Mamman Daura: Olee ebe nwanne Buhari nọ ugbua?

Mgbe e biputara ya

Dịka akụkọ na-ewu na sọshal midia na-ekwu na e bupụrụ Mamman Daura, nwanne nna Onyeisiala Muhammadu Buhari, ala Bekee maka nleta ahụike, ndị nọ ya nso si na ọ bụghị eziokwu, kama na ọ bụ ezumike ka ọ gara n'ala Bekee.

BBC na mmadụ atọ ndị nọ Daura nso nwere mkparịtaụka, ha wee gbaa ama n'ezie na Mamman Daura, nwunye ya, otu nwa ya nwoke, na otu nwoke ọzọ ji ụgbọelu aka mkpa (private jet) fega Lọndọn n'ụtụtụ Wenezde."

Ndị ahụ na-achọghị ka a kpọọ aha ha kwuru n'ije ahụ nwoke ahụ gbara afọ iri asaa na itoolu gara abụghị maka nleta ahụike.

Ha sịrị na "ahụ siri Mamman Daura ike, na o nweghị ọrịa na-arịa ya,"kama ha kwuru na ahụ siri ya ike nke ọ gararịị akwamaozu onye bụbu ọnụ na-ekwuru Buhari bụ Wada Maida n'ụbọchị Wenezde.

Nke a na-eme dịka ndị mmadụ na-ekwu na ọnọdụ ahụike Daura esichaghị ike nke mere ka e buru ya gawa maka nleta n'ala Bekee.

Ndị ezinaụlọ Daura kwuru na o teela ha ji chọọ ka ọ gaa ala bekee gaA zuo ike mana o kweghị dịka o kwuru na ya anaghị aga ebe ọbụla n'ihi mgbachi obodo (lockdown).

Akụkọ ndị ọzọ ga-amasị gị: