You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.
Ihe asaa mba Amerịka na Ịran kwekọrịtara na ihe nwereike ime ka nkwekọrịta ha kpụọ afọ n'ala
- Onye dere ya, Amir Azimi
- Mgbe e biputara ya
- Oge e ji agụ akụkọ nkeji 2
O ruola ihe karịrị ọnwa atọ mba Amerịka na Ịran malitere ịlụ agha, mana ha abụọ mechaara kwenye na mkpebi ịkwụsị agha site na nkwekọrịta ọhụrụ ha mere n'ụbọchị Wenezde, abalị iri na asaa n'ọnwa Juun.
Mana ọtụtụ ajụjụ ka na-achọ azịza. Gịnị ka mba Amerịka na Ịran nwetara n'ime nkwekọrịta a, gịnịkwa bụ ihe mgbochi ndị nwere ike imebi ya?
1. Ịran nwetara nkwụsị agha nakwa ohere ịrụzi akụnaụba ha
Nkwụsị agha enyela mba Ịran ohere ịlaghachi n'ọrụ akụ na ụba kamgbe ihe karịrị ụbọchị 100 ha nọ na-alu ọgụ. Mba Ịran nwere ike ikwu na ha nwere mmeri n'agha ahụ maka na a kwatughị ọchịchị Alakụba ha, ọzọ kwa bụ na a ga-emeghekwa ọwa mmiri Hormuz ọzọ. Nkwekọrịta ahụ mekwara ka mkparịta ụka gbasara iwepụ ụfọdụ mmachi akụ na ụba malite.
2. Mba Amerịka nwetara nkwa kachasị mkpa n'aka Ịran:
Onyeisiala mba Amerịka bụ Donald Trump kwuru na nkwekọrịta ahụ bụ nnukwu mmeri, n'ihi na Ịran ekwenyela ịga n'ihu na mkparịta ụka gbasara ịkwụsị ịmepụta ngwaagha nuklia.
3. Mmanụ ụgbọala nwereike ịdị ọnụ ala:
Mmeghe nke ọwa mmiri 'Strait of Hormuz' nwere ike ime ka ọnụ mmanụ ụgbọala gbadata, nke ga-enyere akụ na ụba ụwa aka.
4. Ndị na-akwado ọchịchị Iran nwere ike ghara inwe afọ ojuju
Ọtụtụ ndị na-akwado ọchịchị Alakuba nke Ịran nwere ike ikwu na gọọmentị Ịran ga-abụ ndị chịliri aka n'elu n'agha ahụ ma ọ bụrụ na ha mee nkwekọrịta gbasara 'uranium' maọbụ ikwụsị ụlọọrụ niuklia ha. Ndị na-eche otu a nwere ike ịhụ ya dịka ikwenyere maọbụ ịku afọ n'ala n'ihu mba US.
5. Trump na-echekwa onwe ya n'aka ndị na-akatọ ọchịchị ya:
Nkwekọrịta ahụ enyela Trump ohere igosi na ọ kwụsịrị agha ngwangwa. Mana ụfọdụ ndị otu patị ya nọ 'Republican' na-akatọ ya, na-ekwu na Ịran nwetara ọtụtụ uru karịa ihe America nwetara.
6. Ego nrughari Ịran ka bụ isi okwu
Nkwekọrịta ahụ kwuru maka atụmatụ mba Amerịka inye Ịran ijeri dọla 300 maka ịruzi akụ na ụba ha. Nke a emeela ka ụfọdụ ndị ndọrọndọrọ ọchịchị mba Amerịka katọọ atụmatụ ahụ, na-ekwu na gọọmentị Amerịka enyela Ịran nnukwu onyinye.
7. Okwu kachasị sie ike ka dị n'ihu
A ka ga-ekpebi ihe ga-eme 'uranium' mba Iran nwere ya na otu a ga-esi wughachi ụfọdụ ụlọọrụ emebiri n'oge agha. Ndị a bụ isi okwu nwere ike ime ka mkparịta ụka ahụ sie ike.