You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.

Take me to the main website

Ndịagha Naịjirịa ruru 26 ebutela ọrịa coronavirus

Ndịagha Naịjirịa ekwupụtala na mmadụ iri abụọ na isii ebutela nje covid-19 n’ime mmadụ narị anọ na iri na asaa ha mere nnyocha.

Mkpuchi Na Eme Ozugbo

  1. Ụbọchị nta ka anyị chụọ n'Owere nchị

    I mere nke ọma wee nọnyere anyị taa.

    Ka chi foo.

  2. Gọọmentị Legos enyochaala ọdọụgbọelu MM1A maka mmepe njem ofesi

    Gọọmentị Legọs Steetị enyochaala ọdọụgbọelu Murtala Muhammed dị na Legọs ma sị na ọ dịla njikere maka imepekwa njem ịga mba ofesi.

    Ha sị na obi dị ha mma n'ebe ndị ụlọọrụ Federal Airport Authority of Nigerian (FAAN) maka mbọ ha gbara ịhụ na mmepe njem ịga ofesi ga-amalite n'ụbọchị ise nke ọnwa Sepụtemba, 2020.

  3. Gere akụkọ gbasara coronavirus dịka ọ dị n'Afrịka taa

  4. Naijiria egosila mmasị inweta ọgwụ mgbochi coronavirus ndị Rọsịa

    Mịnịsta na-ahụ maka ahụike bụ Osagie Ehanire bụ onye kwuru nke a oge ya na onye nnochiteany mba Rọshịa na Naijiria bụ Alexey L. Shebarshin nwechara ọgbakọ n'Abuja.

    Ọ sị,"Anyị na-egosi mmasi anyị n'ọgwụ mgbopchi Covid-19 iji nweta ohere ịrụkọ" dịka o si metụta ọgwụgwọ ọrịa coronavirus.

  5. Silvio Berlusconi bụbu Praim Minista Italy ebutela coronavirus

    Onye chịbụrụ mba Italy dịka Praịm Minista bụ Silvio Berlusconi nọzị n'ụlọọgwụ ugbua dịka o butechara coronavirus.

    Ndị otu ndọrọndọrọ ya bụ Forza ewepụtala ozi kwuo ka ndị mmadụ ghara ịchekasị onwe ha n'ihi na "ahụ dị ya"

    "Ihe mere eji buga ya ụlọọgwụ bụ maka adị ama ama dịka ọ malitere ịgosi njirimara ọrịa ahụ" ka ha kwuru.

  6. Afrịka ga-enweta ọgwụ mgbochi coronavirus nde 220 - WHO

    Ngalaba na-ahụ maka ahụike Bekee kpọrọ "World Health Organization" (WHO) ekwuola na Afrịka ga-enweta ọgwụ mgbochi Covid-19 ruru nde 220 ma ọ pụta.

    WHO sị na nke mbụ a ga-ebute ga-abụ ndị ọrụ ahụike ka a ga-enye ya.

    Onye kwuru nke a bụ onye na-ahụ maka Afrịka na WHO bụ Richard Mihigo.

    Ọ sị na ọ bụ mmadụ ole nọ na mba ga-ekwu ọnụ ọgwụ ole a ga-enye ha.

    Maazị Mihigo sị na mba 54 ekwuola na ha chọrọ ọgwụ mgbochi coronavirus a.

    Mmadụ ijeri 1.3 nọ n'Afrịka.

    Otu a kpọrọ COVAX chọrọ ịzụta ma kee ọgwụ mgochi ruru ijeri abụọ ma kesaa ụwa niile.

    Ha nwere atụmatụ itoolu na-anwa imepụta ọgwụ mgbochi covid-19.

    A na-anwa nakwa enyocha atụmatụ ọgwụ mgbochi abụọ n'ime ndị a n'Afrịka ugbua, dịka Richard Hatchett nke "Coalition for Epidemic Preparedness Innovations" (CEPI) siri kwuo.

  7. Diego Costa ebutela coronavirus

    Otu bọolụ Atletico Madrid ekwuola na ọgba bọọlụ ha bụ Diego Costa na Santiago Arias ebutela nje coronavirus.

    Ọtụtụ ndị otu Atletico gawara ịgbara mba ha dị icheiche dịka a malitere asọmpi UEFA Nations League, mana ndị fọrọ afọ n'ime ha mere nnyocha e wee chọpụta na Costa na Arias bu nje a.

    Ha abụọ enwebeghị onye ya bụ ọrịa na-egosi n'ahụ ya, mana e dopula ha abụọ iche ugbua ruo mgbe ha ga-agbake nke ọma.

  8. Gọọmentị amachiela ụgbọelu mba Fransị na ndị ọzọ ịbata na Naịjirịa

    Gọọmentị etiti amachiela ụlọọrụ ụgbọelu dị icheiche ifebata na Naịjirịa n'ihi na mba ndị nwe ụgbọelu ahụ machiri ụmụ Naịjirịa ịbata na be ha.

    Hadi Sirika, bụ Mịnịsta njem ụgbọelu, kwuru nke a n'ọgbakọ ndị ntaakụkọ n'Abuja n'ụbọchị Tọzde.

    Ụgbọelu ndị a machiri bụ: Air France, KLM, Etihad, Rwandair, Lufthansa, TAAG Angola Airlines, Air Namibia, na Royal Air Maroc.

    Ndị e nyere ikike ịbata Naịjirịa gụnyere: Middle-East, British Airways, Delta Airlines, Qatar Airways, Ethiopian Airlines, Egyptair, Air Peace, Virgin Atlantic, Asky, Africa World Airways (AWA), Air Cote-d’Ivoire, Kenya Airways, Emirate, nakwa Turkish airlines.

    Sirika kwuru na ụgbọelu ndị ga-eso usoro gọọmentị wepụtara maka njem mba ofesi tupu e kwe ka ha bata.

    Usoro ndị a gụnyere na onye ọbụla si mba ọzọ abata Naịjirịa ga-enwerịrị akwụkwọ nnyocha ga-egosi na o bughi coronavirus.

    Nnyocha a ga-abụ nke e mere n'ụlọọgwụ a ma ama na-agafeghi abalị anọ tupu onye ahụ emee njem.

    Onye njem ejighi akwụkwọ a, gọọmentị ga-amanye ya ka o mee ya bụ nnyocha na Naịjirịa tupu ọ banye.

    Njem mba ofesi ga-amalite ọzọ na Naịjirịa n'ụbọchị Satọde, abalị ise nke ọnwa Sepụtemba afọ 2020.

  9. Igbo demeenu!

    Unu apụtala ụtụtụ a?

    Anyị ga na-ewetara unu ndụmọdụ nakwa akụkọ nille metụtara coronavirus.

    Jisinu ike nọnyere anyị.

  10. Gere akụkọ gbasara coronavirus dịka ọ dị n'Afrịka taa

  11. Mmadụ anọ ebutela Covid-19 na NFF

    Mmadụ anọ na-arụ ọrụ na Nigeria Football Federation (NFF) bụ ngalaba na-achịkọta egwuregwu bọọlụ na Naịjirịa, butere ọrịa covid-19.

    N’ozi ha zipuru na Twitter, NFF kwuru na otu onye agbakeela ebe ndị ọzọ na-anata ọgwụgwọ.

  12. Mba 54 dị n'Afrịka chọrọ CoVax - WHO

    Ngalaba na-ahụ maka ahụike mbaụwa bụ World Health Organization (WHO), ekwuola na uche mba iri ise na anọ dị n’Afrịka dị na CoVax.

    Ọ bụ usoro a chọrọ isi hụ na inweta ọgwụ mgbochi covid-19 araghị ahụ.

    Mba asatọ n’Afrịka ekwekọrịtala iji aka ha akwụ ụgwọ ọgwụ mgbochi ha, nke ha ga-ebido ịkwụ ụgwọ ya n’ọnwa Ọktoba.

  13. Ụlọakwụkwọ ga-emepenwu ugbua, ndị NYSC ga-amalitenwukwa - Gọọmenti, Mmachi ngagharị abalị ga-ebidozi n'elekere 12 nke abalị

    Gọọmenti etiti ekwuola na ndị steeti nwere ike ịgbape ụlọakwụkwọ ma ọ bụrụ ma ha hazichaa atụmatụ igbochi mfesa coronavirus.

    Ha kwukwara na ndị na-eji otu afọ efe ala nna ha bụ National Youth Service Corps (NYSC), ga-amalite na mpaghara naijiria dị iche iche.

    Dkta Sani Aliyu bụ onye nchịkọta otu onyeisiala hiwere maka ọgụ coronavirus bụ PTF n'ịchafụ, bụ onye gbaara ndị ntaakụkọ ama a ụbọchị Tọzde n'Abuja bekuru ndị gọvanọ steeti dị iche iche ka ha malite ilebanye anya n'ihe ọ ga-eri ịhụ na ihe niile gara dịka o kwesịrị.

    Ntuziaka ndị ọzọ ndị otu PTF nyere gụnyere:

    - Mmachi ngagharị abalị site n'elekere 10 nke abalị ruo elekere 12 nke etiti abalị, dịka ha ji nwayọọ ebelata mgbachi ngagharị obodo e tinyere maka mgbochi mfesa coronavirus.

    “Anyị na-ahazigharị mgbachi ngagharị abalị ka ọ bụrụ bido n'elekere iri na abụọ nke etiti abalị ruo elekere anọ nke ụtụtụ bido n'abalị a." ka Aliyu kwuru.

    Ọ gara n'ihu kwuo na iwu ọhụrụ a ejighị ndị na-arụ ọrụ dị mkpa nakwa ndị njem si ala Bekee abata.

  14. Kpuchie ihu gị n'oge aramara - Ndị ọrụ ahụike Canada

    Ngalaba ahụike mba Kanada agwaala ndị mmadụ ha kpuchie ihu ha maọbụrụ na ha ndị ebighi n'ụlọ ha na-eme aramara.

    Otu n'ime ha bụ Dọkịta Theresa Lam nyekwara ndụmọdụ ịhapụ nsusuọnụ.

    "Dịka ihe ndị ọzọ ị na-eme na nso mmadụ, o nwere ihe ndị ịkwesiri ịme iji belata mfesa ọrịa coronavirus" ka o kwuru.

    Mana ndụmọdụ ya bụ ka ndị mmadụ hapụ aramara dịka ọrịa ka zuru ụwa ọnụ.

  15. 'Onweghị onye butere coronavirus n'ụlọọrụ onyeisiala'

    Ụlọọrụ Onyeisiala Naịjirịa ekwuola na onweghị onye ọbụla na-arụ ọrụ ebe ahụ butere ọrịa coronavirus.

    Ọnụ na-ekwuru Buhari bụ Garba Shehu kwupụtara nke a n'akwụkwọ ozi o zipuru, ma katọọ akụkọ na-efeghara na soshal midịa.

    Shehu kwuru na ndị niile na-arụ ọrụ n'ụlọọrụ onyeisiala na-eme nnyocha coronavirus kwa mgbe kwa mgbe.

    O kwukwara na onye a kpọrọ aha n'akụkọ ụgha ahụ, enweghị ya bụ ọrịa chaa chaa.

  16. Neymar ebutela coronavirus

    Mmadụ atọ n'otu egwuregwu bọọlụ PSG nke mba Fransị ebutela coronavirus.

    Otu bọọlụ ahụ kwupụtara nke a n'ụbọchị Wenezde mana ha akpọpụtaghị aha mmadụ atọ ya bụ ọrịa metụtara.

    Mana ụlọntaakụkọ CNN nakwa L'Equipe nke mba Fransị na-ekwu na Neymar so n'ime ha.

    L'Equipe dekwara na mmadụ abụọ ndị ọzọ bụ Angel Di Maria na Leandro Paredes.

    Ha butere ya bụ ọrịa dịka ha gachara ezumike nwa mgbe nta n'ebe a kpọrọ Ibiza.

    Ugbua, mmadụ atọ ga-edopu onwe ha iche opekata mpa otu izuụka tupu ha esonyekwara ndị otu ha.

  17. Mmadụ 216 butere coronavirus na Naịjirịa ụbọchị Wenezde

    Ngụkọ ọnụ kwa ụbọchị nke si n'aka ngalaba mgbochi ọrịa bụ 'National Centre for Disease Control' gosiri na ọ bụ mmadụ narị abụọ na iri na isii butere ọrịa coronavirus na Naịjirịa n'ụbọchị Wenezde.

    Nke abulitere ọnụọgụgụ ndị buterela ya bụ ọrịa na Naịjirịa ruo puku iri ise na anọ, narị anọ na iri isii na atọ (54,463).

    lee ka ya bụ okwe si gbaa ụnyaahụ:

  18. Mụ na ezinụlọ m butere coronavirus - 'The Rock'

    Dwayne Johnson bụ onye na-eme ejije Hollywood kwuru na ya na nwunye ya na ụmụ ha abụọ butere ọrịa coronavirus.

    Johnson, onye e ji 'The Rock' mara, kwuru nke a n'ihe onyonyo o tinyere n'akara instagram ya.

    O kwuru na ya bụ ọrịa bụ otu n'ime ihe kachasị taa akpụ ya na ezinụlọ ya gabigara n'ọdị nso a.

    O kwuru sị: "Anyị butere ọrịa a n'agbanyeghi na anyị na-akpachapụ anya nke ọma."

    "Ekele dịrị Chineke na anyị agbakewela ugbua."

    'The Rock' rịọrọ ndị mmadụ ka onye ọbụla na-ekpuchi ihu ya dịka otu ụzọ iji gbochie mfesa ọrịa coronavirus.

  19. Ụtụtụ ọma

    Igbo ndị ọma, ụnụ abọọla chi.

    Anyị na-anabata gị na mgbasa ozi nke ụtụtụ taa.

    Ka ụbọchị taa maara gị mma.

  20. Ka ọ dị echi

    Ka chi foo ụmụ Igbo