Sam Anyanwu ga-arịtu n'ọkwa dịka odeakwụkwọ PDP - BoT
Ndị isi na-achịkọta otu ndọrọndọrọ ọchịchị 'Peoples Democratic Party' (PDP) akpọọla oku ka Samuel Anyanwu gbaa arụkwaghịm dịka odeakwụkwọ pati ahụ, ebe ọ bụ na ọ bụ ya ji ọkọlọtọ pati ahụ azọ ọkwa gọvanọ Imo Steeti.
Otu a bụ 'Board of Trustees' (BoT) kwuru na ọ bụ ihe megidere iwu pati ahụ mmadụ iji ọkwa abụọ n'otu oge.
N'akwụkwọ ozi nke ndị BoT a wepụtara n'ụbọchị Fraịde, nke onyeisioche BoT bụ Adolphus Wabara binyere aka na ya, o kwuru na ha bụ ndị okenye agaghị anọrọ na-ele anya ka ihe mebie na pati ha.
"Ọ bụ ọrụ anyị ịkpọ ndị isi pati anyị ma dụzie ha nke ọma mgbe ha na-emehie ma na-eme ihe iwu anyị akwadoghị," Wabara dere.
"Anyị na-agwa ndị otu 'National Working Committee' ka ha mee ihe kwesịrị ime ngwangwa ma hụ na onye na-azọ ọkwa gọvanọ Imo steeti n'aha pati anyị (bụ Samuel Anyanwu) rituru n'ọkwa odeakwụkwọ pati anyị na-egbughị oge, ma gbado anya na ndọrọndọrọ nke ọ na-azọ bụ nke na-eruzighị ụbọchị 30 ugbua."
Cheta na ntuliaka ọkwa gọvanọ Imo Steeti ga-adị n'ụbọchị 11 nke ọnwa Nọvemba afọ 2023.
Samuel Anyanwu nke PDP na-ele anya ịchụpụ gọvanọ ji ọchịchị ugbua n'Imo steeti, bụ Hope Uzodinma nke pati 'All Progressives Congress' (APC).