Ọtụtụ ndị mmadụ apụtaghị ezi n'ụbọchị Mọnde a bụ ụbọchị 16 nke ọnwa Ọktoba na mpaghara Aba na Umuahia nke Abia steeti, n'ihi egwu mwakpo ndị ojiegbe.
Nke a na-abịa dịka onyonyo fesara na ngwụcha izuụka gara aga ebe ndị ojiegbe kpuchichara ihu ha na-eyi ndị mmaọ̄ụ egwu ma na-ekwu na onye ọbụla ga-apụta n'ezi n'ụbọchị Mọnde a ga-ahụ ihe o mere onwe ya.
Onye ntaakụkọ anyị kpagharịrị na mpaghara dị icheiche n'Aba hụrụ na ọtụtụ okporoụzọ tọgbọ chakoo, ọtụtụ ahịa mechiri emechi, ndị ụlọụka agaghị.
Cheta na iwu mmachi mkpagharị n'ụbọchị Mọnde na mpaghara ọwụwụa anyanwụ Naịjirịa, bụ ihe otu na-azọ nnwereonwe Biafra bụ Ipob tinyere iji gosi iwe ha maka njide gọọmentị Naịjirịa jidere onyeisi ha bụ Mazi Nnamdi Kanu n'ọnwa Jun afọ 2021.
Mana ka ọtụtụ oge gachara, ndị mmaọ̄ụ bidokwara ịpụta n'ụbọchị Mọnde na mpaghara dị icheiche, ọ kacha Aba, Umuahia, Abakiliki, Awka na ebe ndị ọzọ.
Mana na ngwụcha izuụka ka otu onyonyo fesara na soshal midia ebe ụmụ okorobịa bucha nnukwu egbe, kpuchichaa ihu ha, na-eyi ndị mmadụ egwu.
Ndị uweojii wepụtakwara akwụkwọ ozi iji gwa ndị mmadụ ka ha ghara ịtụ egwu ọbụla maka na ndị uweojii ekeela nkwụcha ma dị njikere iweta ezi nchekwa.
Mana ọ dị ka ndị mmadụ egeghị ntị n'ozi ahụ, dịka ebe niile gbara chakoo n'ụbọchị Mọnde na mpaghara Aba na Umuahia. Naanị mmadụ olemole obi kara pụtara kpọsa ngwaahịa ha.
Ndị ọrụ gọọmentị bi nso n'ụlọọrụ ha gakwara ọrụ n'Umuahia, dịka onye ntaakụkọ anyị si chọpụta, mana ndị ụlọ ha tere aka n'ụlọọrụ ha agaghị ọrụ taa.
Ọnọdụ enweghị nchekwa akwanyela njọ n'ọdị nso a na mpaghara ọwụwa anyanwụ Naịjirịa, bụ ebe ndị otu Ipob na-azọ nnwereonwe Biafra.
Otu ndị ojiegbe dị icheiche na-ewepụta onyonyo iji kpọọ gọọmentị Naịjirịa ka a tọhapụ onyeisi Ipob bụ Nnamdi Kanu, onye nọrọ n'ụlọ mkpọrọ n'Abuja, isi obodo Naịjirịa ihe karịrị afọ abụọ ugbua.
Gọọmentị Naịjirịa kpọpụtara Ipob dịka otu a machiri amachi, ma kpọkwaa ha ndị na-eyi ndụ egwu. Nke a so n'ebubo ha na-ebo Nnamdi Kanu, tinyekwara ebubo ịkpa nkata iji kụsaa ọchịchị onye kwuo uche ya na Naịjirịa.
Otu Ipob ekwuola ugboro ugboro na ha abụghị otu na-akpata ọgbaaghara, kama ọ bụ usoro udo ka ha ji achọ nnwereonwe Biafra.
Mana n'afọ 2020 ka Nnamdi Kanu hibere otu ọ kpọrọ 'Eastern Security Network' (ESN) bụ ndị o kwuru na ọrụ ha bụ ichekwa mpaghara ọwụwa anyanwụ maka mwkpo nke ndị ọchịehi na-awakpo ọtụtụobodo na mpaghara ahụ.
Ndị ọrụ nchekwa Naịjirịa, tinyere ndị uweojii na ndị agha, na-ebo ebubo na ọ bụ ndị ọtụ ESN a na-akpata nnukwu ọnọdụ nchekwa ọjọọ dị na mpaghara ahụ ugbua.