You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.

Take me to the main website

Ndịagha Naịjirịa ruru 26 ebutela ọrịa coronavirus

Ndịagha Naịjirịa ekwupụtala na mmadụ iri abụọ na isii ebutela nje covid-19 n’ime mmadụ narị anọ na iri na asaa ha mere nnyocha.

Mkpuchi Na Eme Ozugbo

  1. Daalụ maka ịnọnyere anyị taa

    Echi ga-efotere anyị ihe ọma.

    Ka chi bọọ.

  2. Gere akụkọ gbasara coronavirus dịka ọ dị n’Afrịka taa n'otu nkeji

  3. 'Anyị anaghị etinyekọta ndị ọhụrụ na ndị ochie na nga'

    Ndị ọrụ na-ahụ maka ụlọmkpọrọ na mba Uganda ekwuola na ha anaghị ekwe ka ndị ka batara mkpọrọ na ndị nọterela aka nwee mmekọ n’ihi coronavirus.

    Nke a pụtara dịka otu onye ndọrọndọrọ ọchịchị a nwụchiri maka ịda iwu Covid-19, kwuru na a kpụgara ya ihe ruru nga iri n’ime otu abalị, ebe ọ hụrụ ka a na-ata ndị nọ na nga ahụhụ.

  4. Covid-19 emeela ka akụnaụba mba Saụt Afrịka jiri %51 daa

    Akụnaụba obodo mba Saụt Afrịka ejirila pasentị iri ise na otu dakpọọ kemgbe a banyere agba nke abụọ nke afọ 2020.

    Nke a si n’etu ha si gbachie obodo n’ike ijibuso ọrịa coronavirus agha, nke metụtara ọtụtụ azụmahịa.

  5. India ga-emepe ụlọ nlereanya n'agbanyeghị na ọrịa Covid-19 na-agbali

    Gọọmentị mba India ekwuola na ha ga-emepe ebe nlereanya a na-akpọ Taj Mahal ka ndị ọbịa batawa ọzọ, n’agbanyeghị na ọnụọgụgụ ndị bu coronavirus na-agbali elu na mba ahụ.

    Ha kwuru na ya bụ ebe nlere anya ga-emepe n'abalị iri abụọ na otu nke ọnwa Sepụtemba a.

    N'ụbọchị Mọnde ka India gafere mba Brazil iji bụrụ mba nke abụọ ebe ọrịa coronavirus kacha emetụta ndị mmadụ.

    Mana ndị ọchịchị kọwara na ọ bụ naanị mmadụ puku ise ka a ga na-anabata ebe ahụ kwa ụbọchị, ọ bụghị puku iri abụọ etu ọ dịbu n’oge mbụ.

    Ihe karịrị mmadụ nde anọ na puku narị abụọ buterela nje a n'India, ebe ihe karịrị puku mmadụ iri asaa na abụọ alaala mmụọ n'ihi ya.

  6. A ga-enwerịrị asọmpi Olympics n'afọ 2021 - Gọọmentị Japan

    Gọọmentị mba Japan ekwuola na asọmpi Olympics ga-agarịrị n'ihu n'afọ 2021 ọbụrụgodi na coronavirus akwụsịghị.

    Mịnịsta mba ahụ na-ahụ maka egwuregwu Olympics bụ Seiko Hashimoto kwuru nke oge ọ gwara ndị ntaakụkọ okwu n'ụbọchị Tuzde.

    O kwuru sị: "Onye ọbụla na-agba mbọ ịhụ na asọmpi a gara n'ihu. Ma ndị nhazi ya bụ asọmpi nakwa ndị ga-esonye na ya."

    "Uche m bụ na anyị ga-emerịrị ya, ihe ọ sọrọ ya bụrụ."

    N'ụbọchị Mọnde, osote onyeisi otu 'International Olympic Committee' bụ John Coates, kwukwara na ya bụ asọmpi ga-aga n'ihu "ma Covid ọ dị ma ọ dịghị."

    Cheta na asọmpi Olympics gaara abụ n'afọ 2020 a, mana akagburu ya n'ihi ọrịa coronavirus ma yigharịa ya ka ọ bụrụ n'afọ 2021.

    Nke a bụ nke mbụ a na-akagbu asọmpi Olympics kamgbe a malitere ya n'afọ 1896, mana o nwere oge a kagburu ya n'afọ 1916, 1940 na 1944 n'ihi agha mba ụwa nke mbụ na nke abụọ.

  7. Mmadụ 155 butere coronavirus na Naịjirịa ụbọchị Mọnde

    Ngụpụta nke ngalaba 'National Centre for Disease Control' gosiri na ọ bụ mmadụ otu narị na iri ise na ise ka a hụrụ nje coronavirus n’ahụ ha na Naịjirịa n’ụbọchị Mọnde.

    Nke a wetara ọnụọgụgụ ndị niile buterela ọrịa ka ọ bụrụ puku iri ise na ise, otu narị na iri isii.

    N'ime ndị a, mmadụ puku iri anọ na atọ, narị abụọ na iri atọ na otu agbakeela, ebe otu puku mmadụ na iri isii na otu nwụrụ n'ihi ya.

    Lee ka ọnụọgụgụ nke ụbọchị Mọnde si dị:

  8. Ụtụtụ ọma

    Ụtụtụ ọma ụmụ Igbo.

    Ka taa bụ ụbọchị Eke ketara gị ihe ọma.

  9. Ka ọ dị echi

    Ị mere ọfụma wee nọnyere anyị.

    Nọnyere anyị echi dịka anyị na-ewetara gị akụkọ ndị ị kwesịrị ịma.

    Ndeewo.

  10. Gere akụkọ gbasara coronavirus dịka ọ dị n’Afrịka taa n'otu nkeji

  11. Ọnụọgụgụ coronavirus na Naịjirịa na-agbadata

    Dịka ọrịa coronavirua na-agbali elu na mba India, ọ na-agbadata agbadata na Naịjirịa.

    Naanị mmadụ otu narị ka a hụrụ nje a n'ahụ ha n'ụbọchị Sọnde, dịka ngalaba 'National Centre for Disease Control' si depụta.

    Naanị Ebonyi bụ steeti dị na mpaghara ọwụwa anyanwụ ebe a hụrụ ndị (mmadụ asaa) butere nje a.

    Lee ka o si kwụrụ ebe a:

  12. India agafeela Brazil n'ọnụọgụgụ ndị butere coronavirus

    Mmadụ karịrị puku iri itoolu (90,000) butere nje coronavirus na mba India n'ime otu ụbọchị gara aga.

    Nke a pụtara na Indịa bụzị mba nke abụọ kacha nwee ọnụọgụgụ ndị bu ọrịa a, dịka ọnụọgụgụ ha gafere nke mba Brazil.

    Mmadụ karịrị nde anọ na ụma puku narị abụọ (4,204,613 million) bu ọrịọ́ coronavirus na India ugbua.

    Ya bụ ọrịa egbukwaala ihe karịrị mmadụ puku iri asaa na otu (71,642).

    Ndị nwere coronavirus na Brazi dị nde anọ na ụma otu puku narị (4.14 million).

    Ọnụọgụgụ ndị nwere coronavirus n'India malitere ịgbali elu n'ike n'ike dịka gọọmentị mepere obodo ka ndị mmadụ malitekwa mkpagharị.

    Mmechi obodo iji gbochie mfesa ọrịa coronavirus mere ka akụnụba mba ahụ tipịaa nke na ha ga-abanye ọnọdụ ọtaniisi (recession) n'oge adịghị anya, dịka ndị ọkachamara si kwuo.

    Mba Amerịka bụ ndị kacha nwee ọnụọgụgụ ndị na-arịa ọrịa corona virus, mana ya bụ ọrịa alaala kpamkpam n'obodo Wuhan nke dị na mba Chaịna, ebe o si malite.

    Lee ka ọnọdụ dị na mba Wuhan ugbua:

  13. Ụnụ eteela

    Igbo ndị ọma, ụnụ abọọla chi?

    Ndewo maka isonyere anyị n'ụtụtụ taa bụ ahịa Nkwọ.

    Ihe ọma meere onye ukwu mekwaara onye nta.

  14. "Anyị mefuru N30.5b n'ego onyinye ndị mmadụ nyere maka coronavirus n'ime ọnwa anọ"

    Gọọmentị etiti ekwuola na ha mefuru ego dị ijeri naịra iri atọ na ụma ise (N30,540,563,571.09) so n'ego onyinye ndị mmadụ nyere maka coronavirus n'ime ọnwa anọ (site n'Eprelụ ruo Julaị).

    Nke a dị n'akwụkwọ ozi onye ngụkọ ego gọọmentị etiti bụ Ahmed Idris zigaara ụlọọrụ na-ahụ maka mkwụmọtọ a kpọrọ SERAP na CODE na nzaghachị ozi sị ka ha kwupụta usoro ha ji mefuo ego dị ijeri naịra 36.3 ndị mmadụ nyere gọọmentị maka ibuagha megide coronavirus.

    Nke a pụtara na ihe fọrọ n'ego ahụ ugbua bụzi ijeri naịra ise na ụma itoolu (N5.9bn)

    Ndị ketere ego n'ime N30.5bn a gọọmentị sị ha mefuru

    Dịka ngalaba SERAP na CODE si kwuo n'akara twitter, ha sị na ngalaba gụnyere ndị uweojii, ndịagha, steetị dị iche iche na ndị ọzọ ketere oke n'ego ahụ n'usoro ndị a;

    Otu ọtawaike onyeisiala hiwere maka coronavirus ketere ijeri naịra iri abụọ na abụọ (N22bn).

    Steetị iri atọ na isii (36) nke Naịjirịa ketere ijeri naịra asaa (N7bn).

    Ndịagha ụgbọelu bụ 'Nigerian Airforce' ketere nde narị naịra asatọ na iri asaa na asaa (N877m).

    Ebe ndị uweojii ketere ndị narị naịra ise (N500m).

    SERAP gwara gọọmentị na obi dị ha mma maka izite ozi a kama na ha akọwachaghị kpọmkwem etu ha si mefuo ego ndị a nakwa etu ha ga-esi mefuo ndị nke fọrọ afọ.

    Ha gara n'ihu nye gọọmentị ụbọchị asaa iji kwupụta ozi ndị fọrọ afọ nakwa usoro ha ga-eji mefuo ijeri naịra ise na ụma itoolu ahụ fọrọ afọ.

  15. Ahụla coronavirus n'ahụ mmadụ 162 ọhụru na Naịjriịa ụbọchị Satọde

    Ndị ọrụ NCDC achọpụtala nje coronavirus n'ahụ mmadụ otu narị iri isii na abụọ (162) ọhụrụ na Naịjirịa ụbọchị Satọde.

    N'ime ndị a Delta chitara iri na abụọ (12), Ebonyi itoolu (9), Anambra abụọ (2), ebe Imo jikwa abụọ (2).

    Nke a na ndị ọzọ wetere ọnụọgụ ndị niile bu ya bụ nje na Naịjirịa puku iri ise na anọ, narị itoolu na ise (54,905).

    Mmadụ puku iri anọ na abụọ, narị itoolu, iri abụọ na abụọ (42,922) agbakeela ebe ya bụ nje tagoro isi mmadụ otu puku na iri ise na anọ (1054).

  16. Igbo ndị ọma unu asaala chi e. Taa bụ afọ. Afọ biko wetere anyị ihe ọma. Iseee!

  17. Ka chi foo nu

    I mere nke ọma wee nọnyere anyị taa.

    Anyị a ga-ahụkwa gị echi?

    Chukwu nọnyere gị dịka i si nọnyere anyị taa.

    Echi ga-abụ echi ọma. Ndeewo.

  18. Njem mba ofesi amalitela na Naịjiria, lee etu o si aga

    Dịka gọọmentị nyere iwu ka njem mba ofesi malite na Naịjirịa n'ụbọchị Satọde bụ Sepụtemba 5, ndị mmadụ amalite ime njem n'ike n'ike.

    Ngalaba na-ahụ maka njem ụgbọelu na Naịjirịa bụ Federal Airports Authority of Nigeria (FAAN), gosiri etu ndị mmadụ si akwanye ugwu n'iwu ha tinyere maka ịnọsapụ nakwa njem.

  19. Ndị dọkịnta na Naịjirịa ekwuola na ha ga-agba abụbụ ọrụ n'izu ụka na-abịa

    Dọkinta ndị na-arụ ọrụ na ụlọ ọgwụ steeti nwe na Naịjirịa ekwuola na ya ga-agba abụbụ ọrụ n'ime izuụka na-abịa iji dọta uche gọọmentị banyere ụgwọ ọnwa nakwa ọnọdụ ha.

    Ọ bụ otu na-ahụ maka ndị dọkịnta a kpọrọ "National Association of Resident Doctors" (NARD) kwuru nke a.

    NARD na-anọchite anya dọkịnta ruru 40% na Naịjirịa.

    Abụbụ ọrụ a ga-eso n'ọtụtụ nsogbu na-adakwasị Naịjirịa dịkwa ọ na-ebuso coronavirus agha.

    NARD, n'ime akwụkwọ ozi ha wepụtara, sị: "Ndị NEC (national executive council) anyị enweela nkwekọrịta na ndị otu anyi niile nọ Naịjirịa ga-amalite abụbụ ọrụ site n\'ụbọchị Monde."

    Ọ bụ onyisi otu ahụ bụ Aliyu Sokomba binyere aka na ya bu mkpebi.

    DKT Sokomba si na ha agaghị akwụsị abụbụ ọrụ a ma ya bụrụ na gọọmentị enyeghị ha ihe ntinye metụtara ihe Bekee kpọrọ "life insurance" nakwa "death in service benefits".

    Na June, ndị NARD mere abụbu ọrụ otu izuụka maka ọdịmma ha nakwa enweghị uwe nchekwa eji ebuso coronavirus agha.

  20. Ị bọkwara nke oma taa?

    Anyi na-ekele unu dịka anyị malitere njem ịwete akụkọ metụtara coronavirus taa.