You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.

Take me to the main website

Ụmụnwaanyị Naịjirịa emeriela ndị Ethiopia 4-0 n'asọmpi itozu oke maka Olympics 2024

Nchịkọta akụkọ ndị gbapụtara ihe nke mere na Naịjirịa, Afrịka nakwa mbaụwa niile n'ọnwa Ọktoba.

Mkpuchi Na Eme Ozugbo

Ikechukwu Kalu, Chukwunaeme Obiejesi, Uche Akolisa, Jessica Nwankwo and Adline Okere

  1. Guinnesss Book of Record: Wosu ejirila ọkpa si Legos rue Pọtakọt

    Aka na-achị Rivas Steeti bụ Fubara anabatala nwa amadi ji ụkwụ si legọs rue Pọtakọt, isiobodo Rivas steeti.

    Promise Wosu Junior a ma dịka Wene Port Hacourt, onye gbara afọ 28 ji ọkpa si Lagos steetị mee njem ruru kilomita 606 na mbọ ya ituru ugo ‘’Guiness Book of Record’’ maka onye kachasị jiri ụkwụ mee ogologo njem nke ọ malitere n’ụbọchị 17 nke ọwa Ọktoba.

    O ruru Port Hacourt n’Satọde bụ 21 Ọktọba. Ihe onyonyo na- efeghiari n’soshal midia n’egosi na Promise eruola ụlo gọọmentị nke Pọtakọti ebe ndi mmadu gbakọrọ n'igwe ịzụte ya.

    Akụkọ kwuru na nwaamadi ahụ nọ n’ụlọọgwụ ụgbụa ebe ndị dọkịta na- elezị ya anya ịhu na ahụ sịri ya ịke. Fọtọ pụtụra na soshol media gosiri ebe Govanọ River steetị bụ Siminalayi Fubara zụtere ya.

    Mgbe BBC Igbo kpọrọ onye na-enyere gọvano Riva steeti aka n’ ihe gbasara ọganiru ụmụntorobia na egwuregwu, bụ Norisia Pepple ọ gwara anyi na ha nụrụ maka njem Promise bidoro ituru ugo ‘’Guinness world record’’ mana ha amaghị na o rutela Pọtakọt maọbụ o ruola ụobi gọọmentị dịka akụkọ siri kwu.

    Mgbe anyi juru ihe bụ uche ya na njem ahụ, ọ gwara anyị na ya kwetare na nwata nwoke ahụ meere njem ahụ n’ezịokwu maka na ụmuntorobịa Rivas steeti zuru ka emee na ha na-agbasi mbọ ike.

  2. E duola Uzoma Asagwara n'iyi ọrụ dịka Minista ahuike na mba Canada

    Onye zọrọ ọkwa Onyeisiala na aha Labour Party na Ntuliaka 2023 bụ Peter Obi esorola ụmụ Naijiria ndị jara nwa ada Uzoma Asagwara ike dịka e duru ya iyi ọrụ dịka Minista ahụike mpaghara Manitoba,nke mba Kanada.

    Na nsonso a, e duru Asagwara , onye bụ nọọsụ n'iyi ọrụ dịka Minista ahụike Manitoba.

    N'ozi o wepụtara na akara X ya nke bụbu ọbaozi Twitter, Obi kwuru na Asogwara ruru na ogogo ọ nọ ugbua n'ihi mmụọ ịgba mbọ na itinye uchu n'ọrụ e jiri mara ụmụ Naijiria.

    Ọ sịrị, “Odudu n'iyi ọrụ e duru nwa afọ Naijiria na-eto eto bụ Uzoma Chioma Asagwara dịka Minista ahụike nakwa Osote Premia nke mpaghara Manitoba dị na Kanada, bụ ihe obi ụtọ. Ozi ọnụ a na-egosi mmụọ ịgba mbọ nke ụmụ Naijiria.".

    Asagwara, onye bụ nọọsụ na-elekọta ndị nwere ọrịa isi nakwa onye ọgbabọọlu nkata sobu n'otu 'Canadian National Basketball na-anọchitebu Manitoba n'ụlọnnochiteanya 'Manitoba Legislative Assembly

  3. Benue bank robbery: Ihe ndị uweojii kwuru maka nnwụchị ndị ohi wakporo ụlọakụ anọ

    Ndịuweojii Benue steeti ekwuola na akụkọ sịrị na ha anyụchiela ndị ekperma wakporo ụlọakụ na steeti ahụ gbuo ndị uweojii bụ akụkọ ụgha.

    A gbagburu ndị uweojii anọ ụbọchị Satode dịka nha na ndị ekperima wakporo ụloakụ anọ na Benue steeti na-akwarịta mgbọ.

    Akụkọ na-efeghiarị na soshal midia nke sochiri mkpamkpa ahụ kwuru ndi ụweojịi anwụchịela mmadu anọ n’ime ndi ekperima ahụ wakpọrọ ụlọakụ ụbọchị Satode.

    Ọnu na-ekwuru ndị uweojii Benue steetị bụ SP Catherine Anene gwara BBC Igbo n’ekwentị na o nweghị onye ohi ha nwụchiri.

    Ọ sịrị, "Akụkọ kwuru na anyị nwụchiri mmadu anọ na ndi ohi ahu bụ akụkọ ụgha." Cheta na ndị ohi wakpọrọ ụlọakụ anọ n' Otukpo dị na Benue steeti,ha gbụrụ otu 'DPO' nakwa ndị uweojii atọ ndị ọzọ.

    Ndi ụwe ojii gbụru mmadu abụọ n’ime ndị ekperima ahụ dịka ha agbakọrịtara egbe.

  4. Igbo mma mma nụ o!

    Igbo ndị ọma, mma mma nụ o!

    Onye biri, ibe ya biri o!

  5. Lee ihe ndị ọchịchị mba ụwa kwuru n'ọgbakọ udo e nwere na Egypt

    Ndị ọchịchị mba ụwa dị icheiche nwere ọgbakọ n'ọdị nso a na Cairo, isi obodo mba Egypt, gbasara ọgụ na-ada ugbua n'etiti mba Israel na otu Hamas nke mba Palestine, iji kpaa etu a ga-esi mee ka agha kwụsị, ka udo laghachi.

    Ndị sonyere n'ọgbakọ a gụnyere onyeisi otu 'United Nations' bụ Antonio Guterres, Eze nke mba Jordan, onyeisiala mba Saụt Afrịka, na ọtụtụ ndị ọzọ.

    Lee nchịkọta ihe ụfọdụ n'ime ha kwuru n'ọgbakọ ahụ:

    Antonio Guterres: kpọrọ oku ka a kwụsịtụ ịkwa mgbọ ka ndị ọrụ enyemaka nwee ohere bubaa ihe enyemaka na Gaza

    Eze Abdullah nke mba Jordan: dọrọ mba ndị na-abụghị ndị Arab aka na ntị ka ha kwụsị izipụ "ozi ọjọọ" na "ndụ ndị Palestine adịghị mkpa ka ndụ ndị Israel".

    Onyeisiala Saụth Afrịka Cyril Ramaphosa: kwuru na ndị Saụt Afrịka ghọtara ihe ndị mba Palestine na-agabiga "dịka ha na-alụ ọgụ nnwereonwe ha".

    James Cleverly, Odeakwụkwọ ofesi mba UK: kwuru na ya na ndị gọọmentị Israel nwere mkparịtaụka "maka ọrụ dịịrị ha irube isi n'iwu na-achịkọta ịlụ agha, nakwa mkpa ọ dị ichekwa ndụ ndị nkịtị bi na Gaza".

    Yoko Kamikawa, Mịnịsta ofesi mba Japan: kwueu na mba ndị ọzọ ga-agbasi mbọ ike ịhụ na agha a "egbochighi atụmatụ udo a na-enwe maka mpaghara Middle East".

    Mauro Vieira, Mịnịsta ofesi mba Brazil: kpọkuru ndị ọchịchị ụwa ka ha hụ na agha ahụ agafeghị banye na mpaghara ọzọ

    Annalena Naerbock, Mịnịsta ofesi mba Germany: kwuru na ọ dị mkpa izere okwu na-akpalite ịkpọ asị, "maka na ọ bụ ihe Hamas na ndị nkwado ha na-achọ".

  6. Israel/Hamas Crisis: Ụfọdụ ndị Naịjirịa emeela ngagharịiwe iji kwadoo Palestine

    Ọtụtụ ndị mmadụ na Naịjirịa emeela ngagharịiwe iji kwado mba Palestine, dịka mba Israel ka na-atụ ogbunigwe esepụ aka na mpaghara Gaza nke mba ahụ.

    Ọ bụ otu a kpọrọ 'Conference of Islamic Organisations' haziri ngagharịiwe a. Ndị mmadu bucha akwụkwọ e dere "nnwereonwe maka Palestine" na "ikpe ziri ezi maka Palestine".

    Ụfọdụ ndị kwuru okwu na ngagharịiwe ahụ kpọkuru gọọmentị Naịjirịa ka ha kwụsị mmekọrịta ọbụla ha na mba Israel nwere.

    Israel atụọla ọtụtụ ogbunigwe na mpaghara Gaza kamgbe ụbọchị asaa nke ọnwa Ọktoba oge ndị ọgụ Hamas nke mba Palestine wakporo mba Israel.

    Ihe ruru mmadụ 1,400 tụfuru ndụ ha na mwakpo ahụ dịka Israel si kwuo, mana ndị ọchịchị Gaza na-ekwu na ihe karịrị mmadụ puku anọ - nke ọtụtụ n'ime ha bụ ụmụaka - anwụọla kamgbe Israel malitere ịtụ ogbunigwe na Gaza.

  7. Ndị agha 6,315 ọhụrụ esonyerela otu ndị agha Naịjirịa

    Mmadụ 6,315 esonyerela otu ndị agha Naịjirịa taa bụ ụbọchị 21 nke ọnwa Ọktoba dịka ha mere emume mpụta ha n'ọzụzụ n'ogige 'Nigerian Army Depot' dị na Zaria, Kaduna Steeti.

    Ndị agha a so n'otu nke a kpọrọ '85th Regular Intake'.

    N'emume mpụta ọzụzụ ahụ, onyeisi ndị agha Naịjirịa bụ Ọchịagha Taoreed Lagbaja, gwara ndị agha ọhụrụ ahụ na ha na-abata n'otu ndị agha n'oge ọttụtụ ihe na-akpata enweghị nchekwa na-echere Naịjirịa aka mgba, dịka mwakpo ndị ojiegbe, ndị ntọrị mmadụ, ndị na-eyi ndụ egwu, na ọtụtụ ndị ekperima ndị ọzọ.

    Ọ dọrọ ha aka na ntị ka ha dị njikere, dị uchu n'ọrụ, nwee ezi agwa ma wepu ụjọ ọbụla iji buso ndị ọjọọ a agha ma mee ka ezi nchekwa dị na Naịjirịa.

  8. Ndị uweojii anọ anwụọla na mwakpo ụlọakụ n'Otukpo

    Ndi uweojii Benue steetị kwuru na ndi ohi awakpoola ụlọakụ ise n'obodo Otukpo dị na Benue steetị n’ụbọchị fraịde.

    Ọnụ na-ekwuru ndi uweojii na steetị ahụ bụ Anene Sewuese Catherine kwuru na ulọakụ ndi ha wakpọrọ gụnyere Access Bank, First Bank, Zenith Bank,UBA na Stanbic Bank.

    Dịka Catherine sirị kwu, onye ụwe ojii nke ụlọọrụ Otukpo bụ John Adikwu nwụrụ mgbe ndị ohi ahụ gbara ya egbe n'afọ mgbe ha na-akwa mgbọ.

    Ndị uweojii ọzọ ruru mmadụ atọ nwụrụ na ya bụ ihe dịka ndị ọzọ na-anata ọgwụgwọ n'ụlọọgwụ.

    Amalitela nyocha banyere ihe mere.

  9. Ndị uweojii Sierra Leone ejidela nwaokorobịa Naịjirịa a sị gburu enyi ya nwaanyị

    Aka akparala nwa amadị aha ya bụ Benjamin Best Nnanyereugo bụ onye ndị uweojii Naịjirịa na-achọ achọ maka ebubo igbu enyi ya nwaanyị bụ Augusta Osedion ma gbaa ọsọ.

    ọnụ na-ekwuru ndị uweojii Legọs bụ Benjamin Hundeyin gwara BBC na ọ bụ na mba Sierra Leone ka ndị uweojii jidere nwaokorobịa ahụ, mana a ga-akpọghachite ya na Naịjirịa.

    N'ụbọchị 10 nke ọnwa Ọktoba ka a kpọpụtara nwata nwoke a dị afọ 26, onye e jikwa Killaboi mara, dịka onye a na-achọ achọ maka igbu enyi ya nwaanyị dị afọ 21 ma na-agụ akwụkwọ na 'Lead City University' nke Naịjirịa.

    Kilaboi ji ọnụ ya kwupụta n'akara Instagram ya n'ọnwa Julaị na ya na enyi ya nwaanyị nwere nghọtahie, ya wee sụọ ya mma na-amaghị ama, o wee nwụọ.

    O kwuru na ya ga-ewere onwe ya nyefee n'aka ndị uweojii iji taa ahụhụ maka ihe o metara. O tinyekwara ozi o zigaara nne nwata nwaanyị ahụ iji kọọrọ ya ihe merenu ma kwuo na ya amaghị ama wee gbuo enyi ya nwaanyị.

    Akụkọ na-ewu na soshal midia kwuru na Killaboi mefuru ego ruru $25,000 iji gbanwee njirimara ya na mba Sierra Leone, gbanwee aha ya ma zawa Kanu Princeton Samuel, ma nwetakwa 'passport' mba ahụ.

    Akụkọ ndị a kwuru na ọ bụ n'ụlọ ịgba egwu (night club) ka ndị uweojii jidere nwaokorobịa ahụ. BBC agaghị enweike ikwu ma akụkọ ndị a ọ bụ eziokwu.

    N'akara Instagram ya, Killaboi kọwara onwe ya dịka 'blockchain developer' nakwa 'crypto purveyor'

    N'ụfọdụ ozi ndị o tinyere na soshal midia, nwata nwoke a kwuru na ya nwetara ihe karịrị nde naịra 300 n'afọ 2022 na 2023 site n'ịgba chacha (betting).

  10. Agbaala ọkụkọ ruru 45,000 ọkụ iji kwụsị mfesa 'Bird flu'

    Egbuola ma gbaa ọkụkọ ruru puku iri anọ na ise ọkụ n'akụkụ ndịda mba Mozambique iji gbochi mfesa ọrịa Bird flu n'ebe ahụ

    Ndị ọrụ ahụike ebe ahụ ekwuola na e si mba Saụt Afrịka bụ ebe ọrịa ahụ na-efesi ike tụbata ọkụkọ ndị ahụ.

    Ọrịa ahụ eferuola akụkụ Mozambique akpọrọ Morrumbene dị n'okpuruọchịchị Inhambane dị na ndida. A na-arụsi ọrụ ike ịhụ na ọrịa ahụ efezughi mba ahụ niile.

    Bird flu bụ ọrịa na-efe efe n'etiti ọkụkọ nakwa nnụnụ ọhịa.

    O nwereike ife n'ime naanị ụfọdụ abalị site n'asụmmiri nakwa nsị nnụnụ ndị a maọbụ nri na mmiri bu oria a.

    Mfesa ọrịa a ebutela ụkọ akwa na ọkụkọ ma bulie ọnụ ahịa ya nsonso a na Mozambique nke gụnyere isi obodo ha bụ Maputo.

  11. Nnọọ na peeji anyị taa

    Daalụ n'isonye anyị maka akụkọ ndị dị mkpa na mba ụwa taa.

  12. Tinubu akagbuola ọkwa onyeisioche Ferma o nyeburu nwaokorobịa dị afọ 24

    Onyeisiala Bola Ahmed Tinubu akwgbuo ọkwa o nyeburu Imam Ibrahim Kashim Imam dịka onyeisioche 'board' nke ụlọọrụ 'Federal Roads Emergency Agency' (Ferma).

    O rubeghị otu izuụka Tinubu họpụtara nwa amadị a n'ọkwa a bụ nke mere ka aha ya wuo ewu nke ukwuu na soshal midia n'oge ahụ.

    Mana n'akwụkwọ ozi si n'aka ọnụ na-ekwuru Tinubu bụ Ajuri Ngelale, o kwuru na onyeisiala Tinubu akagbuola ọkwa ahụ o neburu Imam Ibarahim, ma kwukwaa na nkagbu a malitere ịdị iri ozugbo ozugbo.

    Ngelale kwukwara na ọkwa a emetụtaghị ndị ọzọ nọ n'otu 'board' Ferma nakwa ndị isi ụlọọrụ ahụ.

    Onyeisiala ekwughị ihe ọbụla kpatara o ji kagbuo nhọpụta Imam.

    A mụrụ Imam Ibrahim Kashim n'ụbọchị 27 nke ọnwa Disemba 1998.

    Nna ya bụ Kashim Ibrahim bụ ya bụ onyeisi 'Tertiary Education Trust Fund' (Tetfund) ugbua.

    Ọ gụrụ akwụkwọ Mahadum na "Brighton University' nke mba UK bụ ebe o nwetara nzere 'Bacherlors Degree' nakwa 'Masters Degree' na ngalaba ọmụmụ 'Mechanical Engineering'.

    Imam Ibrahi rụburu ọrụ dịka onye enyemaka pụrụ iche nke Mịnịsta ọrụ bụ Dave Umahi.

  13. Inec ga-ezipụ ndị ọrụ karịrị puku 46 maka ntuliaka Imo, Bayelsa na Kogi Steeti

    Ụlọọrụ na-ahụ maka ntuliaka bụ Independent National Electoral Commission (Inec) ekwuola na ha ga-ezipu ndị ọrụ ha dị 46,084 maka ntuliaka ọkwa gọvanọ Imo, Bayelsa na Kogi steeti na-abịa n’ọnwa Nọvemba.

    Onyeisi ha bụ Mahmood Yakubu kwuru nke a n’ọgbakọ ya ndịisi ụlọorụ a ndị ọzọ mere n’Abuja n’ụbọchị Fraịde.

    O kwuru na ntuliaka ga-adị na steeti atọ ndị a nwere ọnụọgụgụ ndị danyere aha ịtụ vootu dị 5,409,438 ebe ọdọ a ga-atụ vootu dị 10,510 na wọọdụ 649 dị n’okpuruọchịchị 56.

    O kwuru na e zigala akụrụngwa ndị e ji atụ vootu a kpọro ‘non-sensitive materials’ na steeti atọ ndị a.

    Ọ gara n’ihu kwuo na ha na-akwado ihe ndị ọzo a ga-eji mee ntuliaka ahụ nke gụnyere ọzụzụ ndị ọrụ.

    Yakubu kwuru na ha enyela ndị na-ele ka ntuliaka si aga dị 126 si na Naịjirịa nakwa mba ofesi ikike iji mee nke.

  14. Gọvanọ Alex Otti enwetela mmeri n’ụlọikpe mkpegharị dị na Kano

    Ụlọikpe mkpegharị bụ ‘Appeal court’ dị na Kano ekwuola n’ezie na ọ bụ Gọvanọ meriri na ntuliaka ọkwa gọvanọ Abia Steeti, dịka ọ kagburu ikpe e kpere n’ụbọchị 18 Mee 2023 nke ọkaikpe M.N Yunusa nke ụlọikpe ukwu dị na Kano chụpụrụ Otti.

    Ụlọikpe a nyere iwu ka onye gbara Alex Otti akwụkwọ kwụọ ya ụgwọ ego dị otu nde naịra (N1,000,000).

    Cheta na ọkaikpe Yunusa kpere ikpe a mgbe otu nwoke a kpọrọ Ibrahim Haruna gbara akwụkwọ ma sị ka a kagbuo mmeri ndị niile a họpụtara n’aha Labour Party.

    Haruna kwuru na nhọpụta ndị a megidere iwu ntuliaka nke afọ 2022 nke mere nhọpụta ha na Kano Steeti nakwa steeti ndị ọzọ na Naịjirịa ji bụrụ n’efu.

    N’ihi nke a ọkaiwu gọvanọ Otti bụ Lateef Fagbemi gbara akwụkwọ n’ụlọikpe mkpegharị banyere ikpe ahụ.

    Cheta na ụlọikpe na-ahụ maka ntuliaka nọọrọ n'ụbọchị isii nke Ọktoba kụchapụ akwụkwọ Okechukwu Ahaiwe nke Peoples Democratic Party (PDP) gbara megide mmeri Otti na ntuliaka ọkwa gọvanọ Abia e mere n'ọnwa Maachị 2023.

  15. Ndị agha Niger egbochiela Onyeisiala Bazoum ịgbapụ ọsọ

    Ndị agha nọ n'ọchịchị na mba Niger ekwuola na onye bụbu onyeisiala mba ahụ bụ Mohammed Bazoum na ezinaụlọ ya na ndị ọrụ ya nwara ịgbapụ ọsọ n'etiti abalị

    Ha kwuru na ndị ahụ nwara ịji ụgbọelu helikọpta gbapụ mana akwụsịrị ha.

    Cheta na anwụchiri Bazoum n'ime ụlọ ya kemgbe ọnwa Jụlaị mgbe anapụrụ ya ọchịchị n'ike.

    Ọnụ na-ekwuru ndị agha ahụ nọ n'ọchịchị bụ Amadou Abdramane kwuru na ọ bụ ebe elekere atọ nke ụzụ ụtụtụ ka ha nwara ịgbapụ ọsọ ahụ.

    "Anyị nwụchiri ndị kpara nkata a nakwa ndị ọzọ so ha mee nke a mgbe ihe ha nwara kụrụ afọ n'ala" ka o kwuru n'igwe onyonyo na mba ahụ.

    O kwuru na atụmatụ mgbapụ ha gụnyere isi ebe e ji ha gbalaga ebe ọzọ ma banye ụgbọelu helikọpta fega n'akụkụ Naịjirịa.

    Amaghị ebe e jizi onye bụbu onyeisiala ahụ nakwa ndị ọzọ ugbua mana amalitela nyocha banyere ihe mere.

    Mohammed Bazoum ajụla itinye akwụkwọ arụkwaghịm kemgbe anapụrụ ya ọchịchị n'ike n'ọnwa Julai.

  16. Nnọọ na peeji anyị

    Ngwụcha izuụka ọzo eruola, kedụ ka ị si akwado ịnweta onwe gị?

    Anyị ga-ewetara gị akụkọ ndị dị mkpa ebe a.

  17. Lee ụbọchị 'Supreme Court' ga-amalite ikpe Atiku na Tinubu

    Ụlọikpe kachasị na Naịjirịaehiwela ụbọchị Mọnde 23 Ọktoba dịka ụbọchị ọ ga-eleba anya n’akwụkwọ Atiku Abubakar nke PDP gbara ka a kagbuo mmeri Bola Tinubu nke APC na ntuliaka ọkwa onyeisiala.

    Ụlọikpe a ga-anọkwa n’ụbọchị ahụ leba anya na mkpesa Atiku nyere ka e nye ya ohere iwebata ihe akaebe ọhụrụ iji gosi na Tinubu ji asambodo adịgboroja nke o nyere ụlọọrụ Inec iji zọọ ọkwa a.

    N’ozi ụlọọrụ ntaakụkọ Channels hụrụ kwuru na ikpe ahụ ga-amalite n’elekere itoolu nke ụbọchị ahụ bụ ebe ndị ọkaiwu Atiku na Tinubu ga-awụchi n’ihu ndị ọkaikpe asaa iji kwupụta mkpesa ha na ọsịsa ha.

    Ndị ọkaiwu Inec na Tinubu ga-agbakọta aka ọnụ ịrụrịtaụka ma iwu megidere ụlọikpe kachasị ịnabata akaebe ọhụrụ n’ikpe ụlọikpe mkpegharị kpere na mbụ.

    Akwụkwọ akaebe Atiku chọrọ igosi ụlọikpe a bụ nke asambodo agụmaakwụkwọ Tinubu bụ nke mahadum steeti Chicago nyere ya na mba Amerịka n’ụbọchị abụọ nke ọnwa Ọktoba.

    Ọ bụ ụlọikpe mpaghara Illonois nke mba Amerịka nyere mahadum a iwu ka ha nye Atiku asambodo Tinubu dịka ihe akaebe.

  18. Etu ndị ntọrị si gbuo osote odeakwụkwọ Federal Polytechnic Uwana, Ebony Steeti

    Etu ndị ntọrị si gbuo osote odeakwụkwọ Federal Polytechnic Uwana, Ebony Steeti

    Ihe ịke mere n’obodo Ezeala Umuezeala di n'okpuruọchichị Ehime Mbano Imo steeti, mbge a huru ozu osote odeakwụkwọ nke Federal Polytechnic Uwana ndị n'Ebonyi Steetị aha ya bụ Innocent Obi.

    Obi bụ onye Ezeala Umuezeala dị n’okpụrụọchịchị Ehịme Mbano, dịka akụkọ sịrị kwụ, atọọrọ ya na be ya n’obodo ya mgbe ọnatara ụlọ maka akwamozụ n’ịzụụka garaaga.

    Dịka akụkọ sịrị kwụ, Obi Innocent e ji "Onye Army’’ maara rụburu ọrụ dịka onye agha ma laa ezumike nka tupu ọ malite ọrụ n'ụlọakwụkwọ a. Ọ na-azọ okwa ịbụ odeakwụkwọ Federal Polyteknic Uwana tupu ọ nwụọ.

    Akụkọ kwụrụ na mgbe Obi lotara n’ụlọ ya dị n'obodo ha, ndị ojiegbe wuchiri n’ụlọ ya were mma sụkasịa ya ahu.

    O bidoro na-eti mkpu akwa enyemaka, ndị mmadu gbakọrọ n’ịgwe inyere ya aka, mana ndi ojiegbe ahụ malitere ịgba egbe aghara aghara, nke a mere ndị biara i nyere ya aka jiri gbaa ọsọndu ha.

    Dịka akụkọ siri kwuo, ụbọchị Satọde, ndi obodo malitere ịchọ Obi, ma n'ụbọchị Ụka ka ha nụrụ na e nwere ozu nọ n’ime ọhia n'agbata Ehime Mbano na Ahiazu Mbaise, mgbe ndi obodo rutere ebe ahu, ha hụrụ na ọ bụ ozu Obi Innocent.

    Dịka onye akaebe siri kwuo, ndị tọọrọ ya ji mma gbukasịa ya ahụ tụpụ ọ nwụọ.

    Mgbe onye ntaakụkọ anyị kpọtụụrụ ọnu na-ekwuru ndi uweojii Imo Steetị bụ Henry Okoye, o kwuru na ọ nụbeghị maka akụkọ a.

    Ụlọntaakụkọ anyị gbara mbọ i nwete ọnu na-ekwụrụ ụlọakwụkwọ Federal Politeknik dị n'Uwana Afikpo Ebonyi Steetị bụ Adline Okeke mana anyi enwetebeghị, ozi e degaara ya n’akara ekwentị ya enwetebeghi ọsịsa tupu akụkọ a apụta.

  19. Ụlọikpe dị na Legọs akụchapụla ebubo ụlọọrụ AMCON boro Sịnetọ Ifeanyi Ubah

    Ụlọikpe Ukwu dị na Legọs nọọrọ n’ụbọchị Wenezde kụchapụ ebubo ụlọorụ Management Corporation of Nigeria (AMCON) boro Sịnetọ Ifeanyi Ubah na ụlọọrụ ya bụ Capital Oil and Gas maka iji ụgwọ ruru otu ijeri narị na ijeri iri atọ na ise (N135bn).

    Ọkaikpe Nichola Oweibo kụpụrụ ebubo ahụ site na mkpesa ọnụ ọkaiwu ụlọorụ AMCON bụ Oluwaseun Onabowu nke na-achọ ka e wepu akwụkwọ a n’ụlọikpe.

    N’ikpe e kpere n’ọnwa Juun, ụlọikpe nyere iwu ka gọọmentị etiti malite ikpe Ubah na ụlọọrụ ya ikpe maka ime mpụ maka ọnụ ebubo asatọ.

    Sịnetọ Ubah na-anọchiteanya Anambra South abịaghị n’ụlọikpe nke taa.

    N’ikpe nke taa, ọkaiwu AMCON gwara ụlọikpe na site n’ikpe nke e kpere n’ụlọikpe dị n’Abuja na ha na Ifeanyi Ubah nwere nkwekọrịta ka e wepu ebubo nke e boro ya n’ụlọikpe dị na Legọs. Ọkaiwu a gara n’ihu gwaa ụlọikpe ka ọ kụchapụ akwụkwọ ha gbara Ubah.

    N’otu aka ahụ, ọkaiwu Ifeanyi Ubah bụ Ifeoma Esom kwuru na ọ bụ eziokwu ha na ụlọọrụ AMCON nwere nkwekọrịta.

    N’ikpe ya, ọkaikpe Oweibe kụchapụrụ ebubo ahụ dị n’isi Ifeanyi Ubah.

    Mana o doghi anya ihe bụ nkwekọrịta Ubah na ụlọọrụ AMCON nwere nke mere ha jiri wepụ aka n’ikpe a.

    Cheta na ụlọọrụ AMCON boro Ubah na ụlọọrụ ya Capital Oil ebubo ịkpa nkata ma tụọ asị banyere ọnụ egole akụnaụba ya dị bụ nke o nyefere n’aka ụlọọrụ a.

    Ha bokwara Ubah ebubo na o gbochiri AMCON ka ha ghara inwete ụgwọ N135bn o ji ha site n’igbochi orire ụlọ ya dị na Banana island nke Legọs.

  20. Anyị achụpụghị ndị Ugwu na-azụ ahịa na Lokpanta kama...– Gọọmentị Abia Steeti

    Gọomentị Abia steeti ekwuola na o nweghi mgbe ha jiri chụpụ ndị na-azụ ahịa na mpaghara Lokpanta, Umunneochui na Uturu.

    Onye ndụmọdụ Gọvanọ Otti n’okwu nchekwa bụ ọchịagha McDonald Ubah kwuru nke a mgbe ọ na-agwa ndị ntaakụkọ okwu n’ụbọchị Mọnde 16 Ọktoba 2023 n’Umuahia.

    O kwuru na ihe gọọmentị mere bụ imechi ụlọ akwampi ruru otu narị na iri isii (160) dị na gburugburu ahịa ahụ bụkwanụ ebe a na-enyo na ndị ntọrị na ndị ohi jiri mere ọnọdụ.

    Ha gara n’ihu sị na e gbenweela ahịa ahụ ka ọ bụrụ nke ga-anazụ naanị n’ụbọchị mgbe ihe dị na-abụghị ahịa ga na-azụ n’abalị.

    Ude kwuru na mkpebi a gọọmentị mere bụ maka iji belata ọnọdụ nchekwa ọjọo dị na mpaghara Lokpanta-Umunneochi nakwa Uturu nke steeti ahụ.

    Nke a na-abịa dịka akụkọ na-efegharị nke kwuru na gọọmentị Abia sị ka ndị Hausa na-azụ ahịa ebe ahụ gwara pụọ.

    N’okwu ya “O nweghi uru ọ bara ịsị ndị na-azụ ahịa na Lokpanta kwakọrọ pụọ, ọ bụ asị. Ọ bụ ihe mwute na akụkọ na-efegharị na Gọọmentị Abia gwara ndị Hausa ka ha si na Lokpanta pụọ. Nke ahụ abụghị eziokwu.”

    “Mpaghara Umunneochi bụ ebe a ma ama ndị ntọrị na-akpa ike dị egwu kamgbe ọtụtụ afọ tupu ọchịchị ugbua amalite.

    “Gọọmentị azọpụla njem ịhụ na e gbochiri maọbụ belata ntọrị mmadụ na mpaghara a.”

    Ọ gara n’ihu kwuo na izuụka gara aga na gọọmentị mere nyocha n’ahịa ahụ site n’enyemaka ndị ọrụ nchekwa ‘operation crush’ ma chọpụta ụlọ akwampi dị 160 bụ nke e mechiri.

    O kwuru na a nwụchiri ọtụtụ ndị ma na-apụta ọtụtụ nde naịra n’aka ndị ekperima a.

    O kwuru na ugbua na ahịa ahụ ga-anazụzi malite n’elekere isii nke ụtụtụ ruo elekere ise nke mgbede.