Ndịagha Naịjirịa ruru 26 ebutela ọrịa coronavirus

Ndịagha Naịjirịa ekwupụtala na mmadụ iri abụọ na isii ebutela nje covid-19 n’ime mmadụ narị anọ na iri na asaa ha mere nnyocha.

Mkpuchi Na Eme Ozugbo

  1. Covid-19: Mụ na ezinaụlọ m agbakeela- Okowa

    Gọvanọ Delta steeti bụ Ifeanyi Okowa ekwuola na ya, nwunye ya nakwa nwa ya nwaanyị buteburu ọrịa coronavirus agbakeela.

    Okowa kwuputara nke a n'ozi o wepụtara na Facebook ụbọchị Fraide.

    Ọ gara n'ihu sị, " Anyị kelere Chukwu nakwa ndị mmadụ ndị nọ na-ekpere anyị ekpere" oge ha n'ọ n'ọrịa Ma bekuo ndị niile bi na Delta steeti ka ha rube isis na ntuziaka maka mgbochi nkesa nje ọjọ ahụ.

    Ifeanyi Okowa na nwunye ya

    Ebe foto si, Ifeanyi Okowa/Facebook

  2. Mmadụ 55 ebutela coronavirus n’otu ụlọakwụkwọ na mba Gana

    Ụmụakwụkwọ  Praimarị

    Ebe foto si, Getty

    Ndị ọrụ ahụike mba Gana ahụla nje coronavirus n’ahụ mmadụ iri ise na ise (55)n’otu ụlọakwụkwọ dị n’Accra,isiobodo Gana.

    Ọ bụ ụmụakwụkwọ na ndị nkuzi ụlọakwụkwọ ‘Accra Girls Senior High School ka ihe ahụ metụtara dịka e nyochara mmadụ nari atọ, iri na anọ.

    Dịka ngalaba na-ahụmaka ahụike nakwa nke na-ahụ maka agụmakwụkwọ siri kwuo, e bugala ha niile ebe ndopu maka nleta.

    Cheta na mba Gana mepere ụlọakwụkwọ n’ọnwa gara aga iji nyee ohere ka ndị nọ na classị ‘egbe- buru-ọlaa mee ule nke ha.

  3. Lee mba ọrịa coronavirus kacha akpa ike

    Ọnụ ọgụgụ ndị buterela ọrịa coronavirus n'ụwa niile akarịala nde iri na atọ.

    Mba ya bụ ọrịa kacha metụta dịka ndị mahadum John Hopkins siri depụta gụnyere

    Amerịka : 3,363,056

    Brazil: 1,884,967

    Ịndia: 878,254

    Russia: 732,547

    Peru: 330,123

    Ebe ndị mmadụ kacha nwụọ

    Amerịka: 125,605

    Brazil: 72,833

    Briten: 72,833

    Mezico: 35,491

    Italị: 34,967

  4. A chọpụtala mmadụ narị ise, iri itoolu na ise ọhụrụ bu nje coronavirus na Naịjirịa

    Ụlọọrụ NCDC achọpụtala mmadụ narị ise, iri itoolu na ise (595) ọzọ bụ nje coronavirus na Naịjirịa.

    N'ime ndị a Imo steeti chịtara iri na atọ, ebe Anambra ji asatọ naanị.

    Nke a wetere ọnụọgụ ndị niile bu nje a na puku iri atọ na atọ, otu narị, iri ise na atọ (33,153) n'ụbọchị iri na ato nke ọnwa Julaị, afọ 2020.

    Mmadụ puku iri na atọ, narị isii, iri asaa na otu sigoro na ya bụ akwa ọrịa kpakee, ebe mmadụ narị asaa iri anọ na anọ nwụrụ anwụ.

    NCDC

    Ebe foto si, NCDC

    Skip X post
    Hapụ X ihe dị na ya?

    Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

    Warning: BBC amaghị maka ihe ndị si n'ọbaozi ndị ọzọ.

    End of X post

  5. Unu asaala chi e. Ụbọchị taa ga-adịrị anyị niile mma

  6. Gọomentị etiti sị ha ga-akwụ ndị nkuzi ụlọakwụkwọ 'private' ụgwọ

    Ụmụakwụkwọ na-amụ ihe

    Gọọmentị etiti ekwela ịkwụ ndị nkuzi ụlọakwụkwọ na-abụghị nke gọọmentị ụgwọ ụlọakwụkwọ ha ji ha.

    Onyeisi otu jikọtara ndị nwe ụlọakwụkwọ na-abụghị nke gọọmentị bụ Yomi Otubela gwara BBC nke a.

    Ọ sị na ma onweghi ihe ọzọ na ha ga-enwete ihe enyemaka n'oge a coronavirus mere ha ịwa.

    Ọ sị na ndị nwe ụlọakwụkwọ a so na dị ga-erite ego dị tarịị naịra 2.3 gọọmentị wepụtara maka enyemaka.

    Skip X post
    Hapụ X ihe dị na ya?

    Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

    Warning: BBC amaghị maka ihe ndị si n'ọbaozi ndị ọzọ.

    End of X post

    Otu a bụ NAPPS sị na mere mkpesa nye gọomentị site n'aka komitii a kpọrọ 'Economic Sustainability' nke osote onyeisiala Yemi Osinbajo nọ n'isioche na ugbua gọọmentị etinyela aka na ya.

    A jụrụ Otubela ụgwọ ọnwa ole a ga-akwụ ndị nkuzi a, ọ sị na ọ mabeghi dịka coronavirus ka-adị ugbua.

    Ọ sị na ọ maghikwa mgbe a ga-ebido ịkwụ ụgwọ a. Na mgbe oge ruru na ha ga-achọpụta ndị otu ha na-akwụbeghi ndị nkuzi ya ụgwọ.

  7. Gọọmentị etiti ewepụtala usoro ọhụrụ a ga-eji mepee ụlọakwụkwọ

    Ụmụakwụkwọ

    Ebe foto si, Getty Images

    Gọọmentị etiti ewepụtala usoro ọhụrụ ụlọakwụkwọ ga-eji mepee n'ogogo niile na Naịjirịa mana ha ekwughi ụbọchị ọ ga-abụ.

    Nke a dị n'ozi mịnịsta steetị nke agụmaakwụkwọ bụ Chukwuemeka Nwajiuba.

    Usoro a gosiri ntuziaka na ihe niile a chọrọ iji mee ka nchekwa dị maka mmepegharị ụlọakwụkwọ.

    Otu n'ime ihe ndị dị n'ime usoro nke mịnịstrị agụmaakụkwọ wepụtara n'ụbọchị Mọnde bụ na a ga-enwere ụmụakwụkwọ aka mee ka ha jiri mita abụọ nọpụ iche.

    Ha sị na ọ bụrụ ebe agaghị ejinwu mita abụọ nọpụ iche, na a ga-agbaso usoro ọzọ iji hụ na nchekwa dị. Nke a gụnyere n'ụmụakwụkwọ nọ na mmalite ọta akara, praịmarị na ndị a na-enye nlekọta pụrụiche.

    Gọọmentị sị ha ga-enyocha akụrụngwa ndị e ji amụ ihe n'ụlọakwụkwọ gụnyere ime klaasị, oche,igwe kọmputa na mmiri e ji akwọ aka.

    Gọọmentị sị na oge eruola mgbe a ga-eji hazie ma wepụta atụmatụ mmepegharị ụlọakwụkwọ na ebe ọmụmụ ihe.

  8. Mba Rọshịa sị na ọgwụ coronavirus ha nwalere n'ahụ mmadụ mere ọfụma

    Ọgwụ coronavirus

    Ebe foto si, Getty Images

    Akụkọ na-ewu ugbua bụ na mba Rọshịa sị na anwelechala ọgwụ coronavirus n'ahụ mmadụ ma chọpụta na ọ na-eme ọfụma.

    Dịka ụlọọrụ ntaakụkọ Forbes si depụta na websaịt ha na Rọshịa abụrụla ndị mbụ nwalechara ọgwụ coronavirus n'ahụ mmadụ.

    Elena Smolyarchuk, bụ onyeisi nyocha n'ụlọọgwụ nyocha dị na mahadum Sechenov dị na Rọshịa gwara ndị ntaakụkọ TSS newswire nke a n'ụbọchị Sọnde.

    Smolyarchuk sị na ha anwalechaala ọgwụ a n'ahụ mmadụ na ndị ahụ e nyere ya agbakeela na ha ga-ahapụ ụlọọgwụ n'oge na-adịghị anya.

    "A nwalechala ọgwụ a ma gosi na ọ dị mma mmadụ ịṅụ. Ndị wepụtara onwe ha ga-ahapụ ụlọọgwụ n'ụbọchị iri na isee na iri abụọ ọnwa Julaị," a sị na Smolyarchuks kwuru.

    Mana o nweghi ozi ọbụla o nyere banyere mgbe a ga-ewepụta ọgwụ a n'ahịa.

    Rọshịa malitere ime nyocha ọgwụ abụọ, otu bụ n'ụlọọgwụ ndịagha ọzọ a bụrụ na mahadum Sechenov.

    Mmadụ iri abụọ wepụtara onwe ha ka e were ha mee nyocha ọgwụ a.

    Mgbe e nyechara ha ọgwụ a, e dopuru ha iche ruo ụbọchị iri abụọ na asatọ.

    Mpụtara gosiri na ọtụtụ n'ime ndị e nyere ọgwụ a na-egosi mgbochi nye ọrịa coronavirus.

    Mana amabeghi ihe ọgwụ a bụ maọbụ ihe ndị dị n'ime ya.

  9. Ebe ọchọma na Ịngland agbapeela taa dịka ewepuru iwu coronavirus ji ha

    ndị na-achọ mma

    Ebe foto si, Getty Images

    Ndị na-arụ ọrụ ọchọma n'Ịngland gbapere ụlọọrụ ha iji nabata ndi chọrọ ịkpụ isi, ike isi maọbụ chọọ mma dị iche iche.

    Nke a bụ mbụ ha na-emepe kemgbe eji maka coronavirus mechie ụlọ ọrụ dị iche iche.

    Ka ụfọdụ na-enwe aṅụrị, onwere ndị na-ekwu na usoro enyere ha iji mepee ka mere ka ọtụtụ mmadụ ghara ị na-abata ulọọrụ ha.

    Usoro mmepe a gụnyere ịgbanarụ ịnọ n'ihu mmadụ na-arụ ọrụ.

  10. Coronavirus nwereike ibute nsogbu obi

    Nyocha ọhụrụ ndị Mahadum Edinburgh mere mmadụ puku iri na abụọ e si na mba iri isii na itolu họpụta na-egosi na ihe karịrị 50% ndịa nwetara nsogbu obi ebe 15% n'ime ha butere ọrịa obi dị njọ.

    Onyeisi nyocha a bụ Marc Dweck kwuru sị "na-agbanyeghị nsogbu obi a coronavirus na-ebute, anyị nwere akụrụngwa iji nyere ndị ometụtara etu a aka".

    Dweck kwukwara na ọ dị mkpa ma achọpụta ndị coronavirus metụtara obi ha n'ihi na ọ ga-enye ohere ka enyere ha aka n'ọgwụgwọ.

    Onye nọ ụloọgwụ

    Ebe foto si, Reuters

  11. Ndị akajiakụ karịrị 80 edela akwụkwọ ga-ebulite ụtụisi ndị ji ego n'ụwa niile maka coronavirus

    Ihe karịrị mmadụ iri asatọ edepụtala akwụkwọ ka mba niile bulie ego ndị nwere ego na-akwụ n'ụtụisi iji nyereaka maka ọrịa coronavirus.

    Ha dere sị "ụjọ enweghị ọrụ maọbụ enweghị ihe oriri anaghị atụ anyị, anyị esọghị kwa na ndị na-alụsọ ọrịa coronavirus ọgụ na ngalaba dị iche iche nke mere na ọ ga-esi ike ka ọrịa a rute anyị, Biko, bulie ụtụisi anyị maka na ọ bụ ihe kwesịrị ekwesị".

    Mmadụ iri asato na ato etinyela aka na ya bụ ọkwa nke gụnyere ezinụlọ Disney, Stephen Tindall na Jerry Greenfield.

  12. Ndị dọkịta Legọs steeti ebidola abụbọ ọrụ taa

    Skip X post
    Hapụ X ihe dị na ya?

    Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

    Warning: BBC amaghị maka ihe ndị si n'ọbaozi ndị ọzọ.

    End of X post

    Ndị dọkịta legọs steeti nke nọ n'okpuru otu Medical Guild ebidola abubọ ọrụ ụbọchị atọ iji dọọ gọọmentị Legọs steeti aka na ndị maka ụgwọ e ji ha na nlekọta ndị dọkịta na-alụsọ coronavirus ọgụ.

    Ọ bụ n'ụbọchị Sụnde ka onyeisi ngalaba Medical Guild bụ Oluwajimi Sodipo gwara ndị nta akụkọ nke a na Legọs steeti.

    Sodipo kọwara na abụba ọrụ a bụ maka ihe gbasara ụgwọ eji ha na nlekọta ndị dọkịta na-alụsọ coronavirus ọgụ.

    Ọ gụpụtara iwe ha nke gụnyere ụgwọ nchekwa e ji ha, ihe dị iche na ego a na-akwụ ndị dọkịta nke gọọmentị isiobodo na nke steeti, ụgwọ "Inducement" gọọmentị si ka akwụọ ha kama gọọmentị legọs steeti anaghị akwụ ya, ma sịkwa na-eji ndị dọkịta na-arụ ọrụ n'ogige ndopu maka ọrịa coronavirus ụgwọ ọnwa abụọ.

  13. Coronavirus egbuola ndị omeiwu abụọ na mba Madagascar

    Onyeisiala mba Madagascar bụ Andry Rajoelina ekwuola n'ụbọchị sụnde na ndị omeiwu ha abụọ anwụọla site n'aka coronavirus.

    Rajoelina ekwuola na ndị osote iri na otu ebe ndị omeiwu iri na anọ ebutela ọrịa coronavirus.

    Ngalaba WHO ekwuola na mmadụ puku anọ na narị ise na iri asaa na asatọ bụ ya bụ ọrịa na mba ahụ ebemmadụ iri atọ na anọ anwụọla.

  14. Saụt Afrịka amachiela orire nmanya na-aba n'anya

    Mba Saụt Afrịka ewepụtala atụmatụ ọzọ nke ga-egbochi orire nmanya na-aba n'anya iji luso ọrịa coronavirus ọgụ.

    Onyeisiala mba ahụ bụ Cyril Ramaphosa onye tinyere ya bụ iwu kwuru na ya bụ mmachị bụ iji nyere ngalaba ahụike ha aka.

    Nke bụ ugboro abụọ a na amachị ya bụ nmanya dịka ihe karịrị mmadụ narị puku abụọ na ụma buterela ya bụ ọrịa na mba ahụ.

    Dịka ọ dị ugbu a, ihe karịrị mmadụ iri anọ anwụọla ebe gọọmentị na-atụ anya na o nwereike iru mmadụ puku iri ise mgbe afọ a gwụrụ.

    Cyril Ramaphosa bụ onyeisiala mba Saụt Afrịka

    Ebe foto si, Reuters

  15. Mmadụ 108 ọzọ ebutela ọrịa coronavirus n'Ebonyi steeti

    Ngalaba NCDC ekwuola na mmadụ narị ise, na iri asaa na otu ebutela ọrịa coronavirus na Naịjirịa.

    Ọnụ ọgụgụ ha gosiri na mmadụ otu narị na asatọ ọzọ ebutela ya bụ ọrịa n'Ebonyi steeti.

    Dịka ọ dị ugbu a, mmadụ iri na isii ọzọ anwụọla ebe mmadụ narị atọ na iri anọ na anọ esila na ya bụ ọrịa gbakee.

    Skip X post
    Hapụ X ihe dị na ya?

    Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

    Warning: BBC amaghị maka ihe ndị si n'ọbaozi ndị ọzọ.

    End of X post

  16. Ndị Igbo ji eme ọnụ...Ụnụ asaala chi

    Aka ajaaja na-ebute ọnụ mmanụ mmanụ

    Onye jị akwụ nkwụ
  17. Ka chi bọọrọ unu!

    Ọ gwụla ka ọ ha anyị taa mana gbanụ mbọ pụtakwa echi ka anyị bidokwa ebe anyị kwụsịrị!

    Udo!

  18. Onye ejije a ma ama na mba India bụ Amitabh Bachchan ebutela coronavirus

    Amitabh Bachchan

    Ebe foto si, Reuters

    Nkọwa foto, Amitabh Bachchan

    Amitabh Bachchan, onye ejije mba India a ma ama, ebutela ọrịa coronavirus.

    Bachchan wuru na ọ bụ ya na nwa ya nwoke butere ọrịa a.

    Ọ rịọkwara ka ndị niile ya na ha mekọtara ahụ n'ọdị nso a ga mee nnyocha.

    Coronavirus na-akpa nnukwu ike na mba India dịka o si eme n'akụkụ ụwa niile.

    Ihe karịrị mmadụ 821,000 bu ya bụ ọrịa na mba ahụ ugbua.

    India bụ mba nke atọ Coronavirus kacha enye nsogbu ma a gụchaa Amerịka na Brazil.

  19. Trump ekpuola 'facemask' n'ọha

    Donald Trump

    Ebe foto si, Reuters

    Ọ gbagwojuru ọtụtụ ndị mmadụ na mba Amerịka anya oge ha hụrụ onyeisiala ha bụ Donald Trump ka o yi mkpuchi imi a kpọrọ 'facemask'.

    Nke a bụ nke mbụ Trump na-eyi mkpuchi imi n'ọha.

    Trump gara n'ụlọọgwụ ndịagha 'Walter Reed' ileta ndịagha na ndịọrụ ahụike merụrụ ahụ n'ihu ọgụ.

    Oge ndị ntaakụkọ gbara ya ajụjụ ọnụ, o kwuru sị, "Onweghi mgbe m ji katọọ mmadụ iyi mkpuchi imi mana ọbụghị oge niile na ebe niile ka a ga na-eyi ya.

    Ọtụtụ ndị mmadụ na-akatọ Trump ma na-ebo ya ebubo na ọ gbasighi mbọ ike ịbelata mfesa ọrịa coronavirus oge ya bụ ọrịa na-amalite ọhụrụ n'Amerịka.

  20. Ụnụ abọọla chi

    Igbo ndị ọma anyị ekelee ụnụ.

    Nke onye chiri ya zere. Ka anyanwụ ụtụtụ taa wetara onye ọbụla ihe ọma.