Ndịagha Naịjirịa ruru 26 ebutela ọrịa coronavirus

Ndịagha Naịjirịa ekwupụtala na mmadụ iri abụọ na isii ebutela nje covid-19 n’ime mmadụ narị anọ na iri na asaa ha mere nnyocha.

Mkpuchi Na Eme Ozugbo

  1. Ọnụọgụgụ ndị buterela coronavirus na Naịjirịa eruola 50,000

  2. WHO agwala ndị ọchịchị Afrịka ka ha mepee ụlọakwụkwọ

    Ụmụ akwụkwọ
    Nkọwa foto, O ruola ọnwa ise ụmụakwụkwọ agabeghị akwụkwọ na Naịjirịa

    Otu WHO arịọla ndị ọchịchị mba Afrịka ka ha malite imepe ụlọakwụkwọ ka ụmụakwụkwọ malitekwa ọmụmụ ihe ọzọ, kama ha kpachapụ anya tinye ihe ndị ga-egbochi mfesa ọrịa coronavirus n'ụlọakwụkwọ ndị a.

    Ha kwuru na mmechi ụlọakwụkwọ ogologo oge maka egwu ọrịa coronavirus anaghị enyere ụmụakwụkwọ aka.

    Cheta na o ruola ihe ruru ọnwa ise ụmụakwụkwọ kjwụsịrị ịga akwụkwọ na Naịjirịa n'ihi egwu ka ọrịa coronavirus ghara ifesa.

    N'ọnwa gara aga, ụmụakwụkwọ rurula ile ule sekọndịrị nke nta na nke ukwu malitere ịga akwụkwọ iji kwadoo maka ule ndị a.

    Ule Waec maka ndị sekọndịrị ukwu malitere abalị abụọ gara aga, mana ụlọakwụkwọ ọta akara, praịmarị na mahadum ka kpọchiri akpọchi.

  3. Mmadụ 593 ọhụrụ ebutela coronavirus na Naịjirịa

    Ngalaba na-ahụ maka mgbochi na mfesa ọrịa na Naịjirịa bụ Nigeria Centre for Disease Control (NCDC) ekwuola na mmadụ 593 ọhụrụ esorola na ndị butere coronavirus na mba ahụ.

    N'ọnụ ọgụgụ NCDC gụpụtara n'ụbọchị Wenesde ha sị na platu steetị nwere mmadụ 186 buetre ọrịa ahụ ọhụrụ, ebe Legọs ji mmadụ 172 na-eso ha n'azụ.

    Kemgbe nje ọrịa batara Naịjirịa mmadụ 50,488 ebutere ya.

    Mmadụ 985 anwụọla site ọrịa a ebe mmadụ 37,304 agbakeela ma laa be ha.

    Skip X post
    Hapụ X ihe dị na ya?

    Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

    Warning: BBC amaghị maka ihe ndị si n'ọbaozi ndị ọzọ.

    End of X post

  4. Ị saala chi?

    Ka ụbọchị taa maara gị mma.

    Iseee!

    Nọnyere anyị taa aka anyị wetara gị akụkọ ga-amasị gị banyere mkpamkpa ọrịa coronavirus na-akpa n'ụwa.

  5. Ụmụakwụkwọ na-ele Waec asaa bu nje coronavirus na Gombe

    Komishona na-ahụ maka agụmakwụkwọ na Gombe steeti bụ Habu Dahiru, agbaala ama na mmadụ asaa si otu ụlọakwụkwọ sekọndrị na steeti ahụ bụ ndị a hụrụ nje coronavirus na ahụ ha.

    Ụmụakwụkwọ ndị a bụ ndị na-aga akwụkwọ na 'Government Science Secondary School Gombe' so na ndị na-ele ule Waec na-aga n'ihu ugbua.

    Dahiru gbara ama na kemgbe a gbapere ụlọakwụkwọ na steeti ahụ na ha emeela nnyocha mmadụ 1,100, ebe e si chọpụta asaa ndịa n'ụlọakwụkwọ ahụ.

    Cheta na nsonso, foto nwata akwụkwọ nọ na 'ụlọ nnọpụ maka coronavirus ede ule waec nke ya fegharị na soshal midia nke mere ya nwa akwụkwọ asatọ a chọpụtara bu ọrịa coronavirus.

    Skip X post
    Hapụ X ihe dị na ya?

    Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

    Warning: BBC amaghị maka ihe ndị si n'ọbaozi ndị ọzọ.

    End of X post

  6. Gee akụkọ ga-amasị gị n'otu nkeji

    Akụkọ ga-amsị gi ịkọ mgbe ọbụla n'otu nkeji

  7. Mmadụ 410 ọhụrụ ebutela coronavirus na Naịjirịa

    Ngalaba na-ahụ maka mgbochi ọrịa bụ Nigeria Centre for Disease Control (NCDC) edepụtala na mmadụ narị anọ na iri (410) ọzọ ebutela ọrịa coronavirus na Naijirịa.

    Ọnụọgụgụ ha gosiri na mmadụ iri si Enugwu ebe atọ n'ime ha si Ebonyi steeti.

    Anambara ketara anọ ebe Abịa ketara abụọ.

    Legọs nwetara mmadụ 210.

    Skip X post
    Hapụ X ihe dị na ya?

    Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

    Warning: BBC amaghị maka ihe ndị si n'ọbaozi ndị ọzọ.

    End of X post

  8. Ị bọọla chi?

    Ndeewo ụmụ Igbo.

    Unu abọọla chi?

    Bịa nọnyere anyị maka akụkọ ndị ga-amasị gị ịkọ taa niile.

  9. Zeerenụ ndị ji aha anyị egwu ndị mmadụ wayo - NCDC

    Chikwe Ihekweazu

    Ebe foto si, NCDC

    Nkọwa foto, Onyeisi ụlọọrụ NCDC, Chikwe Ihekweazu

    Ngalaba na-ahụ maka mgbochi ọrịa na Naịjirịa bụ 'National Centre for Disease Control' adọọla ọha obodo aka na ntị ka ha kpachapụ anya gbasara ndị ekperima ji aha ụlọọrụ ahụ anapụ ndị mmadụ ego.

    Elsie Ilori, onye bụ otu n'ime ndị isi ụlọọrụ ahụ, kwuru nke a oge ọ na-aza ndị ntaakụkọ ajụjụ.

    O kwuru na NCDC agaghị akwụ onye ọbụla ụgwọ maọbụ si onye ọbụla weta ego iji nye ya ọrụ.

    Ọ gara n'ihu kwuo na ụlọọrụ ahụ enwetala mkpesa gbasara ndị mmadụ a napụrụ ego n'aha NCDC.

    Ilori kwuru na ha ga-elebe mkpesa ndị ahụ anya ma taa ndị kpara ya bụ arụ ahụhụ.

  10. Ndi uweojii nwụchiri mmadụ 153 maka ekpughị 'face mask'

    Ali Mohamed, Osote Kọmishona ndị uweojii Legos

    Ndị uweojii Legos kwuru na ha nwụchiri mmadụ otu narị na iri ise na atọ(153) maka ekpughị mkpuchi ihu(facemask) nakwa anọpụghị iche n'ebe ibe ha nọ nke Bekee kpọrọ 'social distancing.'

    Kọmishọna ndị uweojii na Legọs, bụ Hakeem Odumosu, gbara ama a ụbọchị Tuzde oge ọ na-agwa ndị ntaakụkọ okwu n'isiụlọọrụ ha dị n'Ikeja.

    O kwuru na mmadụ iri itoolu na asatọ (98) bụ ndị ha jidere maka eyighị mkpuchi ihu, ebe mmadụ iri ise na ise (55) bụ ndị e jidere maka ịnọkọ ọnụ.

    O kwuru na ndị a so na mmadụ 769 ha nwụchirila n'otu ọnwa maka ịda iwu metụtara coronavirus na Legọs steeti.

    N'ime ndị a, 515 bụ ndị anwụchiri maka ịgagharị oge a machiri ngagharị abalị, ebe 101 bụ ndị e jichiri maka njem si steeti gaa steeti ọzọ.

  11. NCDC chọtara Covid-19 n'ahụ mmadụ 417 ọhụrụ

    Ngalaba na-ahụ maka mgbochi ọrịa na Naịjiria bụ Nigeria Centre for Disease Control (NCDC) chọtakwuru mmadụ 417 ọhụrụ bu ọrịa coronavirus ụnyaahụ.

    N'ime ha, Legọs nwetara mmadụ narị abụọ na asaa (207), Abịa nwetara iri abụọ na asatọ (28), Anambra iri abụọ na otu (21), Ebonyi itoolu, Delta asaa, ebe Enugwu chịtara isii.

    Skip X post
    Hapụ X ihe dị na ya?

    Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

    Warning: BBC amaghị maka ihe ndị si n'ọbaozi ndị ọzọ.

    End of X post

  12. Ị bọọla chi!

    Ị rahụkwara nke ọma?

    Ụbọchị taa ga-ewetara gị naanị oziọma.

    Iseee!

  13. Ụmụ Naịjirịa 376 tọrọ na Saudi Arebia alaghachitela

    Ngalaba na-elekọta ọdịmma ndị Naịjirịa na mba ofesi ekwuola na ụmụ Naịjirịa ruru 288 atụọla ụkwụ na Naịjirịa dịka ha tọburu na mba Saudi Arebịa.

    N'otu aka ahụ, ndị mmadụ ọzọ tọrọ na Turkey alaghachitela ugbua na Naịjirịa site n'ụgbọelu Turkish Airlines.

    Ụgbọelụ ahụ bu ihe echere ruru mmadụ 288 si n'isiobodo mba Turkey bụ Istanbul febata Abuja n'ụbọchị Monde.

    Skip X post
    Hapụ X ihe dị na ya?

    Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

    Warning: BBC amaghị maka ihe ndị si n'ọbaozi ndị ọzọ.

    End of X post

  14. Njem ụgbọelu ofesi ga-amalite na Naịjirịa n'ụbọchị 29 n'ọnwa Ọgọst

    Minista na-ahụ maka njem ụgbọelụ bụ Hadi Sirika ekwuola na njem ụgbọelu ofesi ga-amalite na Naịjirịa n'ụbọchị 29 nk eọnwa Ọgọst.

    O kwukwara na ọ bụ ọdọụgbọelu Legọs na Abuja ka njem a ga-ebu ụzọ malite.

    O kwukwara na ọ ga-ewepụta usoro nakwa iwu ndị pụrụiche ga-ekpuchi njem a n'oge adịghị anya.

    Skip X post
    Hapụ X ihe dị na ya?

    Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

    Warning: BBC amaghị maka ihe ndị si n'ọbaozi ndị ọzọ.

    End of X post

  15. Mba Gana ga-amalitela njem ofesi na Sepụtemba

    Ọdọụgbọelu Kotoka dị na Gana

    Ebe foto si, AFP

    Onyeisiala mba Gana ewkuola na mba ya ga-amalite njem ofesi n'ụbọchị mbụ nke ọnwa Sepụtemba.

    Okwu a na-abịa dịka mba ahụ hụrụ ndatụ n'ọnụọgụgụ ndị ọhụrụ butere ọrịa coronavirus na mba ahụ.

    O kwukwara na ndị niile si ofesi bata n'ọdọụgbọelu ahụ ga-emeriri nyocha ọrịa covid-19.

    Akufo-Addo kwuru na ike ha nwere ịnyocha mmadụ ruru puku iri abụọ na anọ na narị ise kwa izuụka bụ ihe ga-ekwu kpam kpam ma ga-ebido njem ofesi n'ezie.

  16. Mba Rwanda agbachiela ahịa ndị dị n'isiobodo ya

    Mba Rwanda agbachiela ahịa ukwu abụọ dị n'isiobodo ya bụ Kigali n'ihi mgbali elu n'ọnụogụgụ ndị nwere ọrịa coronavirus.

    Ahịa abụọ a bụ Nyarugenge nakwa Kwa mutanga ga-agbachi n'ụbọchị asaa bido n'ụbọchị Monde.

    Nke a na-abịa dịka achọtara mmadụ narị abụọ na iri ise na atọ n'ime ụbọchị atọ bụ ọrịa ahụ.

    Cheta na Rwanda bụ naanị mba dị n'etiti Afrịka nwere ikike ịbanye na mpaghara akpọro "Schengen Zone" na Yurop.

  17. NCDC enwezuola ụlọ nyocha 64 na Naịjirịa

    Ngalaa NCDC enwezuola ụlọ nyocha 64 n'ala Naịjirịa dịka ha tinyere Federal Medical Centre dị na Gusau na ndị ga-eso bido ịme nyocha coronavirus.

    Nke a ga-enyeaka wulite nyocha ọrịa covid-19 na Naịjirịa.

    Steeti ebe ndị enwebeghi ụlọ nyocha na Naịjirịa gụnyere Kebbi, Nigeri, Taraba nakwa Bayelsa.

    Skip X post
    Hapụ X ihe dị na ya?

    Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

    Warning: BBC amaghị maka ihe ndị si n'ọbaozi ndị ọzọ.

    End of X post

  18. Waec nke afọ 2020 amalitela ugbua, lee etu o si aga

  19. Waec nke afọ a adịghị iche na nke ndị ọzọ - Nwajiuba

  20. A dọtikwuola oge ndị ahịa ga-eji na-emepe na Legọs

    Gọọmentị Legọs steeti adọtịkwuola awa ole ndị ahịa, ma ndị na-ere ihe nri ma ndị anaghị ere ihe nri, ga na-emepe n’ụbọchị e kenyere ha imepe.

    Ha kwuru na ahịa ga na-emepezi site n’elekere asatọ nke ụtụtụ ruo elekere isii nke mgbede karịa elekere itoolu ruo nke atọ nke ehihie ọ bụbu.

    Skip X post, 1
    Hapụ X ihe dị na ya?

    Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

    Warning: BBC amaghị maka ihe ndị si n'ọbaozi ndị ọzọ.

    End of X post, 1

    Skip X post, 2

    End of X post, 2