Gọomentị etiti ewepụtala ụbọchị nke anọ ọnwa Ọgọst dịka ụbọchị ndị na-akwado ụwe ọpụpụ ga-amalite akwụkwọ.
Nke a bụ nkwekọrịta ndị Mịnịstrị na kọmishọna agụmakwụkwọ na Naịjirịa taa bụ Mọnde.
Ha kwekọrịtara na ndị na-akwodo ụle Waec ga-amalite ule ahụ ụbọchị iri na asaa nke ọnwa Ọgụst.
Ndị so na nkwekọrịta a bụ ndị Ministri agụmakwụkwọ nke gọọmentị etiti, ndị Kọmishọna agụmakwụkwọ si steeti iri atọ na isii (36) dị na Naijirịa, ndị otu Naịjirịa Union of Teachers, ndị isi ọrụ uleakwụkwọ nakwa ndị isi ụlọakwụkwọ abụghị nke gọọmenti.
Ndị ụmụakwụkwọ na-apụ apụ nwere izuụka abụọ iji kwado ule Waec na Neco tupu o ruo n'ụbọchị iri na asaa nke ọnwa Ọgọst (17-8-2020).
Ha kwekọrịtara na ha ga-arịọ gọọmenti ka enyere ha aka ịme ka ya bụ oge a kara aka nwee isi.
Ha ga-ezukọkwa echị, ha na ndị ụlọọrụ na-ekpokoba ụleakwụkwọ dịka Neco, Nabteb, na Nbais ịlebe anya ka ha ga-esi kpokoba ụle ha ka ha nwee ike ịme ya otu mgbe.