Blessing CEO: EFCC akpụpụla nwada a ụlọikpe maka ebubo ọhụrụ dịka e nyechara ya beelu maka nke e jibu ya

Mgbe e biputara ya
Oge e ji agụ akụkọ nkeji 1

Ụlọọrụ na-ebu agha megide nrụrụaka na mpụ ego bụ Economic and Financial Crime Commission (EFCC) akpụpụla Blessing Nkiruka Okoro, a ma ama dịka 'Blessing CEO' ụlọikpe maka ebubo igwu mmadụ chamdum ego dị nde naira iri isi na itoolu(N69.1m.)

Nke a na-abịa dịka e nyechara ya ntọhapụ nwa oge ka o si n'ụlọ na-abịa ikpe maka ikpe metụtara ebubo igwu mmadụ ego dị nde naịra iri atọ na isii (N36m).

EFCC kpụpụrụ Blessing CEO n'ihu ọkaikpe Jọstịs RA Oshodi nke Ụlọikpe Pụrụ Iche dị n'Ikeja Legọs ụbọchị Tuzde maka ebubo abụọ metụtara iji aghụghọ napụta mmadụ ego na izu ohi ego ruru nde naira iri isii na itoolu.

Mana ọkaiwu na-ekpechitere Blessing CEO bụ Nkama Nneka gwara ụlọikpe na a ka nyechara nwa ada ahụ ohere ịkwụ ụgwọ mgbara isi (bail.)

Jọstịs Oshodi nyere ntuziaka ka e jichie ya na mkpọrọ EFCC rue abalị 16 nke ọnwa Julai afọ 2026 maka ịnụ ikpe mgbapụta ya ka o si n'ụlọ na-abịa ikpe ahụ.

Cheta na a kpụburu Blessing CEO ụlọikpe maka maka igonye ya ụlọelu nwere ọnụụlọ isii na Lekki dị na Legọs Steeti, mana eju olee nne gị, kokororom.

ego dịka ha kpụpụrụ ya n'Ụlọikpe Ukwu Etiti dị na Legọs maka ebubo izu ohi na iji ụzọ aghụghọ napụ mmadụ ego.