Onyeisi ngalaba na-ahụ maka mgbochi ọrịa Tuberculosis, Leprosy na Buruli Ulcer n'Anambra steeti bụ Dkt Ugochukwu Chukwuelobe, ekwuola na ọnụọgụgụ ụmụaka nwere ọrịa tuberculosis n'Anambra steeti karịrị nke steeti niile na Naịjiria.
Chukwuelobe kwuru nke a n'ọgbakọ nke ngalaba gọọmentị etiti n'ahụ maka ahụike na ụlọọrụ KNCV Tuberculosis Foundation and Breakthrough Action Nigeria haziri n'Awka n'ụbọchị Tọzde.
"Dịka ngụkọ gbasara ọrịa tuberculosis na Naịjirịa si gosi, Naịjirịa bụ mba nke isii n'ụwa niile nakwa mba nke mbụ n'Afrịka kacha nwee ọrịa tuberculosis," Chukwuelobe kwuru n'ọgbakọ ahụ.
"Anambra bụ steeti kacha nwee ndị nwere ụdị tuberculosis ụdị nke ọgwụ anaghị emetụta nakwa ụmụaka nwere ọịa tuberculosis na Naịjirịa. Nke a abụghị ihe dị mma.
"Iji wetuo ọnụọgụgụ ọrịa TB, gọọmentị Anambra steeti nakwa ụlọọrụ mgbochi ọrịa tuberculosis na ụlọọrụ ndị ọzọ ejikọọla aka ma hibe ụlọọrụ nnyochapụta ọrịa bụ ọkaibe na steeti a.
"Anyị nwere ụlọọgwụ pụrụ iche nke ọnụọgụ ya karịrị 800 maka nnyochapụta na ọgwụgwọ TB, mana ihe bụ nsogbu bụ na ọtụtụ mmadụ amaghị maka ọrịa TB.
Chukwuelobe gwara ndị ntaakụkọ ka ha gbasie mbọ ike n'ịgbasa ozi maka ọrịa TB nakwa etu ndị mmadụ ga-esi chekwaa onwe ha maọbụ nweta ọgwụgwọ.
"Ụkwara akụsị akwụsị ruo izuụka abụọ maọbụ karịa, ahụ ọkụ, mmadụ ịta ahụ n'ike n'ike, oke okpoofufu n'etiti abalị socha na njirimara ọrịa TB," ka o kwuru.
"Onye ọbụla hụrụ ụdị ihe a kwesịrị ịga ụlọọgwụ dị ya nso maka ọgwụgwọ.
"Ndị nwere ọrịa a kwesịrị ị na-aṅụ ọgwụ ha ma na-emekwa ihe niile a gwara ha n'ụlọọgwụ."
"Onye ọbụla nwere oke na ọrụ dịịrị ya na mgbochi ọrịa TB," ka o kwuru.