You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.
Ndịagha Naịjirịa azọpụtala ụmụnwaanyị na ụmụaka 360 ndị na-eyi ọha egwu tọọrọ na Borno steeti
Ndị ọrụ nchekwa Naịjirịa bụ Northeast Joint Task Force, Operation HADIN KAI ekwuola na ha azọpụtala mmadụ narị atọ na iri isii site n'ogige ndị na-eyi ọha egwu nke ndị otu Jama'atu Ahlis Sunna Lidda'awati wal-Jihad (JAS) dị na mpaghara ugwu Mandara na ndịda Borno steeti.
N'ozi nke ọnụ na-ekwuchitere otu ndị ọrụ nchekwa ahụ bụ Lieutenant Colonel Haruna M. Sani kwupụtara nke a n'ụbọchị Sọnde 7 Juun, kọwara zọpụta ahụ dịka nke mịtara mkpụrụ n'ihi ọtụtụ izu e ji kpokọta ozi nzuzo, nledo anya, na nhazi ọrụ ndịagha.
O kwuru na nke a mere ka ha zọpụta ụmụnoke, ụmụnwaanyị na ụmụaka na-enweghị mmerụ ahụ ọbụla.
Ọ gara n'ihu kwuo na ndị omekome ahụ tọọrọ ndị ahụ site n'obodo dị iche iche ọkachasị na mpaghara ndị dị na Ngoshe ma dosaa ndị a n'ọnọdụ ọjọọ.
Sani kwuru na ụmụaka abụọ nwụrụ n'ihi oke ike ọgwụgwụ nakwa oke ahụhụ ha tara n'ogologo oge ha nọrọ n'aka ndị na-eyi ọha egwu.
"A kpọpụtara ndị ọzọ na-enweghị mmerụ ahụ, kpọga ha n'ebe nchekwa dị mma maka nlekọta ahụike na enyemaka," ka Sani kwuru n'ozi ahụ.
N'aka nke ọzọ, ndịisi ndịagha jara ndị ọrụ nchekwa niile ike maka mbọ ha gbara n'ọrụ ahụ, na otu ha siri gosi obi ike n'izọpụta ndị ahụ a tọọrọ.
Ọ kọwara na ndịagha ahụ wakporo ogige ndị na-eyi ọha egwu ahụ n'ike site n'oke ọgụ ndịagha gosipụtara nke mere ka ọtụtụ ndịagha nnupụisi ahụ gbapụ n'ogige ebe ahụ gbabaa n'ime ọtụtụ ugwu gbara ha gburugburu, ebe ndị ọzọ nyefere onwe ha n'aka ndịagha Naịjirịa.
N'agbanyeghị na ndịagha Naịjirịa ekwupụtaghị ọnụọgụgụ ndị na-eyi ọha egwu nyefere onwe ha, Sani kwuru na ha amalitela inye ndị ahụ ha zọpụtara nnyocha ahụike ha, ma kpọpụ ha na mpaghara ebe ahụ e jichiri ha.
Ndị nchekwa amalitela ịchọ ụmụaka 50 ndị ojiegbe tọọrọ na Mussa, Borno steeti
Ndị ọchịchị Borno steeti ezigala ndị nche obodo na ndị nchekwa iji chọta ụmụaka ruru ihe dịka iri ise nke ndị ojiegbe tọọrọ n'ụlọakwụkwọ dị na Mussa.
Onyeisioche nke okpuruọchịchị Askira Uba nke ya na ogbo ya si Chibok gara obodo Mussa n'ụbọchị Sọnde 17 Mee iji tie ndị nne na nna nke ụmụaka a tọọrọ aka n'obi ma kwe nkwa ime ihe niile ha nwereike ime iji hụ na a tọhapụrụ ha ma kpọghachite ha n'ụlọ.
Ọ gwara ndị nne na nna na otu ndị nche nd ndịagha ga-arụkọ ọrụ iji chọpụta ebe ndị tọọrọ ahụ nọ.
Ka ọ dị ugbu a, otu nne na nna agwara BBC na ụmụaka abụọ n'ime ụmụakwụkwọ a tọọrọ agbapụla n'aka ndị jidere ha ma laghachi n'ezinaụlọ ha.
Cheta na ndị a na-enyo enyo na ha bụ ndị otu jihadist wakporo ụlọakwụkwọ atọ dị na Mussa n'ụbọchị Fraịde 15 Mee 2026, na-agba egbe iji mee ka ụjọ jide ha tupu ha chịkọta ụfọdụ ụmụakwụkwọ wee buru ha n'ụgbọ ọgbatumtum ma pụọ.
E kwukwara na ọtụtụ n'ime ụmụaka ahụ bụ obere ụmụaka dị n'agbata afọ abụọ na ise, si Mussa Central Primary School nke nwere ụlọakwụkwọ ọta akara na ngalaba praịmarị.
Ndị hụrụ ihe merenụ n'ụtụtụ Fraịde na Mussa, Borno steeti, kwuru na ndị a na-enyo enyo ji ụmụaka ahụ kpochie onwe ha mgbe ha na-agba ọsọ n'ụgbọ ọgbatumtum nke na-egbochi ndị nchekwa ịgba ha egbe.
Ka ọ dị ugbu a, o nwebeghị otu kwuru na ọ bụ ha mere mwakpo ahụ.
Ntọrọ ndị a mere n'ụlọakwụkwọ sekọndrị nke gọọmenti nwe bụ Government Day Secondary School, ụlọakwụkwọ praịmarị Mussa Central Primary School, na ụlọakwụkwọ sekọndrị nke State Universal Basis Education Board (SUBEB).