You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.

Take me to the main website

Ụmụnwaanyị Naịjirịa emeriela ndị Ethiopia 4-0 n'asọmpi itozu oke maka Olympics 2024

Nchịkọta akụkọ ndị gbapụtara ihe nke mere na Naịjirịa, Afrịka nakwa mbaụwa niile n'ọnwa Ọktoba.

Mkpuchi Na Eme Ozugbo

Ikechukwu Kalu, Chukwunaeme Obiejesi, Uche Akolisa, Jessica Nwankwo and Adline Okere

  1. A tụọla otu ọchịagha nga afo asaa maka izupu ego

    Ụlọikpe ndị agha pụrụiche amaala otu ọchịagha ikpe maka izupu ego ruru ijeri naira atọ (3bn).

    Ọchịagha Umaru Mohammed bụbu onye na-elekọta ngalaba ala na ụlọ nke ndị agha ga-aga nga afọ asaa maka nrụrụ aka na nzupu ego.

    Ụlọikpe ahụ gwakwara Mohammed ya kwụghachi nde dọlla abụọ nakwa otu ijeri naira.

    Ikpe mara ya n'ebube iri na anọ n'ime iri na asatọ gbadoro ụkwụ n'izupu ego nke e boro ya.

    Onye okaiwu ya rịọrọ ụlọikpe ahụ ka ha kwe ka o nọọ oge ya na mkpọrọ nkịtị mana ụlọikpe jụrụ ajụ sị na ọ ga-anọ na mkpọrọ pụrụiche nke ndị agha.

  2. Ị boola chi

    Daalụ maka isonye anyị na peeji anyị taa.

    Akụko dị ọkụ ka o si dị ọkụ na mba ụwa niile ka ga-ewetara gi.

    Gbado anya

  3. Ka chi fonu

    Igbo ndị ọma, n'ebe a ka anyị ga-apịachi nke taa.

    Sonyere anyị ọzọ n'elekere asatọ nke ụtụtụ Wenezde.

    Ya gazie.

  4. Pope akpọọla ụkọchukwu ụka Katọlik na Gaza, kasie ya obi dịka ọgụ ka na-ada

    Pope Francis akpọọla ụkọchukwu na-elekọta ndị ụka Katọlik na Gaza bụ ụkọchukwu Gabriel Romanelli iji kasie ya obi maka ọgụ na-aga n'ihu na mpaghara ahụ ugbua.

    Romanelli kwuru na Pope Francis gwara ya na ọ na-ekpe ekpere "ka udo chịa n'etiti Israel na Palestine", nakwa "ka mwakpo nke egbe na ogbunigwe dajụọ", n'ihi na "iyi ndụ egwu na agha agaghị eweta ogbugbo ọbụla".

    Ụkọchukwu ahụ kwueu na Pope Francis kpọkwara ya ụnyaahụ iji jụọ ese etu ndị ụka ya si eme.

    Ka ọ dị ugbua, ụkọchukwu ahụ kwuru na ya tọrọ atọ na Bethlehem ebe ọ gara ịụta ọgwụ na ihe ndị ọzọ maka ndị ụka ya, mana ya enwenwughị ike ịlaghachi Gaza.

    O kwuru na ihe ruru mmadụ 150 gbara ọsọ ndụ nọ n'ụlọụka ya ugbua na-ezere ndụ.

    Ihe ruru mmadụ puku atọ anwụọla n'ọgụ a dapụtara n'etiti Hamas na Israel dịka ndị otu Hamas, bụ otu ndị ọgụ alakụba na mba Palestine wakporo Israel site na mpaghara Gaza n'ụbọchị Satọde.

    N'ụbọchị Sọnde, Pope Francis kwuru na obi ya na-agara ndị niile ọgbaaghara ahụ metụtara nakwa ndị na-agabiga ihe egwu na nnukwu nhịahụ.

    "Onweghị onye na-emeri n'agha ọbụla," Pope Francis kwuru na mgbasaozi ahụ. "Ka anyị na-ekpe ekpere maka udo n'Israel na Palestine."

  5. Neco ewepụtala mpụtara ule SSCE nke afọ 2023

    Ụlọọrụ 'National Examination Council' (Neco) ewepụtala mpụtara ule 'Senior School Certificate Examination' (SSCE) nke afọ 2023.

    Onye ji ọkwa Registrar na Neco bụ Dantani Wushishi kwuru na mpụtara ule nke afọ a so na nke kacha mma na nsonso a.

    Wushishi kwuru na ọnụọgụgụ ndị denyere aha maka ile ule Neco n'afọ a dị 1,205,888, mana ndị lere ya bụ ule dị 1,196,985 n'ọnụọgụgụ. Ụmụnwoke dị n'ọnụọgụgụ a dị 616,398 ebe ụmụnwaanyị dị 580,587.

    N'ime ọnụọgụgụ a, mmadụ 737,308 nwetara akara 'credit' na ngalaba ọmụmụ ise, nke gụnyere asụsụ bekee na mgbakọ na mwepu.

    Nke a pụtara na ndị mere nke ọma n'ule nke afọ a bụ pasentị 61.60 ndị niile lere ya bụ ule.

    Wushishi kwukwara na ọnụọgụgụ ụmụakwụkwọ achọpụtara na ha mere mpụ ule n'ụzọ dị icheiche dị puku 12,030, nke bụ pasentị 0.07 ndị niile lere ule ahụ.

    Etu ị ga-esi chọpụta mpụtara ule Neco gị

    • Gaa na websaịt Neco bụ: https://results.neco.gov.ng/
    • Họrọ ụdị ule nke i lere nakwa afọ i lere ya
    • Tinye akara pụrụ iche nke ụlọọrụ Neco ziteere gị n'ekwentị
    • Tinye akara ule gị
    • Pịa aka n'ebe e dere “Check my result”
  6. Ndị ojiegbe atọrọla ụmụakwụkwọ anọ na Mahadum Nasarawa Steeti

    Ndị ojiegbe awakpola ebe ụmụakwụkwọ na-ebi n'ụlọakwụkwọ Mahadum nasarawa Steeti dị na Keffi, ma tọrọ ụmụakwụkwọ anọ.

    Nke a mere na mpaghara a kpọrọ Angwan Kare dị n'okpuruọchịchị Keffi n'ụbọchị Tuzde.

    Ọnụ na-ekwuru ndị uweojii steeti ahụ bụ Ramhan Nansel gwara ndị ntaakụkọ na ndị uweojii nwetara ozi mkpesa maka mwakpo a n'isi ụtụtụ ụbọchị Tuzde dịka a gwara ha na ndị ojiegbe awakpola ụlọ obibi ụmụakwụkwọ.

    "Mbọ niile anyị gbara ijide ndị mere mwakpo a enweghị isi mana ndị ọrụ nchekwa nke gụnyere ndị uweojii na ndị agha amalitela ịchọ ha iji zọpụta ụmụ akwụkwọ ahụ a tọọrọ," Nansel kwuru.

    Ụmụakwụkwọ niiile ahụ a tọọrọ bụcha ndị nọ n'afọ nke mbụ ha n'ụlọakwụkwọ ahụ.

    Aha ha bụ Rahila Hanya - na-agụ na ngalaba 'Science Laboratory Technology'; Josephine Gersho - na-agụ 'Computer Science'; Rosemary Samuel - na-agụ 'Business Administration'; na Goodness Samuel na-agụ 'Geography'.

  7. Etu ndị ekperima si zuo mmadụ ohi, kwapụ ya na keke, ụgbọala arịa ya elu n'Aba

    Nnukwu ihe egwu mere n'okporoụzọ si Aba gawa Owerri n'ụtụtụ ụbọchị Tuzde a, dịka otu nwoke lara mmụọ oge ọ dabachara n'aka ndị ekperima.

    Ndị nọ ebe ihe a mere kwuru na nwoke ahụ dabara n'aka ndị ekperima ji ọgbatumtum ụkwụ atọ ezu ohi, ka ha zuchara nwoke ahụ ohi, ha kwapụrụ ya n'ụgbọala ahụ n'etiti okporoụzọ, otu nnukwu ụgbọala na-abịa n'azụ wee rịa ya elu.

    Nwoke ahụ nwụrụ ozugbo ahụ n'okporoụzọ ahụ. Ihe a mere n'ebe elekere iri n'ọkara nke ụtụtụ Tuzde.

    Ken Nwosu, bụ otu n'ime ndị isi otu jikọrọ na-agba keke n'Abia steeti, gwara onye ntaakụkọ BBC na o teela ha bụ ndị na-agba keke ji etiku gọọmentị mkpu enyemaka maka etu ndị ekperima si eji keke ezu ndị mmadụ ohi.

    Nwosu gwakwara ndị mmadụ ka ha ghara ị na-abanye keke nke na-enweghị akara njirimara. O kwuru na onye ọbụla chọrọ iji ọgbatumtum ụkwụ atọ akpata ego kwesịrị ibu ụzọ bịa denye aha ya n'otu 'Abia State Tricycle Operators Union' (ASTOPU).

    "Anyị ga-amatacha ihe niile gbasara onye ahụ ka ọ ga-abụ ọ bụrụ na ụdị ihe dị otu a mee, anyị ga-ama kpọmkwem etu nakwa onye mere ya," Nwosu kwuru.

    Ọdachia merenụ butere nnukwu kpachikpachi okporoụzọ na mpaghara ahụ ruo mgbe ndị uweojii nke ngalaba Abayi bịara bupu ozu nwoke ahụ n'okporoụzọ.

    Oge BBC kpọrọ ọnụ na-ekwuru ndị uweojii Abia Steeti bụ Maureen Chinaka, o kwuru na ya anụbeghị mkpesa ọbụla maka ihe a merenụ, mana ya ga-ezighachitere anyị ozi ngwangwa ọ chọpụtara ihe merenụ.

    Nke a abụghị nke mbụ akụkọ gbasara ndị ekperima na-eji ọgbatumtum ụkwụ atọ awakpo ndị mmadụ na-apụta n'Aba, Abia Steeti.

  8. APC Bayelsa ga-agbagha nchụpụ Timipre Sylva n'ụlọikpe mkpegharị

    Otu ndọrọndọrọ ọchịchị 'All Progressives Congress' nke Bayelsa Steeti ekwuola na ha ga-aga ụlọikpe mkpegharị iji gbaghaa mkpebi nke ụlọikpe ukwu dị n'Abuja nyere bụ nke kwuru na Timipre Sylva agaghị eso zọọ ntuliaka ọkwa gọvanọ steeti ahụ.

    Ọnụ na-ekwuru APC Bayelsa steeti bụ Perry Tukuwei kwuru na onye wegara mkpesa ahụ n'ụlọikpe bụ Demesuoyefa Kolomo abụghị onye APC kama ọ bụ ory 'Peoples Democratic Party'.

    Tukuwei kwukwara na oge agafeela e kwesịrị iji weta mkpesa ọbụla megide ndị na-azọ ntuliaka, maka na iwu Naịjirịa kwuru na mkpesa ọbụla kwesịrị irute ụlọikpe aka n'ime ụbọchị 14 Inec ji wepụta aha ndị kwesiri iso zọọ ntuliaka.

    "Inec wepụtara aha ndị ga-eso zọọ ọkwa gọvanọ na Bayelsa, Imo na Kogi Steeti n'ụbọchị 12 nke ọnwa Mee 2023, mana Kolomo wegara mkpesa ya n'ụlọikpe n'ụbọchị 13 nke ọnwa June 2023. Nke a pụtara na oge iwu nyere maka mkpesa dị etu a agafeela," Tukuwei kwuru.

    Ọ gara n'ihu kwukwaa na ụlọikpe kachasị enyela iwu na ikpe niile gbasara ntuliaka ga-abụ na steeti ebe a nọrọ mee ntuliaka ka a ga-anọ kpee ikpe ya, "mana iji gosi na ndị mere mkpesa a bu ihe ọjọọ n'obi, ha wegara ikpe a n'Abuja. Abuja ọ bụ Bayelsa?"

    Tukuwei kwuru na ha enyela ndị ọkaiwu ha iwu ka ha gbaghaa mkpebi ụlọikpe ahụ n'ụlọikpe mkpegharị iji kụchapụ ya.

  9. France akwarala lawa na mba Niger taa

    Ndị agha nọ n'ọchịchị na mba Niger ekwuola na ọpụpụ ndị agha mba Fransị ga-amalite n'ụbọchị Tusde.

    Adịghị mma batara n'etiti mba abụọ a kemgbe a napụrụ onyeisiala Mohamed Bazoum nke mba ahụ ọchịchị n'ike.

    Ihe ruru ndị agha mba Fransị 1500 nọ na mba Niger na-enyere ha aka ịlụso ndị oyinduegwu al-Qaeda nakwa Islamic state ọgụ.

    Ndị agha nọ n'ọchịchị agwabuola mba Fransị ha kwara laa n'ọnwa Ọgọọst mana onyeisiala mba Fransị bụ Emmanuel Macron jụrụ ajụ ma mechaa kwere ma kwuo na ha ga-apụ kpam kpam na ngwụcha afọ 2023.

    Ndị agha ọchịchị Niger na-ebo mba Fransị ebubo ị kpa nkata ị weghachite onyeisiala Bazoum n'ọchịchị n'ike.

  10. Ihe mere ụlọikpe ji kwuo na Timipre Sylva agaghị eso zọọ ọkwa gọvanọ na Bayelsa

    Ụlọikpe ukwu dị n'Abuja achụpụla Timipre Sylva dịka onye ga-eji ọkọlọtọ otu ndọrọndọrọ ọchịchị 'All Progressives Congress' (APC) zọọ ọkwa gọvanọ Bayelsa Steeti na ntuliaka a ga-eme n'ụbọchị 11 nke ọnwa Nọvemba.

    Ọkaikpe Donatus Okorowo nyere mkpebi a n'ụbọchị Mọnde, dịka otu onye APC aha ya bụ Deme Kolomo wegara mkpesa n'ụlọikpe ma kwuo na Sylva ekwesịghị iso zọọ ọkwa gọvanọ ọzọ.

    Ụlọikpe ahụ kwuru na e duola Timipre Sylva n'iyi ọrụ dịka Gọvanọ Bayelsa Steeti ugboro abụọ, nke pụtara na ọ bụrụ na o merie ntuliaka nke afọ a, ọ ga-abụ nke ugboro atọ a ga-edu ya n'iyi ọrụ dịka gọvanọ, mana iwu Naịjirịa kwuru na ọ bụ naanị ugboro abụọ ka mmadụ nwereike ịbụ gọvanọ steeti.

    Ọkaikpe Okorowo kwukwara na mgbakọta afọ niile Sylva rụrụla ọrụ dịka gọvanọ Bayelsa Steeti bụ afọ ise, nke pụtara na ọ bụrụ na o merie ntuliaka nke ọnwa Nọvemba 2023, ma gaa n'ihu bụrụ gọvanọ ruo afọ anọ, ọ ga-eweta mgbakọta afọ niile ọ rụrụ ọrụ dịka gọvanọ ruo itoolu, mana iwu Naịjirịa kwuru na mmadụ agaghị abụ gọvanọ steeti karịa mgbakọta afọ asatọ.

    Cheta na Sylva achịbuola Bayelsa Steeti dịka gọvanọ. O meriri ntuliaka nke mbụ ya n'ụbọchị 14 nke ọnwa Eprel afọ 2007 n'otu ndọrọndọrọ ọchịchị 'Peoples Democratic Party' (PDP), e duo ya n'iyi ọrụ n'ụbọchị 29 nke ọnwa Mee afọ ahụ.

    Mana otu onye so zọọ ntuliaka ahụ bụ Ebitimi Amgbare nke pati 'Action Congress (AC) mere mkpesa n'ụlọikpe, nke mere ka ụlọikpe mkpegharị kagbuo ntuliaka ahụ nakwa mmeri nke Sylva meriri, ma nye iwu ka onyeisi ụlọ omeiwu Bayelsa n'oge ahụ bụ Werinipre Seibarugo bụrụ gọvanọ steeti ahụ nke nchereoge.

    N'ụbọchị 24 nke ọnwa Mee afọ 2008, e mere ntuliaka ọzọ dịka ụlọikpe si nye iwu, Timipre Sylva emerikwaa. E duru ya n'iyi ọrụ nke ugboro abụọ n'ụbọchị 27 nke ọnwa Mee afọ ahụ.

    Ọ bụ nke a mere ụlọikpe ji kpebie na e duola Sylva n'iyi ọrụ ugboro abụọ nke bụ ugboro ole iwu Naịjirịa kwuru na a ga-edu mmadụ n'iyi ọrụ dịka gọvanọ.

    O dobeghị anya ma Sylva a ga-agbagha mkpebi a n'ụlọikpe mkpegharị.

    Sylva arụkwaala ọrụ dịka Mịnịsta nta na-ahụ maka mmanụ agbịdị bido n'ọnwa Ọgọst 2019 ruo Maachị 2023.

  11. A ka m kwụ chịm - Gowon

    Aka chịburu ala Naịjiria bụ Yakubu Gowon agọọla akụkọ na-efegharị na ya anwụọla.

    Gowon chịrị dịka onyeisi agha site na 1966 rue 1975 kwuru sị "a ka m kwụ chịm".

    "Hapụnụ akụko ụgha na-efegharị na m anwụọla, ọkwa ị nụla olu m ịmata na m dị ndu" ka o gwara BBC

  12. Unu aboola chi?

    Nnoonu na peeji anyi taa.

  13. Ka chi fo

    Anyị abịala n'isi njedebe mgbasaozi nke taa.

    Sonyere anyị ọzọ echi, n'elekere asatọ nke ụtụtụ.

    Daalụ nụ.

  14. Etu mbuze si gbuo ihe ruru mmadụ 30 na Yaounde, Cameroon

    Opekatampe mmadụ 30 alaala mmụọ n'ihe mberede mbuze mere n'obodo Mbankolo, nke dị na mpaghara Yaounde, bụ isi obodo mba Cameroon.

    Otu ụlọ ntaakụkọ redio na-ekwu na ndị nwụrụ n'ọdachi a eruola 40, ma kwukwaa na a ka na-achọ ọtụtụ achọ.

    Oke ideimmiri ka na-ebu na mpaghara ahụ emeela ka ọrụ enyemaka nke ndị ọrụ gbatagbata siwanye ike, mee ka ndị mmadụ were aka nkịtị na-egwu ala iji zọpụta ndị aja kpuchiri.

    Oke mmiri ozuzo na mpaghara ahụ mere ka osimiri Mefou too tofee oke n'ụbọchị Sọnde nke mere ka ideimmiri tochie ọtụtụ obodo.

    Obodo Mbankolo ebe ọtụtụ ndị bi ebe ahụ bụ ndị ogbenye, ndị ụlọ ha dịcha n'elu ugwu, bụ mpaghara ọdachi a kacha metụta.

    Ymele Guy, otu onye bi na mpaghara ahụ, gwara BBC na nwa ya nwụrụ n'ideimmiri ahụ.

    "Ahụrụ m ihe a, mana dịka m na-akpọ nwunye m na-agwa ya na ihe ọjọọ na-achọ ime, n'otu ntabi anya, mmiri eburula mụ na ụmụ m," Guy kwuru.

    "azọpụtara m nwunye m na ụmụ m atọ, mana mmiri buuru nwa m nke anọ gawara.

    Onye ọzọ aha ya bụ Jouego Catherine kwuru na nwanne ya nwaanyị dị ime ka nọ n'ime ala dịka aja kpuchiri ya.

    "Ahụbeghị nwanne m nwaanyị ruo ugbua. Ọ lụrụ di n'ọnwa Eprel. Ya na ndị ezinụlọ di ya bi, ha dị asaa biri n'ụlọ ahụ. Ha niile nwụrụ. A hụla ozu mmadụ ise n'ime ha, ọ fọdụ ozu nwanne ya nwaanyị na nke otu nwata nwaanyị.

    Mbuze, ụdị nke bekee na-akpọ 'landslide' bụ ihe na-emekarị na mpaghara Yaounde - n'afọ gara aga, ala zekwara ma gbuo opekata mpe mmadụ 14 gara emume olili ozu.

    Ụbịam nakwa ụlọ ndị arụsighị ike emeela ka ọtụtụ obodo dịka Mbankolo na-enwe mmetụta sitere n'ọdachi n'esi n'eligwe dịka oke mmiri ozuzo, nke bụ ihe na-emekarịzi ugbua na mpaghara Afrịka dị icheiche n'ihi mgbanwe ihu eligwe, dịka otu United Nations si kwuo.

  15. Etu ị ga-esi keta oke n'atụmatụ 'conditional cash transfer' nke gọọmentị

    Gọọmentị Naịjirịa ekwuola na a ga-amalite atụmatụ 'conditional cash transfer' n'ụbọchị 17 nke ọnwa Ọktoba afọ a.

    Mịnịsta na-ahụ maka ọdịmma ndị mmadụ na mbelata ụbịam bụ Betty Edu kwuru nke a na mkparịtaụka ya na ụlọ ntaakụọ Channels TV.

    Atụm,atụ a so n'ụzọ dị icheiche gọọmentị etiti kwuru ha si ebelata ahụhụ ndị mmadụ na-ata nakwa nhịahụ so nkwụsị ego gọọmentị na-akwụbu iji butuo ọnụahịa mmanụ ụgbọala na Naịjirịa.

    Kedu etu ndị mmadụ ga-esi keta oke n'atụmatụ a?

    • Gọọmentị kwuru na ndị ga-eso keta ego a bụ bụ ndị ego ha na-enweta kwa ụbọchị erughị $1.95, nke bụ ebe otu puku naịra n'ọkara
    • Aha ndị nọ n'ogogo a dị n'akwụkwọ 'National Social Register'. Akwụkwọ a bụ NSR bụ ebe a na-edekọ aha ndị ụbịam niile nọ n'obodo ọbụla. Steeti dị icheiche nwekwara akwụkwọ NSR nke ha
    • Gọọmentị sị na ha na-eme nnyocha iji hichaa akwụkwọ NSR ma hụ na ndị niile aha ha dị na ya bụ ndị kwesịrị ị na-erite elele dị etu ahụ n'aka gọọmentị. A ga-emecha nke a n'ụbọchị 15 nke Ọktoba
    • Ka ọ dị ugbua, ezinụlọ dị n'akwụkwọ ahụ dị nde 15.7 ebe aha ndị mmadụ dị ebe ahụ ruru nde 62
    • Naanị ọnwa atọ ka gọọmentị ga-akwụ ụgwọ a. Ego ole ha ga na-akwụ bụ puku naịra 25 kwa ọnwa, nke pụtara na ihe gọọmentị ga-akwụ otu onye bụ puku naịra 75 n'ime ọnwa atọ ahụ
    • Gọọmentị kwukwara na ụfọdụ ndị larala ezumike nka ga-eso na ndị ga-erite elele a, mana ndị ọrụ gọọmentị ga-aga dekọta aha ha. Ha ga-amalite inweta ego nke ha n'ọnwa Nọvemba

    Cheta na Onyeisiala Muhammadu Buhari wepụtakwara atụmatụ dị otu a oge ọ nọ n'ọchịchị. N'oge nke ya, Buhari kwuru na ya ga na-akwụ ndị ogbenye puku naịra ise kwa ọnwa.

  16. Afghanistan earthquake: Ihe karịrị mmadụ 1000 anwụọla n'ala ọmajiji n'Afghanistan

    Ala ọmajiji egbuola ihe karịrị mmadụ 1000 na mpahhara Herat na mba Afghanistan, ụbọchị Satode.

    Ka ọ dị ugbua, ndị mmadụ ka ji 'shọwel' egwu ala ị chọ ndị na-efu efu karịị 500 dịka otu United Nations is kwuo.

    N'ụbọchị taa bụ Monde, i he enyemaka ji nwayọọ atụ kpọm n' ebe ihe mere n'ihi mgbubi okporoụzọ nakwa igwe nzirita ozi.

  17. Ka ọ dị echi

    Igbo ndị ọma, daalụnụ maka isonyere anyị taa.

    Sonyere anyị ọzọ n'elekere asatọ nke ụtụtụ Mọnde.

    Ka ọ dị echi.

  18. Gọọmentị Naịjirịa akpọọla oku ka ịlụ ọgụ dere jụụ n'etiti Israel na Hamas

    Gọọmentị Naịjirịa etinyela ọnụ na nnukwu ọgụ na-ada ugbua n'etiti mba Israelna otu Hamas nke mba Palestine, dịka ha kpọrọ oku ka ịlụ ọgụ kwụsị.

    Ihe karịrị mmadụ otu puku alaala mmụọ n'etiti otu abụọ a na-alụ ọgụ, kamgbe ndị ọgụ Hamas mịbanyere na mba Israel site na mpaghara Gaza n'ụbọchị Satọde.

    Yusuf Tuggar bụ Mịnịsta na-ahụ maka mmekọrịta Naịjirịa na mba ndị ọzọ kwuru na ọgbaaghara a na-abawanye n'etiti Israel na Palestine ga-ebute oke ihe ụfụ na ahụhụ dị egwu nye ndị nkịtị na mba abụọ ahụ, nke mere o ji rịọ ka mba abụọ a dere jụụ maka ọdịmma ndị nkịtị.

    Ọ kpọrọ oku ka ndị a na-alụ ọgụ nye ohere maka enyemaka nye ndị merụrụ ahụ, ma kwukwaa ka e nwee mkparịtaụka iji nweta udo.

  19. Nema amaala ọkwa maka ideimmiri ga-eme na steeti dị icheiche

    Ngalaba 'National Emergency Management Agency' (Nema) amaala ọkwa maka ideimmiri ga-amalite na steeti dị icheiche na Naịjirịa dịka mba Cameroon mepere ọdọ mmiri ha bụ 'Lagdo Dam'.

    Onyeisi Nema bụ Mustapha Ahmed dọrọ aka na ntị a dịka ọ na-agwa ndị ntaakụkọ okwu n'Abuja n'ụbọchị Satọde, ma kwuo na ụfọdụ steeti dịka Adamawa, Taraba na Benue amalitela ịhụ ideimmiri na mpaghara ha dị icheiche.

    Ọ kpọrọ oku ka styeeti ndị dị n'akụkọ osimiri Niger na osimiri Benue malite atụmatụ gbatagbata ha na-egbughị oge maka na ha ga-ahụ ideimmiri n'ụbọchị olemole na-abịanụ.

  20. Amerịka, UK ekwela Israel nkwa inye ha nkwado n'agha megide Hamas

    Onyeisiala mba Amerịka bụ Joe Bide, na Praịm Mịnịsta mba UK bụ Rishi Sunak wkewla mba Israel nkwa inye ha nkwado dịka otu Hamas nke mba Palestine wakporo mba ahụ.

    Ozi nke si na 'White House', obi ọchịchị mba Amerịka pụta n'ụbọchị Sọnde kwuru na a kọwaarala Biden na osote ya bụ Kamala Harris etu ihe si kwụrụ na mba Israel ugbua.

    "Ndị ọrụ White House na ndị enyi anyị n'Israel ga-anọgide na mkparịtaụka," akwụkwọ ozi ahụ kwuru. Anyị na na ndị ogo anyị n'Israel na-ekwukọrịta okwu oge niile.

    Odeakwụkwọ mba Amerịka bụ Anthony Blinken gwara ndị ntaakụkọ CBS na ha na-enyocha akụkọ kwuru na ụfọdụ ndị Amerịka so na ndị tụfuru ndụ ha maọbụ ndị otu Ahamas ji eji.

    "Anyị amatabeghị kpọmkwem ma akụkọ a ọ bụ eziokwu ugbua, mana anyị na-agbasi mbọ ike ịma ka anyị ga-esi mata nke ọma," Blinken kwuru.

    N'aka nke ya, Rishi Sunak akọwaala ihe na-eme n'Israel dịka ihe oke egwu na-eme ngwangwa, ma kwukwaa na "onweghị onye chọrọ ka ọnọdụ kawanye njọ na mpaghara ahụ".

    Sunak gwara ndị ntaakụkọ na ya kwụdosiri ike n'okwu ya "na ọ bụ Hamas na ndị nkwado ha ka ụta niile dịịrị maka mwakpo iyi ndụ gwu, ogbugbu ndị nkịtị na ntọrọ ndị aka ha dị ọcha nke gụnyere ụmụntakịrị".

    O kwuru na ya gwara Praịm Mịnịsta Israel bụ Benjamin Netanyahu na gọmentị UK "ga-eme ihe niile anyị nwereike iji nye aka", nakwa na mba UK "kwụdosiri ike ịkwado Israel, nakwa ikike dịịrị ha ichekwa one ha".

    Ọ gara n'ihu kwuo na gọọmentị UK na ndị ọchịchị mba Israel na-enwe mkparịtaụka gbasara ọnọdụ ndị UK nọ n'Israel.