Otu egwu bọọlu ụmụafọ Naịjirịa ga-akwado n'asọmpi Iko Mbaụwa 2026

Otu egwu bọọlu ụmụafọ Naịjirịa ga-akwado n'asọmpi Iko Mbaụwa 2026
Mgbe e biputara ya

Ọ bụ ezie n'otu egwu bọọlụ 'Super Eagles' esọghị n'asọmpi Iko Mbaụwa nke 2026, kama nmasị ndị mmadụ n'asọmpi ahụ ka dị ukwuu dịka ọ na ga-malite n'ụbọchị Tọzde abali 11 nke Juun 2026.

Oge BBC News Igbo jụrụ ụfọdụ ndị Naịjirịa ajụjụ, ha kwuru na ha ga-akwado mba ụfọdụ n'ihi ndị egwuregwu ha hụrụ n'anya, ebe ndị ọzọ kwuru na ha ga-akwado mba ndị Afrịka ga-anọchite anya mpaghara ahụ.

Lee ihe ha kwuru:

Nke bụ eziokwu bụ na ọ na-ewute m na obodo anyị Naịjirịa agaghị aga Iko Mbaụwa. Ma a bịa na ndị m na-achọ ka ha mee ọfụma, onye mbụ m na-atụ aka bụ Sadio Mané nke mba Senegal.

Egwuregwu nwoke ahụ doro anya, ọ nwere ezigbo ndidi, m na-atụkwa anya na ha ga-aga ebe dị anya n'asọmpi a.

Onye nke abụọ kwuru na ya ga-elele asọmpi Iko Mbaụwa nke afọ 2026 a. Ọ bụ ezie na ọ wutere m na otu egwuregwu Super Eagles anyị agaghị eso gbaa ya, mana m ga-elele ya n'ihi ụmụnne anyị ndị Naịjirịa na-agbara mba ọzọ bọọlụ, ndị dịka Bukayo Saka nke Ịngland na Michael Olise nke mba Fransị.

Onye nke atọ kwuru na ya maara na ndi Naịjirịa ga-akwado ndi Ịngland, ụfọdụ ha ga-akwado Brazil, ụfọdụ ga-akwado Argentina, ụfọdu ga-akwado Pọtụgal maka na ndi na-agba bọọlụ ha na-elele na Chelsea, Liverpool and Manchester city.

"Ị maara na ihe ọbụla otu egwuregwu bọọlụ Naịjirịa na-anọghị n'ime ya, obi ndị mmadụ anaghị adịcha na ya. N'agbanyeghị nke ahụ, ama m na ndị Naịjirịa ga-akwado mba Ịngland; ụfọdụ n'ime ha ga-akwado Brazil, ndị ọzọ akwado Argentina, ebe ụfọdụ ga-adabere na Pọtụgal n'ihi ndị egwuregwu ha na-ekiri n'otu egwu bọọlụ dịka Chelsea, Liverpool, na Manchester City," ka onye nke anọ kwuru.

Onye ọzọ kwuru na ya ma na ọ bụrụ na Naịjirịa banyere na 'World Cup', na anyị ga-eturu ugo n'asọmpi ahụ. "Mana, ka ihe siri dị ugbu a, olileanya m niile dị n'ebe mba Afrịka ndị ọzọ nọ dịka Saụt Afrịka na Ọljirịa ka ha gbaa mbọ. Ana m atụ anya ka otu n'ime mba ndị a buru iko ahụ bata n'ala Afrịka."

Onye ọzọ gara n'ihu kwuo: "A bịa na mba ndị Naịjirịa ga-akwado, n'uche nke m, ha dị mba atọ. Otu n'ime ha bụ Ịngland, n'ihi na ọtụtụ ndị bọọlụ nwere ọbara na Naịjirịa dịka Eberechi Eze, Noni Madueke, na Bukayo Saka na-agbara otu egwuregwu bọọlụ Ịngland."

Mba Pọtụgal nwere ndị egwu dịka Ronaldo, Argentina nwere Messi, ebe Brazil nwere Neymar. Ndị Naịjirịa hụrụ ndị egwuregwu a n'anya nke ukwuu, ọkachasị Messi na Ronaldo. Ị ga-achọpụta na ndị na-akwado Ronaldo na ndị na-akwado Messi na-achọ ka otu n'ime ha merie buru iko ahụ.

O nwughi ihe na-enye obi aṅuri na Naịjirịa agaghi asọmpi Iko Mbaụwa afọ asatọ. Ọ bụ ihe ọjọọ nyere anyi bụ ndị Naịjirịa. N'ime ihe niile anyị ga-enye nwanne anyị bụ Gana, ndi agbata obi anyị, kwado.