Ihe anyị ma maka 'IED' gbawara n'ahịa Mushin dị na Legọs

Mgbe e biputara ya
Oge e ji agụ akụkọ nkeji 2

Ndị uweojii Legọs steeti ekwuola na ụda ike ndị mmadụ nụrụ na mpaghara Mushin dị na Legos n'ụbọchị Mọnde 22 Juun 2026 sitere n'ihe 'IED' tiwara na mpaghara ahụ.

Dịka Kọmishọna ndị uweojii na steeti ahụ kwuru na ọnọdụ nchekwa dị mma alaghachitela na mpaghara ugbua.

Tijani Fatai kwuru na ndị ọkachamara na ngalaba na-ahụ maka ihe ntiwa IED gbatara na mpagahara ihe mere na Mushin, gbochie ya ka ndị mmadụ ghara irute nso ma mee nnyocha nke gosiri na ọ bụ ihe IED nke e tinyere n'otu ụgbọala Toyata Sienna onye nwe ya dọkwara n'okporoụzọ n'abalị o nwee nọrọ ebe ahụ chi nwee bọọ.

Fatai gwara ndị ntaakụkọ nao nye nwe ụgbọala ahụ gwara ndị uweojii na ya dọbara ụgbọala n'ebe ahụ chi nwere bọọ ma ọ bụ mgbe ya banyere n'ime ụgbọala ahụ n'ụtụtụ ka ya gbanye ụgbọala ahụ bụ mgbe ihe ntiwa ahụ gbawara n'ebe ndị mmadụ na-anọ n'ime ụgbọala ahụ.

Fatai kwuru na onye nwe ụgbọala ahụ nwekwara obere merụahụ sitere n'ihe ahụ tiwara n'ime ụgbọala ya mana e bugara ya n'ụlọọgwụ bụ ebe ọ na-anata ọgwụgwọ ugbua. Ka o siri kọọ ọnọdụ ahụike onye nwe ụgbọala ahụ dị nke ọma ugbua.

Ọ kọwakwara na ndị uweoji nnyochara mpaghara ahụ niile ma chọpụta na ọnọdụ nchekwa ya ndị nke ọma ugbua. Ọ gwakwara ndị mmadụ ka obi ghara ịma ha jijij dịka ọ gwara onye ọbụla ka ha gaa n'ihu n'ibi ndụ na-atụghị ọjọọ ọ bụla.