Keir Starmer agbaala arụkwaghị n'ọkwa dịka Praịm Minista UK

Mgbe e biputara ya
Oge e ji agụ akụkọ nkeji 3

Praịm minista mba United Kingdom agbaala arụkwaghịm n'ọkwa ya dịka praịm minista na onye ndu nke Labour Party ma kwuo na ya ga-eme ihe niile o nwereike ime iji hụ na enyefere ọchịchị n'usoro.

Keir Starmer kwukwara na ya ga-enye onye ga-anọchi ya nkwado zuru oke.

N'ozi Starmer wepụtara n'ụtụtụ Mọnde oge ọ na-agwa ndị ntaakụkọ okwu n'obi ọchịchị dị na 10 Downing Street, ka o kwuru na mkpebi niile o mere n'oge ọchịchị ya bụ maka ọdịmma obodo Briten.

Cheta na Keir Starmer malitere ọrụ dịka Praịm Minista mba UK n'afọ 2024.

Ka ọ dị ugbu a, Starmer kwuru na ọ ga-anọgide n'ọrụ ruo mgbe a họpụtara onye ga-anọchi ya.

Ọ gara n'ihu kwuo na "Ịga ije n'okporoụzọ Downing afọ abụọ gara aga bụ oge kacha mma na ndụ m,".

Dịka o siri kwuo, ọ sị na ya banyere n'ọchịchị maka ohere ịgbanwe ndụ ọtụtụ nde mmadụ ka ọ ka mma.

Starmer kọwakwara njem ahụ hụrụ ka Labour weghaara ọchịchị n'ọnwa Julaị 2024.

Starmer si n'obi ọchịchị pụọ dịka nwunye ya na ndị mmadụ na-eti mkpu ma na-akụ aka.

Kedụ ebe Keir Starmer si mejọọ ndị Briten?

Starmer gbara arụkwaghịm n'ihi na ọtụtụ ụmụafọ mba Briten malitere ịkpọ oku ka ọ rịtuo n'ọkwa ya.

Kemgbe ọ batara n'ọchịchị n'afọ 2024, Starmer gbanwere ụfọdụ nkwa o kwere ndị pati, ndị nkwado ya nakwa ụmụafọ Briten ndị ọzọ.

Otu n'ime ha bụ atụmatụ gọọmentị ya gbasara ego enyemaka oge oyi maka ndị okenye, nke ọchịchị Starmer kwuru na a ga-akwụ naanị ndị ufọdụ ma hapụ ndị ọzọ.

Ihe ọzọ kpatara nsogbu ahụ bụ mkpebi ya ịmalite nnyocha iwu gbasara ndị otu a na-ebo ebubo imegbu ụmụaka, nke a na-asị na Starmer agbaghị mbọ siri ike ịhụ na e guzobere ya na mbụ.

Ọzọkwa, atụmatụ Starmer ịbelata ụfọdụ ụgwọ enyemaka ọha mere ka ọtụtụ ndị otu ya na Labour malite ịkatọ ya.

N'afọ 2025, Labour Party tufuru ihe ruru oche kansụl 1,500 n'ntuliaka ọchịchị ime obodo n'Ịngland.

Mgbe nke ahụ gasịrị, ụfọdụ ndị isi gọọmenti Starmer gbara arụkwaghịm, ebe ọtụtụ ndị hụrụ okwe ntuliaka ahụ dịka ihe na-egosi na ọtụtụ ndị mmadụ anaghịzi akwado ọchịchị ya.

Nsogbu ọzọ bịara mgbe Starmer kpọpụtara Lord Mandelson dịka onye nnọchi anya Briten na mba Amerịka, n'agbanyeghị akụkọ na-egosi na ọ dara ụfọdụ usoro nnyocha tupu nhọpụta ahụ.

Ndị na-akatọ Starmer kwukwara na mmekọrịta Mandelson na Jeffrey Epstein nwere, onye a mara ikpe n'okwu metụtara mmetọ ụmụaka, mere ka e nwee ajụjụ gbasara mkpebi Praịm Minista Starmer, ịhụpụta ya dịka onye nnọchianya.

Onye bụ Keir Starmer?

Keir Starmer bụ onye ndọrọndọrọ ọchịchị mba Briten bụ onye rigoro n'ọkwa dịka onyendu ndi otu 'Labour Party' kemgbe afọ 2020 ma bụrụkwa Praịm Minista nke UK, site n'ọnwa Julaị 2024 ruo Juun 2026.

A mụrụ ya na ọnwa Septemba afọ 1962 na Southwark, Lọndọn.

Ọ bụ nwa nke abụọ n'ime ụmụnne anọ.

Nne ya bụ onye nọọsụ ebe nna ya bụ onye na-arụ ọrụ igwe. Ezinụlọ ya bụ ndị na-akwado Labour Party, nke mere ka ọ malite inwe mmasị na ndọrọndọrọ ọchịchị mgbe ọ ka bụ nwata.

Mgbe ọ dị afọ 16, Starmer sonyeere otu ndị ntoroọbịa Labour Party. Tupu ọ banye n'ọchịchị, ọ bụ onye ọkaiwu n'afọ 1987.

N'afọ 2008, a họpụtara ya dịka onyeisi ụlọọrụ na-ahụ maka ịgba akwụkwọ mpụ nke Ịngland na Wales.

N'afọ 2015, ọ malitere ịbụ onye omeiwu na-anọchi mpaghara Holborn na St Pancras. Mgbe Labour Party mechara ntuliaka nke 2024, Eze King Charles III họpụtara ya dịka Praịm Minista, bụrụkwa onye mbụ Labour Party weghachitere n'ọkwa ahụ kemgbe 2010.

N'oge ọchịchị ya, Starmer kwere nkwa na ya ga-elekwasị anya na mmepe akụ na ụba, ahụike, agụụmakwụkwọ nakwa nchedo ikike ndị ọrụ.

N'ọnwa Mee afọ 2026, esemokwu dapụtara n'ime Labour Party n'ihi nkatọ Starmer na-enweta gbasara atụmatụ akụnaụba na mbata ndị mbịarambịa n'ala Briten.

Nkatọ a na-aga n'ihu mere ka ụfọdụ ndị isi gọọmenti ya hapụ ọkwa ọchịchị.

Na 22 Juun afọ 2026, Starmer kwuputara na ọ ga-ahapụ ọkwa ya dịka Praịm Minista na onyendu Labour Party.