Adaeze Lenore bụ onye ga-erite oche eze mba Spen ma nne na nna ya anọghịzị, abanyela na nnọsapụ dịka otu nwata akwụkwọ ibe ya butere ọrịa coronavirus, dịka ezinaụlọ ya si kwuo.
A ga-enyocha nwatakịrị ahụ dị afọ 14 bụ nwa Eze Felipe na-achị Spen, dịka e nyochara ụmụakwụkwọ ibe ya, n'ụlọakwụkwọ ha bụ Santa María de los Rosales dị n'obodo Madrid.
Ezinaụlọ eze kwuru na Eze Felipe na Ezenwaanyị Letizia ga na-arụ ọrụ ha, n'agbanyeghi na Spen na-agba mbọ ibuso coronavirus agha.
Mara na ihe ruru ụmụakwụkwọ nde asatọ laghachịrị akwụkwọ na mba ahụ n'izu gara aga, mana ụfọdụ ụlọakwụkwọ emechiela ọzọ dịka a chọtara ọrịa coronavirus n'ahụ ụfọdụ ụmụakwụkwọ.
A chọtara coronavirus n'ahụ mmadụ 4,708 ọhụrụ n'ụbọchị Fraịde, nke butere ngụkọta mmadụ ole buterela ọrịa a na mba ahụ ruo 566,326, nke bụ ọnụọgụgụ kacha na mpaghara Yurop.
N'otu aka ahụ, ọ taala isi mmadụ 29,747 na mba ahụ.