Unknown gunmen attack Obowo Imo: Gịnị na-eme n'Obowo na Ihitte/Uboma?

Mgbe e biputara ya

Ọsọ gbara n'obodo Umulogho dị n'okpuruọchịchị Obowo na Isinweke dị n'Ihitte/Uboma n'Imo steeti, n'abalị Fraịde ka ndị ojiegbe egbu nọ na-agba ọsọ gbagburu ihe ruru mmadụ atọ.

N'otu aka ahụ, ndị oji egbe a wakpokwara obodo Orieagụ dị n'okpuruọchịchị Ehime Mbano nakwa Ofor Ogbe dị n'Ahịazụ Mbaise n'otu abalị ahụ.

Ndị obodo ahụ gwara BBC Igbo na ndị omekome ahụ gbakwara ihe ruru ọgbatumtum iri ọkụ, dịka ha merụrụ ọtụtụ ndị azụmahịa ahụ.

Foto e sere na-efegharị gosiri ebe dimkpa abụọ na otu nwaanyị tọgbọrọ n'ala n'ime ọbara ha.

Ndị nọ ka ihe mere gwara BBC Igbo sị, "obodo anyị bụ obodo udo, anyị nọ ebe anyị na-akọ maka ndọrọndọrọ ọchịchị mgbe ndị a bidoro gbawa egbe"

Ha gara n'ihu kwuo, "Ebe elekere ole na ole agafeela mana o nwebeghị ndị ọrụ nchekwa anyị hụrụ ebe a".

Mgbe BBC Igbo kpọtụrụ Mike Abattam bụ ọnụ na-ekwuru ndị uweojii na steeti ahụ, o kwuru sị "Anyị ka na-eme nnyocha maka ihe mere n'ezie, n'oge adịghị anya anyị ga-ewepụta ozi maka nnyobanye anya anyị mere".

Akụkọ ga-amasị gị: