Unknown gunmen attack Obowo Imo: Gịnị na-eme n'Obowo na Ihitte/Uboma?

Ebe ndị omekome mụnyere ọtụtụ ọgbatumtum ọkụ n'Orieagu dị n'Ehime Mbano, Imo steeti

Ebe foto si, Other

Nkọwa foto, Ọgbatumtum ndị omekome mụnyere ọkụ n'Orieagu dị n'Ehime Mbano, Imo steeti
Mgbe e biputara ya

Ọsọ gbara n'obodo Umulogho dị n'okpuruọchịchị Obowo na Isinweke dị n'Ihitte/Uboma n'Imo steeti, n'abalị Fraịde ka ndị ojiegbe egbu nọ na-agba ọsọ gbagburu ihe ruru mmadụ atọ.

N'otu aka ahụ, ndị oji egbe a wakpokwara obodo Orieagụ dị n'okpuruọchịchị Ehime Mbano nakwa Ofor Ogbe dị n'Ahịazụ Mbaise n'otu abalị ahụ.

Ndị obodo ahụ gwara BBC Igbo na ndị omekome ahụ gbakwara ihe ruru ọgbatumtum iri ọkụ, dịka ha merụrụ ọtụtụ ndị azụmahịa ahụ.

Okpuruọchịchị Obowo Ihitte/Uboma nke Imo steeti
Nkọwa foto, Ebe ndị ojiegbe gbara ụlọahịa na ọgbatumtum ndị obodo ọkụ n'okpuruọchịchị Obowo Ihitte/Uboma nke Imo steeti

Foto e sere na-efegharị gosiri ebe dimkpa abụọ na otu nwaanyị tọgbọrọ n'ala n'ime ọbara ha.

Imo steeti

Ndị nọ ka ihe mere gwara BBC Igbo sị, "obodo anyị bụ obodo udo, anyị nọ ebe anyị na-akọ maka ndọrọndọrọ ọchịchị mgbe ndị a bidoro gbawa egbe"

Ha gara n'ihu kwuo, "Ebe elekere ole na ole agafeela mana o nwebeghị ndị ọrụ nchekwa anyị hụrụ ebe a".

Mgbe BBC Igbo kpọtụrụ Mike Abattam bụ ọnụ na-ekwuru ndị uweojii na steeti ahụ, o kwuru sị "Anyị ka na-eme nnyocha maka ihe mere n'ezie, n'oge adịghị anya anyị ga-ewepụta ozi maka nnyobanye anya anyị mere".

Akụkọ ga-amasị gị:

Aha onyonyo, Etu Ada Palm dị n'Ihitte/Uboma dị