Gịnị mere ụka Church of England ji na-alụ ọgụ gbasara ịkwụ ụgwọ ohu?

Mgbe e biputara ya
Oge e ji agụ akụkọ nkeji 2

Ụka Church of England nọ n'etiti nnukwu esemokwu gbasara atụmatụ ya inye nde pound 100 (£100m) dịka ego nkwụghachi ụgwọ mmebi, iji nyere ndị azụmahịa ohu nke Afrịka mmetụtara aka.

Nnyocha kpaliri arịrịọ mgbaghara:

Nke a bịara mgbe nnyocha e mere chọpụtara na ego ụka ahụ na-etinye n'ọrụ senchuri nke iri na asatọ nwere njikọ na ụlọọrụ 'South Sea Company', otu n'ime ụlọọrụ gọọmenti Briten ji atụ mgbere ohu gafee Oke Osimiri Atlantic.

N'afọ 2023, ndị isi ụka rịọrọ mgbaghara maka uru ha kwuru na ụka ahụ ritere site n'azụmahịa ohu. Ha weputara atụmatụ a kpọrọ 'Project Spire' nke ga-eji ego ahụ kwado azụmahịa, agụmakwụkwọ, na mmepe nke ndị ojii nọ na Briten nakwa mba ndị ọzọ, ọkachasị ndị nwere mgbọrọgwụ sitere n'Afrịka na Caribbean.

Ndị na-akwado atụmatụ a kwuru na ọ bụ ụzọ isi gosi nchegharị ma nabata eziokwu banyere akụkọ ihe mere eme.

Mana ruo taa, e mebeghị atụmatụ ahụ nke ọma n'ihi esemokwu iwu na enweghị nkwekọrita.

Ndị na-emegide ya bu atụmatụ:

Ọtụtụ ndị ọzọ na-emegide atụmatụ ahụ na-ekwu na e nweghị ihe akaebe zuru oke na ego ụka taa sitere n'ịtụ mgbere ohu. Ha kwuru na ego ahụ bụ nke e kwesịrị iji kwado ụka na ọrụ ndị ọzọ dị mkpa kama ịkwụ ụgwọ maka ihe mere ọtụtụ afọ gara aga.

Esemokwu nkwụghachi ụgwọ mgbere ohu:

Ụfọdụ ndị ndọrọndọrọ ọchịchị na ndị ọkammụta kwenyere na ọ bụghị ndị bi ugbua kwesịrị ịta ahụhụ maọbụ kwụọ ụgwọ maka mmehie ndị nna nna ha mere. Ma ndị ọzọ na-ekwu na ihe nna nna ha gabigara dịka ohu ka na-emetụta ha ruo taa, n'ụzọ ịda ogbenye na enweghị ohere ụfọdụ obodo ndị ojii bi na ha.

'Project Spire' ka nọ n'ọnọdụ enweghị mkpebi

Ka ọ dị ugbua, Project Spire ka nọ n'ọnọdụ enweghị mkpebi doro anya. Ndị na-akwado ya nwere olileanya na a ga-emecha ya, ebe ndị na-emegide ya na-arịọ ka a kagbuo ya kpamkpam.

N'ihi ya, ajụjụ ka dị: Ọ ga-ekwe omume ka ụka 'Church of England' kwụọ ụgwọ mmehie e mere n'oge gara aga, ka esemokwu dị n'etiti ndị ọkammụta o nwereike ịgbochi atụmatụ ahụ?