You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.
Tebụlụ na-egosi usoro etu a ga-esi gbaa asọmpi Iko Mbaụwa nke afọ 2026
Asọmpi egwuregwu bọọlụ Iko Mbaụwa nke FIFA na-ahazi ga-ebiri ọkụ n'ụbọchị Tọzde 11 Juun 2026 ma kụrụ ọnụ n'ụbọchị 19 Julaị 2026.
A ga-agba asọmpi a nke agba iri abụọ na atọ a na mba atọ gụnyere Amerịka, Kanada na Mezziko.
Iko Mbaụwa nke afọ a ga-abụ nke mbụ a ga-enwe otu egwuregwu bọọlụ si mba iri anọ na asatọ nke a ga-agba na mba atọ dị iche iche.
N'oge mbụ, naanị mba iri atọ na abụọ na-etozuoke isonye n'asọmpi ahụ. Mana nke ugbua a gbatịkwuru nyere ohere mba ndị na-abịabeghi na mbụ isonye ugbua.
Bọọlụ a ga-eji agba asọmpi a nwere akụrụngwa tekịnụzụ ọhụrụ nke nwere ngụkọ ọsịsọ ruru ogogo narị ise, a na-akwụnye bọọlụ ahụ n'ọkụ latrik ka ọ rụọ ọrụ n'uju.