Ụzọ ọzọ Naịjirịa ga-esi gaa Iko Mbaụwa afọ 2026

Ụzọ ọzọ Naịjirịa ga-esi gaa Iko Mbaụwa afọ 2026
    • Onye dere ya, Chinonso Ugorji
    • Ndị mere akụkọ a, Journalist
    • Onye dere ya, Ikechukwu Kalu
    • Ndị mere akụkọ a, Senior Journalist and Video Journalist
  • Mgbe e biputara ya

Asọmpi Iko Mbaụwa nke afọ 2026 ga-esubiri n'ụbọchị Tọzde 11 Juun, 2026, mana otu ihe doro ewu na ọkụkọ anya bụ na otu egwu bọọlụ Super Eagles nke Naịjirịa agaghị eso ibe ha maa aka n'asọmpi egwuruegwu ahụ.

Mana, o nwere otu okwu ndị Igbo na-ekwu sị kama ehi mmadụ ga-agbanahụ ya, o gbubiri ya ọdụ. Nke a abụrụla ọnọdụ Naịjirịa ugbua, dịka ha ga-eji ọnụ gụtara onwe ha ihe ụkwụ ha na-apụghị ịgbatara ha.

Mbaụwa adịla njikere ugbua ịhụ nke Naịjirịa ji biri, dịka ụmụafọ Naịjirịa anọ 'ji olu eme nka' dịka Davido, Burna Boy, Rema na Ayra Staar ga-eso na ndị ga-atọghe ngịga maka asọmpi Iko Mbaụwa afọ 2026.

N'ozi FIFA wepụtara, Davido, Major Lazer na Nelly Furtado ga-agụ egwu ha kpọrọ "No Place Like Home' n'emume egwu abalị a ga-ahazi na Los Angeles, n'ụbọchị 10 Juun iji sụchasịa ụzọ maka mmalite Iko Mbaụwa.

Burna Boy na Shakira ga-ejikọ olu ha gụọ ukwe njirimara Iko Mbaụwa afọ 2026, a kpọrọ 'Dai Dai'. Rema, Lisa na Anitta ga-ejikọkwa aka gụọ egwu a kpọrọ 'Goals' ebe Ayra Starr na Latto ga-agụ 'Show Me'.

Nke a bụ iji gosi na Naịjirịa anaghị agba ndị ikpeazụ, n'agbanyeghị ọnọdụ ọbụla. Ọ bụ eziokwu na asọmpi Iko Mbaụwa afọ 2026 nke FIFA na-ahazi ahịala Naịjirịa etu maamịrị siri hịa ọkụkọ, mana olu ogene ha ga-agara ha njem n'ebe ụkwụ ha na-apụghị iru.