You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.
Etu ikpe 'Mmụọ Mmiri Afuluanya' si gaa n'ụlọikpe
Ụlọikpe Ukwu nke Anambara enyela dibịa afa si Nnewi, Ikechukwu JohnPaul Ezenagu, onye a ma ama dịka 'Mmuo Mmili Afuluanya', ohere isi n'ụlọ na-abịa ikpe ya site na mgbapụta ego ruru nde naịra iri ise (₦50m).
Ọnọdụ mgbapụta ndị ọzọ ụlọikpe nyere Mmuo Mmili Afuluanya gụnyere mmachibido ya na ndị ntaakụkọ inwe mkparịtaụka.
A gwakwara ya na gọọmentị steeti ga-anapụ ya ụfọdụ akụnaụba ya ma ọ bụrụ na ọ gbaa ọsọ maọbụ mebie ọnọdụ mgbapụta ahụ.
Na mgbakwunye, ụlọikpe nyere iwu ka Mmụọ Mmili Afụlụanya nyefee akwụkwọ ụlọ obibi ya n'aka ụlọikpe.
Ha sị na Gọọmenti Anambara Steeti ga-eweghara ụlọ ahụ ma ọ bụrụ na Mmụọ Mmili Afụlụanya daa mba ịbịa ụlọikpe maọbụ gharịpụ n'ọnọdụ mgbapụta ya.
Oge ọ na-ekwu okwu mgbe e nyechara nchabi ikpe ahụ, Ọkaiwu na-ekwuchitere Mmụọ Mmili Afụlụanya bụ Kingsley Awuka sịrị na ọnọdụ mgbapụta e nyere ha ataghị akpụ, nke na ha agaghị enweike zute ya.
Ọ gara n'ihu gbaa isi akwara na ọ bụ ihe doro ya anya na onye ọ na-ekwuchitere ọnụ ya adaghị iwu.
Awuka sịrị na ya na-eche ịhụ ihe akaebe gọọmenti steeti ahụ ga-ewepụta megide Mmụọ Mmili Afụlụanya.