You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.

Take me to the main website

Ụmụnwaanyị Naịjirịa emeriela ndị Ethiopia 4-0 n'asọmpi itozu oke maka Olympics 2024

Nchịkọta akụkọ ndị gbapụtara ihe nke mere na Naịjirịa, Afrịka nakwa mbaụwa niile n'ọnwa Ọktoba.

Mkpuchi Na Eme Ozugbo

Ikechukwu Kalu, Chukwunaeme Obiejesi, Uche Akolisa, Jessica Nwankwo and Adline Okere

  1. Lebanye anya na nkwafu ọbara na-eme na mpaghara Okigwe - Achonu na-arịọ Tinubu

    Otu n'ime ndị na-azọ ọkwa gọvanọ n'Imo Steeti bụ Athan Achonu, akpọkuola onyeisiala Tinubu ka o hibe kọmiti pụrụ iche iji nyochaa "ogbunigwe nke ndị agha na-atụ na mpaghara Okigwe, nke gburula ọtụtụ mmadụ ma lakwaa ọtụtụ ihe ndị ọzọ n'iyi".

    Achonu, onye na-azọ gọvanọ n'otu ndọrọndọrọ ọchịchị Labour Party kwuru nke a na mkparịtaụka ya na ndị ntaakụkọ n'Owerri, isi obodo Imo Steeti n'ụbọchị Sọnde.

    "Ọ bụ nnukwu mwute ka m ji eme mgbasaozi a gbasara ogbunigwe nke ndị agha Naịjirịa na-atụ aghara aghara na mpaghara Okigwe," Achonu kwuru.

    "Ụdị mwakpo na aka ike dị otu a nke gọọmentị na-akwado ekwesịghị ịdakwasa mpaghara ọbụla maọbụ obodo ọbụla.

    "Ana m akpọku onyeisiala ka o hibe otu ga-etinye anya ma nyochaa ndị a na-ebute nkwafu ọbara na mmebi ngwongwo ndị mmadụ bụ nke na-aga n'ihu ugbua n'Imo Steeti.

    "Onyeisiala werekwa ọkwa ya kpọọ gọvanọ Imo steeti ma dọọ ya aka na ntị, ọ kachasị dịka o kwuru n'ọdị nso a na ya ga-atụ ogbunigwe n'obodo dị icheiche n'Imo Steeti."

    Achonu sị na ọ bụrụ na ya merie ntuliaka, ọ ga-agba mbọ hụ na ndị mwakpo a metụtara ga-enweta ikpe ziri ezi.

    Mana onye ndụmọdụ pụrụ iche nye Gọvanọ Hope Uzodinma n'ihe gbasara mgbasaozi, bụ Collins Ughalaa, kwuru na ebubo Achonu na-ebo abụghị eziokwu.

    Na mkparịtaụka ya na onyentaakụkọ BBC, Ughalaa kwuru na ọ bụ ndị agha Naịjirịa malitere atụmatụ nchekwa ha kpọrọ 'Operation Golden Dawn III" bụ nke ha sị na ọ bụ iji kpochapụ ndị ekperima na-eme ndị Imo steeti ụra aga n'anya.

    "Kedụ etu Achonu ga-esi taa gọvanọ ụta maka atụmatụ nchekwa nke ndị agha na-eme iji buso ndị ekperima agha," Ughalaa jụrụ.

    "Ọtụtụ ndị ekperima, bụ ndị na-enweta nkwado n'aka ụfọdụ ndị otu ndọrọndọrọ ọchịchị, na-eyi ndị mmadụ egwu na mpaghara Okigwe. Ihe gbasara nchekwa bụ ihe dị mkpa nke onye ọbụla kwesịrị itinye aka ka o wee dị mma, ọ bụghị ihe e kwesịrị iji na-eme ndọrọndọrọ ọchịchị."

    Ọ gara n'ihu kwuo na ugbua abụghị oge onye ọbụla ji ata ibe ya ụta, kama ọ bụ oge e kwesịrị ijikọ aka ọnụ maka ọdịmma ndị Imo steeti.

    Cheta na ntuliaka ọkwa gọvanọ nke Imo Steeti ga-abụ n'ụbọchị 11 nke ọnwa Nọvemba 2023.

  2. Afghanistan earthquake: Ọtụtụ mmadụ anwụọla n'ala ọmajiji

    Gọọmenti ndị Taliban na-achị Afghanistan ekwuola na ihe ruru mmadụ puku abụọ anwụọla dịka ala ọmajiji bagidere ime obodo 12. Alaọmajiji mara na Mpaghara Ugwu Herat n'ebe Elekere 11 ụbọchị Satode.

    Ndị zọtara ndụ ha kọrọ etu ala si na-ama jiji dịka ụlọ ndị mmadụ na-ada.

    Ndị ọrụ gbagbata nọ ọrụ kemgbe abalị ịzọpụta ndị tọọrọ n'okpuru ụlọ dara ada.

    Otu United Nations na ụlọrụ ebere ndị ọzọ ezigawala ihe enyemaka na mba ahụ nwere ụkọ ụlọọgwụ dịka ndị ụlọgwụ na-agbalị ilekọta igwe ndị merụrụ ahụ.

    Ebe o metụtakarịrị bụ ndị bi n'ime obodo ebe e ji aja ụpa wuo ụlọ.

    Otu onye obodo ebe o metụtara a kpọrọ Bashir Ahmed gwara ụlọntakụko AFP sị, "Na ọmajiji mbụ ka ụlọ nile dara."

    " O liri ndị no n'ime ụlọ ha . O nwere ezinaụlọ ndị m anụbeghị ihe ọbụla banyere ha."

  3. Ndewoonụ, Igbo ndị ọma

    Igbo ndị ọma, Ndewonụ.

    Nke onye chiri, ya zere!

  4. Ndị uweojii awakpola ogige ndị ekperima n'Ogbunka, Anambra steeti

    Ndị uweojii Anambra steeti ekwuputala etu ha si wakpo ogige ndị ekperima n'obodo Ogbunka, Anambra steeti n'ụbọchị Fraịde, bụ ụbọchi isii nke ọnwa Ọktoba 2023.

    Tochukwu Ikenga, bụ ọnụ na-ekwuru ndị uweojii sị na ọ bụ ndị ngalaba 'Forward Operating Base' na ngalaba Police Rapid Response Squad nke Awkuzu jikọrọ aka n'ọrụ a.

    O kwuru na ha jidere ndị ekperima atọ n'ogige ahụ, tọhapụ mmadụ atọ ndị ekperima ahụ tọọrọ, ma napụtakwa ụgbọala itoolu nke a na-eche na ndị ekperima ahụ napụrụ ndị mmadụ n'ike.

    Ihe ndị ọzọ a hụrụ n'ogige ndị ekperima ahụ gụnyere: egbe 'pump action' atọ, ọtụtụ uwe 'camouflage' ndị agha, ọkọlọtọ Biafra, ọtụtụ ekwentị, ọtụtụ 'sim card' na ihe ndị ọzọ.

    "Ọ bụ ndị ekperima a na-awakpo ma na-atọrọ ndị mmadụ na mpaghara okpuru ọchịchị Orumba Nọt na Saut, nakwa na mpaghara okpuru ọchịchị Aguata n'ọdị nso a," Ikenga kwuru.

    O kwukwara na mmadụ atọ ahụ ha zọpụtara bụ ndị a tọọrọ n'ime ọnwa Ọktoba a.

    Ikenga kwuru na onyeisi ndị uweojii Anambra bụ Aderemi Adeoye na Gọvanọ steeti ahụ bụ Chukwuma Soludo ekwusiela ike na ndị ekperima agaghị enwe ebe nzuzo ọbụla n'Anambra steeti.

    N'ọdị nso a, otu Ohaneze Ndigbo, nke bụ otu jikọrọ ndị Igbo si mpaghara Ọwụwa Anyanwụ Naijiria, haziri ọgbakọ ha kpọrọ 'South East Security Summit' bụ ebe a nọrọ kpaa etu a ga-esi weghachite ezi nchekwa na mpaghara ahụ.

    Ọnọdụ nchekwa na-akwanye njọ na mpaghara ọwụwa anyanwụ. Ndị ọrụ nchekwa na-ebo ebubo na ọ bụ ndị otu na-azọ maka nnwereonwe Biafra na-akpata nke a.

  5. Anyị nọ n'agha - Praim Minista mba Israel

    Praim Minista mba Israel bụ Benjamin Netanyahu apụtala kwuo na mba ya nọ n'agha.

    Okwu ya bịara dịka ha na-azaghachi mwakpo nke si n'aka Hamas.

    Ozi a bụ nke Netanyahu tinyere n'akara Twitter ya kwukwara na "ndị ilo ha ga-ata ahụhụ ha agaghị alachite na ya".

    Dịka ọ dị ugbua, ọgụ na-aga n'ihu n'etiti ndị agha mba Izrel nakwa ndị Hamas n'ime Gaza.

    Ụfọdụ ụlọọgwụ kwukwara na ha na-agwọ ihe ruru mmadụ 148 merụrụ ahụ na mwakpo ịtụ anya nke Hamas mere.

  6. Nnọọ nụ na peeji anyị taa

    Daalụ n'isonye anyị maka akụkọ ndị dị mkpa na mba ụwa taa

  7. Ndịagha sị na ha awakpoola ogige ndị IPOB/ESN dị n'Imo Steeti

    Ndịagha Naịjirịa nọ n’ọrụ a gbara ‘Operation Udoka II’ n’Ọwụwa Anyanwụ kwuru na ha awakpoola ogige ndị Ipob/ESN dị n’Ihioma-Ihittenansa dị n’okpuruọchịchị Orsu nakwa Okigwe nke Imo steeti.

    Nke a dị n'akwụkwọ ozi Jonah Unukhalu bụ ọnụ na-ekwuru ngalaba 'Udo Ka II' wepụtara n'ụbọchị Fraịde 6 Ọktoba, 2023.

    O kwuru na oge ha na-eme nke a, na ogbunigwe gbatara ụgbọala ndịagha mana o nweghi onye merụrụ ahụ.

    Ọ gara n’ihu kwuo na ha ụfọdụ ndị otu kwatara mgbọ ebe ọtụtụ n’ime ha bucha mgbọ egbe n’ahụ gbaa ọsọ dịka ha nwuchiri mmadụ abụọ.

    Ndịagha sị na anatara ụfọdụ ngwo ngwo n’aka ndị a nke gụnyere; ogbunigwe, egbe na mgbọ, uwe ndịagha, ihe onyonyo CCTV, ọgbatumtum abụọ, ekwentị asatọ tinyere ụlọ ebe nchụ aja atọ nọ n’ogige nke ha mebiri.

    Na mpaghara nke Ihioma dị n’Orsu, ha zutere ndị otu a n’akụkụ ahịa Ekeụtụtụ dịka ha malitere ịgbe egbe. O kwuru na ndi bucha mgbọ egbe gbaba n’ime ọhịa Lilu.

    O kwuru na ha kpachiri ihe onyonyo CCTV abụọ ma chụpụ ndị otu a site n’ahịa Ekeututu.

    Unakhalu gara n’ihu kwuo na agha ha na-ebu megide ntọrị, mpụ, igbu mmadụ n’ihi ọgwụego na mpaghara Ọwụwa Anyanwu site n’atụmatụ Udo Ka II agaghị akwụsị.

    O kpọkuru ndị bi na mpaghara ahụ ka ha na-aga mkpa

  8. Nnyocha nke abụọ egosila akaebe ọgwụike n'ọbara Pogba

    Nnyocha nke abụọ e mere n'ọbara Paul Pogba egosila na akaebe ọgwụ a machiri amachị bụ 'testosterone' n'ahụ ya.

    Akwụsịburu Drogba ịgba bọọlụ nwa mgbe nta n'ọnwa gara aga dịka nnyocha nke mbụ e mere gosiri na 'testosterone' dị n'ahụ ya karịrị ole o kwesịrị ịha.

    Ahọpụtara Pogba maka nnyocha a dịka a gbachara asọmpi Juventus na Udinese n'ụbọchị 20 nke ọnwa Ọgọst 2023. Pogba esoghi gbaa asọmpi ahụ, mana a họpụtara ya maka nnyocha dịka a na-eme n'egwuregwu bọọlụ kwa mgbe kwa mgbe.

    Ọ bụrụ na a ma Pogba ikpe maka ịṅụ ọgwụ ike, e nwereike ịmachi ya ịgba egwuregwu bọọlụ ruo ihe dịka afọ abụọ maọbụ afọ anọ.

    'Testosterone' bụ ọgwụ na-eme ka ndị na-eme egwuregwu na-enwewanye ume n'egwuregwu.

    N'oge ahụ, onye nnọchiteanya Pogba bụ Rafaela Pimenta kwuru na "ihe doro anya bụ na onweghị mgbe Pogba ji kpachara anya chọọ imebi iwu".

    Juventus zụtara Pogba site n'otu egwuregwu Manchester United n'ọnwa Julaị 2022 na nkwekọrịta afọ anọ, mana oge Pogba nọrọ na Juventus juputara na mmerụahụ oge niile.

    Mmerụahụ a mere ka ọ ghara iso mba ya bụ Fransị gaa asọmpi iko mba ụwa nke afọ gara aga na mba Qatar.

    N'afọ a, Pogba agbaala naanị nkeji 51 n'asọmpi abụọ, tupu mmerụ ahụ ya alọghachikwa.

  9. Narges Mohammadi eritela nturuugo Nobel Peace Prize 2023

    Kọmitii na-ahụ maka nturuugo ‘Nobel Peace Prize’ ekwupụtala na ọ bụ nwada mba Iran na-ahụ maka ikike dịịrị ụmụnwaanyị bụ Narges Mohammadi ritere nturuugo ahụ nke afọ a.

    Komitii a kwuru na e nyere ya nturuugo ahụ maka ọgụ ọ na-alụ megide mwakpo a na-eme ụmụnwaanyị n’Iran nakwa mbọ ọ na-agba iwulite ikike dịịrị onye.

    Narges Mohammadi bụ nwafọ mba Iran na-ahụ maka ikike dịịrị onye ma bụrụ osote onyeisi ụlọọrụ ‘Center for Human Rights, nke Shirim Ebadi riterela nturuugo Nobel Peace Prize hiwere.

    Narges Mohammadi agaala nga ọtụtụ oge kamgbe afọ 2011 dịka ọ nọ n’ụlọmkpọrọ ọjọọ bụ Evin ugbua maka ebubo “ifesasị akụkọ ụgha.”

    N’afọ a, e tinyere aha ya n’ụmụnwaanyị otu narị BBC na-akwanyere ugwu n’ụwa maka ọrụ pụrụiche ha na-arụ nke a kpọrọ BBC 100 Women Program.

    Komitii a mgbe ha na-ekwupụta nturuugo ya sị na ọ bụ n’ihi “mgbọ ọ na-agba nakwa obi isi ike ya mere o jiri turuugo ahụ.”

  10. Ụlọikpe akụchapụla akwụkwọ PDP gbara megide Alex Otti na LP

    Ụlọikpe e hibere maka ileba anya n'okwu gbasara ntuliaka ọkwa Gọvanọ n'Abịa Steeti akụchapụla akwụkwọ nke ndị Peoples Democratic Party (PDP) gbara megide Alex Otti na otu ndọrọndọrọ ya bụ Labour Party.

    Cheta na ọ bụ Otti ka Inec kpọpụtara dịka onye meriri ntuliaka ahụ bụ nke e mere n'ụbọchị 18 nke ọnwa Maachị 2023.

    Ndị ọkaikpe atọ kpebiri ikpe ahụ, nke onyeisi ha bụ ọkaikpe H.T.D.Gwadah kụchapụrụ ebubo atọ nke PDP boro Otti na LP, ma kwuo na ebubo ndị ahụ achịtaghị aja.

    Ebubo atọ ahụ gụnyere: na Otti etozughi etozu ịzọ ọkwa gọvanọ; na e nwere nnukwu nrụrụaka na ntuliaka ahụ; na Otti enwetazughi vootu iji merie ya bụ ntuliaka.

    Ọkaikpe Gwadah kwuru na PDP egosighi ihe akaebe zuru oke iji kwadoo ebubo ha na-ebo.

    O kwukwara na ebubo gbasara ntuliaka imeụlọ nke ndị otu LP mere iji họpụta Otti dịka onye ga-anọchite anya ha na ntuliaka, abụghị ihe ha ga-eleba anya dịka 'tribunal'.

    Alex Otti nke Labour Party meriri Okechukwu Ahiwe nke PDP na Ikechi Emenike nke APC iji turu ugo na ntuliaka ahụ ma bụrụ Gọvanọ Abia Steeti.

  11. Gọọmenti etiti mezuzie nkwa ha kwere anyị kemgbe afọ atọ - Ndị nkuzi

    Otu na elekọta ndi nkuzị na Niajịrịa NUT, agwaala gọọmentị Niajịrịa ha mezuo nkwa ha kwere ha na 2020.

    Ọnu na ekwuru NUT bụ Titus Amba kwuru nke a na ụbochị amapụtara ịji kene ndị nkuzi na ụwa nile (world teacher’s day) emere na tọzde na Abuja.

    O kwuru nke a mgbe onyeịsịala Naijịrịa Bola Ahmed Tunubu kwere ndi nzụzị nkwa na aga amalite ị kwọ ha ụkwọ ọru ha na ụwa,

    Tinubu gwara ndi nkuzị na ọ kwesiri ka akwanyere ha ugwu ma nye ha nsopuru ruru ha.

  12. Ọrịa otoro agbagbuola mmadụ otu narị na Zimbabwe

    Ndi ọchịchị Zimbabwe amaala ịwụ ịji kwụsị mfesa ọrịa otoro bu cholera n'ala ha dika akuko na-ekwu na ọria ahụ egbụola mmadu nari na mba ahu.

    Usoro ha mapụtara iji gbochi ọria a bụ, ị machi ọgbakọ ọtụtụ mmadu n’ebe ana eli ozu n’ime akuku obodo ndị enwere ntiwapụ ọria a.

    Otutu obodo na Zimabawe nakwa isi obodo bụ Harare so n'ebe ọria a na akpọtụ,

    Gọọmentị amachiela ịkwekọrịta aka nakwa ịke nrị ebe ana eli ozu dika usoro eji ebuso ọria ahu agha.

    Mịnịsta ahuike kwuru ubosi wenesde na n’ime mmadu 4,600 ana enyocha enyocha, na o doola anya na mmadu 905 bu ku ọria ahu.

    Ọria otoro aburula ihe na etịwapụ na Zimbabwe kwamgbe kwambge.

    N'afọ 2008 na 2009, ọria otoro gburu ihe kariri mmadu 4,200, ma fezuo ịhe ruru mmadu 100,000.

  13. Ndị nchekwa ekeela nkwụcha maka nchabi ikpe ntuliaka ọkwa Gọvanọ Abia Steeti

    Ndị uweojii Abia Steeti ekwuola na ha adịla njikere maka nchabi ikpe ntuliaka ọkwa Gọvanọ Abia Steeti nke dị n’etiti Labour Party na Peoples Democratic Party (PDP) na Tọzde 6 Ọktoba 2023.

    Nke a na-abịa dịka ndị nkwa Gọvanọ Alex Otti nke LP na Okey Ahaiwe nke PDP na-agbarịta egbe ọnụ banyere etu ikpe ahụ ga-esi gaa.

    Mana ọnụ na-ekwuru ndị uweojii bụ Maureen Chinaka kwuru na nke e bụ eziokwu ma sị na ha na-ememina onye ọbụla chọrọ ibute ọgbaghara n’ụzọ ọbụla na steeti ahụ.

    Ọ gwara ndị Abia ka ha gaa mkpa dịịrị ha ma ghara itinye aka n’ihe nwereike ibute ọgbaghara n’ụzọ ọbụla.

    Dịka ọ dị ugbua, ndị ọrụ nchekwa jupụtara na gburugburu ụlọikpe ukwu dị n’Umuahịa bụ ebe a ga-anọ kpee ikpe ahụ bụkwanụ ebe ọtụtụ ụlọọrụ gọọmenti dị.

    Cheta na oge e mere ntuliaka ọkwa gọvanọ n’ọnwa Maachị, Alex Otti nke Labour Party meriri Okey Ahaiwe nke PDP na ndị ọzọ so zọo ọkwa ahụ.

    Mmeri a ga-abụ mbụ a ga-anapụ PDP ọkwa ọchịchị n’Abia Steeti kamgbe afọ iri abụọ na anọ.

    Ahaiwe na PDP anabataghị mmeri a nke mere ha jiri gaa n’ụlọikpe banyere ntuliaka ahụ.

  14. Naịra adaala ọzọ ma a tụnyere ya dọla na akwụkwọ ego ndị ọzọ

    Ego Nịjịrịa bụ naịra adaala ajo ada n'etiti ego mbaụwa ndị ọzọ dika ụlọakụ mbaụwa (worldbank) siri kwuo.

    Ha mere ka anyi mata na naira ji pasenti ịrị anọ (40%) daa n'okpuru dọla kamgbe ọnwa juun 2023.

    Ụloakụ mbaụwa kọwara nke a na mkparitaụka ha hiwere ịji kọọwa nsogbu nke akụnaụba mba Afrịka nke ha kpọro ‘’Africa’s Pulse’’ nke ọnwa Ọktoba 2023 nke agba 28.

    Ụlọakụ mbaụwa kwuru na kemgbe afọ 2023, ego Naịjirịa bụ naịra na ego Angola bụ Kwanza bụ ego kachasị adaa n'Afrịka niile.

    ‘’Ọdida naịra bidoro mgbe ụlọakụ etiti Naịjịrịa wepụrụ iwu ji mmekọrịta ha na mba ndị ọzọ n'ahia ego, kwanza bidoro ịda mgbe ụlọakụ mba ha kwụsịrị ịlekọta ego ha anya n’ịhi ọdịda ego mmanu ụgboala n'obodo ha nakwa ụgwọ obodo ha ji bụ nke ha kwụrụ.

    Ego ndi ọzọ dara ada na mbaụwa bụ, ego ndị South Sudan (33%), ego ndị Burundi (27%), ego ndị Democratic Republic of Congo (18%), Kenya (16%), Zambia (12%), Ghana (12%) nakwa Rwanda (11%).

    Ọ dị mkpa ka anyi maara na ahia na-ahụ maka ego na mbaụwa a kpọọ parallel market so n'ihe na-ewete ọdida n'akụnaụba ụfodu obodo na mba Afrịka.

  15. A nwụchiela mmadụ 400 mere ngagharịiwe megide onyeisiala mba Egypt

    Ejichiela ihe luru mmadu 400 na Egypt maka ihe mmberede sitere na ngagharịiwe ha mere mgbe onyeisiala Abdul Fattah al Sisi kwuru na o nwere mmasi ịzọ ọchịchị nke ugboro ato.

    Okwu Onyeisiala Sisi kpalitere iwe n'obi ndị mmadu, nke mere ndị obodo jiri malite ngagharịiwe na mpaghara Ọdịda Anyawụ Marsa Matrouh nke e gosiri n'ihe oyonyo e nwetere na ngagharịiwe ahu.

    N'ihe oyonyo e wepụtara, a hụrụ ebe ndi mmadu na-eti mkpu n'oke olu na-asị Onyeisiala ''Sisi pụọ'' Ihe onyonyo ọzọ zikwara ebe ndị na-eme ngagharịiwe na ndị uweojii na-alụ ogu.

    Ụlọ ntaakụkọ Al-Manassa dere na ode-akwukwo Marsa Matrouh Bar Association siri na anwụchiela umuntoroọbịa 400.

    Onye a bụbu ọchịagha Abudul al-Sisi anoọla n'ọchịchị kamgbe 2013.

    Ọ bara n'ọchịchị mgbe o nyere aka chụpụ onyeisiala mbu bụ Mohammed Morsi n'ọkwa ahụ site n'ịgba ọchịchị ya mgba okpuru.

    Ndi obodo kwuru na ọchịchị Sisi jupụtatara na mmegbu na mkpagbu nakwa ọdịda akụnaụba Egypt.

    Egypt ga-eme ntuliaka iji họpụta onyeisiala ha n'ọnwa Disemba.

  16. Morocco ga-eso mba Spain na Portugal hazie asọmpi Iko Mbaụwa 2030

    Otu na-ahazi egwuregwu bọọlụ Fifa ekwuola na mba Morocco ga-eso hazie asọmpi Iko Mbaụwa nke afọ 2030 ha na mba Spain na Portugal.

    Nke a ga-abụ ugboro abụọ mba Afrịka ga-ahazi asọmpi a dịka mba South Afrịka bụ mba nke mbụ mere ya n’Afrịka n’afọ 2010.

    Mba Uruguay, Argentina na Paraguay ga-ahazi asọmpi mbụ iji cheta afọ otu narị nke asọmpi a.

    Mba Morocco, Spain na Portugal gbakọtara aka ọnụ nwete ohere ịhazi asọmpi a nke afọ 2030.

    Asọmpi Iko Mbaụwa nke mbụ a gbara bụ na mba Uruguay ka a gbara ya bụ kwanụ mba mbụ ga-amabute iko a.

    Nke a bụ mbụ a ga-agba Iko Mbaụwa na mba isii dị na kọntịnent isii.

    “Otu na-achị FIFA ekwekọrịtala na mba Morocco, Portugal na Spain ga-ahazi asọmpi Iko Mbaụwa nke afọ 2030, tinyere na mba ndị a etozuola oke iso gbaa ya,” FIFA kwuru.

    “Tinyere, iji cheta asọmpi Iko Mbaụwa nke mbụ, FIFA kwekọrịtara ime emume ncheta afọ otu narị asọmpi a malitere n’isiobodo mba Uruguay bụ Montevideo...nakwa asọmpi ndị a ga-agba n’Uruguay, Argentina nakwa Paraguay.”

    Argentina bụ ndị ji iko a ugbua site n’asọmpi nke a gbara na Qatar 2022.

  17. Etu onye a họpụtara n'ọkwa minista si daa n’ala mgbe ndị omeiwu na-enyocha ya

    Balarabe Abbas Lawal bụ onye a họpụtara ịbụ minista dara n’ala n’otu ntabi anya dịka ndị ụlọomeiwu na-enyocha ya.

    Nwamadị a bụ onye Kaduna Steeti akwụrụla ọtọ ma kwuo okwu ọtụtụ oge mgbe a na-eme nyocha ahụ tupu ọ daa n’ala nke mere e jiri gbatara ya aka enyemaka.

    Lawal so n’otu n’ime mmadụ atọ a họpụtara n’ọkwa minista ọhụrụ am ndị ọzọ gụnyere Jamila Bio Ibrahim nke Kwara Steeti na Ayodele Olawande nke Onodo Steeti.

    O kwuchaala okwu n’ụlọomeiwu bụ ebe ọ kọwara onwe ya mana mgbe Sịnetọ nke Kaduna South bụ Sunday Marshal na-ekwu na ha enweghi nsogbu banyere nhọpụta ya, mgbe ahụ ka Lawal dara n’ala.

    A gwara ndị ntaakụkọ nọ n’ụlọomeiwu ka ha pụọ dịka a na-agba mbọ itute Lawal.

  18. Ndị ekperima a tọrọla ụmụakwụkwọ ụmụagbọghọ ise na mahadum Katsina Steeti.

    Ndị ekperima atọrọla Ihe ruru ụmụakwụkwọ ụmụnwaanyị ise nke mahadum Federal UniversityDutsinna Katsina Steeti.

    Ndị uweojii kwuru na nke a mere n’ezie kama na ha anwụchiela otu n’ime ndị ekperima a.

    A tọọrọ ụmụakwụkwọ ndị a n’ebe obibi ha dị n’azụ ụlọakwụkwọ Mariamoh Ajiri Memorial Internationaln’okporoụzọ Tsakiya.

    Akụkọ kwuru na a tọọrọ ụmụakwụkwọ a ndị a mgbe o ji ọkara gafee elekere abụọ nke isi ụtụtụ (02:30am).

    Ọnụ na-ekwuru ndị uweojii bụ Abubakar Sadiq kwuru na ha a nwụchiela otu onye a na-enyo enyo so ndị a ma sị na nyocha ka na-aga n’ihu ugbua.

    Ọ gara n’ihu kwuo na ha na-agbasi mbọ ike ịzọpụta ụmụakwụkwọ ndị a.

  19. Kevin McCarthy: A chutuola onyeisi Ụlọnnochiteanya Amerịka

    A chutuola Kevin McCarthy nke otu 'Republican' n'ọkwa ya dịka Onyeisi Ụlọnnochiteanya nke mba Amerịka.

    Nke a bụ mbụ a na-achụtu Onyeisi Ụlọomeiwu Nta mba ahụ n'ọkwa dịka nwa amadi ahụ nwetara vootu 210, ebe ndị achọghị ya tụtara vootu 216 na vootu ndị nwere ntụkwasa obi na ya na ndị enweghị a tụrụ na nsonso a.

    Ndị omeiwu nọ na pati ya so na ndị tụrụ vootu megide ya dịka McCarthy na ụfọdụ ndị senetọ si pati 'Democrat' nwere nkwekọrịta etu a ga-esi enweta ego e ji akwado ụfọdụ ngalaba gọọmentI.

    O dobeghị anya ugbua onye ga-anọchi McCarthy mana ụlọomeiwu Amerika nwere naanị abalị 40 inweta onye ga-anọ n'ọkwa ahụ.

    E meghị otu ahụ, nsogbu imechi gọọmentị nwere ike ịdapụta.

    Omeiwu 'Republican' bụ Matt Gaetz bụ onye ọdịnamma Donald Trump bụ onye kpalitere atụmatụ ịchụtu McCarthy n'ụbọchị Mọnde.

    Gaetz boro McCarthy ebubo ịzụ okwe nzuzo ka a gaa n'ihu were ego na-akwado mba Ukraine.

    Mana Mc Carthy gọ®ọ na ọ bụghị eziokwu.

    McCarthy gwara ndị ndọ®ọndọ®ọ Ọchịchị si Republican n'ọgbakọ ha nwere na mgbede Tuezde na ya enweghị atụmatụ ọbụla ịzọ ọkwa Onyeisi Ụlọnnọchiteanya ọzọ.

  20. Ndewonu, Igbo ndị ọma!

    Ndewonu, ụmụ Igbo ndị ọma anyị ji eme ọnụ!

    Bianụ sonyere anyị ebe a maka akụkọ ndị dị mkpa taa.