You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.

Take me to the main website

Ụmụnwaanyị Naịjirịa emeriela ndị Ethiopia 4-0 n'asọmpi itozu oke maka Olympics 2024

Nchịkọta akụkọ ndị gbapụtara ihe nke mere na Naịjirịa, Afrịka nakwa mbaụwa niile n'ọnwa Ọktoba.

Mkpuchi Na Eme Ozugbo

Ikechukwu Kalu, Chukwunaeme Obiejesi, Uche Akolisa, Jessica Nwankwo and Adline Okere

  1. Ọkụ agbaala n'ahịa Ebonyi International Market

    Ọku agbaala ahia ukwu dí n'Ebonyi steetị a ma dịka ‘’Magaret Umahi international market’’

    Dịka akuko sịrị kwuo, ngwa ahịa ruru ọtụtụ nde naịra nara n'iyi n'ọkụ ahụ gbara.

    Onyeisi otu akụkụ ahịa ahụ akpọrọ Lot 1 bụ maazi Peter Oba kwuru na ọku bidoro gbaba ebe elekere abuọ nke etịtị abalị n’ịme ọdọahịa ukwu a na-ebusa ngwa ahịa gụnyere nri ntacha dịka biskit.

    Oba kwuru na mbọ niile ndị ọrụ mmenyụọkụ gbara ịkwụsị ya bụ ọkụ raara ahụ dịka ọkụ ahụ ka na-efesa n'ọdọahịa ukwu ndị ọzọ.

    Onye ntaakụkọ BBC gara ebe ahụ hụrụ ebe ụfọdụ ụgbọala ndị ọrụ mmenyụọkụ kwụ ebe ahụ nakwa ndị na-azụ ahịa na-ebe arịrị maka ngwa ahịa ha nara n'iyi.

    Otu onye nwere ọdọ ahịa ebe ahụ aha ya bụ Jude Okechukwu sị na nnukwu ihe fụnarịrị n'ihi na ọkụ ahụ nke malitere ịgba n'elekere abụọ akwụsịghị n'agbanyeghi mbọ niile a na-agba imenyụ ya.

    O ji ohere ahụ kpọọ gọọmentị oku enyemaka ihu na e nwere ezi nchekwa n'ahịa ha.

  2. Ndị uweojii anwụchiela onye otu ha gbara egbe n'ahịa Ladipo dị na Legọs

    Ndị uweojii Legọs steeti ekwuola na ha anwụchiela onye otu ha ihe onyonyo gosiri ka ọ na-agbali egbe elu n'ahịa Ladipo oge e mepegharịrị ya.

    Ọnụ na-ekwuru ndị uweojii Legọs bụ Benjamin Hundeyin depụtara nke a n'akara soshal midia X ma sị na aha onye uweojii ahụ bụ Istifanus Kwanchi nke ngalaba MOPOL.

    Ọ gara n'ihu kwuo na nwamadị a ga-azara ọnụ ma kwuo na ndị uweojii katọrọ agwa ọ kpara bụ nke ọ sị megidere iwu na-achịkwa ọrụ ha.

    Cheta na ihe onyonyo malitere ifesa na sohal midia gosiri ka nwamadị a na-agbali egbe elu dịka ndị na-azụ ahịa na Ladipo na-enwe aṅụrị na e mepere ahịa ahụ bụ gọọmentị Legọs steeti mechiri kamgbe otu ọnwa.

  3. Nnọọ na peeji anyị taa

    Anyị ji n'aka na ụbọchị taa ga-amara gị mma.

  4. Daalụ nụ

    I meela sonyere anyị taa.

    Echi ga-abụ echi ọma.

    Ka chi fonu.

  5. Ụnụ anakwala ụgbọala SUV nde naịra 160 - Abure gwara ndị omeiwu LP

    Onyeisioche otu ndọrọndọrọ ọchịchị 'Labour Party' bụ Julius Abure agwala ndị omeiwu pati ahụ ka ha ghara iso nara ụgbọala SUV ọnụahịa ya bụ nde naịra 160 bụ nke a na-enye ndị omeiwu 360 niile n'ụlọ omeiwu nta Naịjirịa.

    N'akwụkwọ ozi o zipụrụ n'ụbọchị Tuzde, Abure kwuru na ndị omeiwu ikesara onwe ha ụgbọala dara oke ọnụ gosiri na ha anaghị eche maka ọdị mma ndị Naịjirịa.

    N'ime ụbọchị olemole gara aga, akụkọ pụtara na ndị isi ụlọ omeiwu Naịjirịa na-akpa atụmatụ ịzụta ụgbọala SUV Toyota Land Cruiser ndị e mepụtara n'afọ 2023 maka ndị sinetọ 109, na ụgbọala Toyota Prado maka ndị omeiwu nta ọnụọgụgụ ha dị 360.

    Mana Abure kwuru na ya bụ atụmatụ bụ nnukwu ihe mwute na ihe nkụda obi ma gosikwa na ndị ọchịchị Naịjirịa achọghị ịma ihe nhịahụ ndị mmadụ na-agabiga na Naịjirịa.

    "Anyị na-akpọku ndị omeiwu Labour Party n'ụlọomeiwu ka ha kwụdosie ike na ntọala pati anyị ma jụ ịkwado ụdị mmefu ego a n'ụzọ enweghị isi. Ndị Naịjirịa niile ga-ejide ha ma taa ha ụta ma ọ bụrụ na ha jụ idopụ onwe ha iche ma mejupụtakwa okwukwa ndị mmadụ nwere n'ime ha wee tụnyere ha vootu na ntuliaka," Abure kwuru.

    "Ọ bụ ihe mwute na dịka ịda ogbenye na-akwanye njọ na Naịjirịa, ndị ọchịchị anyị na-abawanye oke ọchịchọ ha site n'igosipụta ndụ ọgaranya, nke bụ ịkwa emo nye ọtụtụ ụmụ Naịjirịa.

    "Ụgbọala ndị a ga-efu Naịjirịa ihe dịka ijeri naịra 57.6, bịakwa na-eme n'oge gọọmentị na-ekwu na ha enweghị ike ibuli ụgwọ ọnwa opekatampe ndị ọrụ nke bụ naanị puku naịra 30.

    "Etu ihe dị ugbua, mgbali elu ọnụahịa ihe na Naịjirịa ga-eru pasentị 30 n'ebe ọnwa Disemba 2023, mana naanị ihe dị ndị ọchịchị anyị mkpa bụ etụ mmadụ olemole n'ime ha bụ ndị nọ n'ọkwa dị elu ga-esi nọrọ mma karịa."

  6. Tinubu ahọpụtala Musa Aliyu dịka onyeisioche ICPC

    Onyeisiala Bola Ahmed Tinubu ahọpụtala ọkaiwu Musa Adamu Aliyu dịka onyeisioche ọhụrụ nke ụlọọrụ mgbochi nrụrụrụaka bụ 'Independent Corrupt Practices and Other Related Offences Commission' (ICPC).

    N'akwụkwọ ozi si n'aka ọnụ na-ekwuru Tinubu bụ Ajuri Ngelale, o kwuru na a họpụtakwala Mazị Clifford Okwudiri Oparaodu dịka odeakwụkwọ ICPC.

    Aliyu bụbu ọkaiwu kachasị nakwa kọmishọna ikpe ziri ezi nke Jigawa Steeti tupu Tinubu enye ya ọkwa ọhụrụ a.

    "Nhọpụta a bụ iji gaa n'ihu n'atụmatụ 'Renewed Hope' nke gụnyere iwugharị ngalaba gọọmentị dị mkpa nakwa ịkwalite agha megide nrụrụaka na Naịjirịa," Ngelale dere.

    Mazị Aliyu ga-agabiga nnyocha pụrụ iche n'aka ụlọ omeiwu sineti tupu ọ malite ọrụ ya n'uju, mana Mazị Oparaodu ga-amalite ọrụ ya na-egbughị oge n'ihi na nhọpụta nke ya adabereghị na nnyocha ndị omeiwu.

    Onyeisiala gwara ndị isi ụlọọrụ ICPC ka ha kwụba aka ha ọtọ ma rụọ ọrụ ja na-atụghị egwu ọbụla maọbụ ile onye ọbụla anya n'ihu.

    Aliyu ga-anọchi anya Bolaji Owasanoye bụ onye bụ onyeisioche ICPC kamgbe ọnwa Jenụarị afọ 2018.

  7. Ụlọikpe kachasị na mba India ajụla ịkwado ọlụlụ di nwunye n'etiti ndị bụ otu ụdị okike

    Olileanya ọtụtụ ndị LGBTQ+ na mba India dakpọrọ dịka ụlọikpe kachasị na mba ahụ jụrụ ịkwado ọlụlụ di nwunye n'etiti ndị bụ otu ụdị okike.

    Kama inye nkwado a, ụlọikpe ahụ nabatara atụmatụ gọọmentị ihibe kọmiti ga-eleba okwu ahụ anya iji mara etu a ga-esi nyekwuo ndị dị otu a ikike na nkwado iwu.

    N'ọnwa Eprel na Mee, ndị ọkaikpe ise nke ụlọikpe kachasị lebara anya na mkpesa 21 nke ụfọdụ ndị LGBTQ+ wetara, ma na-ekwu na a na-akpaso ha agwa dịka ndị ezughị oke n'obodo n'ihi na ha enweghị ike ịlụ onwe ha.

    Mana gọọmentị India nakwa ndị isi okpukperechi dị icheiche na-ekwusi ike na ụlọikpe kachasị enweghị ikike ikwu na ụdị alụmdi na nwunye a n'etiti bụ otu ụdị okike bụ ihe ziri ezi n'iwu, maka na ha mee ya, o nwereike ịkpata nnukwu ọgbaaghara. Ha kwuru na ọ bụ naanị ụlọ omeiwu mba ahụ nwere ikike ileba okwu ahụ anya.

    Na mkpebi ikpe ha n'ụbọchị Tuzde, ndị ọkaikpe ahụ kwenyere n'ihe gọọmentị kwuru, dịka ha kwuru na ọ bụ ndị omeiwu ka ọ dịịrị ime iwu, ebe ọrụ ndị ọkaikpe bụ ịkọwa ihe iwu kwuru.

    Mmadụ abụọ n'ime ndị ọkaikpe ise ahụ, nke gụnyere Onyeisi ọkaikpe DY Chandrachud, kwadoro ka ndị chọrọ ịlụ ụdị okike ha nwee ikike dị nhatanha ka di na nwunye ndị ọzọ. Mana ndị ọkaikpe atọ ndị ọzọ akwadoghị nke a.

    Ọtụtụ ndị nkwado LGBTQ+ kwuru na mkpebi a ụlọikpe nyere kụdara mmụọ ha.

    "Agara m n'ụlọikpe taa na nnukwu olileanya, mana dịka m na-ege ntị ka ndị ọkaikpe ahụ na-agụpụta mkpebi ha, ọ bụụrụ m ihe nnukeu nkụda obi. Olileanya m niile gbazere," Sharif Rangnekar, onye nkwado ndị gay kwuru.

    N'aka nke ọzọ, Adish Aggarwala, onyeisi otu jikọrọ ndị ọkaiwu nke ụlọikpe kachasị, kwuru na obi dị ya ụtọ na ụlọikpe ahụ anabatala nrụrịtaụka nke gọọmentị nke bụ na ha enweghị ikike ịkwado mmekọrịta n'etiti ndị bụ otu ụdị okike.

    "Ikike ahụ dị naanị n'aka ndị omeiwu India, obi dị anyị ụtọ na ụlọikpe kwenyeere anyị na nke a," ka o kwuru.

  8. A tụọla nwoke ise nga maka igbu isi maka ọgwụ ego

    Ụlọikpe atụọla ụmụnwoke ise mkpọrọ afọ 12, afọ 12 maka ịbọpụta ma gburu isi mmadụ maka iji ya gwọọ ọgwụ ego.

    ụmụnwoke ndị a bụ ndị enwetara isi mmadụ n'akpa ha bu kwetara ezie na ha mere nke a.

    Onye wetara ya bụ ikpe n'ụlọikpe gwara ụlọikpe ahụ na ụmụnwoke ise ahụ gara gwupụta ozu e liri afọ atọ gara aga n'ebe ndị na-ekpe ụka Alakụba na-eli ozu na Niger steeti.

    Ha kwuru na ọ bụ dibia ha mee nke a ma kwee ha nkwa na ha ga-eke akụ ga-esi etu ahụ bịara ha ma ọ bụrụ ha ha weta isi mmadụ.

    Mana aka ndị ọrụ nchekwa kpara ha dịka ha bu ya aga ebe dibia gwara ha.

    A nwuchighị dibia ahụ nke a na-akpụpụ ya ụlọikpe.

    Cheta na ọgwụ na ọgwụ ego na-eme na na mpaghara dịiche iche dịka ụfọdụ nwere nkwenye na mmadụ nwere ike isite n'ịgwọ ọgwụ kpata ego.

  9. Unu emeela

    Igbo ndị ọma, mgbasaozi nke taa abịala n'isi njedebe.

    Sonyere anyị ọzọ n'elekere asatọ nke ụtụtụ Tuzde.

    Ka chi fonu.

  10. Ọtụtụ ebe dara chakoo n'Aba, Umuahia n'ihi egwu ndị ojiegbe yiri

    Ọtụtụ ndị mmadụ apụtaghị ezi n'ụbọchị Mọnde a bụ ụbọchị 16 nke ọnwa Ọktoba na mpaghara Aba na Umuahia nke Abia steeti, n'ihi egwu mwakpo ndị ojiegbe.

    Nke a na-abịa dịka onyonyo fesara na ngwụcha izuụka gara aga ebe ndị ojiegbe kpuchichara ihu ha na-eyi ndị mmaọ̄ụ egwu ma na-ekwu na onye ọbụla ga-apụta n'ezi n'ụbọchị Mọnde a ga-ahụ ihe o mere onwe ya.

    Onye ntaakụkọ anyị kpagharịrị na mpaghara dị icheiche n'Aba hụrụ na ọtụtụ okporoụzọ tọgbọ chakoo, ọtụtụ ahịa mechiri emechi, ndị ụlọụka agaghị.

    Cheta na iwu mmachi mkpagharị n'ụbọchị Mọnde na mpaghara ọwụwụa anyanwụ Naịjirịa, bụ ihe otu na-azọ nnwereonwe Biafra bụ Ipob tinyere iji gosi iwe ha maka njide gọọmentị Naịjirịa jidere onyeisi ha bụ Mazi Nnamdi Kanu n'ọnwa Jun afọ 2021.

    Mana ka ọtụtụ oge gachara, ndị mmaọ̄ụ bidokwara ịpụta n'ụbọchị Mọnde na mpaghara dị icheiche, ọ kacha Aba, Umuahia, Abakiliki, Awka na ebe ndị ọzọ.

    Mana na ngwụcha izuụka ka otu onyonyo fesara na soshal midia ebe ụmụ okorobịa bucha nnukwu egbe, kpuchichaa ihu ha, na-eyi ndị mmadụ egwu.

    Ndị uweojii wepụtakwara akwụkwọ ozi iji gwa ndị mmadụ ka ha ghara ịtụ egwu ọbụla maka na ndị uweojii ekeela nkwụcha ma dị njikere iweta ezi nchekwa.

    Mana ọ dị ka ndị mmadụ egeghị ntị n'ozi ahụ, dịka ebe niile gbara chakoo n'ụbọchị Mọnde na mpaghara Aba na Umuahia. Naanị mmadụ olemole obi kara pụtara kpọsa ngwaahịa ha.

    Ndị ọrụ gọọmentị bi nso n'ụlọọrụ ha gakwara ọrụ n'Umuahia, dịka onye ntaakụkọ anyị si chọpụta, mana ndị ụlọ ha tere aka n'ụlọọrụ ha agaghị ọrụ taa.

    Lee etu Aba dị taa:

    Ọnọdụ enweghị nchekwa akwanyela njọ n'ọdị nso a na mpaghara ọwụwa anyanwụ Naịjirịa, bụ ebe ndị otu Ipob na-azọ nnwereonwe Biafra.

    Otu ndị ojiegbe dị icheiche na-ewepụta onyonyo iji kpọọ gọọmentị Naịjirịa ka a tọhapụ onyeisi Ipob bụ Nnamdi Kanu, onye nọrọ n'ụlọ mkpọrọ n'Abuja, isi obodo Naịjirịa ihe karịrị afọ abụọ ugbua.

    Gọọmentị Naịjirịa kpọpụtara Ipob dịka otu a machiri amachi, ma kpọkwaa ha ndị na-eyi ndụ egwu. Nke a so n'ebubo ha na-ebo Nnamdi Kanu, tinyekwara ebubo ịkpa nkata iji kụsaa ọchịchị onye kwuo uche ya na Naịjirịa.

    Otu Ipob ekwuola ugboro ugboro na ha abụghị otu na-akpata ọgbaaghara, kama ọ bụ usoro udo ka ha ji achọ nnwereonwe Biafra.

    Mana n'afọ 2020 ka Nnamdi Kanu hibere otu ọ kpọrọ 'Eastern Security Network' (ESN) bụ ndị o kwuru na ọrụ ha bụ ichekwa mpaghara ọwụwa anyanwụ maka mwkpo nke ndị ọchịehi na-awakpo ọtụtụobodo na mpaghara ahụ.

    Ndị ọrụ nchekwa Naịjirịa, tinyere ndị uweojii na ndị agha, na-ebo ebubo na ọ bụ ndị ọtụ ESN a na-akpata nnukwu ọnọdụ nchekwa ọjọọ dị na mpaghara ahụ ugbua.

  11. Ụlọikpe mkpegharị achụọla Elisha Abbo ọsọ ụkwụ eru ala n'ụlọ Sineti

    Ụlọikpe mkpegharị dị n'Abuja achụpụla Elisha Ishaku Abbo dịka onye na-anọchite anya mpaghara Adamawa North n'ụlọ sineti Naịjirịa.

    Ụlọọrụ nhazi ntuliaka bụ Inec kpọpụtara Abbo dịka onye meriri ntuliaka nke e mere n'ụbọchị 25 nke ọnwa Febrụwarị afọ 2023, mana ụlọikpe mkpegharị kwuru n'ụbọchị Mọnde, Ọctoba 16 na ọ bụghị Abbo, onye pati ya bụ 'All Progressives Congress', meriri ntuliaka ahụ.

    Ha kwuru na ọ bụ Amos Yohanna nke nọ n'otu ndọrọndọrọ 'Peoples Democratic Party' (PDP) meriri ntuliaka ahụ. Cheta na ikpe gbasara ntuliaka ọkwa ndị omeiwu bụ n'ụlọikpe mkpegharị ka ọ na-akwụsị, ọ naghị agaru ụlọikpe kachasị.

    N'afọ 2019, aha mazị Elisha Abbo wuru ewu na soshal midia Naịjirịa dịka otu onyonyo pụtara nke gosiri ebe ọ na-eti otu nwaanyị ihe n'ime otu ụlọahịa n'Abuja.

    Ka onyonyo ahụ fesara, Abbo mechara rịọ mgbaghara ma kwuo na ya mejọrọ.

    Okwu ahụ gara n'ụlọikpe ebe ọkaikpe mara Abbo ikpe ma nye iwu na ọ ga-akwụ nwaanyị ahụ ọ mara ụra nde naịra 50.

  12. Mgbali elu ọnụahịa ihe na Naịjirịa ruru pasentị 26.72 n'ọnwa Septemba

    Ọnụ ahịa ihe na Naịjirịa ka na-arịkwa elu n'ike n'ike dịka ngụkọ nke ụlọọrụ 'National Bureau of Statistics' (NBS) mere si gosi.

    Ngụkọ a nke a na-akpọ 'Consumer Price Index' gosiri na ọ bụ ọnụ ahịa ihe oriri kacha rịa elu n'etiti ọnwa ọgọst na ọnwa Septemba 2023.

    N'Ọgọst, mgbali elu ọnụahịa dị na pasentị 25.80, mana o jiri pasentị 0.92 rịa elu n'ọnwa Sepụtemba dịka ọ nọzi na pasentị 26.72.

    Iji tụnyere etu ihe dị n'ọnwa Sepụtemba nke afọ 2022, ngụkọ gosiri na ọnụahịa ihe ji pasentị 5.94 gbalie elu na Septemba 2023.

    Na ntule ọnụahịa ihe oriri naanị, mgbali elu kwụ na pasentị 30.64, nke ji pasentị 7.30 kara elu karịa etu ọ dị n'ọnwa Sepụtemba nke afọ gara aga bụ pasnrụ 23.34.

    Mgbali elu ọnụ ahịa ihe dị icheiche kawanyere njọ kamgbe onyeisiala Bola Tinubu kwuru na gọọmentị ga-akwụsị ịkwụ ụgwọ ha na-akwụbu iji butuo ọnụahịa mmanụ ụgbọala, nke a kpọrọ 'fuel subsidy' na bekee.

    Nke a bịara mee ka ọnụahịa mmanụ ụgbọala rịa site na naịra 140 maọbụ 150 ruo ebe naịra 620. Nke a mere ka ọnụahịa njem ụgbọala gbalikwaa, nakwa ọtụtụ ihe ndị ọzọ.

    Otu jikọrọ ndị ọrụ na Naịjirịa bụ Nigeria Labour Congress (NLC) kwuburu na ha ga-amalite abụbụ ọrụ n'ụbọchị atọ nke ọnwa Ọktoba 2023 n'ihi nnukwu nhịahụ ndị ọrụ na-agabiga maka ọnọdụ akụnaba ọjọọ Naịjirịa nọ na ya ugbua. Mana ha kwuru na ha akagbuola atụmatụ ahụ dịka gọọmentị kwere nkwa ilebanye n'etu a ga-esi bulie ụgwọ ọnwa ndị ọrụ.

  13. Ka chi fonu

    Anyị abịala n'isi njedebe mgbasaozi nke taa.

    Daalụ maka isonyere anyị.

    Echi ga-aka mma.

  14. NIMC akwụsịtụla ụlọọrụ ndị ọzọ idebanye aha ndị mmadụ maka akara NIN

    Ụlọọrụ 'National Identity Management Commission (NIMC) ekwuola na ha akwụsịtụla ikike ha nyere ụfọdụ ụlọọrụ idebanye aha ndị mmadụ maka inweta akara njirimara bụ 'National Identity Number' (NIN).

    Nke a si n'akwụkwọ ozi nke onyeisi Nimc bụ Abisoye Coker-Odusote wepụtara n'Abụja n'ọdị nso a, bụ ebe ọ nọrọ kọwaa na ha malitere atụmatụ inyochagharị ụlọọrụ ndị ha nyere ikike idebanye aha ndị mmadụ maka NIN.

    "Nnyochagharị a bụ iji gosipụta na Nimc na-akpachapụ anya nke ukwu iji chekwaa ozi niile ndị mmadụ na-etinye n'ọbaozi ha. Atụmatụ a ga-emekwa ka usoro ndebanye aha maka akara NIN dịwanye mma, ma wepụkwa mperi niile anyị chọpụtara n'usoro ndebanye aha ahụ," Coker-Odusote kwuru.

    "N'ihi nke a, anyị akwụsịtụla ụlọọrụ niile bụ ndị anyị nyeburu ikike idebanye aha ndị mmadụ maka inweta akara NIN, ruo oge anyị ga-emecha nnyochagharị a ma wepụta mpụtara ya."

    Onyeisi NIMC kwere nkwa na ha etinyela ihe niile dị mkpa iji hụ na ha ga-emecha nnyochagharị a n'oge na-adịghị anya.

    Coker-Odusote gara n'ihu kwuo na nke a emetụtaghị usoro ọrụ nke ụlọọrụ NIMC n'ụzọ ọbụla.

    "Ndebanye aha nakwa ọrụ ndị ọzọ NIMC na-arụ ka na-aga n'ihu n'ụlọọrụ NIMC niile dị n'okpuru ọchịchị nakwa steeti niile na Naịjirịa, dịka anyị na-agbakwa mbọ iwepụta usoro ka mma maka ndị bi na mba ofesi," ka o kwuru.

  15. Ahụ mara mụ na Chioma jijiji mgbe a gwara anyị na anyị ga-amụ ejima - Davido

    Otiegwu Naịjirịa bụ David Adeleke, onye a ma dika Davido, akọọla akụkọ gbasara ụmụ ejima nje ya na nwunye ya bụ Chioma nabatara n'ọdịnso a.

    Davido kwuru nke a na mkparịtaụka nke ya na ndị ntaakụkọ n'emume UnitedMasters SelectCon 005 nke e mere n'ụlọ ezumezu New York Terminal 5 Venue n'ụbọchị 14 nke ọnwa Ọktoba 2023.

    O kwuru na oge ha chọpụtara na ọ bụ ụmụ ejima ka Chioma dị ime ya, ahụ na-ama ha jijiji.

    Davido kwukwara okwu banyere nwa ha nwoke bụ Ifeanyi, onye lara mmụọ n'ọnwa Ọktoba 2022, ma kwuo na ụmụ ejima ha bịakwara n'ọnwa Ọktoba 2023.

    O kwuru na ihe ahụ mere ya na Chioma bụ ụdị ihe nwereike ime ka mmadụ kwụsị inwe okwukwe n'ebe Chineke nọ, mana ya onwe ya ka nwere okwukwe. Ọzọkwa bụ na o nwere ọtụtụ ndị ezigbo mmadụ gbara ya gburugburu.

    O meela izuụka olemole akụkọ malitere ifesa gbasara Davido na Chioma na ụmụ ejima ha, mana onweghị onye matara nke bụ eziokwu ruo n'ụbọchị Fraịde, mgbe otu onyonyo pụtara na soshal midia nke gosiri ebe Chioma na Davido si n'ụlọọgwụ na-ala.

    N'onyonyo ahụ, Chioma nọ ala na 'wheelchair' ma kuru ụmụaka abụọ n'aka.

  16. Onye bụ nwa okorobịa a dị afọ 24 onyeisiala Tinubu mere onyeisi Ferma?

    Onyeisiala Bola Ahmed Tinubu ahọpụtala otu nwa okorobịa dị afọ 24 aha ya bụ Imam Ibrahim Kashim dịka onyeisi otu na-elekọta ụlọọrụ nruzi okporo ụzọ bụ 'Federal Road Maintenance Agency (Ferma).

    Ọnụ na-ekwuru Tinubu bụ Ajuri Ngelale kwupụtara nke a n'ụbọchị Fraịde, nke mere aha nwata nwoke ahụ ji malite na-ewu ewu na soshal midia.

    Ngelale kwukwara na Tinubu họpụtara Njinia Chukwuemeka Agbasi dịka 'Director General' Ferma na mmadụ iri ọzọ dịka ndị otu 'board' nke ụlọọrụ ahụ.

    Ọrụ Ferma bụ ilekọta okporoụzọ niile nke gọọmentị etiti nwe, ma na-arụzikwa ha ka ha ghara imebi kpam kpam.

    Onye bụ Imam Ibrahim Kashim Imam?

    • A mụrụ ya n'ụbọchị 27 nke ọnwa Disemba afọ 1998
    • Ọ bụ nwa Kashim Ibrahim-Imam onye bụ onyeisioche 'Tertiary Education Trust Fund' (Tetfund) ugbua.
    • Ọ gụrụ akwụkwọ mahadum na Mahadum Brighton na mba UK, bụ ebe o nwetara nzere 'first glass' na ngalaba ọmụmụ 'Mechanical Engineering'. O nwekwara nzere 'Master's Degree na 'Engineering' sie n'otu mahadm ahụ.
    • O fere Naịjirịa otu afọ, nke a na-akpọ 'National Youth Service' na bekee, malite n'afọ 2021 ruo 2022
    • Ọ bụbu onye enyemaka pụrụ iche nke Dave Umahi, bụ Mịnịsta na-ahụ maka ọrụ, nakwa aka chịburu Ebonyi Steeti
  17. Etu ‘Transformer’ si gbaa, gbagbuo mmadụ isii

    Arịrị na iru ụjụ abadola ndị bi n’ogbe ebe igwe na-enye ọkụ Bekee kpọrọ ‘transformer’ gbara n’ụtụtụ ụbọchị Satode gbagbuo o pekata mpe mmadụ isii.

    Ndị bi na Kabong dị Gada Biyu n’ Okpuru Ọchịchị Jos-North dị na Plateau Steeti na-ebo ebubo na ihe butere ọgbụgba igwe ọkụ ahụ bụ na e were ọkụ ha n’abalị Fraide n’ebe Elekere iri ma weta ọkụ ahụ n’ebe ogogo ya (voltage ) dị elu n’ime ndeeri ebe Elekere abụọ nke isi ụtụtụ nke mere ka igwe ọkụ ahụ gbaa, ma nwuru ọkụ.

    Ọkụ ahụ na ihe ọdụdọ si n’ọkụ ahụ gburu mmadụ ma gbakwa ụfọdụ ụlọ na ọdọahịa ọkụ.

    Oge BBC kpọrọ ya, ọnụ na-ekwuru ndị uweojii steeti ahụ bụ Alfred Alabo sịrị na ya bụ ihe mere n’ezie ma kwukwa na " O pekata mpe mmadụ isii nwụrụ".

  18. A gbapụtala ụmụakwụkwọ mahadum Gusau a tọọrọ

    Ndịagha Naijiria ekwuola na ha azọpụtala ụfọdụ ụmụakwụkwọ mahadum 'Federal University Gusau, dị na Zamfara Steeti a tọọrọ n’abalị 14 nke ọnwa Oktoba.

    Ndị ekperima wakporo ụmụakwụkwọ ndị ahụ na Sabon Gida na mpaghara Damba dị n’Okpuru Ọchịchị Gusau oge ha nọ n’ụra.

    Ọnụ na-ekwuru otu ndịagha a kpọrọ’Wilderness Command’, Captin Ibrahim Yahaya siri n'ozi o wepụtara na ha gbapụtaliri ụmụakwụkwọ ndị ahụ n’ihi na ha zara oku gbatagbata ngwangwa ha nwetara ya.

    Ozi ahụ sirị, "Ndị agha chụsoro ndị ekperima ahụ, h na ha kwaa mgbọ n’ebe Elekere 12 nke mere ka ndị omekataraihedaaụjọ ahụ gbalaga, hapụ ụmụakwụkwọ."

    Ndịagha zọpụtara ụmụakwụkwọ abụọ, ebe ụmụakwụkwọ abụọ bụ ndị gbalahụrụ ndị ntọ ahụ n’onwe ha.

    Na nso nso a, ndị agha nnupụisi mụtara ịwakpo mahadum, tọọrọ ụmụakwụwkwọ.

    N’ọnwa Septemba, ha wakporo mahadum 'Federal University of Gusau' tọọrọ ụmụakwụkwọ n’ebe obibi ha.

  19. Ndeewonụ, ndị ọma!

    Igbo ndị ọma, anyị ekele!

    Ndewoonu!

    Izụka ọhụrụ a mara anyị nile mma!

  20. Ka ọ dị echi

    Igbo ndị ọma, daalụ maka isonyere anyị taa.

    Echi bụkwa ụbọchị ọzọ.

    Ka ọ dị echi.