Etu ikpe 'Mmụọ Mmiri Afuluanya' si gaa n'ụlọikpe

Mgbe e biputara ya
Oge e ji agụ akụkọ nkeji 2

Ụlọikpe Ukwu nke Anambara enyela dibịa afa si Nnewi, Ikechukwu JohnPaul Ezenagu, onye a ma ama dịka 'Mmuo Mmili Afuluanya', ohere isi n'ụlọ na-abịa ikpe ya site na mgbapụta ego ruru nde naịra iri ise (₦50m).

Ọnọdụ mgbapụta ndị ọzọ ụlọikpe nyere Mmuo Mmili Afuluanya gụnyere mmachibido ya na ndị ntaakụkọ inwe mkparịtaụka.

A gwakwara ya na gọọmentị steeti ga-anapụ ya ụfọdụ akụnaụba ya ma ọ bụrụ na ọ gbaa ọsọ maọbụ mebie ọnọdụ mgbapụta ahụ.

Na mgbakwunye, ụlọikpe nyere iwu ka Mmụọ Mmili Afụlụanya nyefee akwụkwọ ụlọ obibi ya n'aka ụlọikpe.

Ha sị na Gọọmenti Anambara Steeti ga-eweghara ụlọ ahụ ma ọ bụrụ na Mmụọ Mmili Afụlụanya daa mba ịbịa ụlọikpe maọbụ gharịpụ n'ọnọdụ mgbapụta ya.

Oge ọ na-ekwu okwu mgbe e nyechara nchabi ikpe ahụ, Ọkaiwu na-ekwuchitere Mmụọ Mmili Afụlụanya bụ Kingsley Awuka sịrị na ọnọdụ mgbapụta e nyere ha ataghị akpụ, nke na ha agaghị enweike zute ya.

Ọ gara n'ihu gbaa isi akwara na ọ bụ ihe doro ya anya na onye ọ na-ekwuchitere ọnụ ya adaghị iwu.

Awuka sịrị na ya na-eche ịhụ ihe akaebe gọọmenti steeti ahụ ga-ewepụta megide Mmụọ Mmili Afụlụanya.