Ụlọọrụ onyeisiala, ndị Mịnịsta, ndị isi NLC, TUC ebidola nzukọ iji gbochie abụbụọrụ
Iji gbochie abụbụọrụ nke ndịọrụ Naịjirịa sị na ha ga-ebido n'ụbọchị atọ nke ọnwa Ọktoba 2023, ụlọọrụ onyeisiala akpọọla ndị isi otu Nigerial Labour Congress na Trade Union Congress nzukọ n'Aso Villa Abuja.
Akwụkwọ ndị ntaakụkọ hụrụ gosiri na ọgbakọ ahụ malitere n'ebe elekere abụọ nke ehihie ụbọchị Sọnde, bụ ụbọchị mbụ nke Ọktoba 2023.
Cheta na gọọmentị na ndị isi ndịọrụ gaara enwebu ọgbakọ n'ụbọchị 29 nke ọnwa Sepụtemba, mana ọgbakọ ahụ agaghị n'ihu n'ihi na ndị isi ndị ọrụ abịaghị.
Ọgbakọ nke a ga-adị n'ụlọọrụ onyeisi ndị ọrụ onyeisiala Tinubu, bụ Femi Gbajabiamila, bụ onye kpọrọ ya bụ ọgbakọ.
Ndị ọzọ ga-esonye n'ọgbakọ ahụ bụ Simon Lalong, Mịnịsta na-ahụ maka ndịọrụ; na Nkiruka Onyejeocha bụ Mịnịsta nta na-ahụ maka ndị ọrụ.
Cheta na n'ụbọchị ise na isii nke ọnwa Septemba, ndị otu NLC gbara abụbụọrụ nke ịdọ aka na ntị, bụ nke ha kwuru na ọ bụ iji kpọkuo gọọmentị ka o mee ihe ha kwesịrị ime maka ọdịmma ndị ọrụ.
Ndị ọrụ Naịjirịa na-ewe iwe maka nnukwu ihe isiike dị n'obodo, nke kawanyere njọ dịka onyeisiala Tinubu kwụsịrị ịkwụ ụgwọ Fuel Subsidy, mee ka ọnụahịa njem ụgbọala na ihe niile gbalie oke elu.
Ha chọrọ ka gọọmentị bulie ụgwọ onwa opekatampe a na-akwụ ndị ọrụ, nke bụ naanị puku naịra 30 ugbua, nakwa ọtụtụ ihe ndị ọzọ.
Dịka ngalaba 'Nigeria Bureau of Statistics' si kwuo, mgbali elu ọnụahịa ihe na Naịjirịa ruru pasentị 25.8 n'ọnwe Ọgọst 2023.