Akụkọ dị mkpa - Juun 5, 2026

Akụkọ dị mkpa - Juun 5, 2026
Mgbe e biputara ya

Gee ihe na-eme n'ụwa taa n'otu nkeji:

  • Ụlọikpe Majie dị n'Abuja nọọrọ n'ụbọchị Fraịde 5 Mee, 2026 leba anya n'ebubo Gọọmentị Naịjirịa boro Emmanuel Kanu bụ nwanne Nnamdi Kanu, Ọkaiwu ya bụ Aloy Ejimakor, Omoyele Sowore na ndị ọzọ.
  • E boro mmadụ ndị ahụ ebubo ịhazi na ime ngagharịiwe n'ụbọchị 20 Ọktoba 2025 iji kpọọ oku ka a tọhapụ onyendu otu Indigenous People of Biafra (Ipob) bụ Nnamdi Kanu, tupu emechaa maa ya ikpe.
  • Akpịrị ịkpọ nkụ egbuola mmadụ iri anọ na itoolu n'ọzara Sahara dị na mpaghara Niger oge ụgbọala ha ji na-eme njem mebiri n'ụzọ.
  • N'ozi ha wepụtara na Facebook, ndị ọchịchị kwuru na ndị ahụ nwụrụ anwụ nọ n'ụzọ na-alọghachi maka emume ndị Alakụba ha gara na mba Mali, mana mmadụ abụọ gbalịrị pụta na ndụ.

Soyere anyị na websaịtị, Instagram, Facebook na WhatsApp chanelụ maka akụkọ niile na-eme n'ụwa.