlọakụ ahụ.

    Ihe anyị ma maka ihe mere

    • Ọ bụ n'elekere asatọ na ụma nke ụtụtụ ka ya bụ mkpamkpa bidoro dịka ndị uweoji wuchiri n'ebe ahụ n'ime nkeji atọ ha nụrụ maka ya
    • Onye ojiegbe a nwụrụ dịka ya na ndị uweojii gbarịtara egbe
    • Kama amabeghị ma ọ bụ ndị uweojii gburu ya ka ọ bụị ya gbagburu onwe ya
    • Ugbua naanị ihe anyị ma bụ na otu onye uweojii merụrụ ahụ
    • Gọvanọ Kentucky bụ Beshear ji anya mmiri gwa ndị ntaakụkọ na ọ ma otu n'ime ndị nwụrụ
  6. Dalai Lama: Onyendu ụka Buddhism arịọla mgbaghara maka ịsị nwata nwoke 'mịchaa ya ire'

    Onyeisi ụka Tibetannke okpukerechi Buddhism bụ ọkwa a na-akpọ Dalai Lama arịọla mgbaghara maka onyonyo gosiri ka ọ na-agwa otu nwata nwoke ka o susuo ya ọnụ ma mịchaa ire ya.

    Ụlọụka ya rịọrọ nwata ahụ na ezinaụlọ ya mgbaghara “maka ihe mgbu okwu o kwuru buteere ha”.

    Ihe onyonyo ahụ gosikwara ebe Dalai Lama ahụ nọ na-esusu nwata ahụ n’ihu ọha.

    Ozi ụlọụka ahụ kwuru:

    “Ụkọchukwu a na-egwusa ọtụtụ ndị ọ na-ezute egwu na-enweghi ihe ọjọọ ọbụla ọ bu n’obi, nke a gụnyere ma n’ihu ọha nakwa ihu onyonyo. Ọ na-arịọ mgbaghara maka ihe a mere”.

    Ihe onyonyo a na-ewu akpatala ọtụtụ nkatọ dịka ọtụtụ ndị mmadụ na soshal midia na-ekwu na agwa ahụ ọ kpara ezighi ezi ma bụrụ ihe ịtụ n’anya dị oke egwu.

    Ọ dị ka ihe a e mere n’ụbọchị 28 nke ọnwa Febrụwarị, n’ime ụlọ nsọ Dalai Lama dịka na Dharamshala n’India.

    Ihe a bụ mgbe o nyechara nso nso na-azụ ụmụakwụkwọ 120 ndị mechara ọzụzụ n’ọrụ aka nke ụka ahụ na ụlọ enyemaka M3M Foundation jịkọọ aka mee.

    Ụlọakụ enyemaka ahụ zipụtara foto emume a na soshal midia n’ọnwa maa nke gosiri otu n’ime ha nke nwata ahụ nọ na-ebi nwa ahụ ọma dịka ihe onyonyo ahụ siri gosi.

    N’ihe onyonyo ahụ na-efesa, nwata ahụ nọ na-arịọ onyendu ụka ahụ bụ Dalai Lama ka o bịa ya ọma.

    Onyendu ahụ gwara ya ka “Mee nke mbụ ebe a”, nwata ahụ susuru ya ọnụ na ntị ya ma bie ya ọma.

    Onyendu ahụ wetere ihu ya nso ebe nwata nwoke ahụ nọ ma wepụta ire ya dịka ọ sị ya ‘mịcha ire m’.

    N’ihe onyonyo ahụ, ụfọdụ ndị nọ ebe ahụ chịrị ọchị ka o kwuru ihe a.

    Nwata ahụ wepụtara ire ya nwa obere ma tinyechie ya n’ọnụ ya tupu onyendu ahụ etinyekwa ire ya n’ime ọnụ nke ya.

    O biri nwata ahụ ọma ugboro ugboro ma gwa ya ka ọ ga n’ihu “na-eṅomi ezigbo ndị na-agba mbọ ikwalite udo na ọnụ anya’.

  7. BBC agbaghaala akara ‘ụlọọrụ mgbasaozi gọọmentị na-enye ego’ Twitter tinye n’akara Twitter ya

    BBC ewepụtala ozi na-agbagha akara ọhụrụ ụlọọrụ Twitter tinyere n’elu akara Twitter BBC [@BBC] nke depụtara ya dịka ‘ụlọọrụ mgbasaozi gọọmentị na-enyo ego ọrụ’.

    Ụlọọrụ BBC ezigarala Twitter ozi ma na-ekwu ka ha hazịgharịa akara ‘ngwa ngwa’.

    Ozi a kwuru “BBC ugbua nakwa kemgbe ụwa bụ ụlọọrụ mgbasaozi kwụụrụ onwe ya nke nọ n’ọnọdụ nnwereonwe. Ego inye ikike nke ọha mba Briten ka anyị ji arụ ọrụ,”

    Elon Musk bụ onyeisi ụlọọrụ Twitter kwuru na ọ kwetere na BBC so n’otu n’ime ụlọọrụ mgbasaozi ‘ ndị kacha ghara ị na-ele mmadụ anya n'ihu’ n’ọrụ ha.

    Mgbe BBC News zigaara onyeisi ụlọọrụ Twitter ozi gwa ya na ọ bụ ego ikike ịrụ ọrụ ka ha na-anata, Musk zichitere ozi jụọ “Akara a Twitter nyere, o zighi ezi?”

    Ozi ya gosikwara na ọ dị ka ọ na-achọ itinye akara nke ga-agba n’anwụ “ebe ego a na-enye [BBC] si abịa kpọm kwem”

    O dobeghi anya ma o ga-ekesakwa atụmatụ a nye ụlọọrụ mgbasaozi ndị ọzọ.

    N’ozi ọzọ o zitere iji mee ka ozi mbụ ya doo anya, Musk dere:

    “Anyị na-agba mbọ itinye usoro doro ọha anya ma zie ezi n’ọrụ anyị. Ime ka ọha mere ndị nwe ụlọọrụ mgbasaozi nakwa ebe ego ha si bụ ihe nwereisi ime. E chere m na ọ dị mkpa na ụlọọrụ mgbasaozi sara anya mara ebe ha kwụ ma ghara ijiụzọ aghụghọ na-eme ka ha amaghị ndị ha na-ele anya n’ihu ewepụta akụkọ ha. ”

    “Ụlọọrụ niile nwere ndị ha na-ele anya n’ihu arụ ọrụ, e nwere ndị nke ha ka njọ karịa ndị ọzọ. Ọ dịkwa ma m ikwupụta na m na-eso BBC News na Twitetr n’ihi e chere m na o so n’ime ụlọọrụ ndị kacha ghara ị na-anaghị ele mmadụ anya n’ihu n’ọrụ ha.”

    Iwu mba Briten manyere ndị mmadụ ịkwụ £159 ($197) tupu ha enweike ile igwe TV maọbụ karịa ihe onyonyo n’ịntanetị bụ iwu gọọmentị tinyere mana ọ bụ ọha ndị mmadụ na Briten na-akwụ ya bụ ụgwọ.

    Agbanyeghi ha akara Twitter @BBC nwere nde abụọ na ụma ndị mmadụ na-eso bụ nke Twitter nyere akara a, akara Twitter BBC nke ekwuregwu nakwa ndị ọzọ na-agbasa akụkọ ụwa anataghi akara njirimara a pụrụiche n’aka Twitter.

    Twitter tinyekwara akara a n’elu akara Twitter ụlọọrụ mgbasaozi mba Amerịka bụ NPR.

    Na mbụ Twitter depụtarabụrụ ụlọọrụ a dịka ‘ụlọọrụ mgbasaozi ya na gọọmentị nwere mmekọ’ – nke bụ akara ha nyere ụlọọrụ mgbasaozi mba Russia bụ RT nakwa nke China bụ Xinhua News.

    E mechara gbanwee ya tinye akara ọzọ nke depụtara ha dịka ‘ụlọọrụ mgbasaozi gọọmentị na-enye ego’ nke bụkwa akara etinyere elu akara @BBC ugbua.

    NPR ekwuola na ha agaghịzị na-eji Twitter agbasaozi ruo mgbe Twitter hazịgharịrị akara njirimara ọhụrụ a e tinyere n’elu akara Twitter ha.

  8. Ndewonụ - Unu asaala chi?

    Daalụ maka isonye anyị.

    Lee akụkọ ndị na-akpọtụ n'ụwa taa.

  9. Ihe ndị uweojii kwuru maka mberede mere n'Enugwu Steeti

    Ndị uweojii Engwu Steeti ekwuola na ihe mberede okporoụzọ mere n'ụbọchị 8th nke ọnwa Aprel afọ 2023 n'abalị 8:30pm.

    Ọ bụ ọnụ na-ekwuchitere ndị uweojii steeti ahụ bụ Daniel Ndukwe kwuru nke a n'akwụkwọ ozi ha depụtara sị na ọ bụ ụgboala bu ndị njem na gwongworo bụ simenti takọtara isi.

    Ụgbọala bu ndị njem sị Aba, Abia Steeti alọta, ụgbọala abụọ a mụnyere ọkụ mgbe ha takọtara isi.

    O kwuru na ọ bụ naanị ọkwọọ ụgbọala bụ onye ji isi ya pụta, ọ na-anata ọgwugwụ n'ụlọọgwụ ugbua.

    Kọmishọna ndị uweojii steeti ahụ bụ Ahmed Ammani tiri ndị mberde a metụrụ aka n'obi ma sị na ha ebidola ịchopụta aha ndị nwụrụ na ya bụ ihe mberede dịka ọkụ gbara ahụ ha.

  10. Akaala ụka n'ụlọụka St. Francis Catholic dị N'Owo kamgbe ndị omekome wakporo ya

    Taa bụ ụbọchị 9 nke ọnwa Aprel afọ 2023 bụ mbụ a na-aka ụka n'ụlọụka St. Francis Catholic nke dị n'Owo, Ondo Steeti, kamgbe ndị omekome wakporo ya n'ihe dịka ọnwa 10 gara aga.

    Ndị omekome agburu mmadụ 50 mgbe ha wakporo ụlọụka a kamgbe ụbọchị 5 nke ọnwa Juun afọ 2022.

    A kara ụka mbilite n'ọnwu nke Kraịst na ya bụ ụlọụka taa.

  11. Etu Poopu Francis si pụta doo ụka ụbọchị ncheta ọnwụ na mbilite Kraịst

    Poopu Francis pụtara doo ụka ụbọchị ncheta ọnwụ na mbilite Kraịst Puku kwuru puku ndị ụka Katọlịk gbakọrọ n’ime ụka Saint Peter’s Square n’ụbọchị Sọnde igere okwu Poopu Francis dịka ọ na-eme massị ụbọchị ncheta ọnwụ na mbilite Kraịsti nakwa inye ngọzị etu ụka Katọlịk si eme.

    Poopu Francis dị afọ 86 lọghachitere n’ọrụ ya dịka ọ nọchara n’ụlọọgwụ na nso nso a ebe enyochapụtara ọrịa ikuume nke ‘Bronchitis’ n’ahụ ya.

    Poopu pụrụ n’ụlọọgwụ ahụ n’ụtụtụ mbụ nke ọnwa Eprel a dịka ọ nọrọ ebe ahụ abalị atọ. Nke a bụ ugboro abụọ ọ na-aga ụlọọgwụ maka ọnọdụ ahụike ya kemgbe afọ 2021.

    N’abalị Satọdee, ọ pụtara doo ụka maasị n’ihu mmadụ 8000 bụ n’ime ụka St. Peter’s dị na Basilica, Vatican. Emume ụka a nọruru awa abụọ na ọkara. N’ụbọchị Fraịdee, ọ pụtaghị sonye n’emume ụka nke ‘Good Friday’ bụ ụbọchị ncheta oge ọnwụ Kraịst. Isi ọchịchị ụka Katọlịk na Vatican kwuru na nke a bụ atụmatụ iji chekwa onwe ya maka oke oyi dara ụbọchị. Nke a bụ mbụ ọ sonyeghi n’emume kemgbe ọ malitere ọrụ dịka poopu n’afọ 2013.

    N’elekere 12 nke ehihe Sọnde, ọha ndị mmadụ gbakọrọ ịnara ngọzị pụrụiche n’emume ụka a. A na-echekwa ka a nụ ozi ndị o ga-ezipụta maka ihe ndị mere n’ụịwa dịka nke a bụ omenala ndị poopu na-emekarị. Agbanyeghi na ọ nweela ọtụtụ nkụda ahụike ya, ihe ndị a kwụsịbeghị ya ịrụ ọrụ ya dịka Poopu.

    Poopu onye na-enwe nsogbu mgbu n’ụkwụ ya, na-ejisi oche pụrụiche ndị nwere nsogbu ụkwụ anọ nakwa akpagharị.

  12. China ezipụla ngwaagha ụfọdụ dasara n’akụkụ Taiwan

    China ezipụla ogbunigwe ofenelu ndị tụrụla n’akụkụ dị iche iche na Taiwan dịka ha banyere abalị abụọ n’ọzụzụ ndịgha mba ha na-eme.

    Ọzụzụ a nke ọchịchị China kpọrọ “ihe oke ịdọ aka na ntị” nye Taiwan bụ iji saa njem onyeisiala Taiwan bụ Tsai Ing-wen mere gaa mba Amerịka na nso nso a.

    Mba Amerịka na-arịọ ndịagha China ka ha lọghachịe azụ n’atụmatụ ịgba mba Taiwan okirikiri bụ ihe ndịagha malitere ịme kemgbe Satọdee.

    Mba Taiwan ekwuola na ihe ruru ụgbọelu agha 71 nke ndị mba China fefere mba ha n’ụbọchị Satọdee.

    Ha kwukwara na ụgbọelu agha ruru 45 gafeere ihe mba abụọ a jiri mere okeala dịka ụfodụ fegaara n’akụkụ ọdịda anyanwụ Taiwan bụ ebe mpaghara ndị ọrụ nchekwa ha.

    Taiwan hụkwara ụgbọmmiri itoolu si ọzụzụ a nke China na-eme ha na-akpọ “Joint Sword” nke a na-eche ga-amalite ruo ụbọchị Mọnde. Ọzụzụ a China na-eme na-akpasụ Taiwan iwe nke ukwuu.

    N’ụbọchị Satọdee, ndị ọrụ nchekwa na Taipei boro China ebubo na ha ji njem onyeisiala Tai mere gaa mba Amerịka dịka “ihe ịgbado ụkwụ nke ha na-achọ kemgbe were malite ịme ngosi ike ndịagha ha bụ ihe kụdarala udo, ịdị jụụ nakwa nchekwa mpaghara anyị”.

    N’ụbọchị mbụ China malitere ọzụzụ a, ụgbọ mmiri ndị agha ha gbara ukwuu n’akụkụ Pingtan island bụ mpaghara kacha nọrọ Taiwan nso.

    Taiwan kwukwara na China malitere izipụ ụgbọelu agha ha ọzọ n’ụtụtụ Sọnde a.

    Mba Amerịka ekwuola na ha na-ele ihe na-eme ebe ahụ anya n’uju, dịka ha kwuru na ha nwere ihe niile e kwesiri iji chekwa mpaghara ahụ.

    Mba Amerịka na Taipei kebiri mmekọ ha kemgbe 1979 mana iwu manyere ha inye Taiwan nchekwa dịịrị ha.

    Cheta na Onyeisiala Joe Biden ekwuola ugboro ugboro na Amerịka ga-echekwa Taiwan ma China wakpoo ha mana ozi mba Amerịka edochabeghi anya.

  13. Mba Iran etinyela ihe onyonyo ga-achọpụta ụmụnwaanyị na-eyighi 'hijab'

    Mba Iran etinyela ihe onyonyo ndị ga na-enyochapụta ụmụnwaanyị na-eyi uwe nfuchi ihu a kpọrọ ‘hijab’.

    Nwaanyị ọbụla a chọpụtara dara iwu a ga-enwete ozi ntaramahụhụ ya n’akara ekwentị ya ka ndị uweojii kwuru.

    Ndị uweojii sị na nke a ga-enye aka ịkwụsị “ịgba isi akwara n’irubeisi n’iwu a.”

    Ngagharịiwe malitere n’afọ gara aga mgbe otu nwagbọghọ bụ onye Kudish Masha Amini nwụrụ n’aka ndị uweojii mgbe ha nwuchiri ya n’ihi ebubu eyichighi ihu ya.

    Kamgbe ahụ ọtụtụ ụmụnwaanyị anaghị ekwezi eyichi ihu ha ọkachasị n’obodo ndị mepere emepe na-agbanyeghi nwuchi a na-anwụchi ha.

    Okwu si n’aka ndị uweojii kwuru na e jiri onyonyo tekịnụzụ chọpụta ndị dara iwu a ma zigara ha ozi ịdọ aka na ntị.

    Iwu ndị alakụba e mere kamgbe afọ 1979 kwuru na ụmụnwaanyị kwesịrị iyichi ihu ha, na ndị dara iwu a ga-akwụ nha maọbụ gaa mkpọrọ.

  14. Ihe Onyeisiala Buhari kwuru maka ihe ruru mmadụ 51 e gburu na Benue steeti n’izu a

    Onyeisiala Muhammed Buhari ezipụtala ozi banyere mwakpo tara isi ọtụtụ ndị mmadụ na Benue steeti n’ụbọchị Wenezde.

    N’ozi a nke ọnụ na-ekwuru ya bụ Garba Shehu zipụtara na Satọdee, ọ katọrọ mwakpo a ma kwuo na ihe a bụ “iji iyi ndụ egwu dịka akụrụ ngwa ibu agha n’etiti obodo na ibe ya” ma nye iwu ka “a chọpụta ndị mere mwakpo ma nye ha ntaraahụhụ dịrị ha”.

    Ọ kpọkuru ndị ọrụ nekwa Naịjirịa nyere ndị uweojii, ngabala ndị uweojii pụrụiche bụ DSS n’ịchafụ, ndịagha nakwa ndị ngalaba ha ndị ọzọ ka ha jịkọọ aka mee nchọpụta ma dajụọ ọgbaghara nọ na mpaghara ahụ.

    O zipụtakwara iti aka n’obi nye ndị ihe a metụtara kwuo:

    “Uche nakwa ekpere anyị nọnyere ezinaụlọ ndị e gburu. Mba anyị niile kwụdoro unu n’agha a na-ebuso ihe egwu a.”

    Ndị ojiegbe gbagburu ihe ruru mmadụ 51 n’obodo Umogidi nke Benue steeti dịka ha yara ndị mmadụ mgbọ ebe ahụ aghara aghara.

    Akụkọ si ebe ahụ pụta na Fraịdee kwuru na a ka nọ na-achọ ozu ụfọdụ ndị mmadụ ebe ahụ.

    Odobeghi anya ihe kpatara mwakpo a mana ụfọdụ na-eche na ọ bụ nsogbu nọ n’etiti ndị ọchị ehi na ndị ọrụ ugbo ebe ahụ nke bụ ihe na-emekarị na steeti ahụ kemgbe.

    Ndị ọrụ ugbo na-ebokarị ndị ọchị ehi ebubo ichiri ehi ha wụba ugbo ha nke a ha na-asị na-emebisi ma tachaa ọrụ ugbo ha.

    Na mwakpo a nke mere n’ụbọchị Wenezde, e kwuru ya ndị ojiegbe ahụ wụbatara ahịa obodo ahụ ma malite ịgba egbe aghara aghara.

    Ọsọ tara ebe ahụ dịka a ka na-achọ ụfọdụ ndị mmadụ achọ.

    Ndị nọ ihe a e mee kwuru na ụfọdụ gbaara ọsọ gbaba ime ọhịa mana a gbagburu ha.

    Otu onye ọchịchị okpuruọchịchị ebe ahụ bụ Bako Eje gwara ụlọ ntaakụkọ AFP na ndị ojiegbe ahụ wakporo ndị mmadụ ka ha nọ na-eru uju maka mwakpo ọzọ tara isi mmadụ atọ abalị foro chi ụbọchị ahụ.

    Eje kwuru na e gburu nwa ya na mwakpo ahụ.

    Agbanyeghi na ezigala ndị ọrụ nchekwa n’akụkụ Benue steeti ugboro ugboro, akụkọ mwakpo ndị dị etu a ka na-esikwa ebe ahụ dapụta.

    Banyere mwakpo a mere na nso nso a, Onyeisiala Muhammadu Buhari ekwuola na

  15. Ndịagha China amalitela ọzụzụ maka ịgba Taiwan okirikiri

    Ndịagha China kemgbe izu atọ gara aga malitere ọzụzụ pụrụiche maka ịgba Taiwan okirikiri ma jibodo ya.

    Ọchịchị mba China na-ahụ Taiwan dịka mpaghara si mba ha kewapụ bụ nke ha akwadoghị nke mere ha ji achọ iji ike were ọchịchị mpaghara ahụ ma ọ bụrụ na o okwu ruo nke a.

    China na-akpọ ọzụzụ a ha na-eme ‘ihe ịdọaka na nti’ nye gọọmentị Taiwan.

    Ọzụzụ ndịagha malitere awa olemole dịka aka chibụrụ China nke bụzị Onyeisiala Taiwa bụ Tsai Ing-wen si njem ọ mere gaa mba Amerịka lọghachite.

    Mịnịstri nchekwa mba Taiwan kwuru na kwuru na ụgbọelu 42 ndị agha China nakwa ụgbọmmiri ha asatọ gafeere oke ala ha.

    Ebe a ha gafeere bụ ebe a na-ahụ dịka ihe kewara mpaghara China na Taiwan.

    Ụlọntaakụkọ gọọmentị mba China kwuru na ọzụzụ a “ga-ahụ na a gbara mpaghara Taiwan okirikiri ma gbaa ha gburugburu.”

    Ha kwukwara na “ogbunigwe ofeen’elu, ogbunigwe nke ime mmiri, ogbunigwe ukwuu nke ala nakwa ngwa agha ndị ọzọ” a bụrụla ihe ndịagha China abụrụla ihe a na-ezupụ maka atụmatụ a.

    Onyeisiala China bụ Xi Jinping kwuru

    “Njịkọ” Taiwan na China “ga-abụriri ihe a mezuru emezu”.

    Agbanyeghi na ndịagha China enweela ọzụzụ n’akụkụ Taiwan ugboro ugboro, ọzụzụ ‘nke ịgba Tiawan okirikiri’ bụ ihe a na-eche bụ agwa iji saa njem njem onyeisial Tasi mere gaa zute onyeisi ụlọomeiwu mba Amerịka bụ Kevin McCarthy n’ụbọchị Wenezde.

  16. Aka akparala ndị ụkọchụkwu na dibia adịgboroja n'Abuja

    Ndị uweojii ngalaba Zone 7 Abuja anwụchiela mmadụ atọ a sị bụ ndị ọgwụego nwere ụlọụka na n’ụlọarụsị adịgborojo.

    Ndị a gbara afọ 24, 28 na 38 ka a nwụchiri n’ụbọchị Wenezde 5 Eprelụ, 2023 na Jikwoyi na Orozo dị nso na Karu ebe ha kpọọ ụmụaka ndị nwoke abụọ dị afọ 11 na 13.

    Ndị uweojii natara ndị a igbeozu atọ, otu ụgbọala ọ kwụ ọtọ ekele eze, otu ụgbọala obere na ekwentị 15.

    A hụkwara uwe na ọbante nwaanyị bụ nke a na-eche bụ onye ha gburu egbu.

    Ndị a bụ ndị Kogi steeti na-eji ọgwụ egwu ndị mmadụ chandum n’Abuja bụ ebe ha bi.

  17. Egbuola onye bidoro Cash App

    Bob Lee onye bidoro ụlọọrụ a na-eche na ọnụ ego ya ruru ikeri pụrụ ijero dọlla bụ Cash App anwụọla na San Francisco City centre nke mba Amerịka n'ụbọchị Tuzde.

    Nna ya bụ Rick Lee kwuru n'ezie na nwa ya anwụọla.

    Nyocha ọnụ ọgụgụ na-egosi na obodo San Francisco so na otu n'ime obodo ndị kacha n'ihe ịze ndụ.

  18. Anyị ebidola nyocha maka nzọpụta onye bụbu osote gọvanọ Nasarawa Steeti - Ndị Uweojii

    Ndị ntọ atọrọla Onje Gye-wado onye bụbu osote gọvanọ Nasarawa dịka ọnụ na-ekwuchitere ndị uweojii steeti ahụ bụ Ramhan Nansel kwuru nke a n'akwụkwọ ozi ha ewpụtara ka ọ nọrọ kwuo na ọ bụ n'ụbọchị Frịde ka ha tọọrọ ya.

    Nansel kwuru sị, " A tọọrọ Gye-Wado n'ụtụtụ ụbọchị frịde n'ụlọ ya dị na obodo Gwagi nke dị n'okpuruọchịchị Wamba nọ na steeti ahụ.

    Nansel kwuru na ndị uweojii ebidola nyocha maka nzọpụta Gye-wado.

  19. Ọ bụ ọgwụ fentanyl na ọgwụ ndị ọzọ gburu Coolio

    Onye nlekọta oti egwu ama ama bụ Leon Ivey Jr e ji Coolio mara apụtala kwuo na ọ bụ ọgwụ ike Fantanyl na ndị ọzọ butere ọnwụ ya n'ọnwa Sepụtemba afọ 2022.

    A hụrụ coolio ka ọ tọgbọ n'ala n'ụlọ otu enyi ya na Los Angeles ọnwa isii gara aga.

    Ọ dị afọ 59 mgbe ọ nwụrụ

  20. Unu abọọla chi

    Soro anyị taa maka akụkọ niile ga-amasị gị